Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe I Nwere Oké Nsogbu Ahụ Ike

Mgbe I Nwere Oké Nsogbu Ahụ Ike

Mgbe I Nwere Oké Nsogbu Ahụ Ike

“Ọ kụghasịrị m ahụ.”—John, mgbe ọ matasịrị na ya nwere ọrịa na-akwarụ mmadụ.

“Ụjọ tụrụ m.”—Beth, mgbe ọ matasịrị otú nsogbu ahụ ike ya siruru n’ike.

ỊMATA na ị na-arịa ọria na-adịghị ala ala, nke pụkwara ịkwarụ gị ma ọ bụ na mmerụ ahụ i nwere n’ihe ọghọm ga-ebibi ahụ ike gị kpam kpam bụ otu n’ime ihe ndị kasị akpata nhụjuanya ná ndụ. Ma à kọọrọ gị banyere ọrịa ahụ na-arịa gị n’ọfịs dọkịta bụ́ nke dị jụụ ma ọ bụ na ị nọ n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede mata ihe ị na-arịa, ọ pụrụ ịdị gị ka ọ bụghị eziokwu. Ọ dịghị ihe ọ bụla ná ndụ na-akwadebe gị ịnagide oké mmetụta uche ị ga-enwe mgbe nsogbu ahụ ike siri oké ike jidere gị.

Iji nweta ihe ọmụma pụrụ inyere ndị dara oké ọrịa na nso nso a aka, Teta! gbara ọtụtụ ndị nọ ná mba dị iche iche ajụjụ ọnụ bụ́ ndị nweworo ihe ịga nke ọma ruo ọtụtụ afọ n’ịnagide ọrịa na-adịghị ala ala na-akpata ọrụsị. A gwara ha ka ha kwuo ihe bụ uche ha banyere ajụjụ ndị dị ka: Mmetụta ndị dị aṅaa ka i nwere? Gịnị nyeere gị aka ịnagide nsogbu ahụ ma nweghachi obi iru ala? Ihe ndị dị aṅaa ka i mere iji nwetatụ onwe gị? E wepụtara ihe ọmụma e nwetara n’ajụjụ ọnụ ndị a nakwa nchọpụta ụfọdụ ndị nchọpụta mere bụ́ ndị na-amụ banyere mmetụta nke ọrịa ndị na-adịte aka, maka abamuru nke ndị nwere oké nsogbu ahụ ike ugbu a. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụ ezie na e dere usoro isiokwu a karịsịa maka ndị ọrịa ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ, usoro isiokwu bụ́ “Ọrịa Na-adịghị Ala Ala—Ịnagide Ya Dị Ka Ezinụlọ” (Teta! nke June 8, 2000) nwere ihe ọmụma e dere karịsịa maka ndị na-elekọta ndị ọrịa.