Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị A Mụtara Site ná Mgbalị Loida Mere

Ihe Ndị A Mụtara Site ná Mgbalị Loida Mere

Ihe Ndị A Mụtara Site ná Mgbalị Loida Mere

ISIOKWU bụ́ “Mgbalị Loida Mere Ikwu Okwu” (September 8, 2000) kpaliri ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị imeghachi omume na ya. Akụkọ a mere eme banyere nwata nwanyị nwere ọrịa ụbụrụ, bụ́ onye na-apụghị ikwu echiche ya ruo mgbe ọ dị afọ 18, metụrụ ọtụtụ ndị n’obi n’ụzọ miri emi. Ihe na-esonụ bụ ole na ole n’ime mmeghachi omume ndị e nwetara.

“Apụghị m ịkwụsị ibe ákwá mgbe m gụrụ ozi Loida ziri ezinụlọ ya mgbe o mesịrị nwee ike ikwu echiche ya. Obi ike na ume ya n’agbanyeghị ọnọdụ ya ndị tara akpụ bụ ihe ndị m ga-agbalịsi ike iṅomi.”—K. G.

“Enwere m ezi ahụ ike, ma mgbe ụfọdụ m na-eme mkpesa banyere ihe dị iche iche. Mgbe m gụsịrị banyere Loida, m kpegaara Jehova ekpere, na-arịọ ka ọ gbaghara m n’ihi enweghị ekele m maka ihe m nwere.”—R. H.

“Na 1980, a mụrụ nwanne m nwoke nke nta bụ́ onye nwere ọtụtụ nsogbu ahụ ike, gụnyere ọrịa ụbụrụ, ọ pụghịkwa ikwu okwu. Ahụmahụ a gbara ezinụlọ anyị ume ịghara ịda mbà ma ọlị, n’agbanyeghị otú ihe pụrụ isiru n’ike.”—L. W.

“Abụ m nwa agbọghọ dị afọ 14, anọwo m na-eche kemgbe na ọ bụ nanị m nwere nsogbu. N’ime Paradaịs, aga m achọ ịhụ ka ahụ dịrị Loida mma ma soro ya kwurịta okwu. Ọ bụ otu n’ime ndị m chọrọ izute ma mere ha enyi ruo mgbe ebighị ebi.”—R. K.

“Isiokwu a metụrụ m n’obi. Anọwo m na-arịa ụdị ọrịa uche dị iche iche. Ịgụ banyere otú Loida si na-atụ anya ụwa ọhụrụ Chineke na-eme ka m chọsie ike ọbụna karị ịnọ ebe ahụ.”—P. B.

“Mụ onwe m kwa nwere ọrịa ụbụrụ, ma ikwu okwu abụghịrị m nsogbu. Isiokwu a na-eme ka m mara na Jehova na-ahụ ihe nile anyị na-ezute ma na-eji onye ọ bụla n’ime anyị akpọrọ ihe maka ihe anyị nile n’otu n’otu pụrụ itinye n’ijere ya ozi.”—D. J.

“Ihe kasị metụ m n’ahụ bụ ịgụ banyere otú Loida si rara ndụ ya nye Jehova mgbe ọ bụ nwata nakwa otú o si na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa. Anyị bụ́ ndị ahụ gbasiri ike karị pụrụ ịmụta ihe site n’aka Loida n’ọtụtụ ụzọ.”—A. R.

“Ahụmahụ Loida emewo ka m gbalịsie ike ịdị na-eche banyere ndị ọzọ karị, na-echekwa banyere ihe m pụrụ imere ha. Anaghị m eji ihe ùgwù m nke inwe ike ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova Chineke egwuri egwu.”—B. M.

“Lee isiokwu na-enweghị atụ ọ bụ! Anyị maara otu di na nwunye n’otu ọgbakọ dị anyị nso bụ́ ndị nwere nwa nwanyị nke na-arịa ọrịa ụbụrụ. Aga m ezigara ha kaadị ekele taa iji mee ka ha mara na m nwere obi ekele n’ebe ha nọ n’ezie nakwa maka ihe nile ha na-emere ya.”—T. G.

“Mgbe m dara mbà n’obi, oge ụfọdụ m na-achọ nanị ọdịmma onwe m, ma Loida na-enwe mmasị pụrụ iche n’ebe ndị ọzọ nọ. Nke ahụ bụ ihe m na-agbalịsi ike ime. Ọ dịkwa m mkpa ịgbalịsikwu ike ịdị ka Loida, na-ekpegakwara Jehova ekpere mgbe ọ dị m ka ò nwere ihe na-anyịgbu m.”—N. D.

“Adị m afọ 14, m na-arịakwa ọrịa ụkwara ume ọkụ. Mgbe ụfọdụ, ana m eche na ọ bụ ọrịa m kasị njọ, ma n’ịgụ ahụmahụ a, aghọtawo m na ọ dịghị otú ahụ. Unu emeela maka ahụmahụ a dị mwute ma n’otu mgbe ahụ bụrụ nke obi ụtọ, nke na-enye anyị olileanya.”—M. C.