Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Ahụ Ike Maka Mmadụ Nile—Ọ̀ Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ A Pụrụ Iru?

Ezi Ahụ Ike Maka Mmadụ Nile—Ọ̀ Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ A Pụrụ Iru?

Ezi Ahụ Ike Maka Mmadụ Nile—Ọ̀ Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ A Pụrụ Iru?

Ị̀ CHỌRỌ ka gị na ezinụlọ gị nwee ike inwe ahụ ike ka mma? N’ezie, ị chọrọ. Ma, ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime anyị pụrụ nanị ịdị na-arịatụ ọrịa oge ụfọdụ, nye ọtụtụ nde mmadụ, ọrịa bụ ihe mgbu ga-adịru oge nile ha dị ndụ.

Otú o sina dị, a na-eme mgbalị dị ukwuu iji belata ọrịa. Tụlee ihe banyere Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO), bụ́ ngalaba nke Mba Ndị Dị n’Otu. N’otu nzukọ nke òtù WHO haziri na 1978, ndị si mba 134 nakwa ngalaba 67 nke òtù UN bịa ya kwetara na ahụ ike abụghị nanị nnwere onwe pụọ n’ọrịa. Ahụ ike, dị ka ha kwupụtara, bụ “ọnọdụ ịdị mma zuru ezu nke anụ ahụ, uche na mmekọrịta ndị mmadụ.” Ndị ahụ bịaranụ meziri ihe pụtara ìhè bụ́ ikwupụta na ahụ ike bụ “ihe bụ́ isi ruuru mmadụ”! Òtù WHO si otú ahụ setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke inweta “ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ike dị mma maka mmadụ nile bi n’ụwa.”

Ihe mgbaru ọsọ dị otú ahụ na-akpali mmasị, ọbụna magbuo onwe ya. Ma ruo n’ókè ha aṅaa ka o yiri ihe a ga-enweta enweta? N’ime ọrụ nile ụmụ mmadụ na-arụ, nkà mmụta ọgwụ aghọwo n’ezie otu n’ime ndị a kasị atụkwasị obi ma nwee mmasị na ha. Dị ka akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ The European si kwuo, “echiche a na-enwekarị banyere ‘ọgwụgwọ ọrụ ebube’: nke bụ́ otu mkpụrụ ọgwụ ịgwọ otu ọrịa, amarawo ndị nọ n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ahụ.” Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, maka ọrịa ọ bụla, anyị na-atụ anya ka ndị ọrụ ahụ ike gwọọ ya n’ụzọ dị mfe n’egbughị oge. Ndị ọrụ ahụ ike hà pụrụ imezu ụdị atụmanya a dị elu?