Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngwá Agha Ndị Obere, Nnukwu Nsogbu

Ngwá Agha Ndị Obere, Nnukwu Nsogbu

Ngwá Agha Ndị Obere, Nnukwu Nsogbu

RUO ọtụtụ iri afọ, nkwurịta okwu ndị e nweworo banyere ịchịkwa ngwá agha metụtakarịsịrị ngwá agha nuklia. Nke a abụghị ihe ijuanya, ebe ọ bụ na otu bọmbụ nuklia pụrụ ibibi otu obodo dum. Ma, n’adịghị ka ngwá agha ndị na-aharughị ka ya, e jibeghị ngwá agha ndị a dị oké ike lụọ agha n’ihe karịrị afọ 50.

Ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere agha bụ́ John Keegan a na-akwanyere ùgwù na-ede, sị: “Ọ dịbeghị onye ngwá agha nuklia gburu kemgbe abalị 9 nke ọnwa August 1945. Mmadụ 50,000,000 ndị nwụworo n’agha kemgbe ahụ abụrụwo, n’akụkụ ka ukwuu, ndị e gburu site ná ngwá agha ndị dị ọnụ ala a na-emepụta n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu na ụmụ obere ngwá agha, bụ́ ndị ọnụ ahịa ha ji ihe dị nta karịa ọnụ ahịa redio nkịtị na ọnụ ahịa batrị nkịtị, bụ́ ndị jupụtaworo n’ụwa n’otu mgbe ahụ. N’ihi na ngwá agha ndị dị ọnụ ala adịghị akpatakebe nsogbu ná mba ndị mepere emepe, e wezụga ebe ndị ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ na iyi ọchịchị egwu jupụtara, ndị bi ná mba ndị bara ọgaranya achọchaghị ịma banyere ihe mgbu nke omume ọjọọ a kpataworo.”

Ọ dịghị onye maara kpọmkwem ọnụ ọgụgụ ngwá agha ndị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ e ji na-eme ihe, ma ndị ọkachamara na-eme atụmatụ na égbè ndị e mepụtara maka ndị agha pụrụ ịdị ihe dị ka nde 500. Ọzọkwa, ndị nkịtị nwere ọtụtụ iri nde égbè ogologo na ndị nke obere e mepụtara maka ndị nkịtị. Tụkwasị na nke a, a na-emepụta ngwá agha ndị ọhụrụ ma wepụta ha maka orire kwa afọ.

Ngwá Agha Ndị A Na-ahọrọ

N’ihi gịnị ka ngwá agha ndị obere ji bụrụ ngwá agha ndị a na-ahọrọ iji eme ihe n’agha ndị a na-alụ n’oge ndị a? Ihe so kpata ya bụ njikọ dị n’etiti agha na ịda ogbenye. A lụrụ ihe ka ọtụtụ n’agha ndị e nwere n’afọ ndị 1990 ná mba ndị dara ogbenye—ndị dara nnọọ ogbenye nke na ha apụghị ịzụta ngwá agha ndị bụ́ ọkpọka. Ngwá agha ndị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ dị ọnụ ala. Dị ka ihe atụ, a pụrụ iji ihe dị ka nde dollar 50, nke bụ́ ihe a na-ere nanị otu ụgbọelu ọgbara ọhụrụ na-atụ bọmbụ, zụta égbè ogologo 200,000 maka ndị agha.

Mgbe ụfọdụ, ngwá agha ndị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ na-adị nnọọ ọnụ ala karịa otú ahụ. Mgbe e gbubilatara ọnụ ọgụgụ ndị agha, a na-enyefe nnọọ ndị ọzọ ọtụtụ iri nde ngwá agha ndị a, ma ọ bụ e jiri ha mee ihe n’agha ndị ọzọ. N’ala ụfọdụ, e nwere ọtụtụ égbè ogologo nke na a na-ere ha nanị dollar isii ma ọ bụ jiri ha gbanweta otu ewu, otu ọkụkọ, ma ọ bụ otu akpa ákwà ochie.

Ma, e wezụga ịdị ọnụ ala ya na ọdịdị ọ dị n’ebe nile, e nwere ihe ndị ọzọ mere ọtụtụ ndị ji na-eji ngwá agha ndị obere na-eme ihe. Ha na-akpa ike. Otu égbè ogologo na-awụpụ mgbọ awụpụ pụrụ ịgbapụ ọtụtụ narị mgbọ n’otu minit. Ọ na-adịkwa mfe iji ha eme ihe na ịrụzi ha arụzi. A pụrụ ịkụziri nwatakịrị dị afọ iri otú e si atụghasị égbè ogologo na-awụpụ mgbọ ma rụzie ya. Nwatakịrị pụkwara ịmụta ngwa ngwa otú e si atụdo ìgwè mmadụ égbè ahụ ma gbaa ya.

Ihe ọzọ mere e ji ejikarị égbè eme ihe bụ na ha na-esi ike ma na-arụ ọrụ ruo ọtụtụ afọ. A ka na-eji égbè ndị dị ka AK-47 na égbè M16, ndị soja ji lụọ agha n’Agha Vietnam, eme ihe taa. E ji ụfọdụ égbè e ji eme ihe n’Africa taa lụọ Agha Ụwa Mbụ. Ọzọkwa, ọ dị mfe iburu égbè gaa ebe ọzọ na izo ha ezo. Otu ịnyịnya pụrụ ibugara ìgwè ndị agha nọ n’oké ọhịa ma ọ bụ n’ugwu dịpụrụ adịpụ ọtụtụ égbè. Otu ìgwè ịnyịnya pụrụ ibuga égbè ga-ezu iji merie ndị agha na-ehighị nne.

Égbè, Ọgwụ Ọjọọ, na Diamọnd

Ịzụ ahịa égbè nke zuru ụwa ọnụ siri ike nkwụsị. A na-esi n’otu mba ebuga ọtụtụ égbè ná mba ọzọ n’ụzọ iwu kwadoro. Mgbe Agha Nzuzo bisịrị, e gbubilatara ọnụ ọgụgụ ndị agha nọ ma n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, gọọmenti dị iche iche bunyekwara ma ọ bụ resị ndị enyi ha na ndị ha na ha jikọrọ aka ngwá agha ndị ha na-ejighịzi eme ihe. Dị ka otu onye edemede nọ n’Ụlọ Ọrụ Na-eme Nnyocha Maka Udo nke dị n’Oslo, Norway, si kwuo, eri 1995 nanị United States ebunyewo ndị ọzọ égbè ogologo, égbè obere, égbè na-akwa mgbọ, na égbè ndị na-atụ bọmbụ grenade karịrị 300,000. A na-eche na ibunye ndị ọzọ ngwá agha na-efu ego dị nta karịa ịtụghasị ha atụghasị ma ọ bụ idebe ha edebe nakwa ichekwa ha echekwa. Ụfọdụ ndị nnyocha na-eme atụmatụ na ikekwe a na-ebufe ngwá agha ndị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ ọnụ ahịa ha ruru ijeri dollar atọ ná mba ọzọ n’ụzọ iwu kwadoro kwa afọ.

Otú ọ dị, ndị nke a na-ere n’ụzọ iwu na-akwadoghị pụrụ ịdị nnọọ ukwuu karị. Dị ka ọ na-adịkarị, a ghaghị ịzụta ngwá agha na nzuzo. N’agha ụfọdụ a na-alụ n’Africa, ìgwè ndị agha ejiriwo, ọ bụghị ego kama diamọnd ndị ha bupụrụ n’ebe ndị a na-egwupụta diamọnd, zụta ngwá agha ndị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ n’ọnụ ego ruru ọtụtụ narị nde dollar. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru, sị: “N’ebe e nwere gọọmenti na-arụrụ aka, ndị agha nnupụisi adịghị eme ebere, ọ na-adịkwa mfe isi n’ókèala gafere . . . Nkume ndị ahụ na-egbuke egbuke aghọwo ihe ndị na-akpata ọrụ ahụhụ, igbu ọchụ, ibepụ akụkụ ahụ, enweghị ebe obibi nke ọtụtụ mmadụ, na oké ndakpọ akụ̀ na ụba.” Lee ihe ijuanya ọ bụ na a pụrụ imesị ree nkume dị oké ọnụ ahịa e ji zụta égbè, n’ụlọ ahịa a na-ere ọla ndị mara mma, dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa na-egosi ịhụnanya na-adịgide adịgide!

Ngwá agha na ịzụ ahịa ọgwụ n’ụzọ iwu na-akwadoghị nwekwara njikọ. Ọ bụghị ihe ọhụrụ òtù dị iche iche nke ndị omempụ isi n’otu ụzọ ndị ahụ ha na-esi azụ ahịa ọgwụ ọjọọ azụkwa ahịa égbè. Ya mere, ọ fọwo nke nta ka ngwá agha ghọọ ego, ihe e ji azụta ọgwụ ọjọọ.

Mgbe Agha Bisịrị

Mgbe agha biri, égbè ndị e ji lụọ ha na-abatakarị n’aka ndị omempụ. Tụlee ihe mere n’otu mba dị n’ebe ndịda Africa bụ́ ebe e si n’ime ihe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị gafee na mpụ ime ihe ike. Ime ihe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị gburu ihe dị ka mmadụ 10,000 nanị n’ime afọ atọ. Mgbe esemokwu ahụ kwụsịrị, e nwere iri elu nke mpụ ime ihe ike. Asọmpi dị n’etiti ndị na-anya tagzi kpatara “agha tagzi,” bụ́ mgbe e goro ndị agboro ịgba ndị ọkwọ ụgbọala na-ama ha aka na ndị ha bu n’ụgbọala ha égbè. N’ụzọ na-arị elu, e ji égbè ndị agha zuo ohi ma mee mpụ ndị ọzọ. Ọnụ ọgụgụ ndị e ji égbè gbuo ruru 11,000 n’otu afọ na-adịbeghị anya, nke abụọ n’ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwere n’ụwa ná mba ndị na-anọghị n’agha.

Ịmata na ndị omempụ ji égbè ma dị ize ndụ na-eme ka e nwee egwu na mmetụta nke anọghị ná nchebe. N’ọtụtụ mba na-emepe emepe, ndị ọgaranya na-ebi n’ebe ndị fọrọ nke nta ka ha bụrụ ebe ndị e wusiri ike, bụ́ ndị e ji mgbidi a na-eche nche ehihie na abalị ndị nwere ọkụ eletrik gbaa gburugburu. Ndị bi ná mba ndị mepere emepe na-akpachapụkwa anya. Nke a dịkwa otú a ọbụna n’ebe ndị a na-alụtụbeghị agha obodo.

Ya mere, ma n’ala ebe ndị e nwere agha ma n’ala ebe ndị e nwere “udo,” égbè so n’ihe ndị na-akpata ọgba aghara. Ọ dịghị onye pụrụ ịma ókè ike ọjọọ égbè na-akpa hà; anyị apụghịkwa ịgụkọ ọnụ ọgụgụ nke ndị nwụrụ anwụ, ndị merụrụ ahụ, ndị mmadụ nwụnahụrụ, na ndụ ndị e tisara etisa. Ma, anyị maara na égbè jupụtara ụwa nakwa na ọnụ ọgụgụ ha na-anọgide na-arị elu. N’ụzọ na-arị elu, ndị mmadụ na-atụ aro ka e mee ihe. Ma gịnị ka a pụrụ ime? Gịnị ka a ga-eme? Ndị a bụ ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]

Otu Onye Na-alụbu Agha Elee Onwe Ya Anya Dị Ka “Onye Dị Nnọọ Iberibe”

Otu nwatakịrị nwoke bụ́ onye soja nke lụrụ agha n’otu agha ahụ nke mere ka ndị mmadụ gbaa ọsọ ndụ, bụ́ nke e kwuru okwu banyere ya n’isiokwu mbụ, ghọrọ na mberede onye na-enwekwaghị ihe ọ na-arụ na onye na-enwekwaghị ego n’obodo ahụ o nyere aka mee ka e merie. O ji iwe kwuo okwu banyere ọhụhụ ọ na-ahụ nwa nwoke nke onye ndú ha ka ọ na-eji ọgba tum tum dara oké ọnụ agbagharị n’obodo, nakwa ka ndị bụbu ndị ọchịagha ha ji aghụghọ na-achọ ịchị achị ma na-ama aka iji mara onye a ga-asọpụrụ. “Mgbe m chere banyere afọ ise m nọrọ n’ọhịa, na-egbu ndị mmadụ ma bụrụ onye a na-agba égbè, m na-ele onwe m anya dị ka onye dị nnọọ iberibe,” ka onye agha ahụ kwuru. “Anyị ji ndụ anyị na-achụ àjà maka ndị na-agaghị echeta echi otú ha si bụrụ ihe ha bụ.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nwatakịrị nwoke bụ́ onye soja: Nanzer/Sipa Press

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

“Ọ Dịghị Ebe Nzopụ Dịnụ”

Ọ bụ ezie na égbè e ji alụ agha n’oge a na-akpa ike, o nwere ihe ndị ọ na-adịghị emeli. Ọ na-agbapụ nanị mgbọ. Ọ pụghị igbu ndị zoro n’azụ mgbidi siri ike ma ọ bụ ihe mgbochi. N’ịma jijiji n’ihi agha, onye soja nwere ike ghara inweta ihe ọ chọrọ ịgba. Ọ bụrụgodị na a nọrọ n’ọnọdụ ndị dị mma mgbe a na-agba ya, a na-agbata ihe a chọrọ nanị ma a nọrọ n’ebe ruru mita 460 gbaa ya.

Ndị agha United States nwere ihe ngwọta maka “nsogbu” ndị dị otú ahụ—égbè ọhụrụ bụ́ ọkpọka, nke e ji eme ọtụtụ ihe bụ́ nke a kpọrọ Ngwá Agha nke Na-eme Ihe Onye Bu Ya Chọrọ (OICW). N’ịbụ nke na-adịchaghị arọ nke na otu onye soja na-ebu ya, égbè OICW ahụ adịghị agbapụ nanị mgbọ kama ọ na-agbapụkwa bọmbụ—grenade, bụ́ nke dị milimita 20. Ihe ọzọ pụrụ iche ọ na-eme bụ: ọ pụrụ igbu ndị iro zoro n’azụ ihe mgbochi. Nanị ihe onye soja ga-eme bụ ịtụdo égbè ahụ kpọmkpem n’elu ma ọ bụ n’akụkụ onye a chọrọ ịgbata. Égbè ahụ na-ejizi aka ya amata ókè ebe onye ahụ a chọrọ ịgbata nọ dịruru anya ma kpakee bọmbụ grenade ahụ ka o wee gbawaa kpọmkwem n’ebe ahụ a chọrọ ka ọ gbawaa, na-awụ onye iro ahụ iberibe mgbọ ndị na-atụpu ígwè. “Ikike pụrụ iche o nwere ga-eme ka ọ fọdụ nke nta ka ndị agha United States nwee ike ịdị na-agbata ihe nọ n’ebe gbara ngọ,” ka onye nnọchiteanya nke ụlọ ọrụ na-arụ ngwá agha ahụ kwuru. Anya égbè dị na ya ga-eme ka ngwá agha ahụ nwee ike inweta ihe n’ụzọ dị irè ọbụna n’ọchịchịrị.

“Ọ dịghị ebe nzopụ dịnụ” pụọ n’ebe égbè a dị, ka ndị rụrụ ya na-etu n’ọnụ, bụ́ ndị na-ekwukwa na ngwá agha ahụ ga-eji okpukpu ise karịa égbè M16 n’ịkpa ike ma jiri okpukpu abụọ na-agafe ebe égbè M203 na-atụ bọmbu grenade na-ejedebe. Ọ dịghị ndị soja ji ya eme ihe mkpa ichegbuwe onwe ha ma hà ga-enweta onye ha chọrọ ịgbata; nanị ihe dị ha mkpa bụ ile anya n’anya égbè ahụ ma kpaa utu égbè ahụ aka iji gbapụ ọtụtụ mgbọ na bọmbụ grenade. Ọ bụrụ na ihe agaa dị ka e si mee atụmatụ ya, a ga-ebunye òtù ndị agha mbụ égbè OICW mgbe ọ na-erule afọ 2007.

Otú ọ dị, ndị nkatọ na-ajụ ajụjụ, sị: Olee otú a ga-esi jiri égbè ahụ mee ihe mgbe ndị agha nọ na nche n’ebe ndị mmadụ jupụtara bụ́ ebe ndị iro na-alụ agha yiri ka hà ga-anọ n’etiti ndị nkịtị? Gịnị ga-eme mgbe e resịrị ndị agha nọ n’ụwa dum égbè OICW, bụ́ ndị pụrụ iji ha megidewe ndị nke ha? Gịnịkwa ga-eme mgbe ngwá agha ahụ banyere n’aka ndị na-eyi ọha egwu na ndị omempụ?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Alliant Techsystems

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

A na-ejikarị diamọnd na ọgwụ ọjọọ agbanweta ngwá agha ndị obere na ndị nke na-agbapụ obere mgbọ