Ọdịdị nke Agha Oge A
Ọdịdị nke Agha Oge A
EJIWO ọkụ ọkụ wuo otu ogige ndị gbara ọsọ ndụ iji lekọta mmadụ 1,548 gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị si n’otu mba Africa dị nso gbapụta na mberede. A masiri ụlọ ntu ndị na-acha anụnụ anụnụ na odo odo ike n’ala n’etiti ọhịa nkwụ a sụchara asụcha bụ́ nke nwere apịtị. Ọkụ eletrik ma ọ bụ ihe ndina adịghị, e nweghịkwa mmiri pọmpụ ma ọ bụ ụlọ mposi. Mmiri na-ezo. Ndị ahụ gbara ọsọ ndụ ji osisi gwuo obere okokoro iji gbochie idei mmiri ịsọbata n’ụlọ ntu ndị ahụ. Òtù abụọ nke mba nile na-arụ ọrụ enyemaka rụrụ ọrụ ọkụ ọkụ iji mee ka ọnọdụ ibi ndụ ka mma.
Tupu mgbe ahụ, ndị ahụ gbara ọsọ ndụ jiri ohere ahụ banye n’otu ụgbọ mmiri meworo ochie nke na-ebu ibu iji zere agha obodo ahụ bụ́ nke bibiworo mba ha ruo ọtụtụ afọ. E jighị ìgwè ụgbọ agha ma ọ bụ ụgbọelu ndị na-atụ bọmbụ n’ike n’ike lụọ agha ahụ. Ọ malitere mgbe ihe dị ka ndị soja 150 buuru égbè ndị bụ́ ọkpọka jiri mpako waba ná mba ahụ. N’afọ ndị sochirinụ, ndị soja ahụ wakporo obodo nta dị iche iche, na-ana ndị nkịtị ụtụ, na-enwetakwu ndị soja isonyere ha, na-egbukwa onye ọ bụla guzogidere ha. N’ikpeazụ, ha meriri mba ahụ dum.
Otu n’ime ndị gbara ọsọ ndụ nọ n’ogige ahụ bụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ Esther. “Ahụmahụ kasị njọ m nwetụworo ná ndụ m bụ ọnwụ di m nwụrụ n’agha a,” ka o kwuru. “Ha gbara ya égbè. Anyị tụrụ egwu nke ukwuu. Ị na-anụ ka mmadụ na-eti mkpu, ị na-echekwa na o nwere onye na-abịa igbu gị. Mgbe ọ bụla ị hụrụ onye bu égbè, ị ga-eche na ọ gaje igbu gị. Ọ dịghị mgbe ọ bụla obi ruru m ala. Ọ bụ nanị n’ebe a ka m na-arahụ ụra n’abalị. Mgbe m nọ n’ụlọ, apụghị m ịrahụ ụra. N’ebe a, m na-arahụ ụra dị ka nwa ọhụrụ.”
“Ị̀ na-ekwu na ị na-arahụli ụra n’ụlọ ntu ndị a mmiri jupụtara?” ka onye edemede Teta! jụrụ ya.
Esther chịrị ọchị. “Ọ bụrụgodị na m ghaghị idina n’apịtị a, m ga-arahụ ụra karịa ka m na-arahụ n’ebe m si bịa.”
Ambrose, bụ́ onye dị afọ iri, esorowo ezinụlọ ya jiri ihe kasị ukwuu ná ndụ ya na-esi n’ebe ndị a na-alụ agha agbapụ. “Ọ ga-amasị m ka e nwee udo ka m wee maliteghachi akwụkwọ,” ka o kwuru. “E kwuwerị, etowala m.”
Kpana, onye dị afọ itoolu, nwere mkpụrụ anya mara mma na-acha nchara nchara. Mgbe a jụrụ ya ihe ndị mbụ mere ná mmalite bụ́ ndị ọ na-echeta, ọ zara n’alaghị azụ, sị: “Agha! Ọgụ!”
A na-alukarị ụdị agha mere ka ndị a gbapụ n’afọ ndị a. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, e jiriwo nanị ngwá agha ndị na-agbapụ obere mgbọ lụọ agha 46 n’ime agha 49 bụ́ isi a lụworo eri 1990. N’adịghị ka mma agha ma ọ bụ ube, bụ́ nke chọrọ nkà na ume iji jiri ya lụọ agha n’ụzọ dị irè, ngwá agha ndị dị obere emewo ka ma ndị nwere ahụmahụ ma ndị na-enweghị ahụmahụ nwee ike ịlụ ọgụ n’agha. * A na-ewekarị ndị nọ n’afọ iri na ụma na ụmụaka n’agha ma manye ha ịkwakọrọ ihe, ịkwarụ, na igbu ndị mmadụ.
Ọ bụghị mba na mba na-alụrịta ọtụtụ n’ime agha ndị a, kama nke ahụ, ha na-abụ agha obodo. Ọ bụghị ndị soja a zụrụ azụ nọ n’ihu agha na-alụ ha, kama nke ahụ, ọtụtụ mgbe, ọ bụ ndị nkịtị nọ n’obodo ukwu na n’obodo nta dị iche iche na-alụ ha. N’ihi na ndị na-alụ ihe ka ukwuu n’agha dị iche iche bụ ndị a na-enyeghị ọzụzụ agha, a dịghị enwekebe nchegbu maka imebi ụkpụrụ ndị na-eduzikarị ịlụ agha. N’ihi ya, a na-ejikarị obi ịta mmiri awakpo ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka na-ejighị ngwá agha. E kweere na ihe karịrị pasent 90 nke ndị a na-egbu n’agha taa bụ ndị nkịtị. N’agha ndị dị otú ahụ, a na-eji ngwá agha ndị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ eme ihe n’ụzọ kasịnụ.
N’ezie, égbè adịghị akpata ọgụ kpọmkwem—ogologo oge gara aga tupu e mepụta nsí égbè, ụmụ mmadụ anọwo na-alụ ọgụ. Otú ọ dị, nkwakọba nke égbè pụrụ ịkpali ọgụ kama ịkpali ime mkpezi. Ngwá agha pụrụ ime ka agha nọtekwuo aka ma mekwuo ka e gbuo ọtụtụ mmadụ.
Ọ bụ ezie na ngwá agha ndị e ji alụ agha taa bụ ndị na-agbapụ obere mgbọ, ha akpatawo ihe ndị dị egwu. N’afọ ndị 1990, ngwá agha ndị dị otú ahụ gburu ihe karịrị nde mmadụ anọ. Ihe karịrị nde 40 ọzọ aghọwo ndị gbara ọsọ ndụ ma ọ bụ ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha. Ngwá agha ndị obere akpawo ọchịchị, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, akụ̀ na ụba, na gburugburu ebe obibi nke ebe ndị agha tisasịrị aka ọjọọ. O fuwo ndị mba ụwa ọtụtụ iri ijeri dollar iji rụọ ọrụ enyemaka, ilekọta ndị gbara ọsọ ndụ, ime udo na iji ndị agha akwụsị agha.
N’ihi gịnị ka ngwá agha ndị obere ji na-ekere òkè dị ukwuu otú ahụ n’agha ndị a na-alụ n’oge a? Olee ebe e si enweta ha? Gịnị ka a pụrụ ime iji belata ma ọ bụ kwụsị mbibi ha na-akpata? Anyị ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Okwu bụ́ “ngwá agha ndị obere” na-ezo aka n’égbè ogologo na égbè mkpụmkpụ—ngwá agha ndị otu onye pụrụ ibu; okwu bụ́ “ngwá agha ndị na-agbapụ obere mgbọ” na-agụnye égbè ndị na-awụpụ mgbọ, ogbunigwe, na ihe ndị na-atụ bọmbụ grenade, bụ́ ndị na-achọ ka mmadụ abụọ buru ha mgbe ụfọdụ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 15]
FOTO UN 186797/J. Isaac