Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpagbu Soviet Kpagburu Okpukpe

Mkpagbu Soviet Kpagburu Okpukpe

Mkpagbu Soviet Kpagburu Okpukpe

E GUZOBERE Union of Soviet Socialist Republics na 1922, nke Russia kasị nnọọ ukwuu na ya ma bụrụ nke a kasị anụ aha ya n’ime mba anọ mbụ mejupụtara ya. O mesịrị gbasaa ịgụnye mba 15, ọ fọkwara nke nta ka ọ gbasaruo otu ụzọ n’ime ụzọ isii nke mbara ala nke ụwa. Ma Soviet Union tisasịrị na mberede na 1991. * N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ bụ mba mbụ gbalịrị ime ka ndị bi na ya ghara ikwere na Chineke.

Vladimir Lenin, onye mbụ chịrị Soviet Union, bụ onye na-eso ụzọ Karl Marx, bụ́ onye kọwara Iso Ụzọ Kraịst dị ka ngwá ọrụ nke mmegbu. Marx kpọrọ okpukpe “ọgwụ mmegharị anya nke ọha mmadụ,” Lenin mesịkwara kwuo, sị: “Echiche ọ bụla e nwere banyere okpukpe, echiche ọ bụla e nwetụrụ banyere chi ọ bụla, . . . bụ ihe arụ jọgburu onwe ya.”

Mgbe Onyeisi Ọtọdọks nke Russia bụ́ Tikhon nwụrụ na 1925, e kweghị ka chọọchị ahụ họpụta onyeisi ọzọ. Mmegide sochirinụ e megidere okpukpe mere ka ihe ka ọtụtụ n’ụlọ chọọchị bụrụ ndị e bibiri ebibi ma ọ bụ bụrụ ndị e ji eme ihe na-emetụtaghị okpukpe. A mara ndị ụkọchukwu ikpe ịga mkpọrọ n’ogige ndị ohu na-arụ ọrụ, bụ́ ebe ọtụtụ n’ime ha nọ nwụọ. “Mgbe Joseph Stalin na-achị ná ngwụsị afọ ndị 1920 nakwa n’afọ ndị 1930,” ka Encyclopædia Britannica na-akọwa, “chọọchị nwetara mkpagbu a kwafuru ọbara na ya, bụ́ nke tara isi ọtụtụ puku mmadụ. Ka ọ na-erule 1939, e nwere nanị ndị bishọp Ọtọdọks atọ ma ọ bụ anọ na-eje ozi na 100 chọọchị e nyere ikike.”

Otú ọ dị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’otu ntabi anya, e nwere mgbanwe dị ịrịba.

Agha Ụwa nke Abụọ na Okpukpe

Na 1939, Nazi Germany, nke ya na Soviet Union jikọrọ aka n’oge ahụ, wakporo Poland, si otú a na-amalite Agha Ụwa nke Abụọ. N’ime otu afọ, Soviet Union weghaara mba 4 ikpeazụ n’ime mba 15 mejupụtara ya—Latvia, Lithuania, Estonia, na Moldavia. N’agbanyeghị nke ahụ, na June 1941, Germany wakporo Soviet Union n’ụzọ siri ike, bụ́ nke bịara nnọọ Stalin na mberede. Ka ọ na-erule ọgwụgwụ afọ ahụ, ndị agha Germany eruola ná mpụga Moscow, mmeri a ga-emeri Soviet Union yikwara ihe dị nso.

N’enweghị olileanya, Stalin gbalịrị ịchịkọta mba ahụ maka ihe ndị Russia kpọrọ Oké Agha Ịhụ Mba n’Anya. Stalin ghọtara na ọ dị ya mkpa inye chọọchị ahụ ohere ụfọdụ iji nweta nkwado ndị mmadụ maka agha ahụ, ebe ọ bụ na ọtụtụ nde n’ime ha ka ji okpukpe kpọrọ ihe. Gịnị si ná mgbanwe a dị ịrịba ama nke ụkpụrụ Stalin nwere n’ebe okpukpe dị pụta?

Site ná nkwado nke chọọchị ahụ, a chịkọtara ndị Russia maka agha ahụ, ka ọ na-erulekwa 1945 ndị Soviet meriri ndị Germany n’ụzọ dị ịrịba ama. Mgbe a kwụsịtụrụ mmegide Soviet na-emegide okpukpe, ọnụ ọgụgụ chọọchị Ọtọdọks mụbaruru 25,000, ọnụ ọgụgụ ndị ụkọchukwu rukwara 33,000.

A Maliteghachi Mmegide

Otú ọ dị, n’eziokwu, nzube nke ndị na-achị Soviet nke bụ́ ime ka ndị ha na-achị chezọọ Chineke agbanwebeghị. The Encyclopædia Britannica na-akọwa, sị: “Praịm Minista Nikita Khrushchev malitere ụkpụrụ ọhụrụ nke imegide okpukpe na 1959-1964, na-ebelata ọnụ ọgụgụ chọọchị ndị e nyere ikike ịbụ ihe na-erughị 10,000. A họpụtara Onyeisi Chọọchị bụ́ Pimen na 1971 mgbe Alexis nwụrụ, ọ bụkwa ezie na ọtụtụ nde ndị mmadụ ka na-aga chọọchị ahụ, a maghị ihe ọdịnihu ya ga-abụ.” *

E mesịa anyị ga-atụle otú Chọọchị Ọtọdọks nke Russia si nwee ihe ịga nke ọma n’ịlanarị mmegide nke Soviet maliteghachiri. Ma olee otú e si mesoo okpukpe ndị ọzọ dị na Soviet Union ihe? N’ime ndị a, olee nke a kasị kpagbuo, ọ bụkwa n’ihi gịnị? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Mba ndị na-esonụ bụ mba 15 nweere onwe ha bụ́ ndị mejupụtaburu Soviet: Armenia, Azerbaijan, Belarus, Estonia, Georgia, Kazakhstan, Kyrgyzstan, Latvia, Lithuania, Moldova, Russia, Tajikistan, Turkmenistan, Ukraine, na Uzbekistan.

^ par. 11 Mgbe ụfọdụ a na-asụpekwa aha Alexis nke Mbụ, nke bụ́ onyeisi Chọọchị Ọtọdọks nke Russia site na 1945 ruo 1970, na Alexis nke Abụọ, nke bụ́ onyeisi site na 1990 ruo ugbu a dị ka Alexy, Aleksi, Aleksei, na Alexei.

[Foto dị na peeji nke 11]

Lenin kpọrọ ‘echiche ọ bụla e nwere banyere Chineke ihe arụ jọgburu onwe ya’

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée d’Histoire Contemporaine—BDIC