Gịnị Ma Ọ Bụrụ na Ndị Mụrụ M Echee na Mụ Etorubeghị Ime Mkpapụ?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Ma Ọ Bụrụ na Ndị Mụrụ M Echee na Mụ Etorubeghị Ime Mkpapụ?
“Mama, oge a na-eme nke a agaala. Ugbu a abụghị afọ ndị 1950. Onye ọ bụla na-eme mkpapụ! Abụghịzi m obere nwa.” —Janie dị afọ 16. *
Ọ PỤRỤ ịkụda gị mmụọ ma a gwa gị na i torubeghị ime mkpapụ. “Achọrọ m ime ihe Bible kwuru ma sọpụrụ nne m na nna m,” ka otu onye ntorobịa na-ekwu, “ma echeghị m na ihe ha kwuru ziri ezi. Amaghịdị m otú mụ na ha ga-esi kwurịta banyere nke a.” Dị ka nwa okorobịa a, ọ pụrụ ịdị gị ka ndị mụrụ gị enweghị ezi uche na ọmịiko. Ma eleghị anya i zutewo onye ihe ya masịrị gị n’ezie ma chọọ ịmata ya nke ọma karị. Ma ọ bụ ikekwe ị na-eche na ịmalite ime mkpapụ ga-enyere gị aka ịdị ka ndị ọgbọ gị karị. “A na-enwe nrụgide,” ka Michelle na-ekwu. “Ọ bụrụ na ị dịghị eme mkpapụ, ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ ga-eche na ị gbapụrụ iche.”
Otu onye ndụmọdụ ezinụlọ kwuru banyere ime mkpapụ, sị: “Ọ dịghị akụkụ ọ bụla ndị mụrụ ụmụ yiri ka hà na-egosi enweghị ezi uche na ya karịa ka ha na-egosi n’akụkụ a.” Ma nanị n’ihi na ndị mụrụ gị yiri ka ha enweghị ezi uche, ọ̀ pụtara na ha enweghị ya n’ezie? E kwuwerị, Chineke chọrọ ka ndị mụrụ g̣ị na-ezi gị ihe, na-azụlite, na-echebe, ma na-eduzi gị. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ọ̀ pụrụ ịbụ na ndị mụrụ gị nwere nchegbu ụfọdụ ziri ezi banyere ọdịmma gị? “Agwọ dị n’akịrịka,” ka otu nne na-ekwu, “ọ na-emenyekwa nnọọ egwu.” N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ ji enwe nchegbu banyere ime mkpapụ na nwata?
Mmetụta Ndị Dị Ize Ndụ
“Ndị mụrụ m na-eme ka ọ̀ dị ihe ọjọọ dị n’inwe mmasị n’ebe mmadụ nọ,” ka Beth dị afọ 14 na-ekpesa. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ ndị Kraịst, ha maara nke ọma na Chineke mere nwoke na nwanyị inwe mmasị n’ebe ibe ha nọ. (Jenesis 2:18-23) Ha maara na mmasị a bụ ihe e bu pụta ụwa, na o kwekọrọ ná nzube Onye Okike anyị bụ́ ka ihe a kpọrọ mmadụ “jupụta ụwa.”—Jenesis 1:28.
Ọzọkwa, ndị mụrụ gị maara ókè agụụ mmekọahụ pụrụ isiru n’ike mgbe ị nọ ná “ntoju ntorobịa.” (1 Ndị Kọrint 7:36, NW) Ha makwaara na i nwebeghị ahụmahụ n’ịmụta otú e si achịkwa agụụ dị otú ahụ. Ọ bụrụ na ị malite iwepụta oge buru ibu iji soro onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-anọkọ, na-ekwurịta okwu na fon, ma ọ bụ ọbụna jiri akwụkwọ ozi ma ọ bụ E-mail na-ezirịta ozi, o yiri ka ọ ga-eme ka mmasị ahụ sikwuo ike. ‘Olee ihe dị oké njọ na nke ahụ?’ ka ị pụrụ ịjụ. Olee ihe ziri ezi ị ga-eji mejuo agụụ ahụ? Ị̀ dị njikere n’ezie ime ka mmetụta ahụ rụpụta ihe ezi uche dị na ya—alụmdi na nwunye? O yighị ka ị dị.
N’ihi ya ime mkpapụ na nwata na-akpata nnukwu nsogbu ụfọdụ. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Mmadụ, ọ̀ ga-agụrụ ọkụ tinye n’uwe obi ya, ma uwe ya agaghị ere ọkụ?” (Ilu 6:27) Ọtụtụ mgbe, ime mkpapụ na nwata na-eduga n’inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, nke pụrụ ime ka ndị ntorobịa tụrụ ime ọkwa ma bute ọrịa na-esite ná mmekọahụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:4-6) Dị ka ihe atụ, Tammy na-eto eto chere na ndị mụrụ ya emeghị ihe ziri ezi mgbe ha na-ekweghị ka o mee mkpapụ. N’ihi ya, ya na otu onye malitere ime mkpapụ na nzuzo n’ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, Tammy tụụrụ ime—ndụ ya gbanwekwara. Ugbu a ọ na-ekweta, sị: “Ime mkpapụ adịghị atọru ụtọ otú e chere.”
Gịnị ma ọ bụrụ na nwoke na nwanyị na-eto eto ejiri nlezianya zere mmekọrịta na-ekwesịghị ekwesị? N’agbanyeghị nke ahụ, a ka nwere ihe ize ndụ nke ịkpọte ma ọ bụ ịkpali ịhụnanya tupu oge ya. (Abụ nke Abụ 2:7) Ịkpali agụụ bụ́ nke a pụrụ nanị imeju n’ụzọ ziri ezi n’ọtụtụ afọ n’ihu pụrụ ịkpata nkụda mmụọ na nhụjuanya.
Isi ihe ndị ọzọ a ga-atụle bụ: Ì nwere ahụmahụ zuru ezu n’ezie ná ndụ ịma ihe i kwesịrị ile anya ya n’onye òtù ọlụlụ? (Ilu 1:4) N’aka nke ọzọ, ì nwere àgwà na nkà ndị dị mkpa iji bụrụ di ma ọ bụ nwunye a ga-ahụ n’anya ma kwanyere ùgwù n’ezie? Ì nwere n’ezie ndidi na mkpebi siri ike dị mkpa iji nọgide na-enwe mmekọrịta na-adịte aka? N’abụghị ihe ijuanya, ọ bụ ihe dị mwute na ihe ka ọtụtụ ná mmekọrịta ịhụnanya nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-adịru nwa oge. Ọ bụ ole na ole na-arụpụta alụmdi na nwunye na-adịte aka.
Ya mere, Monica dị afọ 18 chịkọtara ya nke ọma mgbe o kwuru, sị: “Ndị enyi m nile n’ụlọ akwụkwọ na-akọrọ m akụkọ banyere ndị enyi ha nwoke. Ma ọ́ bụghị na ha lụrụ di na nwata ọ bụrụ na ha mesịrị kewaa n’ụzọ dị egwu n’ihi na ha adịghị njikere ime ihe na-eso ya.” Otu onye ntorobịa aha ya bụ Brandon na-ekwukwa, sị: “Mgbe ị ghọtara na ị dịghị njikere inyefe mmadụ onwe gị ma i chee na i meela ya n’ihi na unu na-eme mkpapụ, ọ na-akụda mmụọ nke ukwuu. Olee otú ị ga-esi kewara n’akpasughị onye nke ọzọ iwe?”
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị mụrụ gị na-agbalị ime ka ị ghara inwe ihe mgbu na nkụda mmụọ ahụ site n’isi ọnwụ na ị gaghị eme mkpapụ ruo mgbe i toruru itinye onwe gị n’alụmdi na nwunye. N’ezie, ha na-eme nanị ihe kwekọrọ na ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ nke dị n’Eklisiastis 11:10: “Wezụga mkpasu iwe n’obi gị, meekwa ka ihe ọjọọ si n’anụ ahụ gị gabiga.”
‘Ịdị Obodobo’
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ị pụghị iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpakọrịta. Ma n’ihi gịnị ka ị ga-eji soro nanị otu onye na-akpakọrịta? N’ọnọdụ ọzọ, Bible na-agba anyị ume ‘ịdị obodobo’ ná mkpakọrịta 2 Ndị Kọrint 6:12, 13) Nke ahụ bụ ndụmọdụ dị mma maka ndị na-eto eto. Otu ụzọ isi mee otú ahụ bụ isoro ìgwè ndị gwara ọgwa na-akpakọrịta. “Echere m na ọ ka ụtọ otú ahụ,” ka Tammy na-ekwu. “Ọ ka mma inwe ọtụtụ ndị enyi.” Monica na-ekwu, sị: “Echiche iso ìgwè na-akpakọrịta dị mma n’ezie n’ihi na ị ga-ahụ ndị nwere àgwà dị iche iche, ọ ga-emekwa ka ị mata na e nwere ọtụtụ ndị ị na-ezutebeghị.”
anyị. (Ndị mụrụ gị nwedịrị ike ịchọ inyere gị aka ime ndokwa maka isoro ndị na-eto eto ọzọ na-ekpori ndụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Anne, bụ́ nne nwere ụmụ abụọ, na-akọwa, sị: “Anyị na-ahụ mgbe nile na ebe obibi anyị bụ ebe mkpori ndụ nke ụmụ anyị ga-achọ ịnọ. Anyị na-akpọ ndị enyi ha òkù, nye ha mgbadume, ma kwe ka ha gwuo egwuregwu. N’ụzọ dị otú a ha adịghị eche na ha aghaghị ịpụ n’èzí iji kporie ndụ.”
Otú ọ dị, ọbụna n’ìgwè ị ka kwesịrị ịkpachara anya ka ị ghara igosi otu onye mmasị gabiga ókè. Ndị ntorobịa ụfọdụ na-eche na ọ bụrụhaala na ndị ọzọ na-eso, ọ bụghị mkpapụ ka ha na-eme n’ezie. Zere nghọgbu onwe onye dị otú ahụ. (Abụ Ọma 36:2) Ọ bụrụ na gị na nanị otu onye ahụ na-anọkarị mgbe ọ bụla unu na ndị enyi unu nọkọrọ, ọ bụ ime mkpapụ. * Na-agbalị iji echiche ziri ezi eme ihe n’ọbụbụenyị gị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị.—1 Timoti 5:2.
Uru Ọ Bara Ichere
Ọ gaghị adị mfe ma a gwa gị na i torubeghị ịmalite ime mkpapụ. Ma ndị mụrụ gị achọghị ịkpasu gị iwe. Kama ha na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji nyere gị aka ma chebe gị. N’ihi ya kama ịtụkwasị obi n’obi gị ma jụ ndụmọdụ ha, gịnị ma i jiri ahụmahụ ha mee ihe? Dị ka ihe atụ, gịnị ma ị chọọ ndụmọdụ ha oge ọzọ i nwere nsogbu n’ihe banyere imeso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị ihe? Ilu 28:26 na-echetara anyị, sị: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu.” Connie na-eto eto na-ekwu, sị: “Mgbe nwa okorobịa nwere mmasị n’ebe m nọ, ihe na-enyere m aka iguzogide nrụgide ime mkpapụ bụ isoro mama m kwurịta banyere ya. Ọ na-akọrọ m ihe mere ndị enyi na ezinụlọ ya n’oge gara aga. Ọ na-enyere m aka n’ezie.”
Icheretụ tupu ị malite ime mkpapụ agaghị egbochi uto mmetụta uche gị ma ọ bụ mee ka ị ghara inwere onwe gị. Ebe ọ bụ na i burubeghị ibu ọrụ nke mbedo na alụmdi na nwunye bụ́ nke onye toworo eto na-ebu, i nweere onwe gị ‘ịṅụrị na nwata ị bụ.’ (Eklisiastis 11:9) Ichere ga-emekwa ka i nwee ohere imeziwanye àgwà gị, iru ntozu okè, na nke kasị ha nile mkpa, ime ka ọnọdụ ime mmụọ gị ka mma. (Abụ Ákwá 3:26, 27) Dị ka otu onye Kraịst na-eto eto si kwuo ya, “I kwesịrị inyefe Jehova onwe gị tupu i nyefee onye ọ bụla ọzọ onwe gị.”
Ka ị na-emewanye okenye, ọganihu gị ana-apụtakwa ìhè n’ihu onye ọ bụla, ndị mụrụ gị ga-amalite ile gị anya n’ụzọ dị iche. (1 Timoti 4:15) Mgbe i toruru n’ezie ime mkpapụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-enwe ike ime otú ahụ site ná nkwado ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.
^ par. 17 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee peeji nke 232-233 nke akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, bụ́ nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Ịhọrọ otu onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị iji gosi ya mmasị pụrụ iche. . .
. . . ga-akpali mmetụta ịhụnanya
[Foto dị na peeji nke 29]
Kama igosi nanị otu onye mmasị, dị obodobo n’ọbụbụenyi gị