Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwekarị Oké Mmetụta Uche

Inwekarị Oké Mmetụta Uche

Inwekarị Oké Mmetụta Uche

“MGBE a gwasịrị m na m nwere ọrịa na-eyi ndụ egwu,” ka otu agadi nwoke na-echeta, “agbalịrị m ịkwụsị ịtụ egwu, ma mmetụta nke amaghị ihe ga-emenụ mere ka ike gwụ m.” Ihe o kwuru na-emesi ike eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụghị nanị na ọrịa na-akpata ihe otiti nke anụ ahụ kama na ọ na-akpatakwa nke mmetụta uche. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ihe otiti ndị dị otú ahụ. Ọtụtụ n’ime ha ga-achọ imesi gị obi ike na e nwere ụzọ dị iche iche e si enwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọrịa na-adịghị ala ala. Ma tupu anyị atụlee ihe ị pụrụ ime, ka anyị buru ụzọ leruo ụfọdụ mmetụta uche ị pụrụ inwe ná mmalite anya.

Ekwenyeghị Ihe, Ịjụ Ịnakwere Eziokwu, Nchekasị

Mmetụta uche ị na-enwe pụrụ ịdị nnọọ iche na nke ndị ọzọ na-enwe. Ka o sina dị, ma ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike ma ndị ọrịa na-ekwu na ndị nwere oké nsogbu ahụ ike na-enwekarị ọtụtụ mmetụta uche na-abịaghachi ugboro ugboro. Ịjụ ịnakwere eziokwu ahụ pụrụ isochi mmetụta ndị mbụ nke egwu na ekwenyeghị ihe e kwuru: ‘O nweghị ike ịbụ eziokwu.’ ‘Ọ ghaghị ịbụ na e mehiere ihe.’ ‘Ma eleghị anya ọ bụ ọbara onye ọzọ ka e nyochara.’ N’ịkọwa otú o si meghachi omume mgbe ọ matara na ọ na-arịa ọrịa cancer, otu nwanyị kwuru, sị: “Ọ ga-adị gị ka gị zoo onwe gị, ị nweekwa olileanya na mgbe ị na-apụtala, ọ laala.”

Otú ọ dị, ka ị malitere ịghọtazu eziokwu ahụ, ị gakwaghị ajụ ịnakwere ya kama ị ga-enwezi oké nchekasị bụ́ mmetụta enweghị obi ụtọ na-eyi egwu dị ka ọdachi dị ize ndụ na-aghaghị ịbịa n’oge na-adịghị anya na-eme. ‘Oge ha aṅaa ka m ga-adịru ndụ?’ ‘M̀ gaje ịnọ n’ihe mgbu n’oge ndụ m fọdụrụnụ?’ nakwa ajụjụ ndị yiri ha pụrụ inye gị nsogbu. Ọ pụrụ ịdị gị ka gị laghachi azụ n’oge a na-achọpụtabeghị ọrịa ahụ, ma i nweghị ike ya. N’oge na-adịghị anya ị pụrụ inwe ọtụtụ mmetụta uche ndị ọzọ na-egbu mgbu ma sie ike. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ha?

Ejighị Ọnọdụ n’Aka, Nchegbu, Egwu

Ọrịa siri ike na-eme ka ị ghara nnọọ iji ọnọdụ gi n’aka ma nwee oké nchegbu ná ndụ gị. “Enweghị ike ịmata ihe ga-esi n’ọnọdụ m apụta na-eme ka ndụ na-agwụ m nnọọ ike mgbe ụfọdụ,” ka otu nwoke na-arịa ọrịa Parkinson kwuru. “Kwa ụbọchị, aghaghị m ichere iji hụ ihe ọ ga-eweta.” Ọrịa ị na-arịa pụkwara ime ka ị tụọ egwu. Ọ bụrụ na o jide gị na mberede, nnukwu egwu nwere ike ịtụ gị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na a chọpụtara ihe na-arịa gị kpọmkwem mgbe ị nọsịrịla ọtụtụ afọ na-echegbu onwe gị banyere mgbaàmà ndị a chọtahiere ihe kpatara ha, egwu gị pụrụ iji nwayọọ nwayọọ kakwuo njọ. Ná mmalite, ị pụrụ inwe ọbụna ahụ iru ala na ndị mmadụ ga-emecha kwere na ị na-arịa ọrịa n’ezie na ọ bụghị aghụghọ ka ị na-aghọ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, egwu n’ihi ịghọta ihe nchọpụta ahụ na-agụnye pụrụ isochi ahụ iru ala ahụ.

Egwu nke ịbụ onye na-agakwaghị emeliri onwe ya ihe pụkwara isogbu gị. Karịsịa, ya bụrụ na ọ na-amasị gị ịdị na-emere onwe gị ihe ruo ókè ụfọdụ, ị pụrụ ịtụ egwu ma i cheta na ị ga na-adaberekwu n’ebe ndị ọzọ nọ. Ị pụrụ inwe nchegbu na ọrịa gị na-amalite ịchịkwa ndụ gị ma na-ekpebi ihe ọ bụla ị ga-eme.

Iwe, Ihere, Owu Ọmụma

Ịghọta na achịkwalighịzi onwe gị na-akawanye njọ pụrụ ịkpasu gị iwe. ‘N’ihi gịnị ka o ji bụrụ m? Gịnị ka m metara nke a ji kwesị ime m?’ ka ị pụrụ ịjụ onwe gị. Ọrịa a dakwasịrị gị yiri gị ihe na-ekwesịghị ime gị na nke na-enweghị isi. Ị pụkwara ime oké ihere ma nwee obi nkoropụ. Otu onye nwere ahụ mkpọnwu na-echeta, sị: “Ihere na-eme m na ihe a nile mere m n’ihi otu ihe mberede na-akpasu iwe!”

Ị pụkwara inwe nsogbu nke ịnọ nanị gị. Ịnọ nanị gị ga-eduje ngwa ngwa n’ikewapụ onwe gị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ bụrụ na ọrịa ị na-arịa emee ka ị ghara ịdị na-apụ n’ụlọ gị, ọ pụrụ ịbụ na ị gaghịzi enwe ike iso ndị enyi gị ochie na-emekọ ihe. Ma, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ na-agụsi gị agụụ ike iso ndị mmadụ na-emekọrịta ihe. Mgbe ọtụtụ ndị letasịrị gị ma kpọọ gị na fon ná mmalite, ọ pụrụ ịbụ mmadụ ole na ole ga-abịa ileta gị ma ọ bụ kpọọ gị na fon.

Ebe ọ bụ na ọ dị mwute ịhụ ka ndị enyi na-agbara gị ọsọ, ị pụrụ imeghachiwo omume n’ahụmahụ a dị mwute site n’ịnọrọ nke gị. N’ezie, o kwere nghọta na ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịnọ nanị gị mgbe ụfọdụ tupu ndị ọzọ abịakwuteghachi gị. Ma ọ bụrụ na ị gaa n’ihu ịnọrọ nke gị n’oge a, ị pụrụ isi n’ikewapụ onwe gị n’ebe ndị ọzọ nọ (mgbe ndị ọzọ na-adịghị abịa ahụ gị) daba n’ikewapụ onwe gị n’ụzọ mmetụta uche (mgbe ị na-achọghị ịhụ ndị ọzọ). Nke ọ bụla ọ bụ, ị pụrụ ịbụ onye na-agbaso oké mmetụta nke owu ọmụma mgba. * Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ọbụna iche ma ị pụrụ ịnọru echi.

Ịmụta Ihe n’Aka Ndị Ọzọ

Otú ọ dị, olileanya dị. Ọ bụrụ na i nwere oké nsogbu ahụ ike na nso nso a, ọ dị ihe ndị bara uru ị pụrụ ime bụ́ ndị ga-enyere gị aka inwetatụ onwe gị.

N’eziokwu, usoro isiokwu a agaghị agwọta ọrịa na-adịghị ala ala na-arịa gị, n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ bụ. Ma, ihe ọmụma e nyere pụrụ inyere gị aka ịhụ ụzọ ndị ị ga-esi nagide ya. Otu nwanyị na-arịa ọrịa cancer chịkọtara mmetụta ọ na-enwe, na-asị: “Mgbe m jụsịrị ịnakwere eziokwu ahụ, ewere m iwe dị ukwuu, ka nke ahụ gasịrị, achọwakwara m ihe ndị m pụrụ ime n’onwe m.” Ị pụkwara ịchọta ha site n’ịgakwuru ndị buru gị ụzọ nwee ahụmahụ yiri nke ahụ ma mụta otú ị pụrụ isi rite uru site n’ihe ndị ha mere.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-enwe mmetụta uche ndị a na-agbanwe agbanwe n’ụdị dịgasị iche nakwa n’ụzọ dị iche iche.

[Burb on peeji 17]

‘N’ihi gịnị ka o ji bụrụ m? Gịnị ka m metara nke a ji kwesị ime m?’ ka ị pụrụ ịjụ onwe gị