Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Mkpagbu Soviet Lekwasịrị Anya

Ebe Mkpagbu Soviet Lekwasịrị Anya

Ebe Mkpagbu Soviet Lekwasịrị Anya

N’AGBANYEGHỊ ohere ụfọdụ e nyere Chọọchị Ọtọdọks nke Russia ka Soviet Union wee merie n’Agha Ụwa nke Abụọ, ọ nọgidere na-achịkwa ihe dị iche iche chọọchị ahụ na-eme. N’ihi ya, dị ka The Sword and the Shield, bụ́ akwụkwọ e dere na 1999 banyere akụkọ ihe mere eme nke KGB (Kọmitii Nchebe nke Mba Soviet), si kwuo, “Ndị KGB nwere nchegbu dị nnọọ ukwuu banyere ‘ịgba mgba okpuru’ ndị Kraịst ahụ, bụ́ ndị ha na-adịghị achịkwa kpọmkwem.” Olee òtù okpukpe ha bụ?

Nke kasị n’ọnụ ọgụgụ bụ Chọọchị Katọlik Gris nke Ukraine, nke bụ́ Chọọchị Katọlik nke ndị Ukraine ugbu a. Ihe dị ka mmadụ 4,000,000 na-ekpe ya. Dị ka The Sword and the Shield si kwuo, “ndị bishọp ya iri, ma e wezụga abụọ n’ime ha, nakwa ọtụtụ puku ndị ụkọchukwu na ndị na-ekpe ya nwụchara n’ogige ọrụ mmanye ndị dị na Siberia maka okwukwe ha.” Ndị ọzọ ndị KGB lekwasịrị anya bụ chọọchị Protestant ndị a na-edebaghị aha ha n’akwụkwọ, bụ́kwa ndị Ọchịchị na-adịghị emetụta kpọmkwem. N’ọgwụgwụ afọ ndị 1950, ndị KGB mere atụmatụ na òtù ndị a nke Protestant nwere ngụkọ nke ihe dị ka 100,000 ndị na-ekpe ha.

Ndị KGB weere Ndịàmà Jehova dị ka òtù Protestant, bụ́ ndị ha mere atụmatụ na 1968 na ha ruru ihe dị ka 20,000 na Soviet Union. Ruo ná mmalite nke Agha Ụwa nke Abụọ na 1939, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ebughị ibu. N’ihi ya, a maghị ha ama. Ma ọnọdụ ahụ gbanwere n’ụzọ dị ịrịba ama mgbe e nwere ọtụtụ puku Ndịàmà na Soviet Union na mberede. Olee otú nke a si mee?

Mmụba Dị Ịrịba Ama Amalite

N’akwụkwọ ya bụ Religion in the Soviet Union, nke e bipụtara na 1961, Walter Kolarz kwuru ihe abụọ kpatara mmụba a dị ịrịba ama. O kwuru na otu n’ime ihe kpatara ya bụ na “mba ndị Soviet Union weghaara na 1939-1940”—Latvia, Lithuania, Estonia, na Moldavia—nwere ọtụtụ “ìgwè Ndịàmà Jehova na-eje ozi na ha.” Ọzọkwa, Soviet Union weghakwaara akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ Poland na Czechoslovakia, bụ́ ebe e nwere ihe karịrị otu puku Ndịàmà, ịbụ akụkụ Ukraine. Ya mere, a kpọbatara Ndịàmà a nile na Soviet Union n’otu ntabi anya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya.

Uto ọzọ e nwere, “n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịdị ịtụnanya,” ka Kolarz dere, sitere ‘n’ogige ịta ahụhụ ndị Germany.’ Ndị Nazi tụrụ ọtụtụ puku Ndịàmà mkpọrọ n’ihi na ha jụrụ ịkwado Hitler na agha o ji na-awakpo mba ndị ọzọ. Kolarz kọwara na “obi ike na ịkwụsi ike nke ‘Ndịàmà’ ahụ masịrị ndị mkpọrọ bụ́ ndị Russia nọ n’ogige ndị a, ma eleghị anya ọ bụ ya mere ha ji nwee mmasị n’okpukpe ha.” N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị Russia malitere inwe okwukwe n’ebe Jehova Chineke nọ nakwa ná nzube ya magburu onwe ya maka elu ala mgbe ha si n’ogige ndị a laghachi Soviet Union.—Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.

N’ihi ihe ndị dị otú ahụ, a bịara nwee ọtụtụ puku Ndịàmà na Soviet Union ngwa ngwa. Ka ọ na-erule ná mmalite 1946, e nwere ma ọ dịkarịa ala 1,600, ka ọ na-erulekwa ọgwụgwụ nke afọ ndị 1940, e nwere ihe karịrị nnọọ 8,000. Ndị KGB chọpụtara uto a ma tụọ egwu, bụ́ ndị, dị ka e kwuru na mbụ, nwere nnọọ nchegbu banyere “ọrụ ndị Kraịst ahụ, bụ́ ndị ha na-adịghị achịkwa kpọmkwem.”

A Malite Mmegide

N’agbanyeghị ọnụ ọgụgụ dị nta nke Ndịàmà na Soviet Union, n’oge na-adịghị anya ndị ọchịchị Soviet malitere imegide ọrụ nkwusa ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ. N’Estonia mmegide ahụ malitere n’August 1948 mgbe e jidere mmadụ ise na-edu ndú n’ọrụ ahụ ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. “N’oge na-adịghị anya ọ bịara doo anya na ndị KGB chọrọ ijide mmadụ nile,” ka Onyeàmà si Estonia bụ́ Lembit Toom kwuru. E mere nke a n’ebe ọ bụla a hụrụ Ndịàmà na Soviet Union.

Ndị Soviet kọwara Ndịàmà dị ka ndị omekome kasị njọ nakwa dị ka ndị kasị eyi Ọchịchị Soviet na-ekweghị na Chineke egwu. Ya mere, n’ebe nile, a na-achụgharị ha, na-ejide ha, ma na-atụ ha mkpọrọ. Akwụkwọ bụ́ The Sword and the Shield kwuru, sị: “Nchegbu ndị isi KGB na-enwe banyere Ndị Jehova bụ, ma eleghị anya, ihe kasị egosi na ha amaghị ihe dị mkpa na ihe na-adịghị mkpa mgbe ha na-eme ihe banyere ọbụna ụdị ekwenyeghị ekwenye kasị nta.”

Nchegbu a pụtara nnọọ ìhè site ná mmegide a haziri nke ọma bụ́ nke e megidere Ndịàmà n’April 1951. Nanị afọ abụọ gara aga, na 1999, Prọfesọ Sergei Ivanenko, ọkà mmụta Russia a na-akwanyere ùgwù, kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ The People Who Are Never Without Their Bibles na ná mmalite April 1951, “a chụgara ihe karịrị ezinụlọ 5,000 nke Ndịàmà Jehova si Ukraine, Belarus, Moldavia, na mba ndị dị n’akụkụ oké osimiri Baltic nke Soviet ‘n’ógbè na-adịgide adịgide’ dị na Siberia, Ebe Ime Ime Ọwuwa Anyanwụ Siberia, na Kazakhstan.”

O Kwesịrị Ncheta

Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche mgbalị e tinyere ná mmegide ahụ—ịchịkọta n’otu ụbọchị ọtụtụ puku ezinụlọ Ndịàmà nọ n’ebe ahụ dum buru ibu? Cheedị banyere ịhazi ọtụtụ narị ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọtụtụ puku ndị ọrụ maka—nke mbụ ịchọpụta Ndịàmà ma jirizie abalị wakpoo ụlọ ha dị iche iche na mberede n’otu oge. Nke ọzọ, e nwere ọrụ nke itinye ndị ahụ n’ụgbọ ndị ịnyịnya na-adọkpụ nakwa n’ụgbọ ndị ọzọ; ibuga ha n’ebe ndị ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị; na itinye ha n’ụgbọ okporo ígwè ndị na-ebu ibu.

Chekwuo banyere ahụhụ nke ndị ahụ tara. Ị̀ pụrụ iche n’echiche ihe ọ dị ka ya ịbụ onye a manyere ịga ebe dị ọtụtụ kilomita—ruo ihe dị ka izu atọ ma ọ bụ karịa—n’ụgbọ okporo ígwè e ji ebu ibu, bụ́ nke mmadụ jubigara ókè a na-adịghị edebe ọcha, nwere nanị otu bọket maka ịga mposi? Gbalịakwa iche banyere ịbụ onye a gbahapụrụ n’ịkpa Siberia, na-amara na iji dị ndụ, ị ghaghị ịta ahụhụ n’ebe ahụ siri ike obibi.

Ọnwa gara aga bụ mgbaafọ 50 nke nchụpụ a chụpụrụ Ndịàmà Jehova n’April 1951. Iji kọọ akụkọ banyere ikwesị ntụkwasị obi ha n’agbanyeghị ọtụtụ iri afọ nke mkpagbu, e tinyewo ahụmahụ nke ndị lanarịrịnụ na vidio. Nke a na-ekpughe na—ọbụna dị ka ọ dị n’ihe banyere ndị Kraịst narị afọ mbụ—mgbalị ndị a na-eme iji gbochie ndị mmadụ ife Chineke ga-akụ afọ n’ala n’ikpeazụ.

Ihe Ndị Si ná Nchụpụ ahụ Pụta

Ndị Soviet chọpụtara n’oge na-adịghị anya na ịkwụsị Ndịàmà ife Jehova ga-esi nnọọ ike karịa otú ha chere. N’agbanyeghị na ndị ji ha ekweghị, Ndịàmà ahụ nọ na-abụ abụ otuto nye Jehova ka a na-achụpụ ha n’ike, ha kokwasịkwara ihe ndị e dere ede n’ụgbọ okporo ígwè ha bụ́ ndị na-ekwu, sị: “Ọ Bụ Ndịàmà Jehova Nọ na Ya.” Otu Onyeàmà kọwara, sị: “Anyị zutere ụgbọ okporo ígwè ndị ọzọ bu ndị a chụpụrụ achụpụ n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị, anyị hụkwara ihe ndị e dere ede e kokwasịrị n’ụgbọ okporo ígwè ndị ahụ.” Lee ihe agbamume nke a bụụrụ ha!

Ya mere kama ịbụ ndị nwere mwute, ndị ahụ a na-achụpụ achụpụ gosiri mmụọ nke ndị ozi Jisọs gosiri. Bible na-ekwu na mgbe a pịasịrị ha ihe ma nye ha iwu ka ha ghara ime nkwusa, ‘ha ahapụghị izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs.’ (Ọrụ 5:40-42) N’ezie, dị ka Kolarz kwuru banyere ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ, “nke a abụghị ọgwụgwụ nke ‘Ndịàmà’ na Russia, kama ọ bụ nanị mmalite nke akụkụ ọhụrụ nke ọrụ ime ntọghata ha. Ha gbalịdịrị ịgbasa okwukwe ha mgbe ha kwụsịrị n’ebe ndị ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị ka ha na-aga ebe a chụgara ha.”

Mgbe Ndịàmà ahụ ruru ebe dị iche iche ha na-aga e wee kwụsị ha, ha nwetara aha ọma n’ihi ịbụ ndị na-erube isi ma na-arụsi ọrụ ike. Ma, n’otu oge ahụ, n’iṅomi ndị ozi Kraịst, ha gwara ndị na-emegide ha n’eziokwu, sị: ‘Anyị apụghị ịghara ikwu banyere Chineke anyị.’ (Ọrụ 4:20) Ọtụtụ ndị ṅara ntị n’ihe Ndịàmà ahụ na-akụzi ma sonyere ha n’ijere Chineke ozi.

Ihe si na ya pụta bụ nnọọ dị ka Kolarz kọwara: “Site n’ịchụpụ ha, Gọọmenti Soviet mere ihe baara ha uru iji kpọsaa okwukwe ha. E si n’obodo nta ebe ‘Ndịàmà’ nọọrọ onwe ha [n’ebe ọdịda anyanwụ nke mba ndị mejupụtara Soviet] kpọga ha n’ógbè sara mbara karị, n’agbanyeghị na nke a bụ nanị ógbè dị egwu nke ogige ịta ahụhụ na ọrụ ike.”

Mgbalị Ndị E Mere Iji Nagide Uto

Ka oge na-aga, ndị Soviet nwalere ụzọ dị iche iche isi kwụsị Ndịàmà Jehova. Ebe ọ bụ na ajọ mkpagbu arụpụtaghị ihe ndị ha chọrọ, ha malitere usoro a haziri nke ọma nke ịgbasa okwu nduhie. A nwalechara iji akwụkwọ, ihe nkiri, na ihe omume redio mee ihe—nakwa mgbebata nke ndị ọrụ KGB a zụrụ azụ gbebatara n’ọgbakọ.

Nkatọ ahụ a katọrọ ha n’ebe nile mere ka ọtụtụ ndị hie ụzọ n’ịtụ Ndịàmà egwu na ịghara ịtụkwasị ha obi, dị ka ọ pụtara ìhè n’isiokwu dị na magazin Reader’s Digest nke August 1982, Mbipụta nke Canada. Ọ bụ Vladimir Bukovsky, onye Russia e kwere ka ọ kwaga England na 1976, dere ya. O dere, sị: “N’otu uhuruchi na London, ahụrụ m ihe e dere n’otu ụlọ bụ́ nke na-agụ, sị: “NDỊÀMÀ JEHOVA . . . Apụghị m ịgụrụ gaa n’ihu, ọ tụrụ m n’anya, nke na ọ fọrọ nke nta ka m mawa jijiji.”

Vladimir kọwara ihe mere o ji tụọ egwu n’ụzọ na-enweghị isi: “Ndị a bụ òtù nzuzo nke ndị ọchịchị ji eyi ụmụaka egwu ná mba anyị . . . Na U.S.S.R., ị ga-ahụ ezigbo ‘Ndịàmà’ nanị n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ. N’ebe a, anọ m n’ihu otu ụlọ, n’ihu ihe e dere ede. Mmadụ ọ̀ pụrụ ịga leta ha n’ezie?” ka ọ jụrụ. Iji mee ka ihe mere o ji na-atụ egwu pụta ìhè, Vladimir kwubiri, sị: “E ji iwe na-achụgharị ‘Ndịàmà’ ná mba anyị dị ka a na-achụgharị ndị Mafia ná mba ha, ihe ndị a na-aghọtabeghị banyere ha bụ otu ihe.”

Ma, n’agbanyeghị ajọ mkpagbu na okwu nduhie, Ndịàmà nọgidesiri ike ma mụbaa n’ọnụ ọgụgụ. Akwụkwọ ndị Soviet ndị dị ka The Truths About Jehovah’s Witnesses, bụ́ nke e bipụtara mkpụrụ 100,000 n’asụsụ Russian na 1978, gosiri mkpa ọ dị ịga n’ihu n’ịgbasa okwu nduhie megide Ndịàmà. V. V. Konik, bụ́ onye dere ya, nke kọwara otú Ndịàmà si na-aga n’ihu n’ime nkwusa ha n’agbanyeghị oké ihe mgbochi, nyere ndụmọdụ, sị: “Ndị Soviet na-eme nchọpụta banyere okpukpe kwesịrị ịchọpụta ụzọ dị irè karị nke a ga-esi merie ozizi ndịàmà Jehova.”

N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Bụrụ Ebe Mmegide ahụ Lekwasịrị Anya?

N’ikwu ya n’ụzọ dị nkenke, mmegide ndị Soviet kasị lekwasị Ndịàmà Jehova anya n’ihi na ha na-eṅomi ụmụazụ Jisọs nke oge mbụ. Na narị afọ mbụ, e nyere ndị ozi iwu ka ha “ghara izi ihe n’aha [Jisọs].” Ma, ka e mesịrị ndị na-akpagbu ha mere mkpesa, sị: “Lee, unu ewerewo ozizi unu mejuo Jerusalem.” Ndị ozi ahụ agọghị agọ na ha adịghị eme nkwusa n’agbanyeghị iwu e nyere ha ka ha kwusị, kama nke ahụ, ha ji nkwanye ùgwù zaa, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:27-29.

Ndịàmà Jehova taa na-ejikwa iwu ahụ Jisọs nyere ụmụazụ ya bụ́ “ime nkwusa nye ndị mmadụ na ịgba àmà nke ọma,” akpọrọ ihe. (Ọrụ 10:42, NW) N’akwụkwọ ya bụ́ The Kremlin’s Human Dilemma, Maurice Hindus kọwara na ọ bụ “ịnụ ọkụ n’obi a na-apụghị ịbịanyụ abịanyụ maka izisa ozi ọma” nke Ndịàmà mere ka ha bụrụ “nsogbu karịsịa nye Moscow ma [mee] ka ha na ndị uwe ojii Soviet nọgide na-enwe nsogbu.” O kwukwara, sị: “A pụghị ịkwụsị ha. A bịanyụọ ha n’otu ebe, ha esi n’ebe ọzọ bilite.”

“Ruo n’ókè m maara,” ka onye Russia na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Sergei Ivanenko dere, “nzukọ Ndịàmà Jehova bụ nanị òtù okpukpe dị na USSR nke ọnụ ọgụgụ ndị nọ na ya mụbara n’agbanyeghị mmachibido iwu na mkpagbu.” N’eziokwu, okpukpe ndị ọzọ nọgidere na-aga n’ihu, gụnyere nke a kasị mara, Chọọchị Ọtọdọks nke Russia. Ọ ga-amasị gị ịmata otú chọọchị ahụ na Ndịàmà si nwechaa ike ịlanarị mmegide Soviet megidere ha.

[Igbe dị na peeji nke 14]

Ndị “A Kasị Jiri Obi Ọjọọ Kpagbuo”

Akwụkwọ bụ́ A Concise Encyclopædia of Russia nke 1964 kwuru na Ndịàmà Jehova “dịbigara uchu ókè n’ime ntọghata,” ha bụkwa “òtù okpukpe a kasị jiri obi ọjọọ kpagbuo na Soviet Union.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

OTU N’IME ỌTỤTỤ PUKU—Fyodor Kalin Akọwaa Nchụpụ A Chụpụrụ Ezinụlọ Ha

Ezinụlọ anyị bi n’obodo nta bụ́ Vilshanitsa, n’ebe ọdịda anyanwụ Ukraine. N’isi ụtụtụ April 8, 1951, ndị ọfịsa chị nkịta bịara kpọtee anyị n’ụra ma gwa anyị na gọọmenti dị na Moscow nyere iwu ka a chụga anyị Siberia. Ma ọ bụrụ na anyị abịanye aka n’akwụkwọ na-ekwu na anyị abụkwaghị Ndịàmà Jehova, a ga-ahapụ anyị. Ezinụlọ anyị bụ́ nke mmadụ asaa mejupụtara, gụnyere ndị mụrụ m na ụmụnne m, kpebisiri ike ịnọgide na-abụ Ndịàmà. Adị m afọ 19 mgbe ahụ.

Otu ọfịsa kwuru, sị: “burunụ àgwà, ọka, ntụ ọka, pickles, cabbage—ma ọ bụghị otú ahụ, olee otú unu ga-esi nye ụmụaka nri?” E kwekwara ka anyị gbuo ọkụkọ na ezì ma buru anụ ha gawa. Ha ji ụgbọ abụọ ịnyịnya na-adọkpụ bịa, e tinyere ihe nile na ha ma buga anyị n’obodo bụ́ Hriplin. N’ebe ahụ ka a fajuru anyị, bụ́ ndị ruru ihe dị ka mmadụ 40 ma ọ bụ mmadụ 50, n’otu ụgbọ okporo ígwè na-ebu ibu ma kwachie ụzọ ya.

Ụgbọ okporo ígwè ahụ nwere ibé osisi ole na ole anyị ga na-arahụ ụra na ha—ndị na-agaghị ezuru mmadụ nile—nakwa ebe ihe e ji afụnwu ọkụ nke nwere kol na nkụ ụfọdụ. Anyị na-eji ihe ahụ e ji afụnwu ọkụ esi nri, na-eji ite ndị anyị wetara esi nri. Ma e nweghị ụlọ mposi—ọ bụ nnọọ n’ime bọket ka anyị na-anyụnye nsị́. Ka e mesịrị, anyị wapuru oghere dị gburugburu n’ala ụgbọ ahụ, tinye bọket ahụ n’ime ya, ma jiri blanket gebichie ya ka a ghara ịdị na-ahụ onye na-anyụ nsị́.

Anyị bikọrọ ọnụ n’ụgbọ ahụ na-akpa akpa bụ́ nke e ji ebu ibu ka anyị ji nwayọọ nwayọọ na-aga ọtụtụ kilomita iji ruo ebe anyị na-amaghị. Ná mmalite, anyị datụrụ mbà n’obi. Ma ka anyị na-abụkọ abụ Alaeze ọnụ—na-eji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi nke na ka e mesịrị olu gụrụ anyị—anyị nwere ọṅụ. Ọfịsa na-emeghe ụzọ ma gwa anyị ka anyị kwụsị, ma anyị adịghị akwụsị ruo mgbe anyị bụsịrị nke anyị kpụ n’ọnụ. Mgbe anyị kwụsịtụrụ n’ebe ndị ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị, ọtụtụ ndị matara na a na-achụpụ Ndịàmà Jehova. N’ikpeazụ, mgbe anyị nọsịrị ụbọchị 17 ma ọ bụ ụbọchị 18 n’ụgbọ okporo ígwè ahụ na-ebu ibu, a kwụsịrị anyị na Siberia n’ebe dịdewere Ọdọ Mmiri Baikal.

[Foto]

Eguzo m n’ahịrị dị n’azụ, n’aka nri

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]

ARMAGEDDON—Ihe Nkiri Soviet Ji Gbasaa Okwu Nduhie

Ndị Soviet mepụtara ihe nkiri bụ́ Armageddon ná mgbalị imebi aha Ndịàmà Jehova. Ọ bụ akụkọ e chepụtara echepụta banyere mmekọrịta ịhụnanya dị n’etiti otu nwa okorobịa bụ́ onye agha Soviet na otu nwa agbọghọ bụ́ onye a rabanyere n’iso Ndịàmà. Ná ngwụsị ihe nkiri ahụ, obere nwanne nwa agbọghọ ahụ nke nwanyị nwụrụ n’ihe ọghọm nke otu onye nlekọta bụ́ Onyeàmà kpatara, bụ́ onye e gosiri dị ka onye ndị nledo nke America ji mere ngwá ọrụ.

N’ikwu banyere ihe nkiri ahụ, bụ́ nke kpaliri mmetụta nke ndị kiriri ya, akwụkwọ akụkọ Ukraine bụ́ The Red Flag nke May 14, 1963, kwuru, sị: “N’ụzọ dị otú ahụ, okwu nduhie nke ndị na-ekweghị na Chineke dị irè, na-eme ka mmadụ kwenye, a pụkwara iji ya eme ihe n’obodo nta ndị ọzọ dị ná mba a bụ́ ebe ndị a na-egosi ụdị ihe nkiri a.”

[Foto dị na peeji nke 14]

E ji ụgbọ okporo ígwè na-ebu ibu buga ọtụtụ puku mmadụ Siberia