Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ọ̀ Bụ Ezigbo Enyi Mmadụ?

Ụmụaka a na-ahapụrụ nkịta n’enweghị onye na-elebara ha anya nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ọ tara, dị ka otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ El Universal nke Mexico City si kwuo. “Ọ fọrọ nke ka ọ bụrụ na ọ bụ nwatakịrị ahụ na-akpasu mwakpo ahụ mgbe nile, nanị ihe nkịta ahụ na-emekwa bụ ịzọ onwe ya,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. N’ime afọ ise gara aga, otu ụlọ ọgwụ dị na Mexico agwọwo ụmụaka 426 n’ihi arụ nkịta. N’ime ụmụaka ndị a, e merụrụ pasent 12 ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide ma ọ bụ nye ha nkwarụ. Akụkọ ahụ na-agba ndị nne na nna ume ịkụziri ụmụ ha ụkpụrụ ndị bụ́ isi banyere nkịta nile: Hapụrụ ha ihe ndị ha ji egwuri egwu, ụlọ ha, na ihe ndị e ji etinyere ha nri; abịala nkịta nso mgbe ọ na-eri nri ma ọ bụ na-ehi ụra; adọla ya aka n’ọdụdụ ma ọ bụ nwaa ịnọkwasị ya n’elu.

Nsogbu Igbu Onwe Onye na Japan

Ikekwe n’ihi nsogbu ọnọdụ akụ̀ na ụba, “Japan yiri ka ò nwekwaghị nzube ya,” bụrụkwa nke “na-enweghị nduzi,” ka ọtụtụ ndị Japan na-ekwu. Ihe ọ kpatara bụ “ntiwapụ nke igbu onwe onye kemgbe afọ iri,” ka The New York Times na-akọ. “N’ọha mmadụ ebe ụjọ mmechuihu na-enwe mmetụta dị ike n’ahụ ndị mmadụ, ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke enweghị ọrụ emewo ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị nwere nkụda mmụọ, ndị na-awagharị n’oge ehihie, bụ́ ndị na-eme ka hà nwere ezigbo ọrụ site n’ịhapụ ụlọ ogologo ụbọchị nile.” N’ihi ịbụ ndị nọ ná nchegbu na ịbụ ndị ihere ji, ụfọdụ ndị na-eche echiche igbu onwe ha. “Olileanya adịghị,” ka Dr. Yukio Saito na-ekwu. “Ndị mmadụ enweghị atụmanya maka ọdịnihu, ihe nile yikwara ka hà na-adakpọ adakpọ . . . Igbu onwe onye aghọwo otu ụdị nke ntiwapụ ọrịa.” O yiri ka igbu onwe onye n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè ọ̀ na-aghọwanye ihe ọtụtụ ndị nwere mmasị na ya. Ná mgbalị igbochi ha, otu ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè etewo ágbá na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ n’ebe ụzọ ụgbọ okporo ígwè gafere n’okporo ámá iji mee ka ọnọdụ uche nke onye na-achọ igbu onwe ya gbanwee, ha etinyegasịwokwa enyo n’akụkụ abụọ nke ụzọ ụgbọ okporo ígwè iji mee ka onye na-amabanye na ya kwụsịtụ ma chee echiche. Ụlọ ọrụ ahụ egbutulatawokwa alaka osisi ka mmadụ ghara iche na a dịghị ahụ ya. Otú ọ dị, ndị ọkachamara na-ekwu na ọ gwụla ma ọnọdụ akụ̀ na ụba ọ̀ dịwanyere mma, mgbalị ndị a yikarịsịrị ka hà ga-akụ afọ n’ala.

Ịrụ Ụka na Alụmdi na Nwunye

Otu nchọpụta ọhụrụ nke Andrew Christensen nke Mahadum California dị na Los Angeles mere gosiri na “ndị di na nwunye na-adịghị akatọ ibe ha na ndị na-anagide nghọtahie ha karị na-enwe alụmdi na nwunye kasị mma,” ka magazin bụ́ Time na-ekwu. N’aka nke ọzọ, nanị ihe ịrụ ụka na-arụpụta ọtụtụ mgbe bụ ịrụkwu ụka.

Ihi Ụra nke Ọma

“Anyị bụ ọha mmadụ nke na-adịghị ehi ụra nke ọma bụ́ nke pụrụ ịdị ize ndụ,” ka ọkà n’akparamàgwà mmadụ na Mahadum nke British Columbia bụ́ Stanley Coren na-ekwu. Ihi obere ụra so n’ihe kpatara ihe ọghọm nuklia ahụ e nwere n’Àgwàetiti Three Mile nakwa nkwafu mmanụ nke Exxon Valdez. Iro ụra na-akpata ihe karịrị 100,000 ihe ọghọm ụgbọala kwa afọ n’Ebe Ugwu America, ka magazin Canada bụ́ Maclean’s na-akọ. Ọkachamara n’ihe banyere ụra na Mahadum Stanford bụ́ Dr. William Dement na-adọ aka ná ntị, sị: “Ndị mmadụ adịghị aghọta n’ezie otú ha kwesịrị ihiru ụra.” Iji hie ụra nke ọma karị, ndị na-eme nchọpụta na-atụ aro, sị: Rie nri abalị gị n’ihe na-adịghị ala karịa awa atọ tupu ị lakpuo ụra. Na-alakpu ụra ma na-ebili n’otu oge ahụ kwa ụbọchị. Edebela TV ma ọ bụ kọmputa n’ọnụ ụlọ ị na-edina. Zere caffeine, mmanya na-aba n’anya, na ụtaba. Yiri sọks iji mee ka ụkwụ gị na-ekpo ọkụ mgbe i dina ala. Jiri mmiri dịtụ ọkụ saa ahụ tupu ị lakpuo ụra. Na-emega ahụ kwa ụbọchị—ma, ọ bụghị kpọmkwem tupu ị lakpuo ụra. N’ikpeazụ, Maclean’s na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị pụghị ihi ụra, bilie ọtọ, mewe ihe ụfọdụ. Jee dinaa ala ọzọ nanị mgbe ike gwụrụ gị, bilizie n’oge ị na-eji ebili mgbe nile.”

Idebe Kichin Ọcha

“Bleach [nkịtị] bụ ihe nchebe kasị mma i nwere” megide ụmụ nje ndị na-akpata ọrịa bụ́ ndị na-ezo na kichin a na-ejikarị eme ihe, ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ Vancouver Sun na-ekwu. Akụkọ ahụ tụrụ aro ndị na-esonụ: Kwa ụbọchị, tinye bleach dị mililita 30 na mmiri dịtụ ọkụ, ọ bụghị ezigbo ọkụ, nke dị lita 4. Mmiri dị nnọọ ọkụ na-eme ka bleach ahụ kupụsịa. Jiri mmiri ahụ e tinyere bleach na ya hichaa elu ihe dị iche iche na kichin gị, na-eji akwa dị ọcha. Hapụ ka ikuku mee ka ha kọọ. Ime ka bleach ahụ nọtekwuo aka n’elu ihe ndị ahụ na-egbu ụmụ ihe dị iche iche karị. Jiri mmiri ọkụ ncha dị na ya saa ihe nile e ji rie nri, mezie ka nje nile dị na ha nwụsịa site n’itinye ha n’ime mmiri ahụ e tinyere bleach na ya ruo minit ole na ole. Ọ dịghị mmiri ọgwụ ga-afọdụ n’elu ihe ndị ahụ e ji rie nri mgbe ha kọsịrị. Kwa ụbọchị, sachaa ma tinye ogbo, akwa e ji ehicha arịa nri, nakwa brọsh e ji ehicha ihe na kichin n’ime mmiri e tinyere bleach na ya. Ijikwa belata ihe ize ndụ nke nje isi n’aka gị banye n’ihe oriri, kwọọ ha nke ọma, karịsịa okpuru mbọ gị.

Asụsụ Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ

Mexico nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ kasị ukwuu na-asụ asụsụ obodo ha na kọntinent ndị dị n’America. Tụkwasị na nke a, ọ bụrụ na India na China gasịa, Mexico bụ ndị nke atọ n’ụwa n’ọnụ ọgụgụ asụsụ obodo ndị a ka na-asụ. Ọtụtụ n’ime asụsụ ndị a na-apụ n’anya, ka akwụkwọ akụkọ asụsụ Bekee nke Mexico, bụ́ The News na-akọ. Rafael Tovar y de Teresa, bụ́ onye nduzi nke Kansụl Maka Ọdịbendị na Ọrụ Nkà, na-akọwa na n’ime ihe na-erughị 100 asụsụ obodo a na-asụ na Mexico ná ngwụsị narị afọ nke 19, ọ bụ nanị 62 fọdụrụ. Ọ bụkwa ihe na-erughị 1,000 mmadụ na-asụ asụsụ 16 n’ime asụsụ ndị a. Otu nchegbu a na-enwe bụ na mgbe asụsụ pụrụ n’anya, a dịghịzi ama aha ndị obodo na-akpọ ihe ọkụkụ dị iche iche, na-eme ka a gharazie ịma otú e si eji ha agwọ ọrịa n’ụzọ ọdịnala.

Aṅụla Mmanya Jee Gwuwe Mmiri

N’ime otu afọ na nso nso a, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmiri riri na Germany bụ n’ihi ihe metụtara “ịṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè,” ka Dr. Klaus Wilkens na-ekwu, bụ́ onyeisi nke Òtù Na-azọpụta Ndụ nke Germany. Dị ka obere akwụkwọ akụkọ ahụ ike bụ́ Apotheken Umschau si kọọ, ihe ọghọm 477 nke mmiri iri mmadụ weere ọnọdụ n’osimiri, ọwa mmiri, na ọdọ mmiri ndị dị na Germany na 1998. Ịṅụ mmanya na-aba n’anya wee jee na-egwu mmiri dị ize ndụ n’ihi na mmanya na-aba n’anya pụrụ ime ka mmadụ ghara imegharị ahụ nke ọma ma belata ike ịrụ ọrụ nke uru ahụ, ọ pụkwara ime ka i nwee echiche gabigara ókè banyere ikike gị. Ya mere, ndị na-ahụ maka nchebe nke ndị na-egwu mmiri na-adọ aka ná ntị, sị: ‘Aṅụla mmanya jee gwuwe mmiri!’

Ndị E Goro Ọrụ Igbu Ụmụ Ahụhụ

Ngalaba na-ahụ maka oké ọhịa na Uttar Pradesh State n’India amalitewo atụmatụ igbu ụmụ ahụhụ ná mgbalị iji gbochie ahụhụ dị sentimita 2.5 n’ogologo, nke nwere nku, nke a na-akpọ hoplo, ibibi oké ọhịa nwere ihe dị ka osisi sal dị 650,000, ka The Times of India na-akọ. N’ihi na ụmụ ahụhụ ahụ amụbawo n’ọnụ ọgụgụ na nso nso a, a na-eyi ịdị adị nke ụdị osisi a egwu. Ụmụ ahụhụ ahụ na-atụ ọnụ banye ná mkpo nakwa n’alaka ya, na-eme ka osisi ahụ kpọnwụọ. Ngalaba ahụ na-ahụ maka oké ọhịa na-eji “ọnyà osisi” ejide ụmụ ahụhụ ahụ. A na-awụsa iberibe mkpo obere osisi sal n’ebe a na-ahụ ụmụ ahụhụ ahụ. Mmiri nke na-esi n’iberibe mkpo ndị a apụta na-adọta ụmụ ahụhụ ahụ ma na-egbu ha ka mmanya, na-eme ka ọ dị mfe karị ịnwụde ha. A na-ewe ụmụ okorobịa ógbè ahụ n’ọrụ ịrụ ọrụ ahụ, bụ́ nke a na-akwụ ha paisa 75 (ihe dị ka cent abụọ) maka otu ahụhụ.

Nkụda Mmụọ n’Ihi Ịla Ezumike Nká

Ikweta ịla ezumike nká tupu oge eruo pụrụ inwe abamuru ụfọdụ, ma ọ pụkwara ịkpa mmetụta uche mmadụ aka ọjọọ. Akwụkwọ akụkọ Brazil bụ́ Diário de Pernambuco na-akọ na ndị na-arụbu ọrụ obodo mere mkpesa nke inwe nsogbu dị iche iche malite ‘n’enweghị afọ ojuju, ahụ mgbakasị, mmetụta nke enweghị nchebe, na mmetụta nke abaghị n’ihe ruo n’ịda mbà n’obi na iche na ụwa ha agwụla.’ Dị ka Guido Schachnik, bụ́ ọkà n’ihe banyere nsogbu na ọrịa ndị agadi, si kwuo, “ndị ikom lara ezumike nká tupu oge eruo na-adabakarị n’ịṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ ndị inyom ana-adabere n’ịṅụ ọgwụ.” Ndị na-eche echiche ịla ezumike nká kwesịrị “iji nkà ha rụwa ụdị ọrụ ọzọ, izere ụgwọ, na ịchọ ndụmọdụ iji gbanahụ ịdaba n’oké ụgwọ,” ka ọkà n’akparamàgwà mmadụ bụ́ Graça Santos na-ekwu.

Ọrịa AIDS na Ọrụ Ugbo na Zambia

A na-ebelata ihe a na-akọpụta n’ugbo na Zambia n’ihi mgbasa ọrịa AIDS na-agbasa n’ike n’ike n’ebe ahụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Zambia Daily Mail na-ekwu na otu n’ime ihe ndị kasị mkpa n’ọrụ ugbo bụ mgbalị ndị ọrụ ugbo na ndị na-enyere ha aka na-etinye. Ma ọrịa AIDS na-egbu ihe dị ukwuu n’ime ndị ọrụ a. “Mgbe ndị ọrụ ugbo nwụrụ, ndị nwere ike ịrụ ọrụ n’ugbo na-ebelata, n’ihi ya kwa, ihe a na-akọpụta na-adalata nke ukwuu. Nke a na-emetụta òkè ihe oriri nke ezinụlọ na-enweta, na-eduga ná mmụba nke ịda ogbenye,” ka Daily Mail ahụ na-akọ. Ihe ngwọta ya, dị ka Daniel Mbepa si kwuo, bụ́ onye na-achị ógbè Mansa na Zambia, bụ ka ndị ọrụ ugbo na-eso nanị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ. O kwuru, sị: “Site n’ịkwalite omume ọma, a pụrụ ibelata nsogbu ọrịa AIDS.”