Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Jụ Ya?

Olee Otú M Pụrụ Isi Jụ Ya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Jụ Ya?

“N’oge okpomọkụ a, otu nwanna nwoke nọ n’ọgbakọ m malitere inwe ịhụnanya n’ebe m nọ. Enweghị m mmasị n’ezie n’ebe ọ nọ. Ihe bụ nsogbu bụ na amaghị m otú m ga-esi jụ ya n’emeghị ihe ga-ewute ya.”—Elizabeth. *

“MỤ NA gị ọ̀ pụrụ ịkpachiwekwu anya?” Nwa okorobịa ọ̀ jụtụwo gị ajụjụ ahụ? Dị ka nwa agbọghọ, * ọ pụrụ ibu gị isi, mee ka i nwee obi ụtọ—ọbụna nwee oké mkpali! N’aka nke ọzọ, ị pụkwara ịnọ ná mgbagwoju anya nke na ị gaghị ama ihe ị ga-aza ya.

Mgbe mmadụ gosiri mmasị ịhụnanya n’ebe ị nọ, ọ pụrụ ịkpali ụdị mmetụta uche dị iche iche. Nke a bụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na i toruwo ogo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, n’ihi ya kwa, nọrọ n’ọnọdụ nke igosigwara mmasị dị otú ahụ! * Ka o sina dị, otú ị ga-esi emeghachi omume ga-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’onye na-ajụ ajụjụ ahụ. Ọ pụrụ ịdịrị gị mfe ịza ya ma ọ bụrụ na ọ bụ onye tozuru okè ná mmetụta uche, ị chọpụtakwa na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na o doro anya na o nweghị iru eru ndị a chọrọ maka ịbụ onye òtù ọlụlụ kwesịrị ekwesị? Ma ọ bụ, gịnị ma ọ bụrụ na i nweghị nnọọ mmasị n’ebe ọ nọ n’agbanyeghị na o nwere àgwà ndị dị mma?

Tụleekwa ihe banyere nwa agbọghọ nke ya na mmadụ nọworo na-eyi oge mkpapụ ruo oge ụfọdụ ma ya abịazie ghọta na ya achọghị ka ya na ya biri ná ndụ ya nile. Kama ịkwụsị mmekọrịta ahụ, ọ nọgidere soro ya na-eme mkpapụ. “Olee otú m pụrụ isi jụ ya?” ka ọ na-ajụ.

Mgbe Ị Na-ahụghị Ya n’Anya

Laa azụ n’oge ndị nna ochie, o doro anya na ndị mmadụ na-alụ ndị ndị mụrụ ha họtaara ha. (Jenesis 24:2-4, 8) N’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst nweere onwe ha ịhọrọ onye ha ga-alụ. Bible kwuru otu ihe a chọrọ—ka onye Kraịst lụọ “nanị n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 7:39.

Nke a ọ̀ pụtara na i kwesịrị ịlụ onye bla kwekwara ekwe nke gosiri mmasị n’ebe ị nọ ma ọ bụ onye gị na ya meworo mkpapụ ruo mkpirikpi oge? Tụlee ihe atụ dị na Bible banyere otu nwa agbọghọ bụ́ onye obodo Shunem nke dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Solomọn, bụ́ eze na-achị ya, hụrụ ya ma nwee ịhụnanya miri emi n’ebe ọ nọ. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị na nwa agbọghọ ahụ jụrụ ya mgbe ọ gbalịrị inweta ya, kamakwa, ọ rịọrọ ndị inyom na-ejere eze ozi, sị: “Unu akpọtela, unu emekwala ka ịhụnanya teta, ma ọlị, ruo mgbe ọ ga-atọ ya ụtọ.” (Abụ nke Abụ 2:7) Nwa agbọghọ a maara ihe achọghị ka ndị ọzọ nwaa ịrụgide ya ịbụ onye mmetụta uche megharịrị anya. O nweghị nnọọ ịhụnanya n’ebe Solomọn nọ, n’ihi na ọ hụrụ onye ọzụzụ atụrụ dị ala n’anya.

Nke a na-akụziri ndị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye taa ihe dị mkpa: Ọ bụghị nnọọ onye ọ bụla ị hụrụ ka ị pụrụ inwe ịhụnanya n’ebe ọ nọ. N’ihi ya, ọbụna mgbe ha meworo mkpapụ ruo oge ụfọdụ, nwa agbọghọ pụrụ ịchọpụta na ya enweghị mmasị ịhụnanya n’ebe onye ahụ nọ. Ikekwe mmetụta ọ na-enwe bụ n’ihi ntụpọ ụfọdụ pụtara ìhè n’àgwà onye ahụ. Ma ọ bụ, ọ pụrụ ịbụ na o nweghị mmasị n’ebe nwa okorobịa ahụ nọ. Ọ ga-abụ ihe nzuzu ileghara mmetụta ndị dị otú ahụ anya. Nanị ileghara ha anya apụghị ime ka ha ghara ịdịkwa. * “Enwere m nnọọ obi abụọ dị ukwuu banyere ya,” ka Tamara kwuru banyere nwa okorobịa ya na ya na-eyi oge mkpapụ. “Ọ bụghị nnọọ ntakịrị obi abụọ kama nke na-enye m nsogbu n’ezie ruo n’ókè nke na ọ na-eme ka m nwee ahụ erughị ala ma mụ na ya nọrọ.” O mesịrị ghọta na n’ihi obi abụọ ndị a, ọ kasị mma ịkwụsị mmekọrịta ahụ.

Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịjụ

Ka o sina dị, ịjụ nwa okorobịa pụrụ ịdị mfe ikwu ekwu karịa ime eme. Dị ka Elizabeth, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, ị pụrụ ịdị na-atụ ụjọ na ị ga-eme ihe ga-ewute ya. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịdị na-echebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche. Bible na-agba ndị Kraịst ume ‘iyikwasị obi ebere’ nakwa ka ha mesoo ndị ọzọ otú ha ga-achọ ka e mesoo ha. (Ndị Kọlọsi 3:12; Matiu 7:12) Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na ị ga na-eme ka a ga-asị na ihe ya masịrị gị nanị ka i wee ghara ime ka nwa okorobịa ahụ nwee ndakpọ olileanya ma ọ bụ nwee mwute? Obi abụọ adịghị ya na n’oge na-adịghị anya ọ ga-achọpụta ihe bụ obi gị n’ezie, emeghị ihe n’eziokwu gị na ịnọ na-eyigharị oge ị ga-agwa ya obi gị ga-emekwa ka o wute ya karị. Nke kadị njọ bụ gị ịlụ nwa okorobịa ahụ nanị n’ihi na ị na-emetere ya ebere. Ebere bụ ntọala na-adịghị mma maka alụmdi na nwunye.

Otú ọ dị, ikekwe ị na-atụgharị n’uche sị, ‘Ọ bụrụ na mụ alụghị ya, o nwere ike agaghi m enweta onye ọzọ.’ Dị ka otu isiokwu nke dị na magazin bụ́ Teen si kwuo ya, nwa agbọghọ pụrụ iche, sị: “Ọ bụghị ụdị ‘onye m chọrọ ịlụ,’ ma, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ bụ onye m hụrụ—ị chọghịkwanụ n’ezie ịnọ nanị gị.” N’eziokwu, ọchịchọ inwe onye ibe siri ike. Otú ọ dị, imeju ọchịchọ a n’ụzọ kwesịrị ekwesị apụtaghị ịlụ nnọọ onye ọ bụla. Ọ na-agụnye ịchọta onye ị pụrụ ịhụ n’anya n’ezie na onye nwere ike ibu ibu ọrụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka alụmdi na nwunye. (Ndị Efesọs 5:33) N’ihi ya, adịla ngwa n’ịhọrọ onye ị ga-alụ! Ọtụtụ ndị emesịwo kwaa ụta n’ihi ịlụ di na nwunye ọkụ ọkụ.

N’ikpeazụ, ụfọdụ pụrụ ịnọgide na-eyi oge mkpapụ ọbụna mgbe o doro ha anya na nwa okorobịa ahụ nwere àgwà ọjọọ ndị gbara ọkpụrụkpụ. ‘Ọ bụrụ na m nyetụkwuo ya oge,’ ka ha na-eche, ‘ọ pụrụ ịgbanwe.’ Ezi uche ọ̀ dị na nke a n’ezie? E kwuwerị, àgwà na omume ọjọọ na-agbanyesikarị mkpọrọgwụ ike ma na-esikwa oké ike ịgbanwe. Ọzọkwa, ọ bụrụgodị na o mee mgbanwe mberede ụfọdụ ndị dị ịrịba ama, ị̀ pụrụ ijide n’aka n’ezie na mgbanwe ndị a ga-adịgide? N’otu ọnọdụ ebe ọ dị otú a, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Karen ji amamihe kpebie ịkwụsị isoro otu nwa okorobịa na-eyi oge mkpapụ mgbe ọ ghọtara na ha enweghị otu ihe mgbaru ọsọ. “O siiri m ike,” ka ọ na-ekweta, “n’ihi na ọdịdị ya masịrị m. Ma amaara m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ime.”

Lezie Anya

N’eziokwu, ịjụ mmadụ adịghị mfe. Dị ka ngwugwu nke ihe dị mfe nkụwa dị n’ime ya, a ghaghị iji nlezianya mee ihe maka ọnọdụ ahụ. Ihe ndị na-esonụ bụ aro ole na ole ndị pụrụ inye aka.

Soro ndmrgma bonye ztozuru okè nn’gbakkwurta okwu ah. Ha nwere ike inyere gị aka ịmara ma ihe ndị ị na-atụ anya ha hà bụ ihe ndị na-apụchaghị ikwe omume ma eleghị anya.

Mee ka ihe na-ekwu doo anya ma breziokwu. Ekwela ka o nwee obi abụọ ọ bụla banyere ihe bụ echiche gị. Nanị ịsị “Ee e i meela” ga-egbochi ọtụtụ ndị ọzọ pụrụ ịchọ ịlụ gị ịbịa. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, jiri okwu ndị siri ike kwupụta ọjụjụ ị jụrụ, dị ka ihe atụ, “Ewela iwe, enweghị m mmasị n’ezie.” Kpachara anya ka ị ghara inye echiche bụ́ na ị pụrụ ịgbanwe obi gị ma ọ bụrụ na ọ gbalịtụkwuo. Ime ka o doo anya na ị hụghị ya n’anya kwesịrị ime ka a ghara inwe ihe mgbagwoju anya ọ bụla ma mee ka ọ dịrị ya mfe karị idi ndakpọ olileanya ahụ.

Jiri akmee ihe n’eziokwu. Ilu 12:18 na-ekwu, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ikwu okwu hoo haa, Bible na-ekwu na okwu anyị aghaghị ịdị ka “ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.”—Ndị Kọlọsi 4:6.

Kwsie ike ná mkpebi g. Ndị enyi, bụ́ ndị bu ezi ihe n’obi, ndị na-amakabeghị ma eleghị anya ihe kpatara mkpebi gị pụrụ ịrụgide gị inyetụkwu mmekọrịta ahụ oge. Ma mee elu mee ala ọ bụ gga-ata ahụhụ ihe si ná mkpebi gị pụta—ọ bụghị ndị enyi gị bu ezi ihe n’obi.

Mee ihe kwekrn’ihe i kwuru. Ọ pụrụ ịbụ na unu abụọ bụbu ezigbo enyi, ọ bụkwa ihe dị otú o kwesịrị ịchọ ka ihe nile dịghachi otú ha dịbu. Ma nke ahụ adịghị abụkebe ihe ezi uche dị na ya, ọ dịghịkwa ekwe omume. Mmetụta o nwere n’ebe ị nọ aghọwo nke ịhụnanya. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na ọ pụrụ nnọọ iwezụga mmetụta ndị ahụ n’ụsọ ma mee ka a ga-asị na ọ dịbeghị ihe merenụ? N’ihi ya, ọ bụ ezie na o doro anya na ọ kasị mma imeso ibe unu dị ka enyi, ịdị na-ekwurịta okwu na fon mgbe nile ma ọ bụ ịdị na-anọkọ ọnụ ọtụtụ mgbe ná ntụrụndụ yiri nnọọ ka ọ ga-eme ka ihe mgbu nke nwoke ka njọ. Ọ pụrụ ịbụ iji mmetụta uche ya na-egwuri egwu, nke ahụ agaghịkwa abụ igosi ya obiọma.

Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume ka ha ‘na-ekwu eziokwu’ gwa ibe ha. (Ndị Efesọs 4:25) Ime otú ahụ pụrụ isi ike, ma ọ pụrụ inyere unu abụọ aka ịdịrị ndụ unu na-aga.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 4 Ọ bụ ezie na isiokwu a lekwasịrị anya n’ebe ụmụ agbọghọ nọ, ụkpụrụ ndị dị na ya metụtakwara ụmụ okorobịa.

^ par. 5 A tụlere ihe ize ndụ ndị dị n’iyi oge mkpapụ mgbe mmadụ ka bụ nnọọ nwata ná mbipụta anyị nke February 8, 2001.

^ par. 10 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Ànyị Kwesịrị Ịgbasa?” nke dị ná mbipụta Teta! (Bekee) nke July 22, 1988.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Ọ bụghị nnọọ onye ọ bụla ị hụrụ ka ị pụrụ inwe ịhụnanya n’ebe ọ nọ

[Foto dị na peeji nke 14]

Mee ka ihe ị na-ekwu doo anya ma bụrụ eziokwu