Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ha Ga-akpụgharị Mma Agha Ha Ka Ha Bụrụ Mma Ogè’—Ole Mgbe?

‘Ha Ga-akpụgharị Mma Agha Ha Ka Ha Bụrụ Mma Ogè’—Ole Mgbe?

‘Ha Ga-akpụgharị Mma Agha Ha Ka Ha Bụrụ Mma Ogè’Ole Mgbe?

OTU ihe ọkpụkpụ na-ewu ewu dị n’isi ụlọ ọrụ Òtù Mba Ndị Dị n’Otu dị na New York City na-egosi nwoke na-akpụgharị mma agha ka ọ bụrụ mma ogè. Ọ dabeere n’amụma Bible ndị dị n’Aịsaịa isi 2, amaokwu nke 4, na Maịka isi 4, amaokwu nke 3. Ole mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi mezuo okwu ndị a?

Otu akụkọ pụtara n’akwụkwọ akụkọ The New York Times na nso nso a bu isi akụkọ bụ́ “Ego A Na-ereta ná Ngwá Agha n’Ụwa Nile Amụbaruo Ijeri $30”! Na 1999 olee ndị kasị wepụta ngwá agha a dịgasị iche? United States bụ mba nke mbụ, na-ereta ijeri $11.8. Russia bụ mba nke abụọ, na-ereta ihe na-erughị ọkara nke ọnụ ego ahụ. Otú ọ dị, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na Russia retara okpukpu abụọ nke ihe o retara n’afọ gara aga. Ndị ọzọ na-esote ha bụ Germany, China, France, Britain, na Itali. Otu akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Dị ka ọ dị n’oge gara aga, ọ bụ mba ndị na-emepe emepe ka e resịrị ihe dị ka ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ngwá agha nile ndị ahụ.”

Ka a lụworo agha ụwa abụọ na ọtụtụ nnukwu agha ndị ọzọ na narị afọ nke 20, bụ́ nke gburu ma merụọ ọtụtụ narị nde mmadụ ahụ, mmadụ aghaghị ịjụ, sị: “Oleedị mgbe mba dị iche iche ga-amụta udo kama ịmụta agha?” Bible na-egosi na mmụta a a ga-amụta udo ga-abụ “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” (Aịsaịa 2:2) N’eziokwu, amụma a enwewalarị mmezu, n’ihi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde Ndịàmà Jehova isii ekwewo ka ha bụrụ “ndị mmụta Jehova.” N’ihi ya, ‘udo ha abawo ụba.’—Aịsaịa 54:13.

N’oge na-adịghị anya Jehova ga-ebibi ngwá agha nile na agha na ndị na-akwado ha, n’ihi na ọ ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’ Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịmatakwu banyere mgbanwe a dị ebube, biko i nweere onwe gị ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ deta akwụkwọ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5.—Mkpughe 11:18.