Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọṅụ A Na-enweta Site N’ikiri Nnụnụ

Ọṅụ A Na-enweta Site N’ikiri Nnụnụ

Ọṅụ A Na-enweta Site N’ikiri Nnụnụ

LEE ka ụwa gaara esi dị iche ma e wezụga nnụnụ! Ubé ha, abụ ha, àgwà ha tụgasịrị na ufe ha—ha nile na-eso eme ka ndụ nwee ihe ndị dịgasị iche mara mma. Ma ọ̀ bụ ugboro ole ka anyị na-akwụsị iji gee ha ntị ma kirie ha? Ọ bụrụ na i bi n’obodo ukwu ebe e nwere ime ihe oké ọsọ ọsọ ná ndụ kwa ụbọchị na ụ̀zụ̀ ụgbọ, ma eleghị anya ị gaghịdị ahụ nnụnụ ndị ahụ na gburugburu ebe obibi unu. Ọ bụrụgodị na i bi n’ime obodo, ọ dị mfe ịghara iji ha akpọrọ ihe. Ma ọ̀ ga-amasị gị ịnọ nso kirie nnụnụ ndị dị n’ógbè unu?

Ị pụrụ ime nnọọ otú ahụ site n’idebe obere ihe e ji etinyere nnụnụ nri n’azụ ụlọ gị, na nso windo. Mgbe ahụ, nanị ihe ga-adị gị mkpa bụ ihe e ji ahụ ihe dị ebe dị anya na kamera nwere ezigbo ihe na-eme ka ihe dị ebe dị anya buo ibu—na inwetụ ndidi! Jiri ọtụtụ film foto na-eseta ihe ngwa ngwa na ezigbo akwụkwọ nduzi e sere nnụnụ iji mata nke bụ nke. Mgbe ahụ kirie, ṅaa ntị, ma nweta ọṅụ!