Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Ọ́bá Akwụkwọ Ọhụrụ nke Alexandria Enweghị Akwụkwọ
Ọ́bá akwụkwọ ahụ pụrụ iche nke Alexandria, “bụ́ nke a ma ama n’ihi inwe ụdị ihe ọmụmụ nile nke mmadụ n’oge Kraịst, . . . bụ nke ọkụ gbara na 47 B.C., n’ikpeazụkwa, ọ pụrụ n’anya na narị afọ nke 7 A.D.,” ka akwụkwọ bụ́ The Wall Street Journal na-ekwu. Site n’enyemaka nke mba Arab ndị ọzọ nakwa nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu, Ijipt ewuwo ọ́bá akwụkwọ ọhụrụ n’Alexandria bụ́ nke ọ na-atụ anya na ọ ga-akarị nke ochie ahụ. “Okpukpu ụlọ elu anọ ya ndị mbụ dị n’okpuru ala. N’ịbụ nke ọdọ mmiri a na-ahụ onyinyo ya n’ime ya gbara gburugburu, ọ́bá akwụkwọ ahụ nwere ígwè mbugo 17, windo ndị na-ehicha onwe ha nakwa usoro nchebe bụ́ ọkpọka nke na ọ pụrụ ịgbanyụ ọkụ n’atụsaghị ọbụna otu ntapụ mmiri n’elu ihe odide dị ụkọ.” Otú ọ dị, Journal ahụ gara n’ihu ikwu na “ọ dị otu ihe dị oké mkpa ọ́bá akwụkwọ ahụ na-enweghị. Akwụkwọ.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwasịrị na mgbe e mefusịrị ọtụtụ nde dollar n’ime ọtụtụ afọ nke owuwu ya, “ego ọ́bá akwụkwọ ọhụrụ a mawapụtara maka ịzụta akwụkwọ n’ezie dị nnọọ ntakịrị nke na onyeisi ọ́bá akwụkwọ ahụ, . . . bụ́ Mohsen Zahran, aghaghị iji obi umeala na-arịọ arịrịọ maka akwụkwọ ndị nanị ihe dị mma na ha bụ na ha bụ n’efu.” Anyị adịghị achọ onyeisi nlekọta ọ́bá akwụkwọ n’ihi na “anyị agaghị akwụli onye ahụ ụgwọ ọnwa,” ka Maazị Zahran na-ekwu. Ọ́bá akwụkwọ ọhụrụ a nwere ohere maka mpịakọta akwụkwọ dị nde asatọ.
Ahụ Mgbu Na-abụghị Ezigbo Ahụ Mgbu
“Ndị nwere otu aka ma ọ bụ otu ụkwụ na-enwekarị ahụ mgbu na-adịghị ala ala nke yiri ka ọ̀ na-esite n’aka ma ọ bụ ụkwụ ahụ na-adịghị adị, ma ọ bụ ha ana-enwe mmetụta ụfọdụ n’aka ma ọ bụ ụkwụ na-adịghị adị ma ọ bụrụ na mmadụ emetụ ihu ha aka,” ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. “Mgbe ihe na-adịghịzi emetụta akụkụ ahụ pụtara apụta—n’ihi na e gbupụrụ ya egbupụ ma ọ bụ n’ihi mmerụ ahụ n’akwara ọkpụkpụ azụ—akwara ndị dị ya nso na-anọchi ọnọdụ nke akụkụ ahụ ahụ na-adịkwaghị, na-eweghara ọrụ ya n’ụzọ bụ́ isi,” ka magazin ahụ na-akọwa. Ọ gbakwụnyere, sị: “Nke a na-emekarị ka ndị mmadụ na-enwe mmetụta nke aka ma ọ bụ ụkwụ na-adịkwaghị, ma ọ bụ ha anọgide na-enwe ahụ mgbu.”
Ọnụ Ísì na Atụmanya Inwe Ọrụ
“Ikwu na [ọnụ ísì] na-emebi ọtụtụ ọrụ abụghị ikwubiga okwu ókè,” ka dọkịta ezé bụ Ana Cristina Kolbe kwuru na magazin achụmnta ego nke Brazil bụ́ Exame. “N’ọnọdụ ndị dị oké njọ,” ka onyeisi na-achọta ndị ọrụ (onye na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ) bụ́ Leandro Cerdeira gbakwụnyere, “a na-achụ ndị mmadụ n’ọrụ ọtụtụ ugboro mgbe ha na-amatatụghị ihe na-akpata ya n’ezie.” N’otu nchọpụta e mere n’obodo ukwu abụọ nke Brazil, pasent 40 nke ndị a gbara ajụjụ nwere ọnụ ísì. Ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị akpata ya bụ nchekasị na ihe oriri na-enwechaghị fiber. Iji belata mgbaàmà ya, Dr. Kolbe na-atụ aro ka ndị na-enwe ya na-aga ezumike ruo ụbọchị ole na ole na ka ha riwekwuo akwụkwọ nri. Iji mee ihe ozugbo bụ́ nke ga-adịru nwa oge, ndị e were n’ọrụ bụ́ ndị nwere ọnụ ísì pụrụ iji mmiri e tinyere obere hydrogen peroxide na-akwụkwụ ọnụ ha.
Obi Nkoropụ nke Na-arị Elu
Dị ka otu akụkọ nke Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) kọrọ banyere mba 105 si dị, ná nkezi, ọ̀tụ̀tụ̀ igbu onwe onye ná mba ndị ahụ ji pasent 60 rịa elu n’agbata 1950 na 1995, ka akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Monde na-akọ. Dr. José-Maria Bertolote, bụ́ onyeisi nke ngalaba ahụ ike uche nke òtù WHO, mere atụmatụ na otu nde mmadụ ga-egbu onwe ha n’afọ 2000 nakwa na nde 10 ruo nde 20 ọzọ ga-anwa igbu onwe ha. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ ndị ga-egbu onwe ha n’ezie pụrụ ịdị elu karị. Dị ka akụkọ ahụ sị kwuo, ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu na-anwụ kwa afọ site n’igbu onwe ha karịa ndị na-anwụ n’agha a na-alụ n’ụwa ma a gụkọta ha nile. N’etiti ndị nọ n’agbata afọ 15 na 35, igbu onwe onye aghọwo “otu n’ime ihe atọ bụ́ isi na-akpata ọnwụ,” ka Dr. Bertolote na-ekwu.
Ndị A Na-edina n’Ike na South Africa
“Kwa afọ, a na-enwe otu nde ndina n’ike na South Africa,” ka World Press Review na-ekwu. Nke a pụtara na a na-edina mmadụ n’ike n’ihe dị ka sekọnd 30 ọ bụla. Isiokwu ahụ na-ekwu na “South Africa nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu n’ụwa nile nke ndina n’ike ndị na-ejedebe n’igbu ọchụ.” Ọnụ ọgụgụ ahụ ji okpukpu 12 karịa nke United States, bụ́ nke na-esote ya ná ndepụta ahụ, n’agbanyeghị na South Africa nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ dị nanị nde 40. Isiokwu ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ná mba ndị ọzọ, ndị mmadụ pụrụ idina gị n’ike, pụnara gị ihe, ma ọ
bụ gbuo gị. Ma na South Africa, ndị mmadụ ga-edina gị n’ike tupu ha egbuo gị, n’ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ nanị n’ihi na ọ dabara na ị nọ n’ebe ahụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a ghaghị idina mmadụ n’ike ka a na-eme mpụ ndị ọzọ.” Ọzọkwa, “ndina n’ike aghọwo akụkụ ememe nke ndị òtù ọjọọ na-eji anabata ndị ọhụrụ n’òtù ha,” bụ́ ndị na-agazi n’ihu n’igbu ndị ha na-edina n’ike. Ihe ndị e hotara n’isiokwu ahụ so na-akpata ya bụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke mmetọ ụmụaka nakwa echiche ahụ zuru ebe nile nke bụ́ na ndụ adịghị ihe ọ bụ. Tụkwasị na nke a, otu nchọpụta e mere na Johannesburg na 1998 “kpughere na ụmụ okorobịa kwenyere na ọ na-atọ ndị inyom ụtọ n’ezie ka e dinaa ha n’ike kama na ha na-ezochi ya, nakwa na ọ bụrụ na ị kpọrọ nwa agbọghọ pụọ, i nwere ikike ịgwa ya ka o soro gị nwee mmekọahụ,” ka isiokwu ahụ na-ekwu.Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara na South Africa
“Ọnụ ọgụgụ dị nnọọ elu nke ndị na-arịa ọrịa AIDS emewo ka otu n’ime ìgwè ụlọ ọgwụ ndị a ma ama ndị mmadụ nwe n’onwe ha na South Africa kpebie ịgbanwe gaa ‘n’ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara,’” ka akwụkwọ akụkọ South Africa bụ́ The Mercury na-akọ. “Nzube anyị,” ka Dọkịta Efraim Kramer, bụ́ onyeisi ụlọ ọgwụ nke na-ahụ maka atụmatụ ahụ kwuru, “bụ ịgba ndị ọrụ nkà ọgwụ na ahụ ike ume inye ndị ọrịa nlekọta ahụ ike na ịwa ha ahụ n’ejighị ọbara e nyere enye mee ihe.” Ọ bụ ezie na ọ dịkarịa ala ndị dọkịta 800 nọ na South Africa na-agwọ ọrịa ma na-awa ahụ n’ejighị ọbara, nke a bụ nke mbụ otu ìgwè ụlọ ọgwụ kpebiworo itinye atụmatụ dị otú ahụ a haziri ná mba ahụ dum n’ọrụ. Dọkịta Kramer kwuru na mmeghachi omume nke ndị dọkịta “dị mma nke ukwuu.” The Mercury ahụ kwuru, sị: “N’ụzọ dị ukwuu n’ihi ọchịchọ ìgwè okpukpe dị iche iche dị ka Ndịàmà Jehova na-achọ ya, bụ́ ndị na-adịghị ekwe ka e jiri ọbara e nyere enye gwọọ ha, a chọpụtawo ụzọ ndị dị irè e si agwọ ọrịa n’ejighị ọbara.”
Mkpụrụ Ọgwụ Vitamin C Ndị Sitere n’Okike
Mkpụrụ osisi bụ́ azarole, nke a makwaara dị ka cherry ọhịa, dị ihe dị ka sentimita abụọ n’ibu. Ma mkpụrụ osisi a nke na-atọtụ ụtọ ma na-elutụ ilu nwere vitamin C nke ji okpukpu 50 karịa nke oroma, jirikwa 100 okpukpu karịa nke lemon. Nchọpụta ndị e mere na Mahadum Steeti nke San Martín dị na Tarapoto, Peru, na-egosi na 100 gram nke akụkụ ime nke lemon kasị agbakasị ọnụ nwere miligram 44 nke vitamin C, ebe akụkụ ime nke mkpụrụ osisi azarole há otú ahụ nwere ya miligram 4,600. Nanị anọ n’ime “mkpụrụ ọgwụ” a bụ́ mkpụrụ osisi sitere n’okike na-enye vitamin C nile dị onye toruworo ogo mmadụ mkpa kwa ụbọchị. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ El Comercio si kwuo, a na-eme mgbalị ịhụ ma à pụrụ ịdị na-akụ azarole, “bụ́ mkpụrụ osisi pụrụ imebi ngwa ngwa,” maka iji ya na-achụ ego dị ka ihe ọkụkụ a ga-eji dochie coca.
Ndụmọdụ nke Na-emebi Ihe
“Usoro mgbasa ozi na ndị ọkà a ma ama n’akparamàgwà mmadụ na-akwalite echiche bụ́ na ‘igosipụta’ [iwe] bara uru,” ka magazin bụ́ Psychologist Today na-ekwu. “Ma ndụmọdụ a na-emebi ihe kama inye aka.” Dị ka ọkà n’akparamàgwà mmadụ na Mahadum Iowa State bụ́ Brad Bushman si kwuo, “igosipụta iwe na-eme n’ezie ka esemokwu ka njọ.” Ndị e ji mee nchọpụta bụ́ ndị “gosipụtara ya” site n’ịdị na-akụ akpa ájá ọkpọ gosipụtara mmụọ iseokwu na obi ọjọọ nke ji okpukpu abụọ karịa nke ndị na-egosipụtaghị ya. Ọbụna “ndị e ji mee nchọpụta bụ́ ndị buru ụzọ gụọ otu isiokwu banyere uru ndị dị na mmadụ igosipụta iwe ya tupu ha akụwa akpa ájá ọkpọ, yikarịrị ka hà ga-achọ ịkụ ọkpọ karịa ndị ọzọ,” ka isiokwu ahụ na-ekwu. “Kama ịnwa ime ka iwe ahụ dajụlata, ka Bushman na-ekwu, kwụsị nnọọ iwe iwe. Gụọ site n’otu ruo 10—ma ọ bụ 100, ma ọ́ dị mkpa—iwe ahụ ga-akwụsịkwa.”
Oghere Ozone Kasịnụ E Nwetụworo
Na September 2000, ígwè ọrụ satellite nke ụlọ ọrụ NASA na-eji enyocha nkebi nke ikuku ozone chọpụtara oghere kasịnụ a hụtụworo n’ozone n’elu ógbè Antarctic. Otú ahụ ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Clarín nke Buenos Aires, Argentina, na-akọ. E nwere oghere ahụ n’elu ebe dị ihe dị ka nde square kilomita 28.3, na-eji ihe gafere otu nde square kilomita karịa oghere kasịnụ e nweburu. Oké ibu nke oghere ahụ buru tụrụ ndị ọkà mmụta sayensị n’anya. Dr. Michael Kurylo nke NASA kwuru na ihe ndị a a hụrụ “na-eme ka nchegbu a na-enwe banyere esighị ike nke nkebi nke ikuku ozone nke dị na mbara igwe ka njọ.” Ọkà n’ihe ọmụmụ physics, bụ́ “Rubén Piacentini nke Kọmitii Mba Argentina Maka Ihe Omume Metụtara Mbara Igwe kwuru na ọ bụ ezie na oghere ahụ dị ugbu a n’elu ógbè Antarctica nke mmadụ na-ebighị na ya, “ọ pụrụ imesị gafere n’akụkụ ebe ndịda [Argentina].” Clarín na-ekwu na ozone na-arụ ọrụ dị ka ihe nchebe site n’ibelata mmetụta pụrụ ibibi ihe nke ụzarị ọjọọ na-esite n’anyanwụ.