Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ikiri Ụwa” Agaa Ụlọ Akwụkwọ

“Ikiri Ụwa” Agaa Ụlọ Akwụkwọ

“Ikiri Ụwa” Agaa Ụlọ Akwụkwọ

EDELMIRA, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 15 onye bi na United States jiri magazin Teta! mee ihe n’ụzọ dị irè n’ụlọ akwụkwọ ha. N’otu akwụkwọ ozi o degaara ndị na-ebipụta ya, o dere, sị:

“Anyị na-enwe ihe omume kwa Friday ịkọ banyere okwu a kpụ n’ọnụ. Agụrụ m Teta! nke May 8 2000 ma kpebie isi n’otu isiokwu dị ‘n’Ikiri Ụwa’ bụ́ ‘Ụlọ Ọrụ Na-emepụta Ụtaba Ekweta na Ise Siga Na-akpata Ọrịa Cancer’ nweta ihe m ga-akọ. Edepụtara m isi ihe ndị dị n’ime ya ma gụọrọ ya ndị klas anyị. Onye nkụzi na ụmụ akwụkwọ gere ntị nke ọma. Mgbe m gụsịrị, otu nwa klas anyị jụrụ m—n’ihu ndị klas—ma ò were m ogologo oge iji nweta ihe m kọrọ. Enyere m ya Teta! ahụ. O ji oké mmasị malite ịgụ ya, otu nwa okoro nke nọ n’ọgbakọ anyị bụ́ onye ya na nwa agbọghọ ahụ so mụọ ihe ọmụmụ na-esonụ kwukwara na mgbe ya hụrụ nwa agbọghọ ahụ na ọ ka na-agụ ya. Ugbu a, nwa agbọghọ ahụ kwuru na ya chọrọ ịdị na-enweta mbipụta ọ bụla nke ma Teta! ma nke ya na ya na-agakọ bụ́ Ụlọ Nche.

“Ahụmahụ a mere ka m nwee obi ụtọ ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ kụziiri m na anyị nwere nnọọ ọtụtụ ohere ikwu okwu banyere Jehova.” Edelmira mechiri akwụkwọ ozi ya, site n’ide, sị: “Ana m ekele unu maka ịrụsi ọrụ ike n’ibipụta magazin ndị a. Biko nọgidenụ na-ebipụta ‘Ikiri Ụwa’!”