Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkwọgide Ụgbọ Epeepe Ruo Ọnwụ

Ịkwọgide Ụgbọ Epeepe Ruo Ọnwụ

Ịkwọgide Ụgbọ Epeepe Ruo Ọnwụ

Site n’Aka Onye Edemede Teta! na France

ANYỊ pụrụ nnọọ iji anya nke uche anyị hụ ya. Ìgwè mmadụ nọ na-ele anya ka ụgbọ epeepe ahụ a ka malitere iji eme ihe ọhụrụ nke eze France, na-ahapụ ọdụ ụgbọ mmiri Marseilles dị na Mediterranean. Ọ bụ otu n’ime ụgbọ mmiri ndị kasị maa mma gbatụworo n’oké osimiri. E ji ọtụtụ ihe a tụrụ atụ nakwa ọlaedo dị ukwuu na pearl e ji achọ ihe mma mee ka azụ ya maa mma. E ji ákwà kasị mma ndị a chọrọ mma mee ka elu ya makwuo mma. Ka ìhè ụtụtụ na-awakwasị n’ihe a mara oké mma, ụfọdụ ndị ji nganga na-eche echiche miri emi banyere aha e ji mara Eze Louis nke Iri na Anọ nke bụ́ “Eze Anyanwụ.”

Ka ọ na-erule na narị afọ nke 17, a na-eji ụgbọ epeepe ole na ole alụ agha, n’agbanyeghị nke ahụ Eze Louis nke Iri na Anọ kpebiri ịmụba ọnụ ọgụgụ ụgbọ mmiri ya ịbụ 40—ìgwè ụgbọ epeepe kasị ọtụtụ n’osimiri Mediterranean. Ndị ọkachamara na-eme atụmatụ na ụgbọ epeepe 20 gaara egbo mkpa ya n’ụzọ zuru ezu. Gịnị bụ nzube e ji nwee ìgwè ụgbọ mmiri dị otú ahụ?

Onye ndụmọdụ eze ahụ bụ́ Jean-Baptiste Colbert kọwara, sị: “Ọ dịghị ike ọ bụla e ji mara ịdị ukwuu nke eze nakwa nke na-eme ka ndị ala ọzọ mara ya karịa ụgbọ epeepe ndị ahụ.” N’ezie, ihe bụ́ isi mere Louis ji rụọ ụgbọ epeepe ndị ahụ bụ ka a na-akwanyere ya ùgwù. Ma, gịnị ka o furu iji kwanyere ya ùgwù?

Tụlee ahụhụ ndị mmadụ tara. A chịbajuru mmadụ 450 na-akwọ ụgbọ n’ime ụgbọ epeepe—ụgbọ na-erughị mita 45 n’ogologo na mita 9 n’obosara. Ha ebiri ma na-arụ ọrụ ruo ọtụtụ ọnwa n’esepụghị aka n’ebe a na-akpa akpa. Ikuku nnu si n’oké osimiri ahụ akpatara ha ọnyá n’akpụkpọ ahụ, apa nke ihe a na-eti ha mgbe mgbe adịchaakwa n’ahụ ha. Ọkara n’ime ha anwụọ n’ihe ndị France na-akọ akụkọ ihe mere eme kpọrọ “mbibi kasịnụ nke ndị mmadụ” na France.

N’ezie, ihe mmadụ ole na ole ji na-eme oké ngosi ma nweta ebube kpataara ọtụtụ ndị ọzọ nhụsianya na ọnwụ. Otú ọ dị, olee ebe eze ahụ si nweta ọtụtụ puku mmadụ ga na-akwọ ụgbọ mmiri 40 ya?

Ịchọta Ndị Ga Na-akwọ Ụgbọ Mmiri

Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ndị ọkwọ ụgbọ epeepe—ma ọ bụ ndị galeotti, dị ka a na-akpọ ha—bụ ndị nweere onwe ha, a na-elekwa ịkwọ ụgbọ mmiri anya dị ka ọrụ na-enye ùgwù. Otú ọ dị, ka ọ na-erule na narị afọ nke 17, ihe gbanwere. A na-esi n’Alaeze Ukwu Ottoman azụta ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọ mmiri, ndị a na-akpọ ndị Turk. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Alakụba, ọ bụ ezie na ụfọdụ bụ ndị Ọtọdọks. E jikwa ndị a nwụdere n’ihu agha mee ihe.

“Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nziga e zigara ndị dike Iroquois n’ụgbọ epeepe Eze Anyanwụ so n’ihe na-adịghị mma, ndị ezi uche na-adịghịkwa na ha e mere iji mee ka ndị na-arụ ọrụ na ya ‘sikwuo ike,’” ka ndị France na-akọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu. E hiere ụzọ n’ịtọrọ ndị American Indian. E zilara ha na 1689 mgbe mba ndị Iroquois yiri mba ndị mbụ France na-achị egwu.

Otú ọ dị, atụmatụ ọrụ Louis ji oké ọchịchọ mee chọkwuru ndị ọkwọ ụgbọ mmiri. Colbert chọtara ihe ngwọta ya. Ọ gwara ndị majie ọchịchọ eze chọrọ ka ha “na-ama ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ndị omempụ ikpe ruo ókè o kwere mee nakwa ka ha na-agbanwe ọbụna amamikpe ọnwụ ịbụ ịkwọ ụgbọ epeepe.” Iji ndị omempụ eme ihe n’ụzọ dị otú a abụghị ihe ọhụrụ. E jiriwo ndị a mara ikpe mere ndị ohu na-akwọ ụgbọ epeepe mgbe ha na Itali lụrụ agha n’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ ndị e zigara ịkwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ n’oge Louis nke Iri na Anọ na nwa nwa nwa ya bụ́ Louis nke Iri na Ise na-achị enweghị atụ. N’agbata afọ 1680 na 1748, a mara ihe dị ka ndị ikom 60,000 ikpe ịkwọ ụgbọ mmiri. Ole ndị bụ ndị ohu a na-akwọ ụgbọ epeepe?

Ole Ndị Ka E Nwetara Isonye na Ya?

Ihe ruru ọkara nke ndị e zigara ịkwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ bụ ndị omempụ nkịtị. E nwere malite ná ndị gburu mmadụ ruo ná ndị na-eme aka ntụtụ. A na-enyekwa ndị ahịa iwu ntaramahụhụ n’ụzọ dị otú a, na-eme mgbe ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ.

Ọzọkwa, a na-amanye ndị a na-ejighị kpọrọ ihe n’obodo ịkwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ. Na 1666 ọfịsa na-elekọta ha na Marseilles dere, sị: “Ọ ga-amasị m ka e kpebie iji ndị umengwụ, ndị njem ala nsọ, . . . ndị Gypsy, na ndị ọzọ na-awagharị awagharị tinyejuo n’ụgbọ epeepe ndị ahụ dum. . . . Nke ahụ ga-ewepụ ndị na-abaghị uru bụ́ ndị bụụrụ ụwa ibu arọ.” Ya mere, n’ime ka a ga-asị na a na-akwado udo nke ọha na eze, a nwụdere ndị Gypsy na ndị ogbenye ọnụ ntụ. Na 1660, a nwụdekwara ọbụna ndị Poland gara n’ebe nsọ dị na France isonye na ya!

Ndị ọzọ e nwetara ka ha na-akwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ bụ ndị agha gbara ọsọ bụ́ ndị a na-ama ikpe ịkwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ ruo ogologo ndụ ha nile mgbe e jidesịrị ha. A na-ebepụ ndị gbara ọsọ imi na ntị, kanye ha akara na nti, kpụọkwa ha isi. N’oge ahụ Louis nke Iri na Anọ nọ na-alụ ọtụtụ agha, malite n’afọ 1685 ruo n’afọ 1715, e zigara ihe dị ka ndị agha 17,000 gbara ọsọ ịga kwọọ ụgbọ epeepe ndị ahụ. Gịnị chere ndị ikom a ihu?

Ahụhụ Ha Tara

Ahụhụ nke ndị na-akwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ na-amalite n’ezie ọbụna tupu ha agawa n’oké osimiri. Ná mmalite, a na-ahapụtụ ha n’ụlọ mkpọrọ ruo ihe ruru ọnwa isii tupu a tụkọta ha na ọtụtụ narị ndị ọzọ ịgà ma kpụga ha Marseilles. Nye ụfọdụ n’ime ha, dị ka ndị e si na Brittany ma ọ bụ Paris zite, ịga ije a a manyere ha amanye bụ ahụmahụ ọjọọ nke ịga kilomita 800 ruo ihe karịrị otu ọnwa. Otu onye kpọrọ ya “ntaramahụhụ kasị njọ maka ndị a mara ikpe.” Ọtụtụ n’ime ha nwụrụ n’ụzọ.

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ókè njem ahụ hà n’ogologo ma ọ bụ obere nri a na-ekenye ha gburu ha. Ndị na-eche ha nche mekpọrọ ndị mkpọrọ ahụ ọnụ. Iti ihe na ekweghị ka ha rie nri ma hie ụra kpara ha aka ọjọọ. Ọzọkwa, ndị nọ n’ụzọ ha si aga na-enwe ọmịiko dị nta n’ahụ ndị ikom ahụ na-esite n’ebe nile na France agafe. N’ịzaghachi arịrịọ ọ rịọrọ ka e kunye ya mmiri, e kwuru na ndị inyom obodo zara otu n’ime ndị mkpọrọ ahụ, sị: “Gawa, gawa! N’ebe ị na-aga, ị ga-enwe mmiri buru ibu ị ga-aṅụ!”

Ọkara n’Ime Ha Alanarịghị

Ọtụtụ n’ime ndị ahụ a mara ikpe ahụtụbeghị oké osimiri, ma ya fọdụkwa ụgbọ epeepe. Irute n’ọdụ ụgbọ mmiri Marseilles n’oge ahụ bụ ahụmahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ. Dị ka otu n’ime ha dere, a na-achịbanye ndị mkpọrọ ahụ n’ụgbọ epeepe ihe na-adịghị na ya ma nyochaa ha dị ka “ehi ndị a zụtara n’ahịa.” A na-edekọ ihe ọmụma banyere ha, ndị mkpọrọ ahụ na-enwekwa nọmba e ji amara ha n’ụgbọ epeepe ahụ. “Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịbanye n’etiti ndị na-akwọ ụgbọ epeepe na-akpata oké mgbagwoju anya, ọ na-akpatakwa nsogbu uche ma na-awụ akpata oyi n’ahụ n’ụzọ dị ukwuu,” ka otu ọkọ akụkọ na-ekwu. Otú ọ dị, mmeso kasị njọ na-echere ha.

Ndị ikom ise na-ebi ma na-anọ ná nkebi dị nanị mita 2.30 n’ogologo na mita 1.25 n’obosara, bụ́ ebe e ji ịgà tụgide ha na bench, na-akwọ ụgbọ epeepe ruo ọtụtụ ọnwa n’esepụghị aka. Nke ọ bụla n’ime ndị ọkwọ ụgbọ epeepe nwere ebe dị nanị sentimita 45 ọ ga na-anọdụ ala. Ọ na-akpa nnọọ akpa nke na ndị ikom ahụ apụghị ọbụna ịsụ aka ha asụ ka ha na-akwagharị ụmara, ndị nke ọ bụla n’ime ha dị ma ọ dịkarịa ala mita 12 n’ogologo ma dị ihe karịrị kilogram 130 n’arọ. Ịkwọ ụgbọ epeepe ahụ ruo ọtụtụ awa n’esepụghị aka bụ ọrụ ndọlị nke na-eme ka uru ahụ nke ndị ọkwọ ụgbọ epeepe na-egbu ha mgbu, ọ na-agwụkwa ha ike nke ukwuu. Ọ bụ ọrụ “a pụrụ iji tụnyere ọrụ sikarịsịrị ike ndị a na-arụ n’ihu igwe nke ebe okpomọkụ,” ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme na-akọwa.

Ụgbọ epeepe ndị ahụ na-adị ala, ndị na-akwọ ha na-anọkwa nanị ihe dị ka otu mita site n’elu mmiri. N’ihi ya, ahụ ha na-ede mmiri mgbe nile, ha na-azọkwasịkarị ụkwụ na mmiri mgbe ha na-akwọ ụgbọ epeepe, ikuku nnu na-atakasịkwa akpụkpọ ahụ ha. A na-ekenye ha obere ihe oriri. “Ndị ahụ a mara ikpe na-eme ihe ọ bụla iji lanarị,” ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu. Ọ fọrọ nke nta ka mgbapụ ghara ikwe omume. Ụgwọ ọrụ a na-enye onye chọtara ndị gbapụrụ agbapụ kwaliri ndị obodo isoro na-achọgharị onye ọ bụla nwara ịgbapụ. Ọ na-abụ nanị 1 onye n’ime 100 mmadụ na-agbapụli.

A dịghị agbasokarị ikpe a mara ha. N’ihi ya, ọkwọ ụgbọ epeepe a mara ikpe ịnọ afọ ole na ole ka pụrụ ịnọ na-akwọ ụgbọ ihe dị ka afọ 25 n’ihu. Ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị ikom ahụ na-anwụ n’ime afọ atọ. N’ozuzu, ọkara nke ndị ahụ na-akwọ ụgbọ epeepe alanarịghị. Ọnụ ọgụgụ ndị ọkwọ ụgbọ epeepe nwụrụ n’oké osimiri hà ka ndị nwụrụ mgbe ha kwụsịrịla ịkwọ ụgbọ epeepe. N’oge oyi nke afọ 1709/1710, otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha nwụrụ n’ihi ụnwụ nri na ihu igwe na-adịghị mma. Ọ dị mwute ikwu na e zigara ụfọdụ ịkwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ nanị n’ihi okpukpe ha.

Ndị A Mara Ikpe n’Ihi Okpukpe Ha

Na 1685, Eze Louis nke Iri na Anọ kagburu Iwu Nantes, a machibidokwara Okpukpe Protestant iwu na France. * A mara ihe dị ka ndị Protestant 1,500 ikpe ịkwọ ụgbọ epeepe n’ihi na ha jụrụ ịba Okpukpe Katọlik ma ọ bụ nwaa ịgbapụ ná mba ahụ. A nwalewo ịta “ndị jụrụ okwukwe” ahụhụ n’ụzọ dị otú a na 1545, mgbe a nọrọ n’otu izu ziga ndị òtù Waldo 600 * ịkwọ ụgbọ epeepe site n’iwu nke Eze Francis nke Mbụ nyere. N’oge ọchịchị nke Louis nke Iri na Anọ bụ́ onye a na-akpọ eze bụ́ ezigbo onye Kraịst, mkpagbu ahụ bịara ka nnọọ njọ.

N’ihi gịnị ka e ji ziga ndị Protestant ịkwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ? Otu onye ọrụ nke eze kwuru ihe kpatara ya: “Ọ dịghị ụzọ ọzọ a pụrụ isi mee ka ndị jụrụ okwukwe lọghachi ma e wezụga ime ya n’ike.” Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwukwara, sị: “Eze tụrụ anya na ozugbo e tinyere ha ‘n’ụgbọ mmiri’ ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị Protestant ahụ a mara ikpe ga-ahapụ okpukpe ahụ ha chụwooro àjà dị nnọọ ukwuu.” Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ime ha jụrụ imebi okwukwe ha ka e wee tọhapụ ha. N’ihi ya, ọtụtụ mgbe ndị ụkọchukwu Katọlik nọ n’ụgbọ epeepe ndị ahụ na-eme ka e tie ha ihe nke ukwuu n’ihu ọha. Ụfọdụ n’ime ha nwụrụ; ndị ọzọ buru apa ruo oge ndụ ha nile.

N’agbanyeghị ajọ ime ihe ike a, ndị Protestant gwara ndị ọzọ banyere okpukpe ha n’ụzọ dị irè. Dị ka ihe si na ya pụta, ụfọdụ, gụnyere ma ọ dịkarịa ala otu ụkọchukwu Katọlik, ghọrọ ndị Protestant. E si n’ụgbọ epeepe ndị ahụ kpọpụta ndị e weere na ha kasị dị ize ndụ, ndị Protestant gụrụ akwụkwọ, ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ dị n’okpuru ala ka ha nwụọ. Otú ọ dị, nke a akwụsịghị ndị Protestant ahụ na-akwọ ụgbọ epeepe inyere ibe ha aka, ọbụna ruo n’ókè nke ịhazi klas ịmụ ịgụ na ide ihe maka ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ bụ́ ndị na-amaghị agụ ihe.

Ndị ahụ a mara ikpe buuru ihe mere e ji na-akpagbu ha n’uche. “Ka m na-ata ahụhụ karị, otú ahụ ka eziokwu ahụ nke mere ka m na-ata ahụhụ na-amasị m karị,” ka onye Protestant bụ́ Pierre Serres dere. Mmegide France na-emegide okpukpe wụrụ ọtụtụ mba akpata oyi n’ahụ mgbe ha nụrụ banyere ya. Na 1713, Eze Nwanyị Anne nke England gbalịsiri ike n’ụzọ gara nke ọma ime ka a tọhapụ ọtụtụ ndị a maworo ikpe. N’ụzọ na-eju anya, a chụpụziri ndị Protestant bụ́ ndị a machibidoburu iwu ka ha ghara ịhapụ France.

Njedebe nke Ụgbọ Epeepe Ndị Ahụ

N’ikpeazụ, a kwụsịrị iji ụgbọ epeepe ndị ahụ eme ihe n’ihi ihe ọhụrụ ndị metụtara agha mmiri na enweghị nkwado ego. Nsogbu ego nke Eze Louis nke Iri na Anọ nwere mere ka e belata ihe dị iche iche. Ka ọ na-erule na 1720, ọ bụ nanị ụgbọ epeepe 15 fọdụrụ, e belatakwara ọrụ ha nke ukwuu. N’ihe ka n’oge ahụ, ndị ọkwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ nọrọ na Marseilles, bụ́ ebe ha banyere n’azụmahịa obodo ahụ, na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị na-eme ncha ma ọ bụ na-ere ákwà ndị ha kpara. N’ikpeazụ, na 1748 e tiri iwu nke wetara njedebe nke ụgbọ epeepe ndị ahụ n’ezie.

Ndị France ka na-echeta ụgbọ epeepe ndị ahụ. Ndị France chee ihe isi ike ihu, ha na-etikarị, sị: “Quelle galère!” ma ọ bụ n’ịsụgharị okwu ya efu n’Igbo, “Ụgbọ epeepe nke a!” Anyị nwetara akụkụ ka ukwuu nke ihe anyị maara banyere ihe ndị mere n’ụgbọ epeepe ndị ahụ n’ihe ndekọ ndị Protestant na-akwọ ụgbọ epeepe ndị ahụ dekọrọ n’onwe ha. N’agbanyeghị oké ịkpa ókè okpukpe, ha guzobere òtù iji nyere onwe ha aka na inye nkwado agbamume. Ntachi obi na olileanya dị mkpa maka nlanarị ha, ha echeghịkwa echiche imebi okwukwe ha.

N’ụzọ na-akpali mmasị, ọ bụ ezie na e nwere okpukpe ekweghị ọzọ dịrị n’oge ahụ, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekwuwo na o juru ha anya na ndị ọkàikpe dị njikere “ịkwado, n’eleghị anya n’azụ, iwu debere ndị ahụ a na-achị achị bụ́ ndị na-eme ihe n’eziokwu ma na-eguzosi ike n’ihe na ndị omempụ obi tara mmiri n’ọnọdụ hà nhata.”

N’ezie, ncheta a na-echeta ndị ohu na-akwọ ụgbọ epeepe ka bụ ihe àmà siri ike nke oké ihe ọjọọ ụmụ mmadụ mere megide ibe ha. Ee, “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, oge eruwela mgbe Onye Ọchịchị nke Chineke họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka.”—Abụ Ọma 72:12-14.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 25 Lee Ụlọ Nche nke August 15, 1998, peeji nke 25-29.

^ par. 25 Lee Ụlọ Nche nke August 15, 1982, peeji nke 11-15.

[Foto dị na peeji nke 27]

Ha na-akwọ ụgbọ epeepe n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Musée de la Marine, Paris

[Foto dị na peeji nke 29]

Okwu nkọwa e dere n’asụsụ French n’elu foto a na-agụ, sị: “Ụzọ ndị e ji n’aka nakwa nke ịkwụwa aka ọtọ isi mee ka ndị jụrụ okwukwe lọghachi n’okpukpe Katọlik.” E sere ihe a n’afọ 1686

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

Peeji nke 2, 26, na 29: © Cliché Bibliothèque nationale de France, Paris