Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ànyị Kwesịrị Ịga Nzukọ Ndị Kraịst?

Ànyị Kwesịrị Ịga Nzukọ Ndị Kraịst?

Echiche nke Bible

Ànyị Kwesịrị Ịga Nzukọ Ndị Kraịst?

“ANA m agabu chọọchị, ma adịghịzi m aga.” “Echere m na ị pụrụ ife Chineke ofufe n’ebe ọ bụla, ọ bụghị nanị na chọọchị.” “Ekweere m na Chineke nakwa na Bible, ma ekweghị m n’ịga chọọchị.” Ị̀ nụwo okwu yiri ndị a? Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ taa na-ekwu okwu ndị dị otú ahụ, karịsịa n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ndị na-agabu chọọchị adịghịzi eche na ọ dị mkpa. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ịga chọọchị?

Okwu bụ́ “chọọchị” pụtara ihe karịrị ugboro 110 na King James Version. Nsụgharị ndị ọzọ jikwa okwu a mee ihe. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “chọọchị” pụtara, n’ụzọ nkịtị, “ọkpụkpọ òkù,” ma ọ bụ, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mgbakọta nke ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, Ọrụ 7:38, na King James Version, na-ekwu banyere Mosis ịnọ “na chọọchị ahụ n’ọzara,” ya bụ, n’etiti mkpọkọta nke mba Israel. N’ebe ọzọ, Akwụkwọ Nsọ kwuru na “ajọ mkpagbu malitere megide chọọchị ahụ,” na-ezo aka n’ebe ndị Kraịst nọ na Jerusalem nọ. (Ọrụ 8:1, The Jerusalem Bible) N’otu n’ime akwụkwọ ozi ndị o dere, Pọl kelere “chọọchị dị n’ụlọ [Faịlimọn],” bụ́ ọgbakọ na-ezukọ n’ebe ahụ.—Faịlimọn 2, Revised Standard Version.

N’ụzọ doro anya, okwu bụ́ “chọọchị” dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible pụtara, ọ bụghị ebe a na-anọ efe ofufe, kama ìgwè ndị na-efe ofufe. N’ikweta nke a, Clement onye Alexandria, onye nkụzi okpukpe nke narị afọ nke abụọ, dere, sị: “Ọ bụghị ebe ahụ, kama ọ bụ ọgbakọ nke ndị a họpụtara ahọpụta, ka m na-akpọ Chọọchị.” Ma, ọ̀ bụ iwu na ndị Kraịst ga-abịakọtarịrị n’otu ebe ma ọ bụ n’otu ụlọ ka ofufe ha wee bụrụ nke Chineke na-anara?

Ofufe ná Mba Israel

Iwu Mosis chọrọ ka ndị ikom nile bụ́ ndị Juu na-abịakọta n’otu ebe maka ememe atọ a na-eme kwa afọ. Ọtụtụ ndị inyom na ụmụaka na-agakwa. (Deuterọnọmi 16:16; Luk 2:41-44) N’oge ememe ụfọdụ ndị nchụàjà na ndị Livaị kụziiri mkpọkọta ahụ ihe, na-agụ site n’Iwu Chineke. Ha ‘na-agụpụta ya nke ọma, na-eme ka a mata isi ya, na-eme ka a ghọtakwa ọgụgụ ya.’ (Nehemaịa 8:8) Maka afọ Izu Ike, ntuziaka Chineke kwuru, sị: “Kpọkọta ndị Israel, bụ́ ndị ikom, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ọbịa gị nke nọ n’ime ọnụ ụzọ ámá gị nile, ka ha wee nụ, ka ha wee mụtakwa, wee tụọ egwu Jehova, bụ́ Chineke unu, leziekwa anya ime okwu nile nke iwu a.”—Deuterọnọmi 31:12.

Ọ bụ nanị n’ụlọukwu dị na Jerusalem ka mmadụ pụrụ ịchụrụ Chineke àjà ma nata ntụziaka site n’aka ndị nchụàjà. (Deuterọnọmi 12:5-7; 2 Ihe E Mere 7:12) Ka oge na-aga, e guzobere ụlọ ndị ọzọ a na-efe ofufe n’Israel—ụlọ nzukọ. Ha bụ ebe a na-anọ agụ Akwụkwọ Nsọ ma na-ekpe ekpere. Otú ọ dị, ụlọukwu dị na Jerusalem bụ ebe bụ́ isi a na-efe ofufe. E gosipụtara nke a site n’ihe onye so dee Bible bụ́ Luk kọrọ. O kwuru banyere otu agadi nwanyị aha ya bụ Ana, bụ́ onye “na-apụghị n’ụlọ Chineke, ma o weere obubu ọnụ na arịrịọ na-ekpere Chineke abalị na ehihie.” (Luk 2:36, 37) Isoro ndị ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi na-efe ezi ofufe bụ ihe bụ́ isi ná ndụ Ana. Ndị Juu ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke mere ihe yiri ya.

Ezi Ofufe Mgbe Kraịst Nwụsịrị

Mgbe Jisọs nwụsịrị, ụmụazụ ya anọkwaghị n’okpuru Iwu Mosis, a chọghịkwa n’aka ha ife ofufe n’ụlọukwu. (Ndị Galetia 3:23-25) Ma, ha nọgidere na-ezukọta maka ekpere na ịmụ Okwu Chineke. Ha enweghị oké ụlọ, kama nke ahụ ha na-ezukọta n’ụlọ ndị mmadụ nakwa na nke ọha na eze. (Ọrụ 2:1, 2; 12:12; 19:9; Ndị Rom 16:4, 5) Ebe a na-adịghị enwe oké ememe na oké ngosi na ha, nzukọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ adịghị mgbagwoju anya ma ọlị.

Ka Alaeze Ukwu Rom ruru unyi n’ụzọ omume, ụkpụrụ Bible a na-ezi ná nzukọ ndị ahụ nwupụrụ ọcha ka diamọnd. Ụfọdụ ndị na-ekweghị ekwe bịara nke mbụ ha na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na Chineke nọ n’etiti unu.” (1 Ndị Kọrint 14:24, 25) Ee, Chineke nọ n’etiti ha n’ezie. “Ya mere a na-enye nzukọ [“chọọchị,” RS, JB] Kraịst ike n’okwukwe anyị, ọnụ ọgụgụ ha na-ababigakwa ụba ókè kwa ụbọchị.”—Ọrụ 16:5.

N’oge ahụ onye Kraịst ọ̀ pụrụ inweta ihu ọma Chineke site n’ife ofufe nanị ya ma ọ bụ n’ụlọ arụsị ndị ọgọ mmụọ? Bible nyere ntụziaka doro anya n’okwu a: Ndị na-efe ofufe bụ́ ndị a nwapụtara aghaghị ịghọ akụkụ nke nanị otu ezi chọọchị, ma ọ bụ ọgbakọ, “otu ahụ́” ahụ nke bụ́ ezi ndị na-efe ofufe. Ha bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs, bụ́ ndị a maara dị ka ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 4:4, 5; Ọrụ 11:26.

Gịnị Banyere Taa?

Kama ịgba anyị ume ife ofufe na chọọchị, Bible na-agba anyị ume isoro chọọchị na-efe ofufe, bụ́ “nzukọ nke Chineke dị ndụ,” ndị ‘na-akpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.’ (1 Timoti 3:15; Jọn 4:24) Nzukọ okpukpe nke Chineke nwapụtara kwesịrị izi ndị mmadụ ihe “n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile.” (2 Pita 3:11) Ha kwesịrị inyere ndị bịaranụ aka ịghọ ndị Kraịst tozuru okè, ndị pụrụ “ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.”—Ndị Hibru 5:14.

Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịgbaso ihe nlereanya nke ndị Kraịst narị afọ mbụ. Ihe karịrị ọgbakọ 91,400 n’ụwa nile na-ezukọ mgbe mgbe iji mụọ Bible na ịgbarịta ibe ha ume, na-eme otú ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche, n’ebe obibi ndị mmadụ, na n’ebe ndị ọzọ. Nke a kwekọrọ n’ihe Pọl onyeozi kwuru: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.”—Ndị Hibru 10:24, 25.