Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ka Ala Na-adịghị Emepụta Ihe Mepụta Ihe

Ime Ka Ala Na-adịghị Emepụta Ihe Mepụta Ihe

Ime Ka Ala Na-adịghị Emepụta Ihe Mepụta Ihe

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’INDIA

Olee otú a pụrụ isi mee ka ebe ndị na-adịghị emepụta ihe na Ladakh, ógbè dị n’ebe ugwu India, malite imepụta ihe karị? Nke ahụ bụ ajụjụ Tsewang Norphel, bụ́ injinia laworo ezumike nká, nọ na-eche banyere ya. Mmiri na-amalite ịgbapụta ná mkpụkọ mmiri ji aka ya kpụkọọ n’elu Ugwu Himalaya n’ọnwa June, ọ bụghị n’April bụ́ mgbe mmiri na-adịghị ezokarị, ndị ọrụ ugbo ana-achọkwa mmiri ha ga-agba n’ugbo ha. Norphel jiri nkà chọpụta ihe ngwọta ya: Mee ka mmiri kpụkọọ ná mgbada ugwu ahụ, bụ́ ebe mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ ga-amalite ịgbaze ná mmalite afọ.

Dị ka magazin akụkọ nke India bụ́ The Week si kwuo, Norphel na ndị òtù ya malitere ime ka mmiri nke na-agbapụta n’ugwu ahụ na-abanye n’ọwara mmadụ mere bụ́ nke dị mita 200 ma nwee oghere 70 mmiri ga-esi na-asọpụ. Mmiri na-esi n’oghere ndị a jiri nwayọọ nwayọọ na-asọdata ná mkpọda ugwu ahụ ma kpụkọọ tupu ya eruo ná mgbidi a rụchibidoro n’ebe dị n’ala ala nke mkpọda ugwu ahụ. Mmiri ahụ ga-eji nke nta nke nta kpụkọọ, mesịa jupụta ná mgbidi ahụ. N’ịbụ nke ugwu ahụ chere ndò, mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ ga-agbaze nanị mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ rịrị elu n’April, na-eme ka e nweta mmiri dị oké mkpa maka ịgba n’ugbo n’oge ahụ.

È nwere ihe ịga nke ọma site n’echiche nke ime ka mmiri kpụkọta? N’eziokwu, echiche Norphel bịara bụrụ nke bara uru nke na e mewo ka mmiri kpụkọọ otú ahụ n’ebe iri na Ladakh, a na-emekwa atụmatụ maka imetakwu ndị ọzọ. Otu mkpụkọ mmiri dị otú ahụ, bụ́ nke e mere ka ọ kpụkọọ n’ebe dị mita 1,300 n’ogo, na-eme ka e nweta ihe dị ka nde lita mmiri 34. Ego ole ka ọ na-efu? “Ime ka mmiri kpụkọọ na-ewe ihe dị ka ọnwa abụọ ma na-efu Rs 80,000 [$1,860], nke ihe ka ukwuu n’ime ya bụ ego e ji arụ ya arụ,” ka The Week na-ekwu.

Ime nkà nke ụmụ mmadụ pụrụ n’ezie ịba uru mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Cheedị banyere ọrụ ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwe ike ịrụzu n’okpuru nduzi nke Alaeze Chineke! Bible na-ekwe nkwa, sị: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. . . . n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị.” (Aịsaịa 35:1, 6) Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ ikere òkè n’ime ka ụwa anyị maa mma!

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

Arvind Jain, Magazin The Week