Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Dị Oké Ọkụ Ihe Si Aga n’Ụwa A

Ụzọ Dị Oké Ọkụ Ihe Si Aga n’Ụwa A

Ụzọ Dị Oké Ọkụ Ihe Si Aga n’Ụwa A

OTÚ IHE SI AGA NÁ NDỤ Ọ̀ NA-ENYE GỊ NNỌỌ NSOGBU MGBE ỤFỌDỤ? Ọ̀ NA-EME KA I NWEE NKỤDA MMỤỌ, IKE ỌGWỤGWỤ, NA-EME KA Ị GHARA INWECHA IKE ỊNAGIDE IHE? YA BỤRỤ OTÚ AHỤ, Ọ BỤGHỊ NANỊ GỊ.

ỌTỤTỤ nde mmadụ, karịsịa ndị bi n’obodo ukwu, na-achọpụta na ihe na-agazi oké ọsọ ọsọ ná ndụ ma na-agwụ ike. Ọ dị otú a karịsịa n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. N’otu nzukọ okpukpe e nwere na nso nso a na United States, otu onye kwuru okwu gwara ndị na-ege ya ntị ka ha welie aka ha ma ọ bụrụ na ike na-agwụkarị ha. Ozugbo, ọtụtụ ndị weliri aka ha.

Akwụkwọ bụ́ Why Am I So Tired? na-ekwu, sị: “Ruo ugbu a, ndụ nke oge a jupụtara ná nrụgide ndị a na-enwetụbeghị mbụ—ịbanye ụgbọelu n’oge, imecha ihe n’oge a chọrọ, ibuga ụmụ akwụkwọ ọta akara n’ụlọ akwụkwọ na ibulata ha n’oge—o nweghị ọgwụgwụ.” Ọ bụghị ihe ijuanya na a kọwawo ike ọgwụgwụ dị ka ihe na-akpata mbibi n’oge anyị. *

N’oge gara aga, ndụ dị mfe karị, ihe na-agakwa nwayọọ nwayọọ ná ndụ karị. Ndị mmadụ na-ebikarị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’otú e si kee ụbọchị—ehihie bụ maka ọrụ, abalị abụrụ maka ezinụlọ onye ahụ nakwa maka ihi ụra. Taa, e nwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji na-enwewanye oké ike ọgwụgwụ.

Na Mberede, Oge Ehihie Adịwanye Ogologo

Otu ihe pụrụ ịkpata ya bụ na ndị mmadụ adịghị ehicha ụra. Otu n’ime ihe ndị dị ịrịba ama malitere na-akpaghasị oge ụra bụ mmepụta nke ọkụ eletrik. A gbanyehaala ọkụ, ndị mmadụ pụrụ ịchịkwa ókè “oge ehihie” ga-aharu n’ogologo, n’oge na-adịghịkwa anya ndị mmadụ malitere ịmụ anya karị. N’ezie, ọtụtụ ndị apụghị ime ihe ọ bụla banyere ya n’ihi na ụlọ mmepụta ihe malitere ịrụ ọrụ ehihie na abalị, ụlọ ọrụ ndị na-ejere ọha ozi gbatịkwukwara oge ọrụ ha. Otu onye edemede, kwuru, sị: “A malitere inwe ọha mmadụ na-arụ ọrụ ehihie na abalị.”

Ihe ndị ọzọ e mepụtara site na nkà na ụzụ, dị ka redio, TV, na kọmputa, ekerewokwa òkè n’igbochi ndị mmadụ ihi ụra dị ha mkpa. N’ọtụtụ ala, a na-eme ihe omume TV ehihie na abalị. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ndị ihe nkiri ma ọ bụ egwuregwu na-amasị ịga ọrụ na-ero ụra ma nwee ike ọgwụgwụ mgbe ha kirisịrị ihe nkiri n’abalị ruo ogologo oge. Kọmputa na ọtụtụ ihe ndọpụ uche dị na ya na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ ghara ịlakpu ụra n’oge. Otú ọ dị, ụta adịrịghị ihe ndị a n’onwe ha; ka o sina dị, ha na-akpalikwu ụfọdụ ndị ileghara mkpa ọ dị izu ike anya.

Ihe Agakwuo Ọsọ Ọsọ ná Ndụ

Ọ bụghị nanị na oge ehihie anyị adịkwuola ogologo kama ihe dị iche iche n’onwe ha yiri ka hà na-agakwu ọsọ ọsọ ná ndụ—nke nkà na ụzụ mekwara ka ọ dị mfe karị. Ụgbọ ịnyịnya na-adọkpụ bụ́ nke e nwere n’ihe na-erughị otu narị afọ gara aga eyitụdịghị ụgbọala ndị na-efe ọsọ, ụgbọ okporo ígwè ndị na-efe oké ọsọ, na ụgbọelu nke taa. N’eziokwu, onye ọchụ ntá ego nke oge a, onye ọ pụrụ ịbụ na nna ya ochie na-eji ụkwụ ma ọ bụ na-agba ịnyịnya ma ọ bụ ịnyịnya ígwè aga ọrụ, pụrụ iji ụgbọelu fefere Oké Osimiri Atlantic tupu oge nri ọzọ eruo!

E nwewokwa oké mgbanwe na-akpataghị ọgba aghara n’ọfịs ka e wee na-arụ ọrụ ngwa ngwa ma na-arụpụta ihe. Kọmputa, ígwè ozi fax, na ozi E-mail anọchiwo anya ígwè typewriter na usoro a na-ejikarị eziga akwụkwọ ozi. Kọmputa elu apata ụkwụ, fon ndị na-enweghị eriri, na ígwè ozi pager emewo ọbụna ka ebe obibi yie ọfịs.

N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ibelata ụzọ na-adịwanye ọkụ ihe si aga n’ụwa. Otú ọ dị, anyị pụrụ n’onwe anyị ime mgbanwe ndị ga-enyere anyị aka ibi ndụ dị jụụ ma zie ezie karị. Ma tupu anyị atụlee nke a, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime mmetụta nke ụzọ dị oké ọkụ ihe si aga taa pụrụ inwe n’ebe anyị onwe anyị na ọha mmadụ dum nọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 E wezụga nrụgide ndị a na-enwe kwa ụbọchị, ọtụtụ ihe pụkwara ịkpata ma ọ bụ ime ka oké ike ọgwụgwụ ka njọ. Ihe ndị na-akpata ya pụrụ ịgụnye nsogbu ahụ ike, erighị nri nke ọma, ọgwụ ọjọọ, mmetọ ọgwụ na-akpata, nsogbu uche na nke mmetụta uche, ịka nká, ma ọ bụ njikọta nke ihe ndị a na-akpata ya.