Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Obodo Ukwu Ndị Mmadụ Na-ejubiga Ókè Na ha”

“Obodo Ukwu Ndị Mmadụ Na-ejubiga Ókè Na ha”

“Obodo Ukwu Ndị Mmadụ Na-ejubiga Ókè Na ha”

“Ụmụ mmadụ na-akwagharị dị ka ha na-akwagharịtụbeghị, ihe kakwa ọtụtụ ná ndị na-ahapụ ụlọ ha ịchọ ebe ndụ ka mma na-akwaga n’obodo ukwu.”

NKE ahụ bụ ihe akwụkwọ bụ́ Foreign Affairs kwuru n’okwu mmeghe ya n’isiokwu bụ́ “Obodo Ukwu Ndị Mmadụ Na-ejubiga Ókè na Ha ná Mba Ndị Ka Na-emepe Emepe.” Dị ka isiokwu ahụ kwuru, ọtụtụ ndị abụrụwo ndị “ọkụ na-achasi ike dọọrọ, ma ọ bụ bụrụ ndị oké ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ọnọdụ akụ̀ na ụba, nrụgide nke ụba mmadụ, na ndakpọ nke gburugburu ebe obibi manyere isi n’ime obodo kwapụ.”

N’ókè há aṅaa ka ndị mmadụ na-enuga n’obodo ukwu? Ụfọdụ ndị na-eme atụmatụ na ndị mmadụ na-enuga n’obodo ukwu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu nke bụ́ ihe karịrị otu nde mmadụ kwa izu! Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ihe karịrị obodo ukwu 200 nwere ugbu a ọnụ ọgụgụ mmadụ gafere otu nde. Ihe dị ka 20 n’ime ha eruwo nde iri! Olileanya adịghịkwa na ọ ga-ebelata. Were dị ka ihe atụ, obodo ukwu Nigeria bụ́ Lagos. Dị ka akụkọ Worldwatch Institute nyere si dị, “ka ọ na-erule 2015, Lagos pụrụ ịbụ ebe obibi nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ 25, na-arịgo site n’ịbụ obodo ukwu nke iri na atọ a kasị nwee ụba mmadụ na ya gaa n’ịbụ nke atọ kasịnụ.”

Ọtụtụ ndị ọkachamara na-eche na nke a adịghị agba àmà ihe ọma maka ọdịnihu. Federico Mayor, onye bụbu nnukwu onyeisi nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu, na-adọ aka ná ntị na ka ọ na-erule afọ 2035, “puku nde mmadụ atọ ọzọ ga-ebi n’obodo ndị mepere emepe ndị e nwere taa.” Iji gboo mkpa nke oké ụba mmadụ a, “ọ ga-adị mkpa anyị iwu otu puku obodo ukwu ndị nde mmadụ atọ ga-ebi na ha n’ime iri afọ anọ ọzọ, iri abụọ na ise kwa afọ.”

Ndị ọkachamara na-ekwukwa na ọnụ ọgụgụ mmadụ bi n’obodo ukwu bụ́ nke na-amụba ngwa ngwa na-enwe mmetụta ọjọọ n’obodo ukwu dị iche iche gburugburu ụwa. Nke ahụ na-agụnyekwa obodo ukwu ndị dị n’akụkụ ụwa mepere emepe bụ́ ndị bara ọgaranya. Nsogbu ndị dịgasị nnọọ aṅaa na-eche obodo ukwu dị iche iche ihu, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke a pụrụ inwe n’ebe ị nọ? È nwere ngwọta dị nso? Isiokwu ndị na-esonụ na-enyocha okwu ndị a dị oké mkpa.