Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị a kpọtụrụ uche, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 16. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)

1. Gịnị ka a kpọrọ ụlọikpe dị elu nke ndị Juu? (Ọrụ 5:27, NW)

2. Dị ka Jọn onyeozi zoro aka na ya, ọ̀ bụ n’oge dị aṅaa ka Jisọs na-eweta ihe ụfọdụ metụtara nzube Chineke ná njedebe n’ụzọ gara nke ọma? (Mkpughe 1:10)

3. Ngwá agha atọ dị aṅaa ka Golaịat bu mgbe ọ bịara ịlụso Devid agha? (1 Samuel 17:45)

4. Ònye bụ nwunye Hosea? (Hosea 1:3)

5. Ole ndị chọpụtara na ndị Siria nọchibidoro Sameria agbalawo? (2 Ndị Eze 7:3-5)

6. Gịnị ka Eze Peasia bụ́ Ahasuerọs mere ka ala nile ọ na-achị zuru ike na ya n’oge o mere Esta ka ọ bụrụ nwunye ya? (Esta 2:18)

7. N’oge na-adịghị anya mgbe e kesịrị Adam, gịnị ka Jehova kwuru na ọ dịghịrị ya mma? (Jenesis 2:18)

8. Gịnị ka Jehova gwara Joshua ka o mee ịnyịnya ndị iro ụmụ Israel, si otú ahụ na-agba ụmụ Israel ume ịdabere n’ebe Jehova nọ maka nchebe? (Joshua 11:6)

9. Gịnị pụrụ ime ka ọnụma laghachi azụ? (Ilu 15:1)

10. N’ihi gịnị ka e ji dekwasị ihe n’elu ọtụtụ n’ime abụ ọma? (Abụ Ọma 3-9)

11. Okwu dị aṅaa ka Job kwuru ma eleghị anya iji gosi na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ bụla o ji lanarị? (Job 19:20)

12. N’ụlọ ònye ka Jisọs nọ mgbe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii boro ya ebubo na ya na ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri ihe? (Luk 5:29, 30)

13. Olee akụkụ ahụ anụmanụ e ji chụọ àjà nke Iwu Mosis machibidoro iwu ka a ghara iri eri? (Levitikọs 7:23-25)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Sanhedrin

2. ‘Ụbọchị Onyenwe anyị’

3. Mma agha, ube, na mkpụmkpụ ube

4. Gomea

5. Ndị ekpenta anọ

6. N’ịtụ ụtụ

7. ‘Ịnọ nanị ya’

8. Ibipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya nile ma suree ụgbọala nile n’ọkụ

9. Ọzịza okwu dị nro

10. Iji mee ka a mata onye dere ya, iji nye ntụziaka banyere egwú, na iji nye ihe ọmụma ga-eme ka a ghọta ya ma ọ bụ iji kwuo nzube nke abụ ọma ahụ

11. “Akpụkpọ ezé m”

12. N’ụlọ Livaị, ma ọ bụ Matiu

13. Abụba