Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Na-awụ Akpata Oyi nke Ọrịa AIDS!

Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Na-awụ Akpata Oyi nke Ọrịa AIDS!

Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Na-awụ Akpata Oyi nke Ọrịa AIDS!

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SOUTH AFRICA

THEMBEKA bụ nwata nwanyị dị afọ 12 bi n’otu ime ime obodo nke ebe ndịda Africa. Ọrịa AIDS gburu ndị mụrụ ya, a hapụkwara ya ilekọta ụmụnne ya nwanyị atọ ndị ọ tọrọ bụ́ ndị dị afọ iri, afọ isii, na afọ anọ. “Ụmụntakịrị ahụ bụ́ ụmụ nwanyị adịghị akpata ego ọ bụla, ha na-adaberekwa kpam kpam n’ihe ndị agbata obi ha na-enye ha . . . otu ógbè bred, poteto ole na ole,” ka otu onye nta akụkọ kwuru. E gosiri foto ụmụntakịrị nwanyị anọ a bụ́ ụmụ mgbei n’ihu peeji nke akwụkwọ akụkọ South Africa nke kọrọ banyere agba nke 13 nke Nzukọ Mba Nile Maka Ọrịa AIDS, nke e nwere na July 2000, na Durban, South Africa.

Ọtụtụ nde ụmụaka ọrịa AIDS mere ka ha bụrụ ụmụ mgbei na-eche ọnọdụ yiri nke Thembeka na ụmụnne ya ndị nwanyị ọ tọrọ ihu. Nzukọ ahụ lebara anya n’ụzọ dị iche iche a ga-esi mee ihe banyere nsogbu na-esiwanye ike nke ọrịa AIDS, dị ka ịkụzi otú e si egbochi ọrịa AIDS site n’iji condom eme ihe; iji nlekọta ọgwụgwọ ọrịa AIDS na-adịchaghị oké ọnụ eme ihe, bụ́ nke e nwere ugbu a; na itinyekwu ego maka mmepụta nke ọgwụ mgbochi ọrịa AIDS. E tinyekwara ọnụ n’otú ndị inyom si nọrọ n’ihe ize ndụ, karịsịa ụmụ agbọghọ.

Ọ dị mwute na ndị ikom, bụ́ ndị kwenyere na ha na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke inwe mmekọahụ ga-agwọ ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, na-achụgharị ọtụtụ ụmụaka ndị ọrịa AIDS mere ka ha bụrụ ụmụ mgbei. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ikom agaghị alụ nwa agbọghọ ọ gwụla ma o bu ụzọ mụọ nwa. Ya mere a na-ewere iji condom eme ihe dị ka ihe na-egbochi ma alụmdi na nwunye ma ịbụ nne.

N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ụmụ agbọghọ amaghị banyere ihe ize ndụ nke ọrịa AIDS. Akwụkwọ akụkọ South Africa bụ́ Sowetan kwuru banyere akụkọ a kọrọ ná nzukọ nke Òtù Na-ahụ Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF), sị: “Nnyocha nke òtù Unicef mere gosiri na pasent 51 nke ụmụ agbọghọ ndị dị site n’afọ 15 ruo 19 na South Africa amaghị na onye yiri ka o nwere ahụ ike pụrụ ịbụ onye bu nje HIV, nweekwa ike ibunye ha ya.”

Ihe ọzọ na-akpata mgbasa nke ọrịa AIDS bụ mmetọ a na-emetọ ndị inyom n’ụzọ mmekọahụ. Ranjeni Munusamy, bụ́ onye gara nzukọ ahụ, kọrọ n’akwụkwọ akụkọ Sunday Times nke Johannesburg, South Africa, sị: “Imeso ndị inyom ihe ike, nke bụ́ ụdị kasị akpata nchegbu nke ike ndị ikom, ka bụ ihe mkpọbi ụkwụ bụ́ isi nye mgbochi nje HIV na nlekọta nke ndị bu ya. Ụdị ya nile—ndina n’ike, idina onye ikwu, iti nwunye ihe nakwa mmetọ n’ụzọ mmekọahụ—pụtara na a na-amanyekarị mmadụ inwe mmekọahụ amanye, nke bụ n’onwe ya ihe ize ndụ na-akpata mbufe nke nje HIV.”

Ndekọ ọnụ ọgụgụ e wepụtara ná nzukọ ahụ na-emenye ụjọ, dị ka chaatị na-esonụ na-egosi. Kwa ụbọchị, ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ndị na-eto eto 7,000 na 1,000 ụmụ ọhụrụ na-ebute nje HIV. N’otu afọ, bụ́ 1999, ọrịa AIDS gburu ndị nkụzi nke ihe dị ka ụmụaka 860,000 ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara.

Dị ka otu nnyocha nke Kansụl Ime Nchọpụta Ọgwụ nke South Africa bipụtara, nde mmadụ 4.2 nọ na South Africa bu nje HIV, nke na-anọchi anya 1 n’ime ụmụ amaala 10 ọ bụla. Ọnọdụ dị ná mba ndị ha na ya gbara agbata obi ka njọ. Akwụkwọ akụkọ bụ́The Natal Witness kọrọ banyere atụmatụ Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ọnụ Ọgụgụ Mmadụ n’America mere, sị: “Ọnụ ọgụgụ mmadụ ná mba Africa ụfọdụ, bụ́ ebe ọrịa AIDS kpaworo aka, ga-amalite ịdalata n’oge na-adịghị anya ka ọrịa ahụ na-egbu ọtụtụ nde mmadụ, afọ ndụ ga-adalatakwa ruo ihe dị ka 30 ka ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ iri.”

Ọdachi ọrịa AIDS bụ ihe àmà ọzọ na-egosi na ihe a kpọrọ mmadụ na-ebi ‘n’oge dị oké egwu’ bụ́ nke Bible buru amụma na ọ ga-adị “na mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) Ndị hụrụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’anya na-atụ anya ihe ngwọta zuru ezu na-adịgide adịgide maka ọrịa AIDS na nsogbu ndị ọzọ nile na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eweghara nlekọta nke ihe na-eme n’ụwa. N’ụwa ọhụrụ ahụ nke ezi omume, ịda ogbenye na mmegbu ga-abụ ihe gara aga. (Abụ Ọma 72:12-14; 2 Pita 3:13) Kama nke ahụ, a ga-eme ka ndị bi n’ụwa nweghachi ahụ ike zuru okè, ọ dịghịkwa onye n’ime ha ga-asị mgbe ọ bụla: “Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

N’ụwa nile e nwere ihe dị ka ụmụaka 13,000,000 bụ́ ndị ọrịa AIDS mere ka ha bụrụ ụmụ mgbei

[Chaatị/Map dị na peeji nke 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ TOWORO ETO (SITE N’AFỌ 15 Ruo 49) NDỊ BU HIV/AIDS, NÁ NGWỤSỊ 1999

Ebe Ugwu America 890,000

Caribbean 350,000

Latin America 1,200,000

Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe 520,000

Ebe Ugwu Africa na Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa 210,000

Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ebe Etiti Europe 410,000

Ebe Ndịda na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia 5,400,000

Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia na Pacific 530,000

Australia na New Zealand 15,000

Mba Africa Ndị Dị na Ndịda Sahara 23,400,000

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe E Si Nweta Ya: UNAIDS

[Chaatị/Foto dị na peeji nke 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

PASENT NDỊ TOWORO ETO (SITE N’AFỌ 15 Ruo 49) NDỊ BU HIV/AIDS NÁ MBA AFRICA 16, NÁ NGWỤSỊ 1999

Botswana 35.8%

2 Swaziland 25.2

3 Zimbabwe 25.0

4 Lesotho 23.5

5 Zambia 20.0

6 South Africa 20.0

7 Namibia 19.5

8 Malawi 16.0

9 Kenya 14.0

10 C.A.R. 14.0

11 Mozambique 13.2

12 Djibouti 11.7

13 Burundi 11.3

14 Rwanda 11.2

15 Côte d’Ivoire 10.7

16 Etiopia 10.6

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe E Si Nweta Ya: UNAIDS

[Foto dị na peeji nke 13]

Thembeka na ụmụnne ya nwanyị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto: Brett Eloff