Otú Okpukpe Si Lanarị
Otú Okpukpe Si Lanarị
KA Ọ na-erule mgbe Nazi Germany wakporo Russia na June 1941, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị Soviet ekpochapụwo Chọọchị Ọtọdọks nke Russia. Ma mgbe ndị Nazi wakposịrị ha, ndị Soviet malitere ịgbanwe otú ha si emeso okpukpe. Gịnị kpaliri nke a?
Richard Overy, prọfesọ akụkọ ihe mere nke oge a nke King’s College, London, kọwara n’akwụkwọ ya bụ́ Russia’s War—Blood Upon the Snow, sị: “Bishọp Sergei [Sergius], bụ́ onye nduzi Chọọchị ahụ, rịọrọ ndị chọọchị ya n’ụbọchị ahụ ndị Germany wakporo ha ka ha mee ihe nile iji mee ka e nwee mmeri. O dere ma ọ dịkarịa ala akwụkwọ ozi iri abụọ na atọ n’afọ abụọ sochirinụ, na-akpọku ndị chọọchị ya ka ha lụọrọ mba na-ekweghị na Chineke bụ́ nke ha bi na ya agha.” Ya mere, dị ka Overy gara n’ihu ikwu, ‘Stalin kwere ka okpukpe nwewe ọganihu ọzọ.’
Na 1943, Stalin mesịrị kweta ịkwado Chọọchị Ọtọdọks site n’ịhọpụta Sergius dị ka onyeisi ọhụrụ ya. “Ndị isi Chọọchị ahụ zaghachiri site n’ịnakọta ndị chọọchị ha ego iji kwado ndị agha ụgbọala nke Soviet,” ka Overy kwuru. “Ndị ụkọchukwu na ndị bishọp gbara ndị
chọọchị ha ume ime ihe kwekọrọ n’okpukpe ha, bụ́ nke Chineke na Stalin na-anakwere.”N’ịkọwa oge a nke akụkọ ihe mere eme Russia, Sergei Ivanenko, onye Russia bụ́ ọkà mmụta okpukpe dere, sị: ‘Akwụkwọ Chọọchị Ọtọdọkọs nke Russia, bụ́ The Journal of the Moscow Patriarchate, toro Stalin dị ka onye ndú na onye nkụzi kasị ukwuu e nwetụrụla, nke mba dị iche iche, nke Chineke zipụrụ ịzọpụta mba a pụọ ná mmegbu, n’aka ndị nwe ala, na n’aka ndị aka ji akụ̀. Ọ kpọkuru ndị chọọchị ahụ ka ha were ndụ ha chụọ àjà iji chebe USSR pụọ n’aka ndị iro ya nakwa ka ha nye ihe nile ha nwere iji wulite Ọchịchị Kọmunist.’
Ndị “Baara Ndị KGB Uru nke Ukwuu”
Ọbụna mgbe Agha Ụwa nke Abụọ bisịrị na 1945, Chọọchị Ọtọdọks nọgidere na-abara ndị Ọchịchị Kọmunist uru. Akwụkwọ bụ́ The Soviet Union: The Fifty Years, nke Harrison Salisbury dere, kpughere otú nke a si dị otú ahụ, sị: “Mgbe agha ahụ biri, ndị ndú okpukpe mere ihe kwekọrọ n’iwu Stalin tiri maka iso mba dị iche iche na-emekọrịta ihe n’oge Agha Nzuzo.”
Akwụkwọ e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya bụ́ The Sword and the Shield na-akọwa otú ndị ndú okpukpe si mee ihe Soviet chọrọ. Ọ na-akọwa na Onyeisi Chọọchị bụ́ Alexis nke Mbụ, onye nọchịrị Sergius dị ka onyeisi na 1945, “ghọrọ onye òtù nke Kansụl Na-ahụ Maka Udo n’Ụwa, nke bụ́ òtù Soviet e hiwere na 1949.” Akwụkwọ ahụ na-ekwukwa na ya na Bishọp Nikolai “baara ndị KGB [Kọmitii Nchebe nke Mba Soviet] uru nke ukwuu dị ka ndị nyeere ha aka inwe ikike ụfọdụ.”
N’ụzọ dị ịrịba ama, na 1955, Onyeisi Chọọchị bụ́ Alexis nke Mbụ kwuru, sị: “Chọọchị Ọtọdọks nke Russia na-akwado kpam kpam iwu gọọmenti anyị tiri maka iji udo soro mba dị iche iche na-emekọrịta ihe, ọ bụghị n’ihi na e kwuru na Chọọchị anyị enwereghị onwe ya, kama ọ bụ n’ihi na ụkpụrụ Soviet ziri ezi ma kwekọọ n’echiche dị iche iche nke ndị Kraịst bụ́ ndị Chọọchị anyị na-ekwusa banyere ha.”
Ná mbipụta nke January 22, 2000, nke akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian nke London, England, e kwuru na Georgi Edelshtein, onye nkatọ bụ́ ụkọchukwu nke Chọọchị Ọtọdọks sịrị: “E ji nlezianya họta ndị bishọp ahụ nile ka ha wee soro gọọmenti Soviet rụkọọ ọrụ. Ha nile bụ ndị ọrụ KGB. Ọ bụ ihe a maara nke ọma na ọ bụ ndị KGB were Onyeisi Chọọchị bụ́ Alexy n’ọrụ ma nye ya utu aha bụ́ Drozdov. Taa, ha na-agakwa n’ihu n’otu ndọrọ ndọrọ
ọchịchị ahụ ha tinyere aka n’afọ 20 ma ọ bụ afọ 30 gara aga.”Ihe Enyemaka nke Mba Soviet
Banyere mmekọrịta dị n’etiti Chọọchị Ọtọdọks na ndị Soviet, magazin bụ́ Life nke September 14, 1959, kwuru, sị: “Stalin nyere okpukpe ohere ụfọdụ, chọọchị ahụ mesokwara ya dị ka eze ukwu. Otu ministri pụrụ iche nke gọọmenti na-ahụ na njikọ aka nke Chọọchị Ọtọdọks na gọọmenti dịgidere, Ọchịchị Kọmunist ejiriwokwa chọọchị ahụ na-eme ihe kemgbe dị ka ngwá ọrụ mba Soviet.”
N’akwụkwọ o dere na 1956 bụ́ The Church in Soviet Russia, Matthew Spinka, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere chọọchị Russia, kwadoro na e nwere mmekọrịta chiri anya n’etiti Chọọchị na Ọchịchị. “Onyeisi Chọọchị bụ́ Alexei nke nọ ugbu a,” ka o dere, “amarawo ụma mee ka Chọọchị ya bụrụ ngwá ọrụ gọọmenti.” N’ezie, Chọọchị Ọtọdọks lanarịrị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, site n’ịghọ ihe enyemaka nke Ọchịchị. ‘Ma nke ahụ ọ̀ bụ oké ihe ọjọọ?’ ka ị pụrụ ịjụ. Tụlee otú Chineke na Kraịst si ele okwu ahụ anya.
Jisọs Kraịst kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu esiteghị n’ụwa, kama Mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa.” Okwu Chineke jụkwara kpọmkwem, sị: “Unu ndị na-akwa iko, ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke?” (Jọn 15:19; Jemes 4:4) Ya mere, dị ka Bible si kwuo ya, chọọchị ahụ mere onwe ya akwụna okpukpe nke ya na “ndị eze ụwa kwara iko.” O gosipụtawo onwe ya ịbụ akụkụ nke ihe Bible kpọrọ “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile nke ụwa.”—Mkpughe 17:1-6.
Otú Ndịàmà Si Lanarị
N’ụzọ dị iche, Jisọs Kraịst kpughere otú a ga-esi mara ezi ụmụazụ ya, na-ekwu, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ịhụnanya a bụ ihe bụ́ isi mere ka Ndịàmà lanarị n’ebe bụbu Soviet Union, dị ka akụkọ na-esonụ dị na The Sword and the Shield na-egosi. “Ndị Jehova nyeere ndị òtù ha aka n’ụdị nile, bụ́ ndị nọ n’ogige [ọrụ mmanye] dị iche iche ma ọ bụ ndị a chụgara n’akụkụ ọzọ nke mba ha, na-enye ha ego, nri na ákwà.”
Ihe so ná “nri” ahụ e nyere ndị ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ bụ nri ime mmụọ—Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. ‘Okwu nile si n’ọnụ Chineke pụta,’ bụ́ ndị Jisọs kwuru na ha dị anyị mkpa iji kwagide ndụ ime mmụọ anyị, dị na Bible. (Matiu 4:4) Ndị zobatara akwụkwọ n’ogige ndị ahụ tinyere onwe ha n’oké ihe ize ndụ, ebe ọ bụ na a na-enye onye ọ bụla a chọpụtara na-eme nke a nnukwu ntaramahụhụ.
A tụrụ Helene Celmina, onye Latvia, mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ Potma dị na Russia site na 1962 ruo 1966. O dere Women in Soviet Prisons, bụ́ akwụkwọ ọ kọwara n’ime ya, sị: “A mara Ụlọ Nche n’ụlọ ha. Ebe ọ bụ na a na-ejide ndị mmadụ n’ihi inwe mbipụta ndị a, a pụrụ ịghọta ihe mere ndị nlekọta ji nwee nchegbu ma na-ewe iwe maka onwunwe e nwere akwụkwọ ndị a n’ogige ahụ.”
ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova ikpe ịga mkpọrọ ọrụ ahụhụ ruo afọ iri, nanị maka inwe mbipụta ole na ole nke magazinN’ezie, mmadụ itinye nnwere onwe na nchebe ya n’ihe ize ndụ iji mee ka e nweta enyemaka ime mmụọ bụ ihe àmà nke ịhụnanya ndị Kraịst! Ma, ọ bụ ezie na nke a bụ ihe dị mkpa mere ka Ndịàmà lanarị, e nwere ọbụna ihe ọzọ ka mkpa. “Ọ dịghị onye pụrụ ịghọta,” ka Helene Celmina kwuru, “otú akwụkwọ ndị a machibidoro iwu si enwe ike abata n’ebe a e ji waya nwere ogwu gbaa gburugburu ma bụrụ ebe a na-adịghị enyekebe ndị mmadụ ohere ịkpakọrịta.” O yiri ihe na-apụghị ime eme, ebe ọ bụ na a na-enyocha onye ọ bụla na-abanye n’ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma. “O yiri ka a ga-asị na ndị mmụọ ozi na-efebata n’abalị ma tọgbọ ha,” ka onye a na-ede akwụkwọ dere.
N’ezie, Chineke kwere nkwa na ya agaghị ahapụ, ma ọ bụ gbahapụ, ndị ya. Ya mere, Ndịàmà Jehova nọ n’ebe bụbu Soviet Union na-ekweta ngwa ngwa, dị ka onye ọbụ abụ so dee Bible kwetara, sị: “Lee, Chineke bụ onye na-enyere m aka.” (Abụ Ọma 54:4; Joshua 1:5) N’ezie, enyemaka ya dị mkpa iji mee ka Ndịàmà nọ n’ebe bụbu Soviet Union lanarị!
Otú Ọnọdụ Si Gbanwee
Na March 27, 1991, Ndịàmà Jehova ghọrọ ndị iwu kwadoro na Soviet Union mgbe a bịanyere aka n’akwụkwọ nkwado iwu bụ́ nke na-agụnye nkwupụta okwu na-esonụ: “Nzube nke Òtù Okpukpe ahụ bụ ịga n’ihu n’ọrụ okpukpe ahụ nke ime ka a mara aha Jehova Chineke na ndokwa ịhụnanya o meere ihe a kpọrọ mmadụ site n’Alaeze eluigwe ya nke dị n’aka Jisọs Kraịst.”
Ụfọdụ n’ime ụzọ ndị e depụtara n’akwụkwọ ahụ isi gaa n’ihu n’ọrụ a nke okpukpe bụ ime nkwusa n’ihu ọha na ịga n’ụlọ ndị mmadụ, ịkụziri ndị chọrọ ige ntị eziokwu Bible, iduzi ọmụmụ Bible n’efu site n’enyemaka nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, na ikesa Bible.
Kemgbe a bịanyesịrị aka n’akwụkwọ ahụ n’ihe karịrị afọ iri gara aga, Soviet Union etisasịwo, ọnọdụ okpukpe agbanwewokwa n’ụzọ dị ukwuu ná mba 15 bụbu mba Soviet. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọdịnihu nke okpukpe n’ebe ahụ nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa?
[Igbe dị na peeji nke 19]
Njikọ Aka nke Chọọchị na Ndị Soviet
N’akwụkwọ o bipụtara na 1945, bú Russia Is No Riddle, Edmund Stevens dere, sị: “Chọọchị ahụ leziri nnọọ anya ịghara ichezọ onye foro ya ọdụ n’udu mmiri. Ọ maara nke ọma na iji kwụghachi ụgwọ ihe ọma e meere ya, gọọmenti na-atụ anya ka Chọọchị ahụ kwadosie Ọchịchị ike ma mee ihe ruo n’ókè ụfọdụ.”
Stevens gara n’ihu ịkọwa, sị: “Nkwenkwe e nwere eri ọtụtụ narị afọ na ọ bụ okpukpe Ọchịchị kwadoro gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na Chọọchị Ọtọdọks, n’ihi ya, ọ nakweere n’ụzọ dị mfe, ọrụ ọhụrụ nke iso Gọọmenti Soviet jikọsie aka ike.”
Ụlọ ọrụ Keston nyochara nke ọma njikọ aka nke Alexis nke Abụọ, bụ́ onyeisi Chọọchị Ọtọdọks nke Russia, na ndị Soviet n’oge gara aga. Akụkọ ya kwubiri, sị: “Njikọ aka nke Aleksi adịghị iche n’ibe ya—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nnukwu ndị ndú okpukpe nile gọọmenti kwadoro—gụnyere ndị Katọlik, ndị Baptist, ndị Adventist, ndị Alakụba, na ndị Buddha—ghọrọ ndị ọrụ KGB. N’ezie, akụkọ mgbaafọ nke kọwara mbanye Aleksi banyere n’ọrụ ahụ kọkwara ọtụtụ ndị ọrụ ọzọ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha nọ na Chọọchị Lutheran nke Estonia.”
[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]
Irute Ndị Nọ n’Ogige Ndị Ahụ
Viktors Kalnins, onye Latvia bụ́ odeakụkọ, nọrọ ihe ka ukwuu na mkpọrọ afọ iri ya (1962-1972) n’ogige ọrụ mmanye dị na Mordovia, ihe dị ka kilomita 400 na ndịda ọwụwa anyanwụ Moscow. N’ajụjụ ọnụ onye edemede Teta! gbara ya na March 1979, a jụrụ Kalnins, sị: “Ndịàmà ahụ a tụrụ mkpọrọ hà maara ihe na-aga ná nzukọ ha na United States ebe a ma ọ bụ ná mba ndị ọzọ?”
“Ha maara,” ka Kalnins zara, “ọ bụkwa site n’akwụkwọ ndị ha na-enweta. . . . Ha na-egosidị m magazin ha. Amaghị m ebe a na-ezo akwụkwọ ndị ahụ; a na-agbanwe ya site n’oge ruo n’oge. Ma onye ọ bụla maara na akwụkwọ ndị ahụ dị n’ogige ahụ. . . . Ndịàmà Jehova nọgidere na-agbalị izo akwụkwọ ndị ahụ, ndị na-eche ha nche nọgidere na-agbalị ịchọta akwụkwọ ndị ahụ!”
Mgbe a jụrụ ya, sị: “Ndịàmà Jehova hà gbalịrị ịgwa gị banyere nkwenkwe ha?” Kalnins zara, sị: “Eenụ! A maara ha nke ọma. Anyị maara ihe nile banyere Amagedọn . . . Ha na-ekwu ihe dị ukwuu banyere njedebe nke ọrịa.”
[Foto]
Ndịàmà nọ n’ogige Mordovia nọgidere na-eji obi ike na-ekwusa eziokwu Bible
[Foto dị na peeji nke 17]
A chụpụrụ ezinụlọ Vovchuk gaa Irkutsk, Siberia, na 1951, ha nọgidekwara dị ka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ruo taa
[Foto dị na peeji nke 18]
N’ihi nkwado chọọchị nyere n’oge Agha Ụwa nke Abụo, Stalin kwere ka okpukpe gaa n’ihu ruo nwa oge
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto U.S. Army
[Foto dị na peeji nke 18]
Onyeisi Chọọchị bụ́ Alexis nke Mbụ (1945-1970) kwuru, sị: ‘Ụkpụrụ Soviet kwekọrọ n’echiche dị iche iche nke ndị Kraịst bụ́ ndị Chọọchị anyị na-ekwusa banyere ha’
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe Nchebe Etiti maka ihe odide ndị metụtara film/foto/phonograph nke Saint-Petersburg