Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nrọ Hà Bụ Ozi Ndị Sitere n’Aka Chineke?

Nrọ Hà Bụ Ozi Ndị Sitere n’Aka Chineke?

Echiche nke Bible

Nrọ Hà Bụ Ozi Ndị Sitere n’Aka Chineke?

AKỌRỌ na nchepụta Elias Howe, bụ́ onye na-echepụta ihe, chepụtara otú ígwè e ji akwa ákwà ga na-adị dabeere ná nrọ. Mozart, bụ́ onye na-arọ egwú, kwuru na ya nwetara ọtụtụ n’ime isiokwu egwú ya ná nrọ. Friedrich August Kekule von Stradonitz, bụ́ onye na-emepụta mmiri ọgwụ, kwukwara na ya chọpụtara ọdịdị nke mmiri ọgwụ benzene ná nrọ. Ihe atụ ndị dị otú a abụtụghị ihe ọhụrụ. N’akụkọ ihe mere eme nile, ọtụtụ ọdịbendị anọwo na-ekwu na nrọ na-esite n’aka ndị bụ́ mmụọ. Ndị ụfọdụ kweere na ihe mere ná nrọ bụ ezie dị nnọọ ka nke mere n’ìhè bụ.

E nwere ọtụtụ akụkọ dị na Bible bụ́ ndị a kọwara nrọ na ha dị ka ihe dị mkpa na-enye ihe ọmụma—otu n’ime ụzọ ndị Chineke si agwa mmadụ okwu. (Ndị Ikpe 7:13, 14; 1 Ndị Eze 3:5) Dị ka ihe atụ, Chineke gwara Abraham, Jekọb, na Josef okwu ná nrọ. (Jenesis 28:10-19; 31:10-13; 37:5-11) Chineke mere ka Eze Babilọn bụ́ Nebukadneza rọọ nrọ amụma. (Daniel 2:1, 28-45) Ya mere, à pụrụ inwe ezigbo ihe mere a ga-eji kwere na ọbụna taa nrọ ụfọdụ bụ ozi ndị sitere n’aka Chineke?

Nrọ Ndị Sitere n’Aka Chineke

Na Bible, nrọ ndị sitere n’aka Chineke na-enwekarị ihe mere kpọmkwem e ji rọọ ha. N’eziokwu, mgbe ụfọdụ onye rọrọ nrọ apụghị ịghọta ozugbo isi nrọ ahụ. Otú ọ dị, n’ọtụtụ ọnọdụ, onye “na-ekpughe ihe nzuzo nile” n’onwe ya na-enye nkọwa ya ka a ghara inwe mgbagwoju anya banyere isi nrọ ahụ. (Daniel 2:28, 29; Emọs 3:7) Nrọ ndị sitere n’aka Chineke adịghị enye echiche na-agbagwoju anya dị ka ọ na-adịkarị n’ihe banyere nrọ nkịtị.

Mgbe ụfọdụ, Chineke jiri nrọ mee ihe iji chebe ndị keere òkè dị mkpa ná mmezu nke nzube ya. Ọ bụghị ndị nile e mere ka ha rọọ nrọ ndị dị otú ahụ bụ ndị ohu Chineke. Dị ka ihe atụ, ndị na-agụ kpakpando bụ́ ndị letara nwatakịrị ahụ bụ́ Jisọs alaghachighị iji hụ Herọd ahụ chọrọ ịgbu ọchụ dị ka ọ rịọrọ. N’ihi gịnị? A dọrọ ha aka ná ntị ná nrọ. (Matiu 2:7-12) Nke a mere ka nna nkuchi Jisọs, bụ́ Josef, nwee ohere zuru ezu ịkpọrọ ezinụlo ya gbaga Ijipt, n’ihi ntụzi ya onwe ya kwa nwetara ná nrọ. Nke a zọpụtara ndụ nwatakịrị ahụ bụ́ Jisọs.—Matiu 2:13-15.

Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Fero nke Ijipt hụrụ ná nrọ oko ọka asaa bujuru ebuju na ehi asaa mara abụba n’anụ ahụ ha bụ́ ndị dị iche n’oko ọka asaa fịkpọrọ afịkpọ na ehi asaa tara ahụ n’anụ ahụ ha. Site n’enyemaka Chineke, Josef kọwara nrọ ndị ahụ n’ụzọ ziri ezi: Ijipt ga-enwe ihe oriri n’ụzọ bara ụba ruo afọ asaa, bụ́ nke afọ asaa nke ụnwụ nri ga-esochi. Ịmata nke a tupu ya emee mere ka ndị Ijipt mee nkwadebe ma bukọta ihe oriri. Nke a bịara bụrụ ihe e ji zọpụta ụmụ Abraham ma mee ka ha bata n’Ijipt.—Jenesis, Isi 41; Je 45:5-8.

Eze Nebukadneza nke Babilọn rọkwara nrọ. O mere ka a mata banyere mbilite na ọdịda nke ike ọchịchị ụwa ndị a ga-enwe n’ọdịnihu, bụ́ ndị ga-emetụta ndị Chineke kpọmkwem. (Daniel 2:31-43) Ka e mesịrị, ọ rọrọ nrọ ọzọ nke mere ka a mata banyere ara ga-agba ya n’ọdịnihu na mgbake ga-esochi ya. Nrọ amụma nke a mezuru n’ụzọ sara mbara karị, na-egosi kpọmkwem nguzobe e guzobere Alaeze Mesaịa, bụ́ nke Chineke ga-eji mezuo uche ya.—Daniel 4:10-37.

Gịnị Banyere Taa?

Ee, Chineke gwara ndị ụfọdụ okwu site ná nrọ. Ma Bible na-egosi na nke a emeghị ọtụtụ ugboro. Nrọ abụghị ụzọ bụ́ isi Chineke si gwa mmadụ okwu. E nwere ọtụtụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị na-enwetaghị ozi ọ bụla site n’aka Chineke ná nrọ. A pụrụ iji ojiji Chineke jiri nrọ mee ihe iji gwa mmadụ okwu tụnyere nkewa O kewara Oké Osimiri Uhie. Anyị maara na o mere ya otu ugboro, ma nke ahụ abụghị n’ezie ụzọ ọ na-esikarị emeso ndị ya ihe.—Ọpụpụ 14:21.

Pọl onyeozi kwetara na n’ụbọchị ya, mmụọ Chineke na-eduzi ndị ohu ya n’ọtụtụ ụzọ dịgasị iche. Pọl kwuru, sị: “N’ihi na a na-esite n’aka Mmụọ Nsọ nye otu onye okwu amamihe; a na-enyekwa onye ọzọ okwu ọmụma, dị ka Mmụọ ahụ na-achọ: nyekwa ibe ya okwukwe, n’ime otu Mmụọ ahụ; nyekwa onye ọzọ onyinye amara nile ime ka ahụ mmadụ dị ike, n’ime otu Mmụọ nke a; nyekwa onye ọzọ nrụpụta nke ọrụ dị ike; nyekwa onye ọzọ obubu amụma; nyekwa onye ọzọ ịtụle mmụọ dị iche iche: nyekwa ibe ya aha asụsụ dị iche iche; nyekwa onye ọzọ ịsụgharị asụsụ.” (1 Ndị Kọrint 12:8-10) Ọ bụ ezie na a kpọtụghị nrọ ndị sitere n’ike mmụọ nsọ aha kpọmkwem, ihe àmà na-egosi na e mere ka ọtụtụ ndị Kraịst rọọ nrọ site n’ike Chineke dị ka otu n’ime onyinye nke mmụọ nsọ iji mezuo Joel 2:28.—Ọrụ 16:9, 10.

Otú ọ dị, onyeozi ahụ kwuru banyere onyinye ndị a pụrụ iche, sị: “Ọ bụrụ na ibu amụma dị, a ga-eme ka ha ghara ịdị irè; ọ bụrụkwa na asụsụ dị iche iche dị, ha ga-agwụ; ọ bụrụkwa na ihe ọmụma dị, a ga-eme ka ọ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 13:8) Ihe àmà na-egosi na ụdị dịgasị iche nke ụzọ Chineke si agwa mmadụ okwu so n’ihe ndị a gụnyekọtara ha na onyinye ndị “a ga-eme ka ha ghara ịdị irè.” Mgbe ndị ozi nwụsịrị, Chineke kwụsịrị inye ndị ohu ya onyinye ndị a pụrụ iche.

Taa ndị ọkachamara ka na-agbalị ịghọta usoro e ji arọ nrọ nakwa ma ò nwere ihe bara uru ọ na-arụ. Bible emeghị ka okwu ndị dị otú ahụ doo anya. Otú ọ dị, Bible na-adọ ndị nọgidere na-achọ ka Chineke na-agwa ha okwu ná nrọ aka ná ntị. Na Zekaraịa 10:2, ọ na-ekwu, sị: ‘Ọ bụkwa nrọ ụgha ka ndị na-ajụ ase na-eze.’ Chineke dọkwara aka ná ntị banyere ịchọ ihe àmà ọdịnihu. (Deuterọnọmi 18:10-12) N’ihi ịdọ aka ná ntị ndị a, ndị Kraịst taa adịghị atụ anya inweta nduzi Chineke ná nrọ ha. Kama nke ahụ, ha na-ele nrọ anya nanị dị ka ihe a na-eme mgbe a na-ehi ụra.