Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible—Ọ̀ Bụ Ihe Ndekọ Akụkọ Ihe Mere Eme A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

Bible—Ọ̀ Bụ Ihe Ndekọ Akụkọ Ihe Mere Eme A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

Bible—Ọ̀ Bụ Ihe Ndekọ Akụkọ Ihe Mere Eme A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

HA KATỌRỌ ndị ọchịchị. Ha baara ndị nchụàjà mba. Ha dọrọ ndị nkịtị aka ná ntị maka ajọ omume ha. Ha deturu ọbụna emezighị emezi na mmehie ha n’akwụkwọ ka ọha na eze gụọ. A chụgharịrị ha ma kpagbuo ha, e gbukwara ụfọdụ ọbụna maka ikwu na ide eziokwu. Ole ndị ka ha bụ? Ndị amụma Bible, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha so dee Akwụkwọ Nsọ.—Matiu 23:35-37.

N’akwụkwọ ya bụ́ The Historian and History, Page Smith dere, sị: “[Ndị Hibru] emereghị ndị dike ha ebere dị ka ha na-emereghị ndị omekome ha, ha emereghị onwe ha ebere dị ka ha na-emereghị ndị iro ha, n’ihi na Chineke na-ahụ ihe ha na-ede, ọ dịghịkwa uru ha ga-erite site n’ikpuchi eziokwu kama nke ahụ ọ ga-efu ha oké ihe.” Smith dekwara na “ihe ndekọ banyere mkpagbu a kpagburu ndị Chineke họpụtara na mmeri ha nwere . . . bụ akụkọ na-adọrọ mmasị ma e jiri ya tụnyere usoro ọgụgụ oge ndị na-adịghị adọrọ mmasị nke ndị eze Siria ma ọ bụ Ijipt bụ́ ndị na-ebu agha. Ndị ode akụkọ ihe mere eme bụ́ ndị Hibru chọpụtara otu n’ime ihe ndị kasị mkpa n’ide akụkọ ihe mere eme—na ọ bụ akụkọ banyere ndị dịrị ndụ n’ezie, nke gosipụtara emezighị emezi na ntụpọ ha nile.”

Ndị dere Bible jikwa nlezianya dee ihe ndị ziri ezi. Mgbe ọ tụlesịrị Bible na-adabere n’akụkọ ihe mere eme na nkà mmụta ihe ochie, onye edemede bụ́ Werner Keller kwuru ná mmalite nke akwụkwọ ya bụ́ The Bible as History, sị: “N’ihi ọtụtụ ezi ihe àmà a pụrụ ịtụkwasị obi ndị a nwapụtara anwapụta e nwere ugbu a, . . . otu ahịrịokwu nke nọgidere na-abata m n’uche bụ: ‘Bible zidịrị ezi!’”

Ihe Ndekọ Akụkọ Ihe Mere Eme nke Na-akpali Akpali Ma Nwee Ihe Mmụta Ndị Dị Ike

N’akụkụ kasị ukwuu, ndị dere Bible bụ ndị nkịtị—ndị ọrụ ugbo, ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ọkụ azụ̀. Ma, ihe ha dere n’ime ihe dị ka afọ 1,600 emetụtawo ndị mmadụ karịa ihe odide ndị ọzọ e nwere n’oge ochie ma ọ bụ n’oge a. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ekwugidewo ihe odide ha, ma o nweghị isi. (Aịsaịa 40:8; 1 Pita 1:25) Taa, a pụrụ ịgụ Bible n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’ihe dị ka asụsụ 2,200—ihe karịrị nnọọ akwụkwọ ọ bụla ọzọ! N’ihi gịnị ka Bible ji gbapụ iche n’ụzọ dị otú ahụ? Ebe ndị na-esonụ e zoro aka na-enye aka ịza ajụjụ ahụ.

“Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.

“Ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4.

“Ihe ndị a na-emerị ndị ahụ [ụmụ Israel] n’ụzọ ihe atụ; e wee dee ha n’akwụkwọ nsọ ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị [ndị Kraịst] ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo.”—1 Ndị Kọrint 10:11.

Ee, dị ka ihe ndekọ e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee ma chekwaa banyere ndị dịrị ndụ n’ezie—ụfọdụ ndị mere ihe na-atọ Chineke ụtọ na ụfọdụ ndị na-emeghị—Bible kasị akwụkwọ ndị ọzọ nile elu. N’ezie ọ bụghị ndepụta nke e mere n’ajụghị ase nke jupụtara n’ihe ndị a ga-eme na ihe ndị a na-agaghị eme ma ọ bụ nchịkọta nke akụkọ ndị na-adọrọ mmasị e ji eme ụmụaka obi ụtọ. N’ezie, Chineke ji ndị odeakwụkwọ bụ́ mmadụ mee ihe, nke a mere nnọọ ka Bible dịwanye ụtọ, na-eme ka ọ na-adọrọ nnọọ mmasị n’ụzọ metụworo ndị na-agụ ya n’obi n’ọgbọ nile. Ọkà mmụta ihe ochie bụ́ William Albright kwuru, sị: “Nkọwa miri emi nke omume na ihe ime mmụọ nke Bible na-enye, nke bụ́ mkpughe pụrụ iche Chineke nyere mmadụ site n’ahụmahụ mmadụ, ziri nnọọ ezi taa dị ka ọ dị puku afọ abụọ ma ọ bụ atọ gara aga.”

Iji gosipụta abamuru na-adịru oge nile nke Bible, ka anyị gaa kpọmkwem ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ—ebe nanị Bible pụrụ ịkpọga anyị—ma tụlee ihe mmụta ụfọdụ bụ́ isi site n’akwụkwọ Jenesis.

Ihe Mmụta Ndị Bịara n’Ezi Oge Site n’Akụkọ Ochie

Tinyere ihe ndị ọzọ, akwụkwọ Jenesis na-ekpughe mmalite nke ezinụlọ mmadụ—aha ha na ihe nile ọzọ banyere ha. N’isiokwu a, ọ dịghị akwụkwọ akụkọ ihe mere eme ọzọ nke kapịrị okwu ọnụ ka ya. ‘Ma olee uru ịmara nne na nna anyị mbụ bara taa?’ ka ị pụrụ ịjụ. O nwere abamuru dị ukwuu, n’ihi na site n’ikpughe na mmadụ nile—n’agbanyeghị ụcha akpụkpọ ahụ, ebo, ma ọ bụ mba ha—sitere n’otu nne na nna, Jenesis na-ewepụ ihe ndabere ọ bụla maka ịkpa ókè agbụrụ.—Ọrụ 17:26.

Jenesis na-enyekwa nduzi n’ihe banyere omume ọma. O nwere ihe ndekọ banyere Sọdọm, Gọmọra, na obodo ndị dị ha nso, bụ́ ndị Chineke bibiri n’ihi mmekọahụ rụbigara arụ ókè nke ndị bi na ha. (Jenesis 18:20–19:29) Jud Amaokwu nke 7 nke akwụkwọ Bible bụ́ Jud na-ekwu, sị: “Sọdọm na Gọmọra, na obodo dị ha gburugburu, ebe ha raara onwe ha nye n’ịkwa iko . . . wee pụọ soo anụ ahụ dị iche, e debewo ha n’ihu ọha mmadụ dị ka ihe ngosi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ndị Sọdọm na Gọmọra anataghị iwu ọ bụla na-ekwu banyere omume site n’aka Chineke; otú ọ dị, dị ka mmadụ nile, ha nwere ikike akọ na uche nke Chineke nyere ha. N’ihi ya, Chineke ziri ezi n’ime ka ha zaa ajụjụ banyere omume ha. (Ndị Rom 1:26, 27; 2:14, 15) N’otu aka ahụ taa, Chineke ga-eme ka mmadụ nile zaa ajụjụ banyere omume ha, ma hà nabatara Okwu ya, bụ́ Bible Nsọ, ma ọ bụ na ha anabataghị ya.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:8, 9.

Ihe Mmụta Dị n’Akụkọ Ihe Mere Eme Maka Nlanarị

Otu ihe a kpụrụ akpụ dị n’Ogidi Titus na Rom na-egosi ndị agha Rom na-eburu arịa nsọ dị iche iche site n’ụlọukwu Jerusalem mgbe e bibisịrị obodo ahụ n’afọ 70 O.A. E gburu ihe karịrị otu nde ndị Juu. Otú ọ dị, ndị Kraịst na-erube isi lanarịrị n’ihi aka ná ntị Jisọs dọrọ ha tupu o mee: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya. N’ihi na ndị a bụ ụbọchị mkpepụta.”—Luk 21:20-22.

Kama ịbụ nanị ihe mere n’oge ochie, mkpagbu Jerusalem sere onyinyo akụkụ nke mkpagbu ka ukwuu bụ́ nke ga-abịakwasị ụwa dum n’oge na-adịghị anya. Ma, ọzọkwa, a ga-enwe ndị ga-alanarị. A kọwara ndị a dị ka “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” Ha “na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta” n’ihi okwukwe ha nwere n’ọbara Jisọs a wụsịrị—okwukwe nke dabesiiri ike n’amụma na akụkọ ihe mere eme nke Bible.—Mkpughe 7:9, 14.

Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga Ndị Na-agaghị Eme Ọzọ

Anyị na-ebi taa n’oge Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America na-achị, nke ikpeazụ bụ́ nke dị n’amụma Bible. Ihe ndị mere n’oge gara aga na-egosi na dị ka ndị ọzọ bu ya ụzọ, o kwesịrị ịbịa ná njedebe. Ma n’ụzọ dị aṅaa? Dị ka Bible si kwuo, njedebe nke ike ọchịchị a ga-apụ iche n’ezie. N’ịtụ aka n’ihu n’afọ 1914 O.A., Daniel 2:44 kwuru banyere ike ọchịchị ahụ na-achị achị, ma ọ bụ “alaeze,” sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”

Ee, Alaeze Chineke—ọchịchị eluigwe ya bụ́ nke Jisọs Kraịst nọ n’isi ya—ga-ebibi akụkụ nile fọdụrụnụ nke ọchịchị aka ike mmadụ n’Amagedọn, bụ́ njedebe nke ‘oké mkpagbu’ ahụ a kpọtụrụ uche na mbụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ‘a gaghị ahapụrụ ndị ọzọ’ Alaeze a, nke pụtara na a gaghị akwatu ya akwatu ma ọ bụ wepụ ya n’ọchịchị site n’ịjụ ịtụliri ya aka. Ókèala ya ga-eru “nsọtụ nile nke ụwa.”—Abụ Ọma 72:8.

N’ikpeazụ, ọchịchị nke okpukpe ụgha, ọchịchị aka ike, na azụmahịa anyaukwu a nọgidere na-enwe ga-akwụsị. Abụ Ọma 72:7 na-ekwe nkwa, sị: “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ . . . dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị.” Ọ bụghị ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na nganga ga-ejupụta mbara ala kama ọ bụ àgwà bụ́ isi nke Chineke bụ́ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Jisọs kwuru, sị: ‘hụrịtanụ ibe unu n’anya.’ Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant kwuru banyere nke a sị: “Ihe kasị mkpa m mụtara n’akụkọ ihe mere eme bụ otu ihe ahụ Jisọs mụtara. . . . Ịhụnanya bụ ihe kasị baa uru n’ụwa.”

Ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ kwaliri ya inye ike e ji dee Bible. Ọ bụ nanị ya na-eme ka a mara banyere oge gara aga, ugbu a, na ọdịnihu. Biko nabata ozi ya nke na-enye ndụ site n’itinyetụ oge n’ọmụmụ Bible. Iji mezuo nke ahụ nakwa iji rube isi n’iwu Jisọs, Ndịàmà Jehova na-ekwusara ndị agbata obi ha “ozi ọma nke a nke alaeze.” N’oge na-adịghị anya, ozi ọma a ga-abụ ihe karịrị amụma. Ọ ga-aghọ akụkọ mere eme.—Matiu 24:14.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Bible zidịrị ezi!”—WERNER KELLER

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

“Nkọwa miri emi nke omume na ihe ime mmụọ nke Bible na-enye . . . ziri nnọọ ezi taa dị ka ọ dị puku afọ abụọ ma ọ bụ atọ gara aga.”—WILLIAM ALBRIGHT, ỌKÀ MMỤTA IHE OCHIE

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 9]

Nkume Moab: Ihe Eze Misha kwuru banyere agha dị n’etiti Moab na Israel (2 Ndị Eze 3:4-27), aha ebe dị iche iche e dere na Bible, na aha Chineke e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru oge ochie dee dị na ya.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris.

Shilling ọlaọcha: Ihe oyiyi ya nke nwere onyinyo na ihe odide Taịbiriọs Siza (Mak 12:15-17).

Ihe Ndekọ Nabonidus: Ihe odide cuneiform nke na-akwado mmeri Saịrọs meriri Babilọn na mberede. (Daniel, isi 5)

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto e sere site n’ikike a natara British Museum.

Mbadamba nkume: O bu aha Pọntiọs Paịlet n’asụsụ Latịn.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto © Israel Museum, Jerusalem; site n’ikike a natara Israel Antiquities Authority.

Ihe osise Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ dị n’azụ: Nnyocha e mere n’ihe odide Aịsaịa gosiri na ọ fọrọ nke nta ka akwụkwọ a bụrụ nke a na-agbanweghị agbanwe n’ime ihe karịrị 1,000 afọ nke e ji aka na-edepụtaghachi ya.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e debere akwụkwọ ahụ, Israel Museum, Jerusalem.

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ihe a kpụrụ akpụ dị n’Ogidi Titus na-akwado mbibi e biri Jerusalem na 70 O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Soprintendenza Archeologica di Roma