Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Na-ezi Ihe Ma Na-enye Ihe Ọmụma’

‘Ọ Na-ezi Ihe Ma Na-enye Ihe Ọmụma’

‘Ọ Na-ezi Ihe Ma Na-enye Ihe Ọmụma’

Ihe ahụ e dere n’elu bụ otú otu nwoke dị afọ 26 bi n’Ebe Bụ́ Ugwu Ugwu na Papua New Guinea si kọwaa Teta!

N’akwụkwọ ozi o degaara alaka ụlọ ọrụ mba ahụ, o dere, sị: “M na-aja unu mma maka ibipụta ihe ọmụma dị iche iche n’isiokwu na-adọrọ mmasị, na-ekwu eziokwu, na-ezi ihe, na-enyekwa ihe ọmụma bụ́ ndị dị na magazin Teta! unu a ma ama.” Nwoke ahụ kọwara, sị: “Ọ bụ ezie na abụghị m onye òtù okpukpe Ndịàmà Jehova, ọ na-atọgbu m atọgbu ịgụ magazin Teta! ndị m na-anata ndị enyi m. . . . Oge ọ bụla m gụrụ otu magazin a, ọ na-adị m ka m detara unu akwụkwọ iji jaa unu mma maka ezi mgbalị unu. Ma mgbe m ga-achọ ide ya, ọzọ na-abịa mee ka m jide ọrụ n’aka ọzọ.”

Onye a na-agụ akwụkwọ anyị nke nwere ekele kwubiri, sị: “N’echiche m, Teta! bara uru n’ezie nye onye ọ bụla pụrụ ịgụ ihe. Site n’ala ala obi m, achọrọ m ikele unu nke ukwuu.”

Teta! na-enye ihe ọmụma n’ọtụtụ isiokwu. Nke kachasị mkpa, ọ na-ewulite obi ike ná nkwa Onye Okike maka ụwa ọhụrụ nke gaje ịnọchi anya usoro ihe ndị dị ugbu a.

Broshuọ nwere peeji 32 bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? na-eme ka nzube ahụ nke Chineke pụta ìhè, na-enye ihe ọmụma sitere na Bible iji gosi ihe dị mkpa ka anyị mee iji nweta nnwapụta ya. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.