Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Nchịkwa Ngwá Agha?

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Nchịkwa Ngwá Agha?

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Nchịkwa Ngwá Agha?

N’AFỌ ndị na-adịbeghị anya, gọọmenti ndị dị gburugburu ụwa ekwurịtawo ụzọ ndị a ga-esi kwụsị ịzụ ahịa ngwá agha ndị obere n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Nzukọ Ezumezu nke Mba Ndị Dị n’Otu atụlewo okwu ahụ. A kwadebewo okwu, tụọ aro ma mee mkpebi n’ihe dị iche iche. Otú ọ dị, ndị nkatọ na-ekwu na ilekwasị anya nanị n’ahịa nzuzo pụtara na ndị kasị azụ ahịa ngwá agha—gọọmenti n’onwe ha—bụ ndị e leghaara anya.

N’ezie, e nwechaghị ọdịiche dị n’etiti ịzụ ahịa ngwá agha iwu kwadoro na nke iwu na-akwadoghị. E nwere mgbe a na-ere ọtụtụ ngwá agha iwu na-akwadoghị n’ụzọ iwu kwadoro. A na-ezurukarị ngwá agha ndị e resịburu ndị agha ma ọ bụ ngalaba ndị uwe ojii ma ree ha na nzuzo. Ọzọkwa, ọ bụghị ihe ọhụrụ onye zụrụ ngwá agha iresị ya onye ọzọ n’emeghị ka onye mbụ rere ya mara ma ọ bụ n’anataghị ya ike. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ Arms Control Today na-ekwu, sị: “Tụkwasị ná nkwado nke ndị gọọmenti nke mba dịgasị iche karịsịa na-akwado igbochi ịzụ ahịa ngwá agha ndị na-agbapụ obere mgbọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị, ha aghaghịkwa ịtụle òkè ha onwe ha na-ekere n’ịzụ ahịa ngwá agha iwu kwadoro bụ́ ndị a na-azụ ugbu a.” Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nwere olileanya na mba dị iche iche ga-emesị gbochie ịzụ ahịa ngwá agha ndị obere, otu odeakụkọ kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ọ bụ nanị mba ise so ná ndị òtù a na-adịghị agbanwe agbanwe nke kansụl [nchebe nke Mba Ndị Dị n’Òtù] na-ahụ maka ihe karịrị 80% nke ịzụ ahịa ngwá agha a na-azụ n’ụwa, ikekwe anyị ekwesịghị inwesi olileanya ike.”

Ihe ọzọ na-eme ka nsogbu nke ịchịkwa ngwá agha ndị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ sikwuo ike bụ na ngwá agha ndị dị otú ahụ dịtụ mfe mmepụta. Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe dị ka mba ole na ole na-emepụta ngwá agha ndị bụ́ ọkpọka dị ka ụgbọ agha, ụgbọelu, na ụgbọ mmiri e ji alụ agha, ihe karịrị ụlọ ọrụ 300 n’ihe dị ka mba 50 na-emepụta ugbu a ngwá agha ndị na-agbapụ obere mgbọ. Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị na-emepụta égbè bụ́ nke na-arịwanyekwa elu abụghị nanị na ọ na-emekwu ka mba dị iche iche na-akwakọba ngwá agha kamakwa ọ na-eme ka e nwekwuo ohere nke ibunye ndị agha nkịtị, ndị òtù agha nnupụisi, na òtù ndị omempụ égbè.

Okwu Ndị A Na-arụsiri Ụka Ike

Ka ọ dị ugbu a, anyị elekwasịwo anya nke ukwuu n’ojiji e ji ngwá agha ndị obere alụ agha ná mba ndị agha tisasịrị. Otú ọ dị, a na-arụsi ụka ike banyere ịchịkwa égbè n’ala ndị nwetụrụ udo bụ́ ebe agha na-adịghị. Ndị na-akwado ka e nwee iwu ndị siri ike na-achịkwa égbè na-ekwu na inwekwu égbè na-eme ka a na-egbukwu ọchụ. Ha na-arụ ụka na na United States, bụ́ ebe a na-adịghị achịkwa ya nke ọma, égbè ehiekwa nne, a na-egbu ọtụtụ mmadụ, ma n’England, bụ́ ebe a na-achịkwa égbè nke ọma, a na-egbu mmadụ ole na ole. Ndị na-akwadoghị iwu ịchịkwa égbè adịghị egbu oge ịrụ ụka na na Switzerland, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-enweta égbè n’ụzọ dị mfe, ma a na-egbu mmadụ ole na ole.

Iji mee ka okwu sikwuo ike, nchọpụta ndị e mere na-egosi na na United States, ọnụ ọgụgụ ndị a na-ejighégbè gbuo dị elu karịa ngkta nke ọnụ ọgụgụ ndị e gburu n’ọtụtụ mba dị na Europe. Ma, e nwere mba ndị ọzọ bụ́ ebe ọnụ ọgụgụ ndị a na-ejighégbè gbuo karịrị ngkta nke ọnụ ọgụgụ ndị e gburu na United States.

Ọ bụghị ihe ọhụrụ iji ndekọ ọnụ ọgụgụ mee ihe n’ụzọ ziri ezi—na n’ụzọ na-ezighị ezi—iji kwado otu echiche kpọmkwem. N’okwu banyere ịchịkwa égbè, o yikwara ka arụmụka nke ọ bụla ò nwere ihe mgbagha nke yiri ka ezi uche ọ̀ dị na ya. Okwu ahụ tara akpụ. Otú ọ dị, ndị ọkachamara n’ozuzu ha na-ekweta na ọtụtụ ihe, ma e wezụga inwe égbè, na-emetụta ọnụ ọgụgụ igbu ọchụ na ime mpụ.

Òtù Na-ahụ Maka Égbè nke dị na United States, bụ́ òtù siri ike, na-ekwukarị, sị: “Égbè adịghị egbu mmadụ; ọ bụ ndị mmadụ na-egbu mmadụ.” Dị ka echiche a si gosi, ọ bụ ezie na e mere égbè igbu mmadụ, ọ dịghị eji aka ya egbu mmadụ. Ọ bụ mmadụ na-agbapụrịrị égbè, ma ọ ma ụma ma ọ bụ na ọ maghị ụma. N’ezie, ndị ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na égbè na-eme ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe igbu mmadụ.

Ịkpụgharị Mma Agha Ka Ha Bụrụ Mma Ogè

Dị ka Bible si kwuo, a gaghị agwọta nsogbu nke ndị mmadụ igbu ibe ha site nanị n’ịnapụ ndị nwere ọchịchọ nke igbu ọchụ égbè. Mpụ bụ nsogbu mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọ bụghị nanị nsogbu nke inwe ngwá agha. Ezi ngwọta ya na-agụnye ịgbanwe àgwà na ọchịchọ nke ndị mmadụ n’onwe ha. E nyere Aịsaịa onye amụma ike mmụọ nsọ ide, sị: “[Chineke] ga-ekpekwa ikpe n’etiti mba nile, dozikwaara ọtụtụ ndị dị iche iche okwu ha: ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:4.

Nke a eyighị ihe na-agaghị ekwe omume dị ka ndị ụfọdụ pụrụ iche. Amụma Aịsaịa na-emezu taa n’etiti ezi ndị Kraịst n’ụwa nile. Mkpụgharị ha na-akpụgharị ngwá agha n’ụzọ ihe atụ ka ha bụrụ ihe e ji eme udo na-egosipụta ọchịchọ miri nnọọ emi ha nwere ime ihe Chineke na-achọ na isoro ndị ọzọ bikọọ n’udo. Ka oge na-aga, n’Alaeze Chineke, onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-ebi ndụ n’udo zuru ezu na ná nchebe. (Maịka 4:3, 4) Égbè agaghị egbu ndị mmadụ. Ndị mmadụ agaghị egbu ibe ha. Ihe ndị e ji egbu mmadụ agakwaghị aba uru.

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

‘Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè’