Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Ọ̀ Bụ Chineke Agbụrụ nke Ndị Juu?

Jehova Ọ̀ Bụ Chineke Agbụrụ nke Ndị Juu?

Echiche nke Bible

Jehova Ọ̀ Bụ Chineke Agbụrụ nke Ndị Juu?

N’ỌTỤTỤ ala taa, a na-ejikọta aha Jehova na nzukọ nke Ndịàmà Jehova nke oge a n’ụzọ chiri anya. Ma, aha a dị n’ụfọdụ nsụgharị Bible ndị okpukpe dị iche iche na-eji eme ihe ma e wezụga Ndịàmà Jehova. N’ezie, a nọwo na-eji aha ahụ bụ́ Jehova, dị ka e ji Tetragrammaton gosipụta ya, eme ihe ruo ọtụtụ puku afọ.

Mgbe ụfọdụ a na-akpọ Jehova “Chineke Israel.” (1 Ihe E Mere 17:24) Okwu a emewo ka ụfọdụ ndị chee na ọ bụ nanị chi agbụrụ bụ́ nke ndị Hibru nwetara n’obodo ọzọ ma ọ bụ nke ha mere n’onwe ha. “Ná mmalite a na-ele [Jehova] anya dị ka chi agbụrụ nwere obi ọjọọ nke ndị Israel,” ka Karen Armstrong, onye dere akwụkwọ bụ́ A History of God na-azọrọ. “Ka e mesịrị, ndị amụma Israel . . . , n’ihe dị ka narị afọ nke asaa na nke isii B.C., mere ka Chineke agbụrụ a bụrụ onye kachasị elu.”

Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere okpukpe anwawo ikwu na aha ahụ bụ́ Jehova malitere na Kenean ma ọ bụ n’Ijipt. Ndị ọzọ na-ekwusi ike na ọ “bụ aha ochie nke agbụrụ” nakwa na ọ dịghị ezo aka n’ebe Chineke nke e kwuru okwu banyere ya ‘n’Agba Ọhụrụ’ nọ. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Gịnị ka a na-achọpụta ma e jiri nlezianya gụọ Bible?

Jehova—Chineke nke Ndị Nile

Bible kwetara na Jehova na mba Israel nwere mmekọrịta chiri anya. Ma nke a abụghị ihe mere a ga-eji lee ya anya dị ka nanị chi agbụrụ. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ Chineke nke nanị ndị Juu? Ọ́ bụghịkwa Chineke nke ndị mba ọzọ?” Gịnị ka Pọl zara n’ụzọ doro anya? “Ee, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.” (Ndị Rom 3:29) Ònye bụ Chineke ahụ Pọl na-ezo aka n’ebe ọ nọ? N’otu akwụkwọ ozi a o degaara ndị Rom, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ugboro 19. N’ihota onye amụma Hibru oge ochie bụ́ Joel, onyeozi ahụ kwuru na ọ bụghị nanị ndị Juu kamakwa “onye bla nke ga-akpọku aha [Jehova, NW], a ga-azọpụta ya.”—Ndị Rom 10:13, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche; Joel 2:32.

Ndị Israel ahọrọghị Jehova ịbụ Chineke ha; kama nke ahụ, Jehova họọrọ ha iji mezuo nzube ya—ya bụ, iji dozie ụzọ maka Mesaịa. Ọzọkwa, a na-ejikọta n’ụzọ chiri anya ọdịnihu nke chi agbụrụ na nke ndị na-efe ya. Ọ bụrụ na e merie otu agbụrụ, a na-emerikwa chi ya. Nke a emebeghị Jehova.

Ọgbụgba ndụ Jehova na Abraham gbara—nke malitere ịdị irè ọtụtụ narị afọ tupu oge ndị Kraịst—ga-ewetara ndị nke mba nile ngọzi, bụ́ nke na-egosi mmasị Chineke nwere n’ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ nọ. (Jenesis 12:1-3; Ọrụ 10:34, 35; 11:18) Eze Israel, bụ́ Devid gosiri na ọ bụghị nanị ala Israel ka Jehova nwere: “Jehova nwe ụwa na ùjú ya; elu ụwa dum mmadụ bi na ndị bi n’ime ya.”—Abụ Ọma 24:1.

Ka e mesịrị mgbe nwa Devid bụ́ Solomọn raara ụlọ nsọ nke ofufe nye Jehova, o gosiri na e nwere ụzọ dịnụ ndị dị umeala n’obi nke mba ọ bụla pụrụ isi bịakwute Jehova. N’ekpere nraranye o kpere, Solomọn kwuru, sị: “Ọzọkwa, ihe banyere onye ala ọzọ, nke ọ bụghị ná ndị Gị, bụ́ Israel, ka o sitere, ma o siwo n’ala dị anya bịa . . . kpee ekpere n’ebe ụlọ a dị; Gị onwe gị nụrụkwa n’eluigwe, bụ́ ọnọdụ obibi Gị guzosiri ike, mee dị ka ihe nile si dị nke onye ala ọzọ ahụ na-akpọku Gị; ka ndị nile nke ụwa wee mara aha Gị, ịtụ egwu Gị, dị ka ndị Gị, bụ́ Israel, si eme.”—1 Ndị Eze 8:41-43.

A Jụ Israel

N’ihe banyere mmekọrịta dị n’etiti Israel na Jehova, Prọfesọ C. J. Labuschagne dere, sị: “N’akụkọ ihe mere eme ya nile Israel chọpụtara ugboro ugboro na Chineke nke ‘mba’ pụrụ imeso mba ya ihe n’eletụghị ha anya n’ihu nakwa ọbụna n’ụzọ megidere ha.” Na narị afọ mbụ bụ́ mgbe Israel jụrụ Mesaịa ahụ, Jehova jụrụ mba ahụ.

Otú ọ dị, ndị Kraịst gara n’ihu na-eji aha Jehova eme ihe. Ka ọgbakọ ndị Kraịst na-eto, ndị mejupụtara ya bịara gụnye ndị nke mba nile. Ka ọ na-eduzi nnọkọ ndị Kraịst e nwere na Jerusalem, onye juu na-eso ụzọ bụ́ Jemes kwuru banyere Chineke dị ka onye ‘letara ndị mba ọzọ [na-abụghị ndị Juu], isi n’etiti ha wepụtara aha Ya otu nd.’ Dị ka ihe na-egosi na e buwo nke a n’amụma, Jemes hotara n’oge ahụ otu amụma dị n’akwụkwọ Emọs bụ́ nke a kpọrọ aha Jehova na ya.—Ọrụ 15:2, 12-18; Emọs 9:11, 12.

Ọ Na-eche Banyere Mmadụ Nile, Na-agọzi Mmadụ Nile

N’ịkwadokwu ọbụbụ Jehova bụ Chineke nke ụwa nile, Pọl dere, sị: “Ọ dịghị ihe dị iche n’etiti onye Juu na onye Grik: n’ihi na otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onyenwe ọha mmadụ, brkwa Onye nwere akụ̀ hie nne inye ndnile na-akpku Ya.” (Ndị Rom 10:12, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ee, ihe nile a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị na-erube isi pụrụ inweta ngọzi Jehova.

Jehova kwere nkwa inye ụmụ ya nile bụ́ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ma na-erube isi—n’agbanyeghị mba na agbụrụ ha—ọdịnihu dị ebube. Okwu ya na-akọwa ndị dị otú ahụ dị ka “ihe a na-achọsi ike nke mba nile.” (Hagaị 2:7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ndị a na-abịa mara Jehova ma hụ ya n’anya. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-ekwu banyere ha, sị: “Mba nile ga-abịa kpọọkwa isiala n’ihu Gị [Jehova]; n’ihi na e mere ka ezi omume Gị nile pụta ìhè.”—Mkpughe 15:4.

[Foto dị na peeji nke 28]

Mosis, ka o bu Iwu Iri ahụ