Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Pụrụ Izuru Ihe E Ji Amata Gị!

Ha Pụrụ Izuru Ihe E Ji Amata Gị!

Ha Pụrụ Izuru Ihe E Ji Amata Gị!

NWA agbọghọ ahụ malitere inweta ozi na-adịghị mma n’ígwè na-azara ya telifon site n’aka ndị ikom dị iche iche. Otu nwoke wee kpọọ ya na fon ma kwuo na ya na-azaghachi ozi ndị ahụ rụrụ arụ o zipụworo n’Internet. Ma o nweghịdị kọmputa. O were ya oge ụfọdụ iji chọpụta na mmadụ ewerela aha ya n’ebe a na-edebe ozi n’Internet ma na-akpọsa ozi ndị ahụ n’Internet. Ọ bụghị nanị nke ahụ, onye aghụghọ ahụ a na-amaghị onye ọ bụ na-enyekwa ndị ọzọ adres nwa agbọghọ ahụ, ntụziaka banyere ịgaru ụlọ ya, na ọbụna ndụmọdụ banyere ụzọ isi zere ígwè mgbaàmà dị n’ụlọ ya!

Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-eji ihe e ji amata anyị egwuri egwu. Anyị maara ndị anyị bụ, ọ bụrụkwa na a maa anyị aka, anyị pụrụ igosi ndị anyị bụ. Ma ihe anyị na-ejikarị eme ihe dị ka ihe àmà nke ndị anyị bụ—satifiketi ọmụmụ, nọmba e ji amata mmadụ, * akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala, akwụkwọ ikike ngafe, kaadị e ji amata mmadụ, na ihe yiri ha—na-adịzi nnọọ mfe ime ndị adịgboroja ha ma ọ bụ izuru ha nke na okwu ọhụrụ e ji akọwa mpụ a apụtawo, “izu ohi ihe e ji amata mmadụ.”

Ntiwapụ nke Igwu Wayo

Ụdị mpụ a na-agbagwoju anya, bụrụ nke zoro ezo, nweekwa ike imebi ihe. Ndị e mere ya na-achọpụta na mberede na ọ dị onye na-eji aha ha ebutegasị ụgwọ, na-aghọgbu ndị e ji ụgwọ, na-akpatakwa mbibi ndị ọzọ. Ná mba ụfọdụ, iwu na-echebe ndị e mere mpụ a pụọ n’ịkwụ ụgwọ ndị a, ma ha pụrụ imesị nwee aha ọjọọ, bụrụkwa ndị e weere dị ka ndị oji ụgwọ.

Ọtụtụ n’ime ndị na-ahụ maka idebe iwu, ndị na-eme nchọpụta banyere ụgwọ mmadụ ji, na òtù ndị na-ahụ maka ọdịmma nke ndị na-azụ ihe na-ekweta na izu ohi ihe e ji amata mmadụ na-akpata ịla ọtụtụ ijeri dollar n’iyi kwa afọ. Ọ dịghị ụzọ ọ bụla a ga-esi mata kpọmkwem mmadụ ole e gwuru wayo site n’izu ohi ihe e ji amata ha. Otu n’ime nsogbu ndị kasịnụ bụ na ọtụtụ ọnwa pụrụ ịgafe tupu mmadụ achọpụta na e zurula ihe e ji amata ya. Ụfọdụ ndị na-ahụ maka idebe iwu na-akpọ izu ohi ihe e ji amata mmadụ mpụ kasị na-amụba amụba na United States. A na-akọ banyere nsogbu ndị yiri ya ná mba ndị ọzọ.

Iji mee ka ihe dịwanye njọ, ndị ohi maara na o siri ike ime nchọpụta banyere wayo nke ihe e ji amata mmadụ, a dịghịkwa agbakebe akwụkwọ maka ya. “Nye ndị omekome, ọ bụ mpụ na-adịghị emetụta mmadụ,” ka Cheryl Smith bụ́ onye nchọpụta pụrụ iche na-ekwu. “Ndị a na-eme ya bụ ụlọ akụ̀ ma ọ bụ nnukwu ụlọ ahịa. Ha adịghị eche banyere imejọ mmadụ.”

Ime Aha Onwe Gị Anụ Oriri

Ndị na-ezuru ihe e ji amata mmadụ na-ezurukarị otu ma ọ bụ karị n’ihe ọmụma ndị bụ́ isi banyere gị, dị ka nọmba e ji amata gị ma ọ bụ akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala. Ha na-ejizi ya eme ka hà bụ gị, mepeekwa ihe ndekọ ụgwọ n’aha gị. N’otu mgbe ahụ, ha na-eme ka a na-ezitere ha akwụkwọ metụtara ihe ndekọ ụgwọ ahụ n’ebe ha si anata akwụkwọ ozi. Ha na-emefu ego ruo ókè ha nwere ike nakwa ngwa ngwa dị ka ha nwere ike. Ị gaghị ama ihe na-eme ruo mgbe ndị ọrụ na-agba ụgwọ malitere ịkpọtụrụ gị.

Olee otú ndị a na-enweghị ụkpụrụ na-esi ezuru ihe ọmụma onwe onye dị otú a? Ọ dị nnọọ mfe. Ọ na-amalitekarị site n’inweta ihe ọmụma onwe onye nke ọtụtụ mmadụ na-ejikarị eme ihe mgbe ha na-etinye akwụkwọ maka ịzụrụ ihe n’aka ma ọ bụ nke ha na-enye ndị na-eji telifon ere ngwá ahịa. Ụfọdụ ndị wayo na-ahọrọ ịbọghasị ebe ị na-ekpofu ihe, na-achọ ihe ndekọ ụlọ akụ̀ gị, nke ego mgbazinye, ma ọ bụ nke i ji zụọ ihe n’aka. Ndị ọzọ na-esi n’igbe akwụkwọ ozi ezuru akwụkwọ ozi ndị metụtara ego. ‘Ndị na-enyoro ihe ọmụma banyere mmadụ’ bụ ndị ohi na-eji ígwè foto ma ọ bụ ígwè inyopụta ihe ekiri ka ndị ha ga-ezu ohi na-apị nọmba ígwè e ji akwụnye ego n’ụlọ akụ̀ (ATM) ma ọ bụ na fon ọha na eze. Ná mba ụfọdụ, a na-enweta ihe ọmụma dị ukwuu banyere mmadụ n’ụzọ dị mfe n’ụlọikpe, n’akwụkwọ ọha na eze, ma ọ bụ n’Internet.

Imebi Aha Ọma Gị

Ozugbo onye wayo ahụ nwetara nọmba e ji amata gị, ọ pụkwara ịchọ inweta ihe ọmụma ndị ọzọ e ji amata gị, dị ka ụbọchị a mụrụ gị na adres gị na nọmba fon gị. Onye ohi ahụ pụrụ iji ihe ọmụma a, nakwa ma eleghị anya akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala adịgboroja nke bu foto ya, malite mpụ ahụ. Onye ohi ga-etinye akwụkwọ maka ịzụrụ ihe n’aka ozugbo n’onwe ya ma ọ bụ site n’akwụkwọ ozi, na-eme ka ọ̀ bụ gị. Ọ na-enyekarị adres nke ya, na-ekwu na ya akwapụwo. Ka ha na-eme ngwa ngwa iji nye ndị a ga-eresị ihe n’aka nkwado, ndị na-enyocha ụgwọ adịghị eleru ihe ọmụma ma ọ bụ adres anya mgbe nile.

Ya mere ozugbo onye wayo ahụ mepere ihe ndekọ ego nke mbụ ahụ, ọ pụrụ iji ihe ndekọ ego ọhụrụ a na ihe ọmụma ndị ọzọ ahụ e ji amata mmadụ na-eme ihe iji gosi na ya kwesịrị ntụkwasị obi. Nke a na-akwalitekwu mgbasa nke wayo ahụ. Ugbu a onye wayo ahụ agawala nnọọ ịba ọgaranya ma, ka ọ na-eme nke ahụ, ọ na-ebibi ikwesị ntụkwasị obi gị na aha ọma gị.

Idozi ihe o bibiri pụrụ isi ike, iwe oge, ma na-ekoropụ obi. Mari Frank, bụ́ ọkàiwu si California, chọpụtara otú nke a pụrụ isiru n’ike mgbe onye wayo ji aha ya nakọta ụgwọ ruru $100,000. “Ọ bịara dị mkpa na m dere akwụkwọ ozi 90 ma tinye awa 500 n’ime ihe iji wepụ aha m n’ụta,” ka ọ na-ekwu. “Ọ bụ ọgụ maka ikwesị ntụkwasị obi gị na uche zuru okè gị. . . . Ọtụtụ mgbe, ị naghị ama onye na-eme ya, a dịghịkwa ejide ndị na-eme mpụ ahụ.”

Ihe Ị Ga-eme

Ọ bụrụ na e zuuru ihe e ji amata gị, e nwere ọtụtụ ihe ị pụrụ ime. Nke mbụ, a na-atụ aro ka ị kpọtụrụ ma gwa ngalaba na-ahụ maka igwu wayo n’ụlọ ọrụ na-elekọta ịzụrụ ihe n’aka n’ógbè unu. Jirizie nkwupụta e dere ede sochie ya, ma rịọ ka a kpọtụrụ gị iji nwapụta arịrịọ ndị e ji aha gị rịọ maka ịzụrụ ihe n’aka n’ọdịnihu.

Nke ọzọ, dee ihe merenụ n’akwụkwọ nye ndị uwe ojii. Jide n’aka na i nwetara ihe odide si n’aka ndị uwe ojii n’ihi na ọ pụrụ ịdị gị mkpa iji ya eme ka ndị e ji ụgwọ mara.

Ị ghaghịkwa ịgwa ndị ụlọ akụ̀ nakwa ụlọ ọrụ na-enye kaadị e ji azụrụ ihe n’aka bụ́ ndị gị na ha na-emekọ ihe. Ọ bụrụgodị na onye ohi ahụ ewere ihe ọmụma ndị o zutere mee kaadị ndị ọhụrụ e ji azụrụ ihe n’aka, ị ga-akasị nwee nchebe ma ị megharịa kaadị nile i ji azụrụ ihe n’aka. Ọzọkwa, ọ bụrụ na o metụtara ihe ndekọ ego gị, ọ pụrụ ịdị gị mkpa imepe ndị ọhụrụ. Ọzọkwa, ọ pụrụ ịdị gị mkpa inweta kaadị ATM ndị ọhụrụ nakwa nọmba ọhụrụ e ji amata mmadụ.

È Nwere Ihe Ngwọta Ọ Bụla Dị Nso?

Ndị gọọmenti, ndị na-ahụ maka idebe iwu, na ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka ịzụrụ ihe n’aka na-achọgharị ụzọ isi gbochie izu ohi ihe e ji amata mmadụ. N’ebe ụfọdụ, e meela iwu ndị na-ekwu na ime mpụ a bụ arụ, meekwa iwu ndị na-echebe ihe ọmụma banyere mmadụ nke ọma karị. E meela atụmatụ maka ihe mgbochi ndị ọzọ bụ́ ọkpọka. Ndị a na-agụnye akara mkpịsị aka ndị a bịanyere na kaadị, kaadị ATM bụ́ ndị na-eme ka a mata akara ọbụ aka mmadụ ma ọ bụ ọdịdị ụda olu ya, kaadị kọmputa nke pụrụ idebe ụdị ihe ọmụma e ji amata mmadụ dị ka ụdị ọbara ya na akara mkpịsị aka ya, nakwa kaadị ndị nwere ebe a na-abịanye aka na ha nke a na-apụghị ihicha ehicha.

E wezụga ụzọ mgbochi ndị dị otú ahụ bụ́ ọkpọka, e nwere ihe ndị dị irè ị pụrụ ime iji chebe onwe gị. (Lee igbe bụ́ “Ụzọ Isi Chebe Onwe Gị Pụọ n’Ịbụ Onye E Zuuru Ihe E Ji Amata Ya.”) Site n’ichepụ echiche n’ihu na iji nlezianya na-eme atụmatụ, ị pụrụ inye aka belata ihe ize ndụ nke ịbụ onye e zuuru ihe e ji amata ya!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 N’ọtụtụ mba, a na-enye ụmụ amaala na ndị bi ebi ụdị ụfọdụ nke nọmba e ji amata mmadụ. A pụrụ iji nke a mee ihe ọ bụghị nanị maka ịmata mmadụ kamakwa maka ịtụ ụtụ isi nakwa nlekọta ahụ ike. Na United States, ụmụ amaala na-anata ihe a na-akpọ nọmba Nchebe Ọha na Eze. Ihe a na-akpọ ụdị nọmba ndị a na-adịgasị iche site n’otu mba gaa n’ọzọ.

[Igbe dị na peeji nke 28]

Ụzọ Isi Chebe Onwe Gị Pụọ n’Ịbụ Onye E Zuuru Ihe E Ji Amata Ya

● Enyela onye ọzọ nọmba e ji amata gị ọ gwụla ma ọ dị oké mkpa.

● Etinyela kaadị e ji azụrụ ihe n’aka karịa ole dị mkpa na pọọsụ i ji apụ apụ ma ọ bụ tinye kaadị e ji amata gị, satifiketi ọmụmụ gị, ma ọ bụ akwụkwọ ikike ngafe, e wezụga mgbe ha dị mkpa.

● Dọkaa akwụkwọ ndị i tinyere maka kaadị e ji azụrụ ihe n’aka bụ́ ndị a nabataworo, tupu ị tụfuo ha. Otú ahụ ka ị ga-emekwa akwụkwọ ndekọ ọnọdụ ego gị dị n’ụlọ akụ̀, akwụkwọ ụgwọ fon, risit kaadị e ji azụrụ ihe n’aka, na ihe ndị ọzọ.

● Jiri aka gị mere ihe mkpuchi mgbe ị na-eji ígwè ngụkọ ego eme ihe ma ọ bụ mgbe i ji kaadị fon gị na-akpọ ebe dị anya na fon. ‘Ndị na-enyoro ihe ọmụma banyere mmadụ’ pụrụ iji ígwè e ji enyopụta ihe ma ọ bụ ígwè foto nọrọ nso.

● Nweta igbe akwụkwọ ozi a na-akpọchi akpọchi iji belata izuru akwụkwọ ozi.

● Jiri aka gị na-ewere akwụkwọ ndọrọ ego ndị ọhụrụ n’ụlọ akụ̀ kama ikwu ka e si na post ọfịs na-ezitere gị ha.

● Dekọọ nọmba nile dị na kaadị i ji azụrụ ihe n’aka ma ọ bụ jiri ígwè photocopier mepụtaghachi kaadị ndị ahụ, debekwa ha n’ebe dị nchebe.

● Enyela ụlọ ọrụ ọ bụla nọmba kaadị i ji azụrụ ihe n’aka ma ọ bụ ihe ọmụma onwe onye ndị ọzọ site na fon, ọ gwụla ma gị na ha ùnu nwere mmekọrịta azụmahịa a tụkwasịrị obi, nakwa ma ọ bụrụ gị kpọrọ ha òkù fon ahụ.

● Buru mkpụrụ okwu ndị ị na-eji abanye na kọmputa n’isi. Etinyela ihe e dere mkpụrụ okwu ndị ị na-eji abanye na kọmputa n’ime pọọsụ gị.

● Na-enweta mgbe nile akwụkwọ na-egosi ihe ndị ị zụrụ n’aka ma ọ bụrụ na o kwere mee.

● Mee ka e wepụ aha gị site ná ndepụta ụlọ ọrụ na-edekọta ihe ndị a zụrụ n’aka nakwa nke ndị na-agbatịkwu oge a ga-akwụ ụgwọ ihe ndị a zụrụ n’aka.

[Foto dị na peeji nke 27]

‘Ndị na-enyoro ihe ọmụma banyere mmadụ’ na-ekiri ka ndị ha ga-egwu wayo na-apị nọmba na fon ọha na eze ma ọ bụ n’ígwè e ji akwụnye ego n’ụlọ akụ̀

[Foto dị na peeji nke 28]

‘Ndị na-abọghasị ebe ikpofu ihe’ na-abọghasị ihe e kpofuru ekpofu iji zuru ihe ọmụma banyere mmadụ