Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Obodo Ukwu?

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Obodo Ukwu?

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Obodo Ukwu?

“ILE obodo ukwu anyị dị iche iche anya bụ ileba anya n’ọdịnihu anyị.” Nke ahụ bụ ihe Ismail Serageldin nke Ụlọ Akụ̀ Ụwa kwuru. Ma site n’ihe anyị hụworo ruo ugbu a, ọdịnihu ahụ bụ nke olileanya na-adịghị na ya.

N’ụzọ kwesịrị ịja mma, a na-emesi mgbalị ike imeziwanye ndụ a na-ebi n’ọtụtụ obodo ukwu. Na nso nso a, New York City rụzigharịchara Ámá Times dị na Manhattan. Ọ bụbu ebe e ji ọtụtụ ụlọ ọrụ na-emepụta ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na mpụ mara. Obere ụlọ ahịa ndị ọhụrụ na ebe ndị a na-eme ihe nkiri jupụtara n’okporo ámá ya dị iche iche ugbu a, na-adọta ọtụtụ puku ndị nleta. Dị ka magazin bụ́ National Geographic si kwuo, e bibiri Naples, Italy, nke bụ́ “ọmarịcha obodo ukwu nke mepere nnọọ emepe, nke ya na London na Paris nọbu n’otu ọkwá,” n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Naples fọrọ nke nta ka ọ ghọọ ebe e ji ama atụ mpụ na ọgba aghara. Otú ọ dị, mgbe a họọrọ obodo ukwu ahụ dị ka ebe a ga-anọ enwe otu nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na 1994, ọ gbanwere n’ihi nrụzigharị gbara ọkpụrụkpụ a rụzigharịrị obodo ukwu ahụ.

N’ezie, inwe obodo ukwu ndị dị nchebe ma dị ọcha karị na-efu ihe. Inwekwu nchebe na-apụtakarị inwekwu ndị uwe ojii. Ihe ọzọ ọ pụrụ ifu bụ mmadụ ịnọrọ onwe ya. Ndị nta akụkọ ụlọ ọrụ telivishọn na ndị ọrụ uwe ojii na-eyighị yunifọm na-anọ mgbe nile n’ebe ọha na eze na-anọ. Ka ị na-agafe n’ogige ntụrụndụ ma na-agafe ebe ndị mmiri na-agbali elu, ihe ndị a kpụrụ akpụ, ma ọ bụ ebe ndị a kụrụ okooko osisi, ị pụrụ ịdị na-agafe ebe e nwere ihe e ji eche nche n’amaghị ama.

Mgbe ụfọdụ a na-emeziwanyekwa ihe n’ụzọ na-efu ndị ogbenye oké ihe. Tụlee usoro nke ime ka ezinụlọ ndị nwere ego karị bichie n’ógbè ndị ogbenye bibu. Ihe na-akpata usoro a bụ ọnọdụ akụ̀ na ụba na-agbanwe agbanwe—“mgbanwe site n’imepụta ihe gaa n’ije ozi, site n’ịdabere na nkà ndị mmadụ gaa n’iji ígwè arụ ọrụ.” (Gentrification of the City, nke Neil Smith na Peter Williams chịkọtara) Ka ọrụ aka na-apụ n’anya, ka a na-achọwanyekwa ndị ọrụ bụ́ ọkachamara na ndị nwere nkà pụrụ iche, ọchịchọ a na-achọwanye ụlọ obibi nke ndị batụrụ ọgaranya na-arịkwa elu. Kama ịdị na-aga aga n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, ọtụtụ ndị ọkachamara a na-akwụ ụgwọ buru ibu na-ahọrọ ịrụzigharị ụlọ ndị dị n’ebe ndị datụrụ ogbenye bibu.

Dị ka ọ na-adịkarị, nke a na-arụpụta ọganihu dị ukwuu n’ógbè ahụ. Ma ka ógbè ndị ahụ na-aka mma, ọnụ ahịa ihe na-arị elu. Ndị ogbenye na-achọpụta mgbe mgbe na ha apụghịzi ibi n’ógbè ndị a ha biworo ma nọrọ rụọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ!

Ọ̀ Bụ Njedebe nke Obodo Ukwu?

Obodo ukwu pụrụ nnọọ ịmalitewo inwe mmetụta nke mgbanwe ndị nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ na-akpata. Ka ndị mmadụ na-enwekwu mmasị n’Internet dị ka ụzọ isi zụọ ahịa ma na-achụ nta ego, nke a pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị ịrịba ama. Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ emeelarị ka ọ dịrị ụfọdụ ụlọ ọrụ achụmnta ego mfe karị ịkwapụ n’obodo ukwu—na-adọrọ ọtụtụ ndị ọrụ.

Ka iji kọmputa azụ ahịa na iji ya arụ ọrụ na-aghọ ụzọ bụ́ isi e si eme ihe, ndị mmadụ pụrụ inwe mmasị dị ala ịga n’ógbè achụmnta ego ndị mmadụ jupụtara. Akwụkwọ bụ́ Cities in Civilization na-atụ aro, sị: “Anyị pụrụ ịtụ anya ịhụ ụfọdụ ndị ọrụ a na-enwekebe, karịsịa ndị ọrụ nwa oge, ka ha na-arụ ọrụ ha nile site n’ụlọ ha ma ọ bụ na kọmputa ndị dị n’ógbè ha, . . . si otú a na-ebelata ọnụ ọgụgụ ụgbọala na-aga n’okporo ụzọ.” N’otu aka ahụ, onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ bụ́ Moshe Safdie na-eche, sị: “N’ọnọdụ ọhụrụ a, anyị pụrụ inwe mgbasa nke ọtụtụ nde obodo nta n’ụwa nile, na-eme ka ndị bi n’otu ógbè nwee ntụsara ahụ nke ụdị ndụ a na-ebi n’ime obodo ma sitekwa na kọmputa na-anụ ụtọ nke ọdịnala e ji mara obodo ukwu ndị a ma ama.”

Ọdịnihu Dị Aṅaa Na-echere Obodo Ukwu?

Ọtụtụ ndị na-ahụ ihe na-emenụ kweere na n’agbanyeghị nkà na ụzụ, obodo ukwu nwere ozi na abamuru ndị ga-anọgide na-adọta ndị mmadụ. N’agbanyeghị ihe ọdịnihu pụrụ iweta, obodo ukwu nke oge a nọ ná nsogbu ugbu a! Ọ dịghịkwa ihe ngwọta dị ngwa a pụrụ inweta maka oké nsogbu nile nke ụlọ obibi na idebe ihe ọcha nye ọtụtụ nde ndị ogbenye na-amụba amụba bụ́ ndị bi n’obodo ukwu. Ọ dịghịkwa onye ọ bụla chọtaworo ma ọlị ụzọ isi kwụsị mpụ, mmetọ gburugburu ebe obibi, ma ọ bụ mmetọ a na-emetọ obodo ukwu.

Ụfọdụ ndị ga-arụ ụka na ndị gọọmenti kwesịrị nnọọ itinyekwu ego n’obodo ukwu ha. Ma a tụlee otú ọtụtụ gọọmenti siworo jiri ihe onwunwe ha na-eme ihe, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na ịgwọta nsogbu nke obodo ukwu bụ nanị okwu banyere iwepụta ego? Ọtụtụ iri afọ gara aga, akwụkwọ bụ́ The Death and Life of Great American Cities kwuru, sị: “E nwere echiche hiere ụzọ bụ́ na a sị nnọọ na anyị nwere ego zuru ezu imefu . . . , anyị pụrụ ikpochapụ ógbè nile jupụtara ná nkịrịka ụlọ . . . Ma leenụ ihe anyị jiworo nnukwu ego ndị mbụ anyị nwere wuo: Ihe owuwu ndị na-enye obere ego bụ́ ndị na-aghọ ógbè nnupụisi, mmebisị ihe, nakwa ógbè olileanya zuru ọha ọnụ kọrọ bụ́ ndị dị njọ karịa ógbè jupụtara ná nkịrịka ụlọ ndị ha kwesịrị idochi.” Okwu ndị a ka yiri ka ha bụ eziokwu.

Ma ọ bụrụ na ọ bụghị ego bụ ihe ngwọta ya, gịnị bụ ihe ngwọta ya? Anyị aghaghị icheta na ọ bụ mmadụ mejupụtara obodo ukwu, ọ bụghị nanị ụlọ na okporo ámá. Ya mere, mee elu mee ala, ọ bụ ndị mmadụ bụ ndị na-aghaghị ịgbanwe ma ọ bụrụ na ndụ a na-ebi n’obodo ukwu ga-aka mma. “Atụmatụ nchekwa akụ̀ na ụba kasị mma nke obodo ukwu bụ ilekọta na ịzụ ndị mmadụ,” ka Lewis Mumford na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ The City in History. Ọ bụrụkwa na a ga-ewepụ iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ịgba akwụna, mmetọ, nretọ gburugburu ebe obibi, ahaghị nhata nke ọha mmadụ, imebisị ihe, idekasị ihe n’ebe ọ bụla, na ihe ndị yiri ha, a chọrọ ihe karịrị inwekwu ndị uwe ojii ma ọ bụ itegharị ágbá. A ghaghị inyere ndị mmadụ aka ime mgbanwe pụtara ìhè n’echiche ha nakwa n’àgwà ha.

Mgbanwe nke Onye Nlekọta

O doro anya na iweta oké mgbanwe dị otú ahụ karịrị ike ụmụ mmadụ. Ya mere mgbalị ndị a na-eme iji gwọta nsogbu nile nke obodo ukwu nke oge a—n’agbanyeghị otú ha siteruru n’ezi obi—ga-akụ afọ n’ala n’ikpeazụ. Otú ọ dị, ndị na-amụ Bible enweghị obi nkoropụ n’ihi na ha na-ewere nsogbu nke obodo ukwu ndị nke oge a dị ka nanị otu ihe atụ ọzọ nke mmadụ enweghị ike ilekọta ụwa anyị nke ọma. Obodo ukwu nke taa ndị na-amụba n’ike n’ike, ndị jupụtara n’ọgba aghara na-emesi ike ihe ahụ e kwuru na Bible, na Jeremaịa 10:23: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Mgbalị mmadụ na-eme ịchị onwe ya arụpụtawo nhụsianya dị ukwuu—nsogbu ndị na-apụtakwu nnọọ ìhè n’obodo ukwu anyị.

N’ihi ya ndị bi n’obodo ukwu n’ụwa nile pụrụ inweta nkasi obi ná nkwa Bible ahụ e dekọrọ ná Mkpughe 11:18, na Chineke ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’ Kama ịbụ ihe na-adịghị mma, nke a na-ezo aka n’ọdịnihu dị mma maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ na-ekwe nkwa na Chineke ga-eweghara nlekọta nke ụwa anyị site n’otu ọchịchị, ma ọ bụ Alaeze. (Daniel 2:44) Ọtụtụ nde mmadụ agaghịzikwa ada ụdị ogbenye a na-apụghị ichetụ n’echiche, bụrụ ndị a napụrụ ụlọ kwesịrị ekwesị na ọnọdụ ịdị ọcha dị mkpa, bụrụ ndị a napụrụ ùgwù ha ma ọ bụ ndị na-enweghị olileanya. N’oge ọchịchị Chineke ga na-achị, ndị mmadụ ga-enwe ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe, ezi ahụ ike, na ụlọ mara mma.—Aịsaịa 33:24; 65:21-23.

Ụwa ọhụrụ a bụ nanị ihe ngwọta ezi uche dị na ya nye nsogbu nke obodo ukwu nke oge a.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

A na-eme mgbalị siri ike iji meziwanye ndụ a na-ebi n’ọtụtụ obodo ukwu

Naples, Italy

[Ebe E Si Nweta Foto]

SuperStock

New York City, U.S.A.

Sydney, Australia

[Foto dị na peeji nke 10]

Ụwa ọhụrụ Chineke na-enye ihe ngwọta maka nsogbu nke ndị bi n’obodo ukwu n’oge a