Agha ahụ Akwụsịghị Anyị Ime Nkwusa
Agha ahụ Akwụsịghị Anyị Ime Nkwusa
DỊ KA LEODEGARIO BARLAAN SI KỌỌ
Na 1942, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, Japan na United States nọ na-achịpụ ya n’agha ha ji na-azọ inweta Philippines, bụ́ ala nna m. Anọ m n’obodo nta Tabonan nke dị n’elu ugwu, ebe ndị agha okpuru nke ógbè ahụ bụ́ ndị na-ebuso ndị Japan agha kpọchiri m. E tiri m ihe, boo m ebubo ịbụ onye nledo, yiekwa m egwu igbu m. Ka m kọwaa otú m siri daba n’ọnọdụ a nakwa otú m siri lanarị.
A MỤRỤ m na January 24, 1914, n’obodo San Carlos, Pangasinan. N’afọ ndị 1930, nna m dunyere m ụlọ akwụkwọ ije mụọ ọrụ ubi. N’ụbọchị Sunday, ana m aga Mas, onye ụkọchukwu na-ekwukwa okwu banyere Oziọma ndị ahụ—Matiu, Mak, Luk, na Jọn. N’ihi ya, achọrọ m ịgụ ha.
Otu ụbọchị, eji m ego m nwetara site n’ire akwụkwọ nri wee jee n’ebe obibi ndị nọn iji zụta otu akwụkwọ nwere Oziọma ndị ahụ. Kama nke ahụ, e nyere m otu akwụkwọ nta isiokwu ya bụ́ The Way to Heaven, o bughịkwa Oziọma ndị ahụ. Nke a kụdara m obi. Mgbe e mesịrị, n’ịchụso ọchịchọ m inweta Oziọma ndị ahụ, m jere Manila. N’ebe ahụ, deede m bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nyere m otu Bible zuru ezu.
Na Manila, ezutere m ọtụtụ Ndịàmà, bụ́ ndị nkà ha nwere ihota akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche, masịrị m. Site n’aka ha m nwetara azịza ndị na-eju afọ nye ọtụtụ ajụjụ. N’ikpeazụ,
deede m, bụ́ Ricardo Uson, kpọ m gaa otu nzukọ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Mgbe anyị na-eru nso n’ebe ahụ, amụnyere m siga. “Tụfuo ihe ahụ,” ka deede m kwuru. “Ndịàmà Jehova anaghị ese siga.” Ya mere atụfuru m siga ahụ, esetụghịkwa m siga ọzọ. Ezutere m Joseph Dos Santos, bụ́ onye nlekọta alaka ahụ, nakwa ụfọdụ Ndịàmà ọzọ. Taa, ọtụtụ iri afọ ndị a nile mgbe nke ahụ gasịrị, m ka na-echeta ezigbo ụmụnna ndị Kraịst ahụ.Ọchịchọ Ijere Chineke Ozi
Ka ọ na-erule October 1937, mgbe m bụ nwa akwụkwọ na Kọleji Ọrụ Ubi nke Los Baños, adịghịzi m eje Mas. Kama nke ahụ, m na-agụ Bible, ya na akwụkwọ deede m nyere m. Otu ìgwè Ndịàmà Jehova letara ogige kọleji ahụ, n’ihi nkwurịta okwu nke mụ na otu n’ime ha bụ́ Elvira Alinsod nwekwara, ọchịchọ m nwere ijere Jehova Chineke ozi bịara sie ike.
Mgbe m gwara ndị nkụzi m na emere m atụmatụ ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ, ha jụrụ, sị: “Ònye ga na-egbo mkpa gị?” M kọwaara ha na m nwere obi ike na ọ bụrụ na m jeere Chineke ozi, ọ ga-egbo mkpa m. Mgbe m kwụsịrị ije ụlọ akwụkwọ, ejere m n’ụlọ ọrụ Watch Tower Society ma gosi onwe m dị ka onye na-enyefe onwe ya n’afọ ofufo, na-akọwa, sị: “Agụwo m akwụkwọ ndị bụ́ Loyalty, Riches, na Where Are the Dead? Ugbu a achọrọ m ijere Jehova ozi oge nile.” A gwara m ka m jee n’Ógbè Cebu sonyere ndị ọsụ ụzọ atọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova.
Ịmalite Ime Nkwusa M
Na July 15, 1938, Salvador Liwag zutere m n’ebe e si arịtu n’ụgbọ mmiri mgbe m rutere n’àgwàetiti Cebu. N’echi ya, amalitere m ije ozi ụlọ n’ụlọ. Ọ dịghị onye nyere m ọzụzụ. Nanị ihe m na-eme bụ inye onye nwe ụlọ kaadị ịgba àmà nke kọwara ọrụ anyị. N’ezie, amaara m nanị okwu abụọ n’asụsụ Cebuano, nke a na-asụ n’ógbè ahụ. Otú ahụ ka ụbọchị mbụ m n’ozi si malite.
Mgbe anyị malitere ịgba àmà n’obodo ọhụrụ, ọ bụ omume anyị ibugodị ụzọ jee n’ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo. N’ebe ahụ, Nwanna Liwag na-agbara onyeisi obodo àmà; Pablo Bautista na-agbara onyeisi ndị uwe ojii; Conrado Daclan na-agbakwara onye ọkàikpe. Ana m agwa onyeisi post ọfịs okwu. Mgbe ahụ anyị agazie n’ọdụ ụgbọala bọs, ogige ndị uwe ojii, ụlọ ahịa, na ụlọ akwụkwọ. Ọzọkwa, anyị na-akpọtụrụ ndị mmadụ n’ebe obibi ha. Anyị na-enye ha akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ Enemies. Ka m na-eṅomi ụzọ ndị ibe m si na-enye kaadị ịgba àmà, nke nta nke nta amụtara m ịsụ asụsụ Cebuano, amalitekwara m itinye akwụkwọ. N’ime ọnwa atọ, anyị jezuru ógbè Cebu ahụ nile—obodo 54. M wee jụọ Nwanna Liwag, sị: “À pụrụ ime m baptism ugbu a?”
“Oge erubeghị, nwanna m,” ka ọ zara. Anyị wee gafere n’àgwàetiti ọzọ bụ́ Bohol, meekwa nkwusa n’ebe ahụ ruo otu ọnwa na ọkara, na-ejezu ihe karịrị obodo 36. M wee rịọ ọzọ ka e mee m baptism. “Oge erubeghị, Nwanna Barlaan,” ka a gwara m. Ebe anyị jezuworo Bohol ma jeekwa Àgwàetiti Camiguin, anyị jere n’àgwàetiti ukwu bụ́ Mindanao, meekwa nkwusa na Cagayan de Oro City.
Ka ọ dị ugbu a Virginio Cruz sonyeere ìgwè anyị. Ọ bụwo onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ọha ma hapụ ọrụ ahụ iji ghọọ onye ọsụ ụzọ. Anyị gafere n’obodo ndị ọzọ ma mesịa ruo Ọdọ Mmiri Lanao. Mgbe anyị nọ n’ebe ahụ, m jụghachiri ma a pụrụ ime m baptism. N’ikpeazụ, na December 28, 1938, mgbe ihe dị ka ọnwa isii nke ịsụ ụzọ gasịrị, Nwanna Cruz mere m baptism n’ime mmiri nke Ọdọ Mmiri Lanao n’obodo Lumbatan.
Ịbụ Onye E Nyere Ụgwọ Ọrụ Maka Ịtụkwasị Chineke Obi
Mgbe e mesịrị, m sonyeere ndị ọsụ ụzọ atọ nọ na Negros Occidental. Ha bụ Fulgencio de Jesus, Esperanza de Jesus, na Natividad Santos, bụ́ onye anyị na-akpọ Naty. Anyị mekọrọ nkwusa ọnụ n’ọtụtụ obodo dị n’ógbè ahụ. N’ezie, anyị aghaghị ịtụkwasị obi kpam kpam na Jehova, ebe ọ bụ na mgbe ụfọdụ ego anyị anaghị ehi nne. N’otu oge, anyị chọrọ inweta azụ̀ anyị ga-eji rie osikapa. Ezutere m otu nwoke n’ụsọ mmiri wee jụọ ya ma m ga-azụtatụ
azụ̀, ma e buruwo nke ya nile jee ahịa. Otú ọ dị, o nyere m otu nke o debeere onwe ya. Ajụrụ m ya ego ole ọ bụ. “Esogbula,” ka o kwuru. “Werewa.”Ekelere m ya. Ma ka m na-apụ, echetara m na otu azụ̀ agaghị ezuru mmadụ anọ. Ka m na-agafe otu obere ọwa mmiri, o juru m anya ịhụ otu azụ̀ tọgbọ n’elu otu nkume, ọ ka dị mmiri mmiri. Echere m, ‘Ma eleghị anya ọ nwụọla.’ M jere iwelite ya ma nwee ihe ijuanya ịhụ na ọ ka dị ndụ. Ka m jidere ya, m jisiri ya ike, na-echeta ozugbo nkwa Jisọs bụ́: “Burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:33.
Ime Nkwusa n’Oge Agha
Mgbe ìgwè anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ mụbara ruo mmadụ itoolu, e guzobere ìgwè abụọ. E kenyere ìgwè nke anyị ije Cebu. Ọ bụ ugbu a December 1941, Agha Ụwa nke Abụọ na-agakwa n’ihu na Philippines. Mgbe anyị nọ n’obodo Tuburan, otu soja Philippines nke nọ n’ọkwá lieutenant bịara n’ụlọ anyị n’etiti abalị. “Ụmụ m, tetanụ,” ka o kwuru. “Ndị soja na-achọ unu.” A na-enyo anyị enyo ịbụ ndị nledo nke ndị Japan, n’ihi ya kwa a gbakatara anyị ajụjụ chi abọọ.
Mgbe nke ahụ gasịrị, e tinyere anyị n’ụlọ nga nke gọọmenti ime obodo ahụ. Ndị agha United States nọ na Cebu City chọrọ ka anyị nye ha akwụkwọ anyị dị iche iche ka ha wee nwee ike ịchọpụta ma anyị bụ ndị nledo nke ndị Japan. Ọtụtụ ndị obodo ahụ bịara leta anyị n’ụlọ nga, na-achọsi ike ịhụ ihe ndị ahụ e boro ebubo ịbụ ndị nledo nke ndị Japan dị ka ya. Ụfọdụ jụrụ ajụjụ, anyị gbakwaara ha àmà banyere Alaeze Chineke.
Mgbe anyị nọsịrị n’ụlọ nga ruo ụbọchị ise, onyeisi ndị uwe ojii natara telegram site n’isi ụlọ ọrụ Usuu Ndị Agha United States, na-enye ya iwu ka ọ tọhapụ Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, o nyere anyị iwu ka anyị ghara ime nkwusa ọzọ n’ihi na ugbu a bụ oge agha. Anyị kọwara na anyị apụghị ịkwụsị ime nkwusa n’ihi na anyị nwere iwu si n’aka Chineke ịrụ ọrụ a. (Ọrụ 5:28, 29) Onyeisi ahụ were iwe ma kwuo, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide na-eme nkwusa, m ga-ahapụ ka ndị mmadụ gbuo unu.”
N’ụbọchị ndị sochirinụ, onyeisi ndị uwe ojii ahụ gbara mbọ ime ka e jideghachi anyị. N’ikpeazụ, otu ìgwè nta nke Usuu Ndị Agha United States kwụsịrị anyị, onye nọ n’ọkwá lieutenant aha ya bụ Soriano jụrụ Nwanna Nwanyị Santos, sị: “Ùnu ga-akwụsị ime nkwusa?”
“Ee e,” ka ọ zaghachiri.
“Ọ bụrụkwanụ na anyị edokwaa ka ìgwè ndị agha gbagbusie unu?” ka ọ jụrụ.
“Nke ahụ agaghị agbanwe mkpebi anyị,” ka ọ kọwara.
Mgbe o kwusịrị nke ahụ, e tinyere anyị nile n’otu gwongworo ma buga anyị na Cebu City, bụ́ ebe anyị pụtara n’ihu Colonel Edmund. Lieutenant Soriano gwara ya banyere anyị, sị: “Ndị a bụ Ndịàmà Jehova. Ha bụ ndị nledo nke ndị Japan!”
“Ị̀ sịrị Ndịàmà Jehova?” ka onye colonel ahụ
jụrụ. “Amaara m Ndịàmà Jehova nke ọma n’America. Ha abụghị ndị nledo! Ha na-anọpụ iche.” O cheziri ihu n’ebe anyị nọ ma kwuo, sị: “N’ihi na unu na-anọpụ iche, a gaghị atọhapụ unu.” E mesịa, mgbe a kpọchisịrị anyị ruo oge ụfọdụ n’ọnụ ụlọ a na-akwakọba ihe, Colonel Edmund gwara anyị okwu ọzọ wee jụọ, sị: “Ùnu ka na-anọpụ iche?”“Ee, Nna Anyị Ukwu, anyị ka na-anọpụ iche,” ka anyị zaghachiri.
“Ya bụrụ otú ahụ, a gaghị atọhapụ unu,” ka o kwuru, “n’ihi na ọ bụrụ na anyị atọhapụ unu, unu ga-anọgide na-eme nkwusa, ndị unu tọghatakwara ga na-anọpụ iche. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emee otú ahụ, o nweghịzi onye ga-alụ ọgụ.”
Nnwere Onwe Ime Nkwusa Ọzọ
Mgbe e mesịrị, a kpọfere anyị n’ụlọ nga dị na Cebu City. N’April 10, 1942, ndị Japan wakporo obodo ahụ. Bọmbụ dara n’ebe ọ bụla, oké ọkụ ọgbụgba malitekwara! Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ hụrụ Nwanna Nwanyị Santos, bụ́ onye ọnụ ụlọ nke ya dịdewere ihu ụlọ nga ahụ. “Ewoo! Ndịàmà Jehova ka nọ n’ime ụlọ!” ka o tiri ná mkpu. “Meghee ụzọ ka ha pụta!” Anyị kelere Jehova maka nchebe Ya.
Ozugbo, anyị tinyere isi n’ógbè dị n’elu ugwu iji chọọ Ndịàmà ibe anyị. Anyị hụrụ otu onye n’obodo Compostela. Ná mmalite o butewo ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ, ma ugbu a o kpebiri ịkwụsị ime nkwusa ma kwaga na Cebu City, wee malite ahịa ire arịa dị iche iche. Otú ọ dị, mkpebi anyị bụ ịnọgide na-ekwusa banyere Alaeze Chineke, ihe ọ sọrọ ya mee.
Anyị nwere ọtụtụ akwụkwọ nta ahụ bụ́ Comfort All That Mourn, anyị rụsikwara ọrụ ike itinye ha n’aka ndị mmadụ. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị gbalịrị imenye anyị egwu site n’ikwu na ọ bụrụ na ndị Japan ahụ anyị, ha ga-ebepụ anyị isi. Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, a haziri òtù ndị agha okpuru na-alụso ndị Japan agha, a nwụchikwara onye ahụ kwụsịworo ime nkwusa, onye jekwara ịchụ nta ego na Cebu City. O wutere anyị ịnụ na e boro ya ebubo ịbụ onye nledo nke ndị Japan ma gbuo ya.
E Boo Anyị Ebubo Ịbụ Ndị Nledo
Ka ọ dị ugbu a, anyị nọgidere na-eme nkwusa n’ógbè ahụ dị n’elu ugwu. Otu ụbọchị anyị nụrụ banyere otu nwanyị nwere mmasị, ma iji ruo ebe o bi, anyị aghaghị ịgafere ogige dị iche iche nke ndị agha okpuru. Anyị rutere obodo nta Mangabon, bụ́ ebe nwanyị ahụ bi, ma otu ìgwè ndị soja n’ebe ahụ hụrụ anyị ma were olu ike jụọ, sị: “Gịnị bụ nzube unu ji bịa ebe a?”
“Anyị bụ Ndịàmà Jehova,” ka m zaghachiri. “Ùnu chọrọ ịnụ ozi anyị ji ígwè phonograph na-ezi?” Mgbe ha zaghachiri n’ụzọ dị mma, anyị kpọrọ rekọd bụ́ The Value of Knowledge.
Mgbe e mesịrị, e nyochara anyị ma gbaa anyị ajụjụ, kpọrọkwa anyị gazie n’isi ụlọ ọrụ ndị agha okpuru n’obodo nta bụ́ Tabonan. Anyị kpere ekpere maka nchebe Jehova n’ihi na a na-ekwukarị na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-egbu onye ọ bụla a kpọgara ebe ahụ.E chere anyị nche, mesookwa anyị mmeso ọjọọ. Nke a na-eweta anyị n’ọnọdụ ahụ m kọwara ná mmalite, mgbe e tiri m ihe, onye lieutenant ahụkwa tụgidere m aka wee sị: “Ị bụ onye nledo!” E mesoro anyị mmeso ọjọọ ruo oge ụfọdụ, ma kama igbu anyị, a mara anyị ikpe ịga nga ọrụ ahụhụ.
Nwanne m nwoke bụ́ Bernabe bụ otu n’ime ndị ọsụ ụzọ a tụrụ mkpọrọ na Tabonan. Kwa ụtụtụ, a na-achọ ka anyị bụ́ ndị mkpọrọ bụọ abụ bụ́ “Chineke Gọzie America” nakwa “Chineke Gọzie Philippines.” Kama nke ahụ, ndị bụ́ Ndịàmà na-abụ “Ònye Dịnyeere Onyenwe Anyị?” N’otu oge, onye ọfịsa na-elekọta ebe ahụ tiri mkpu, sị: “Onye ọ bụla nke na-abụghị abụ ‘Chineke Gọzie America,’ a ga-akwụgbu ya n’osisi acacia ahụ!” Ma n’agbanyeghị iyi egwu ndị dị otú ahụ, ọ dịghị onye n’ime anyị e gburu. N’ikpeazụ, a kpọfere anyị n’ogige ndị ọzọ. N’ikpeazụ, anatara m akwụkwọ ntọhapụ m, nke e dere na July 1943. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, abụwo m onye mkpọrọ ruo ọnwa asatọ na ụbọchị iri.
Oge Ndụ nke Ime Nkwusa
Ọchịchọ anyị ịhụ ndị nwere mmasị bụ́ ndị anyị buworo ụzọ meere nkwusa kpaliri anyị ime njem ruru kilomita 60 gaa obodo Toledo. E hiwere nzukọ a na-enwechi anya n’ebe ahụ, e mesịkwara mee ọtụtụ ndị baptism. N’ikpeazụ, agha ahụ biri na 1945. Afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ itoolu mgbe e mesịrị m baptism, m jere mgbakọ mbụ m, bụ́ nke e mere na Santa Ana Racetrack dị na Manila. Ihe dị ka mmadụ 4,200 gbakọtara maka okwu ihu ọha bụ́ “Ọṅụ nke Ndị Nile.”
Tupu agha ahụ amalite, anyị nwere ihe dị ka Ndịàmà 380 na Philippines, ma ka ọ na-erule 1947, e nwere ihe dị ka 2,700! Kemgbe ahụ, anọgidewo m na-enwe ọtụtụ ihe ùgwù n’ozi Jehova. Site na 1948 ruo 1950, ejere m ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ógbè Surigao. Na 1951, alụrụ m Natividad Santos, bụ́ onye jiworo obi ike soro ìgwè anyị mee nkwusa n’oge agha ahụ. Mgbe anyị lụsịrị, anyị jere ozi n’ọrụ njegharị na Mindanao nile site na 1954 ruo 1972.
Iji mee ka anyị nwee ike ịnọrọ ndị nne na nna anyị meworo agadi nso, nakwa iji nyere ha aka, anyị ghọrọ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na 1972. Ọ bụ ezie na anyị abụọ nọ n’afọ ndị nke 80 na ụma anyị, anyị nọgidere na-asụ ụzọ, ebe anyị tinyeworo ná ngụkọta, ihe karịrị afọ 120 n’ozi oge nile. Lee ihe ọṅụ ọ bụwooro anyị ịhụ ka ọnụ ọgụgụ nke ndị na-akpọsa ozi ọma Alaeze Chineke na Philippines mụbaworo ruo ihe karịrị 130,000! Ọ bụ ọchịchọ anyị inyere ọtụtụ ndị ọzọ aka ịmara na Alaeze Chineke bụ nanị olileanya dịnụ maka inweta ezi udo na obi ụtọ n’ụwa.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]
A na-enyo anyị enyo ịbụ ndị nledo nke ndị Japan, n’ihi ya kwa a gbakatara anyị ajụjụ chi abọọ
[Foto dị na peeji nke 23]
Na 1963, mụ na ndị enyi anyị n’Àgwàetiti Bohol. Mụ na nwunye m bụ ndị nke anọ na nke ise site n’aka ekpe
[Foto dị na peeji nke 24]
Mụ na nwunye m taa
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]
Foto dị n’azụ: Foto nke U.S. Signal Corps