Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta Site n’Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga?

Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta Site n’Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga?

Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta Site n’Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga?

“Ọ dịghị ihe dị ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme mkpa karịa ịkọwa ihe kpatara ihe na ihe ọ rụpụtara.”—GERALD SCHLABACH, OSOTE PRỌFESỌ AKỤKỌ IHE MERE EME.

N DỊ ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ajụkarị, sị, N’ihi gịnị, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ihe ụfọdụ si eme? Dị ka ihe atụ, akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị na Alaeze Ukwu Rom dara. Ma n’ihi gịnị ka o ji daa? Ọ̀ bụ n’ihi nrụrụ aka ka ọ bụ n’ihi ịchọ ihe ụtọ? Alaeze ukwu ahụ ọ̀ bịara sie ike ọchịchị ma na-emefu nnukwu ego n’isi ndị agha ya? Ọ̀ bụ nanị na ndị iro Rom bịara dị nnọọ ọtụtụ ma sikarịa ya n’ike?

N’oge na-adịbeghị anya, Ọchịchị Kọmunist nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, bụ́ nke a na-elebu anya dị ka ihe na-eyi Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa egwu dakpọrọ, site n’otu mba ya ruo n’ọzọ n’ihe yiri ka ọ bụ n’otu ntabi anya. Ma n’ihi gịnị? Ihe mmụta ndị dị aṅaa ka a ga-enwetakwa? Ndị a bụ ụdị ajụjụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-agbalị ịza. Ma ruo ókè ha aṅaa ka ajọ mbunobi onwe onye ha na-emetụta mkpebi ha n’inye azịza?

À Pụrụ Ịtụkwasị Akụkọ Ihe Mere Eme Obi?

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme yiri ndị ọrụ nchọpụta karịa ka ha yiri ndị ọkà mmụta sayensị. Ha na-eme nnyocha, na-ajụ ajụjụ, ma na-agbagha ihe ndekọ ndị e dere n’oge gara aga. Ha na-achọ eziokwu, ma ọtụtụ mgbe nzube ha adịghị edo anya. Ihe so akpata ya bụ na ọrụ ha na-emetụtakarịsị ndị mmadụ, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme apụghịkwa ịma ihe dị n’uche ndị mmadụ—karịsịa uche ndị nwụrụ anwụ. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme pụkwara ibuworị ụzọ nwee echiche dị iche iche ma nwee ajọ mbunobi. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ akụkọ kasị mma na-abụ n’ezie nkọwa—nke sitere n’echiche nke onye ahụ dere ya.

Otú ọ dị, ọkọ akụkọ ihe mere eme inwe echiche nke ya apụtachaghị na o dere ihe na-ezighị ezi. Akụkọ Bible nke Samuel, Ndị Eze, na Ihe E Mere na-agụnye ihe ndekọ ndị yiri ibe ha bụ́ ndị mmadụ ise dere, ma a pụrụ igosi na ha enweghị nnukwu ọdịiche ma ọ bụ ihe ndị na-ezighị ezi. Otú ahụ ka ọ dịkwa Oziọma anọ ahụ. Ọtụtụ ndị so dee Bible dekọrọ ọbụna emezighị emezi na ihie ụzọ nzuzu ha—ihe siri ike ịhụ n’akwụkwọ ụwa.—Ọnụ Ọgụgụ 20:9-12; Deuterọnọmi 32:48-52.

E wezụga ajọ mbunobi ndị a pụrụ inwe, ihe ọzọ dị mkpa ịtụle mgbe a na-agụ akụkọ ihe mere eme bụ ebumnobi nke onye dere ya. “A ghaghị inyosi ike akụkọ ọ bụla ndị ọchịchị dị n’aka ma ọ bụ ndị na-achọ inweta ọchịchị ma ọ bụ ndị enyi ha kọrọ,” ka Michael Stanford na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ A Companion to the Study of History. Ebumnobi a na-enyo enyo na-apụtakwa ìhè mgbe akwụkwọ akụkọ ihe mere eme na-egosipụta iji aghụghọ ma ọ bụ ọbụna ụzọ pụtara ìhè akpali ịhụ mba n’anya. Ọ dị mwute ikwu na a na-ahụ nke a mgbe ụfọdụ n’akwụkwọ ụlọ akwụkwọ. Otu iwu gọọmenti nyere n’otu mba kwuru nnọọ hoo haa na nzube nke ịkụzi akụkọ ihe mere eme bụ iji “mee ka echiche ịhụ mba n’anya sie ike n’obi ndị mmadụ . . . n’ihi na ịma ihe mere ná mba n’oge gara aga bụ otu n’ime ihe ndị kasị mkpa na-akpali àgwà ịhụ mba n’anya.”

Ịgwagbu Akụkọ Ihe Mere Eme

Mgbe ụfọdụ ọ bụghị nanị na akụkọ ihe mere eme na-egosi ajọ mbunobi kama a na-agwagbu ya agwagbu. Dị ka ihe atụ, mba bụbu Soviet Union “kachapụrụ aha bụ́ Trotsky n’ihe ndekọ e nwere, ka ihe na-egosi na onyeisi òtù ọchịchị ahụ dịrị ndụ fuo,” ka akwụkwọ bụ́ Truth in History na-ekwu. Ònye bụ Trotsky? Ọ bụ onye ndú nke Mgbanwe Ọchịchị Bolshevik e nwere na Russia ma bụrụ onye na-esote Lenin. Mgbe Lenin nwụsịrị, Trotsky na Stalin sere okwu, a chụpụrụ ya n’Òtù Ọchịchị Kọmunist, e mesịakwa gbuo ya. A kachapụrụ ọbụna aha ya n’akwụkwọ nkà ihe ọmụma Soviet. Ngwagbu a gbagburu akụkọ ihe mere eme n’ụzọ yiri nke a, ọbụna ruo n’ókè nke ịkpọ akwụkwọ ndị na-ekwu ihe dị iche ọkụ, abụrụwo àgwà e ji mara ọtụtụ ndị ọchịchị aka ike.

Otú ọ dị, ịgwagbu akụkọ ihe mere eme bụ omume oge ochie, nke malitere ma ọ dịghị ihe ọzọ n’Ijipt na n’Asiria. Ndị fero, ndị eze, na ndị eze ukwu dị mpako ma na-anya isi na-ahụ na a kọrọ akụkọ dị mma karị banyere ihe ndị ha mere n’oge gara aga. Ya mere, a na-ekwubigakarị okwu ókè banyere ihe ndị ha rụzuru, ebe a na-ewepụ ma ghara ikwusi okwu ike banyere ihe ihere ọ bụla, dị ka mmeri e zutere n’agha, ma ọ bụ mgbe ụfọdụ ọbụna ghara ikwu ya ekwu. N’ụzọ dị nnọọ iche, akụkọ Israel e dekọrọ na Bible na-agụnye ma mmejọ ma àgwà ọma nke ndị eze nakwa nke ndị ha na-achị.

Olee otú ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si achọpụta izi ezi nke ihe odide ndị meworo ochie? Ha na-eji ha atụnyere ihe ndị dị ka ihe ndekọ ụtụ isi ochie, usoro iwu, mkpọsa orire a ga-ere ndị ohu n’ọnụ ego dị ala, akwụkwọ ozi na ihe ndekọ onwe onye ndị mmadụ na ndị metụtara achụmnta ego, ihe ndị e dere ná mpekere ite, ihe ndekọ banyere ụgbọ mmiri, na ihe ndị a chọtara n’ili. Mgbe mgbe ihe ndị a na-enyekwu nkọwa ma ọ bụ nye nkọwa dị iche banyere ihe ndekọ ndị e nwere. N’ebe a ka nwere ụkọ ihe ọmụma na mgbagwoju anya, ezigbo ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwukarị otú ahụ, ọ bụ ezie na ha pụrụ ikwu ihe ha chepụtara iji mee ka ihe ọmụma ahụ zuo ezuo. Ka o sina dị, ndị na-agụ ihe bụ́ ndị maara ihe, na-agụ ihe karịrị otu akwụkwọ ma ọ bụrụ na ha achọọ inweta nkọwa ziri ezi.

N’agbanyeghị ihe ịma aka nile ọkọ akụkọ ihe mere eme na-eche ihu, ihe ndekọ ya pụrụ inye ihe ọmụma dị ukwuu. Otu akwụkwọ akụkọ ihe mere eme na-akọwa, sị: “Ọ bụ ezie na o siri ike odide, . . . akụkọ ihe mere eme banyere ụwa dị anyị oké mkpa.” E wezụga ime ka anyị mara ihe ndị mere n’oge gara aga, akụkọ ihe mere eme pụrụ ime ka anyị ghọtakwuo ọnọdụ ndị mmadụ nọ na ya ugbu a. Dị ka ihe atụ, anyị ga-achọpụta n’oge na-adịghị anya na ndị oge ochie gosipụtara otu àgwà ndị ahụ ndị mmadụ na-egosipụta taa. Ngosipụta a na-egosipụtaghachi àgwà ndị a enwewo mmetụta dị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme, ikekwe na-eme ka a na-ekwu na ihe mere n’oge gara aga ga-emekwa ọzọ. Ma ezi izu ọ̀ dị ná nkwubi okwu ahụ?

Ihe Mere n’Oge Gara Aga Ọ̀ Ga-eme Ọzọ?

Ànyị pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu na-adabere n’ihe ndị mere n’oge gara aga? Ụdị ihe ụfọdụ na-eme ọzọ. Dị ka ihe atụ, onye bụbu Odeakwụkwọ Mba United States bụ́ Henry Kissinger kwuru, sị: “Mmepeanya ọ bụla nke dịworo mgbe ọ bụla adawo kpam kpam.” O kwukwara, sị: “Akụkọ ihe mere eme bụ akụkọ banyere mgbalị ndị daworo ada, banyere ọchịchọ ndị a na-enwetaghị. . . . Ya mere, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme, mmadụ aghaghị ịnakwere na a pụghị izere ọdachi.”

Ọ dịghị alaeze ukwu abụọ dara n’otu ụzọ. Ndị Midia na ndị Peasia meriri Babilọn n’abalị 539 T.O.A. Gris tisara ghọọ alaeze dị iche iche mgbe Alexander Onye Ukwu nwụsịrị, o mesịrị nyere Rom ohere. Otú ọ dị, a ka na-arụ ụka banyere ọdịda Rom dara. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Gerald Schlabach na-ajụ, sị: “Olee mgbe Rom ji daa? Ọ̀ dị mgbe ọ dara n’ezie? Ihe gbanwere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe n’agbata 400 OA na 600 OA. Ma ọtụtụ ihe gara n’ihu ime.” * N’ụzọ doro anya, akụkụ ụfọdụ nke ihe mere n’oge gara aga na-emeghachi, ebe ndị ọzọ na-adịghị emeghachi.

Ihe a na-amụtakarị n’akụkọ ihe mere eme bụ enweghị ihe ịga nke ọma nke ọchịchị mmadụ. N’ọgbọ nile, ọdịmma onwe onye, elepụghị anya n’ihu, anyaukwu, nrụrụ aka, imelara ndị ikwu, karịsịakwa oké ọchịchọ nke inweta ọchịchị na ịnọgide na ya emewo mgbe nile ka a ghara inwe ezi ọchịchị. N’ihi ya, oge gara aga jupụtara n’asọmpi ịkpụpụta ngwá agha, nkwekọrịta ndị a na-emezughị, agha, ọgba aghara ndị mmadụ na ime ihe ike, inwe akụ̀ na ụba n’ụzọ na-ahaghị nhata, na ndakpọ akụ̀ na ụba.

Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe akwụkwọ bụ́ The Columbia History of the World na-ekwu banyere mmetụta nke mmepeanya nke Ebe Ọdịda Anyanwụ nwere n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa: “Mgbe Columbus na Cortes mesịrị ka ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe mara ihe ndị pụrụ imenụ, a kpalisiri ọchịchọ ha nke ịtọghata ndị mmadụ, inweta uru, na ịbụ ndị a ma ama, ike, n’ụzọ bụ́ isi e jikwa ike webata mmepeanya nke Ebe Ọdịda Anyanwụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụwa dum. N’ịbụ ndị chọrọ nnọọ ịgbasawanye nakwa ndị nwere ngwá agha ndị ka mma, ndị nwere mmeri ji ike mee ka akụkụ ndị ọzọ nke ụwa nọrọ n’okpuru ike ọchịchị ndị dị ike na Europe . . . N’ikwu ya ná nkenke, e jiri obi ọjọọ rigbuo ndị bi na kọntinent ndị a [Africa, Esia, kọntinent ndị dị n’America] n’esepụghị aka.” Lee ka okwu dị na Bible, n’Eklisiastis 8:9, si bụrụ eziokwu: “Otu mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya”!

Ikekwe ọ bụ ihe a e dekọrọ dị mwute kpaliri otu onye ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Germany ikwu na nanị ihe a ga-amụta n’ihe ndị mere n’oge gara aga bụ na ndị mmadụ adịghị amụta ihe ọ bụla n’ihe ndị mere n’oge gara aga. Jeremaịa 10:23 na-ekwu, sị: “Mmadụ apụghị ịchịkwa ụzọ ya, mmadụ enweghịkwa ike nke iduzi nzọụkwụ ya ka ọ na-aga ije.” (The Jerusalem Bible) Ike a anyị na-enweghị iduzi nzọụkwụ anyị kwesịrị ịgbasa anyị taa karịsịa. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-enwe nsogbu ndị na-enweghị atụ ma n’ọnụ ọgụgụ ma n’isi ike ha. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi nagide ha?

Nsogbu Ndị Na-enweghị Atụ

N’akụkọ ihe mere eme nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ igbukpọsị oké ọhịa, nrichapụ elu ala, mgbasa nke ọzara, oké mkpochapụ nke ụdị osisi na anụmanụ dị iche iche, mbibi nke ikuku ozone, mmetọ, ụwa ikpo ọkụ, imetọ oké osimiri, na ọnụ ọgụgụ mmadụ ịbawanye ụba gbakọrọ aka yie ụwa egwu.

“Ihe ịma aka ọzọ na-eche ọha mmadụ nke oge a ihu bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ji nnọọ agbanwe” ka akwụkwọ bụ́ A Green History of the World na-ekwu. Ed Ayres, editọ magazin World Watch na-ede, sị: “Ihe anyị na-enwetụbeghị ahụmahụ ya na-eche anyị ihu nke na anyị adịghị aghọta ya n’ezie, ọbụna mgbe e nwere ọtụtụ ihe àmà. Nye anyị, ‘ihe’ ahụ bụ oké mgbanwe nke ihe ndị dị ndụ na ndị na-adịghị ndụ n’ụwa nke nọworo na-enyere anyị aka.”

N’ihi ihe ndị a na nsogbu ndị ọzọ yiri ha, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Pardon E. Tillinghast na-ekwu, sị: “Ebe ọha mmadụ na-eche ihu abụwo nke na-agbagwoju anya karị, nyekwa ọtụtụ n’ime anyị ọnọdụ ahụ nke amaghị ihe a ga-eme dị egwu. Nduzi dị aṅaa ka ndị ọkachamara n’akụkọ ihe mere eme pụrụ inye ndị nwere mgbagwoju anya taa? O yighị ka ọ dị ukwuu.”

Ndị ọkachamara n’akụkọ ihe mere eme nwere ike ghara ịma ihe ha ga-eme ma ọ bụ ndụmọdụ ha ga-enye, ma n’ezie ọ gaghị adị otú ahụ n’ebe Onye Okike anyị nọ. N’ezie, o buru amụma na Bible na “oge dị oké egwu” ga-adị n’ụwa na mgbe ikpeazụ. (2 Timoti 3:1-5) Ma Chineke emewo ọbụna karịa nke ahụ, o mewokwa ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-enweghị ike ime—o gosiwo ihe ngwọta ya, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Ihe Schlabach kwuru kwekọrọ n’ihe Daniel onye amụma buru n’amụma na alaeze ga-anọchi Alaeze Ukwu Rom ga-esite n’ime Rom n’onwe ya topụta. Lee isi nke 4 na nke 9 nke Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

“A ghaghị inyosi ike akụkọ ọ bụla ndị ọchịchị dị n’aka . . . kọrọ.”—MICHAEL STANFORD, ỌKỌ AKỤKỌ IHE MERE EME

[Foto dị na peeji nke 4]

Eze Ukwu Nero

[Ebe E Si Nweta Foto]

Roma, Musei Capitolini

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

N’ọgbọ nile, “otu mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

“The Conquerors,” nke Pierre Fritel sere. Ọ na-agụnye (site n’aka nri gaa n’aka ekpe): Ramses nke Abụọ, Attila, Hannibal, Tamerlane, Julius Caesar (n’etiti), Napoléon nke Mbụ, Alexander Onye Ukwu, Nebukadneza, na Charlemagne. Site n’akwụkwọ bụ́ The Library of Historic Characters and Famous Events, Mpịakọta nke Atọ, 1895;

ụgbọelu: foto USAF