Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọtụtụ Nde Mmadụ Ga-aga—Ị̀ Ga-aga?

Ọtụtụ Nde Mmadụ Ga-aga—Ị̀ Ga-aga?

Ọtụtụ Nde Mmadụ Ga-aga—Ị̀ Ga-aga?

Ịga ebee? Ịga ememe mgbaafọ nke ọnwụ Jisọs Kraịst. N’afọ 2000, ngụkọta zuru ụwa ọnụ nke mmadụ 14,872,086 gara ya.

N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji aga? N’ihi ihe ọnwụ Kraịst pụtaara ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ pụtara mwepụ a ga-ewepụ ọrịa, ahụhụ, na ọnwụ, n’oge na-adịghị anya. A ga-akpọlite ọbụna ndị a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ gaa ná ndụ n’ụwa paradaịs.

Olee otú ọnwụ Jisọs pụrụ isi weta ngọzi ndị dị otú ahụ? A na-akpọ gị òkù ịchọpụta. Ndịàmà Jehova chọrọ ka i sonyere ha n’ihe omume a dị mkpa.

Gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị dịrị ebe obibi gị nso. N’afọ a, ụbọchị a ga-eme ya bụ April 8, mgbe anyanwụ dasịrị. Jụọ Ndịàmà nọ n’ógbè gị maka oge a ga-eme ya kpọmkwem.