Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Mgbanwe Okpukpe na Britain

Ndị Britain na-agbanwe okpukpe n’ụzọ dị ngwa karịa mgbe ọ bụla ọzọ, na-enwe ihe dị ka 1,000 mmadụ na-agafe n’okpukpe ọzọ kwa izu, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sunday Telegraph na-akọ. “Ndị Anglịkan na-aghọ ndị Roman Katọlik, ndị Roman Katọlik na-aghọkwa ndị Anglịkan, ndị okpukpe ndị Juu na-aghọ ndị Buddha, ndị Alakụba na-aghọ ndị Anglịkan, ndị Roman Katọlik na-aghọkwa ndị okpukpe ndị Juu.” A kasị atọghata mmadụ gaa n’Alakụba, n’okpukpe Buddha, n’Okpukpe Ọgbọ Ọhụrụ, na n’ịgọ mmụọ. Dr. Ahmed Andrews nke Mahadum Derby dị n’England, bụ́ onye ya onwe ya gbanwekwara okpukpe ya, na-ekwu, sị: “Ná mba a, e nwere ndị ọcha dị n’agbata 5,000 na 10,000 a tọghatara gaa n’Alakụba, ihe kakwa ọtụtụ ná ndị m maara bụbu ndị Katọlik.” Ndị mejupụtara pasent 10 ruo pasent 30 nke ndị a na-atọghata gaa n’okpukpe Buddha bụ ndị okpukpe ndị Juu. Ọnụ ọgụgụ ndị Anglịkan a tọghatara gaa n’Okpukpe Katọlik bịara rịa elu mgbe Chọọchị England kpebisịrị ichi ndị inyom echichi. Dị ka Rabaị Jonathan Romain si kwuo, “ndị mmadụ na-enwe agụụ ihe ime mmụọ, ya mere ha na-achọ ya n’okpukpe ndị ọzọ.”

Ụzọ Ndụ na Ọrịa cancer

“Ọrịa cancer bụ nnọọ nke ebe i bi, ihe ị na-eme, na ihe na-eme gị ná ndụ na-akpata kama ịbụ nke ihe ị bụ na-akpata, ka nnyocha e mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụ ejima 90,000 gosiworo,” ka akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Guardian na-ekwu. Ọ bụ Dr. Paul Lichtenstein nke Ụlọ Akwụkwọ Karolinska dị na Sweden duziri ndị nnyocha mere nchọpụta a. Ọ na-ekwu, sị: “Ihe ndị na-eme gburugburu mmadụ na-emetụta ya karịa mkpụrụ ndụ ihe nketa.” Ndị ọkà mmụta sayensị kwenyere na ise siga na-akpata ihe dị ka pasent 35 nke ọrịa cancer, ebe o yiri ka ọ̀ bụ ihe oriri na-akpata pasent 30 ọzọ. Mkpụrụ ndụ ihe nketa so n’ihe na-akpata ọrịa cancer akụkụ ahụ na-ewepụta mmiri na-agwakọta ná mwụsị ahụ, nke eriri afọ, na nke ara, ma Dr. Tim Key nke Òtù Britain Na-ahụ Maka Inyocha Ọrịa Cancer n’Oxford, England, na-adụ ọdụ, sị: “Ọ bụrụgodị na . . . [ọrịa cancer] dị ezinụlọ unu n’ọbara, otú i si ebi ndụ dị nnọọ mkpa karị. I kwesịghị ise siga, i kwesịrị ịkpachara anya maka ihe ndị ị na-eri. Ihe ndị ahụ na-enye aka.”

Jiri Ụbụrụ Gị Na-eme Ihe

“Ike ụbụrụ nwere pụrụ ịdịgide otú ọ dị ruo ogologo ndụ anyị nile, ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-eji ya eme ihe,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Vancouver Sun na-ekwu. “Na-agụ ihe, na-agụ ihe, na-agụ ihe,” ka Dr. Amir Soas nke Ngalaba Nkà Ọgwụ na Ahụ Ike nke Mahadum Case Western Reserve dị n’Ohio, U.S.A., na-ekwu. Iji mee ka ike ụbụrụ dịgide ka ị na-eme okenye, họrọ ihe omume ntụrụndụ ndị chọrọ ka e jiri ụbụrụ mee ihe, mụọ asụsụ ọhụrụ, mụọ ịkpọ ngwá egwú, ma ọ bụ na-enwe mkparịta ụka ndị na-akpali akpali. “Ihe ọ bụla na-akpali ụbụrụ iche echiche,” ka Dr. Soas na-ekwu. Ọ na-agbakwa ume ka e belata oge e ji ekiri TV. “Mgbe ị na-ekiri telivishọn, ụbụrụ gị na-anọrọ nkịtị,” ka ọ na-ekwu. Sun na-ekwukwa na ikuku oxygen sitere n’akwara nkesa ọbara ndị na-enweghị nsogbu dịkwa ụbụrụ na-enweghị nsogbu mkpa. Ya mere, mmega ahụ na nri kwesịrị ekwesị, otu ihe ndị ahụ na-enye aka egbochi ọrịa obi na ọrịa shuga, na-enyekwara ụbụrụ aka.

Enyí “Adịghị Echezọ Ndị Enyi Ha”

“Enyí adịghị echezọ ihe ma ọlị—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, ha adịghị echezọ ndị enyi ha,” ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. Dr. Karen McComb nke Mahadum Sussex, England, tinyere na teepu “ubé ọkpụkpọ òkù” bụ́ nke dị ala nke nne enyí Africa ndị nọ n’Ogige Nchekwa Anụmanụ Mba dị n’Amboseli, Kenya, na-arịba ama enyí ndị na-anọkọkarị ọnụ nakwa ndị na-adịghị anọkọ. Mgbe e mesịrị, ọ kpọnyere ubé ndị ahụ ka ìgwè enyí 27 nụ ha iji chọpụta otú ha ga-esi meghachi omume. Ọ bụrụ na anụmanụ ndị ahụ maara nke bere ubé ahụ nke ọma, ha na-ebeghachi ozugbo. Ọ bụrụ na ha amachaghị nke bere ubé ahụ, ha na-ege ntị ma ghara ibeghachi, ubé ha na-amaghị na-ewe ha iwe, ha na-emekwa ihe iji chebe onwe ha. “Ha pụrụ ịmata ndị si ma ọ dịkarịa ala n’ìgwè 14 ọzọ site n’ubé ha, nke na-egosi na enyí nke ọ bụla pụrụ icheta ihe dị ka 100 enyí ndị ọzọ toworo eto,” ka isiokwu ahụ kwuru. Enyí pụkwara icheta ndị mmadụ. John Partridge, onyeisi ngalaba na-elekọta anụ ndị na-enye nwa ara n’Ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa na Bristol, England, na-ekwu na enyí Esia o lekọtara ruo afọ 18 matara ya mgbe ya lọghachiri ka afọ atọ ya na-arụghị ọrụ n’ebe ahụ gasịrị.

Ndị Na-eji Ngwá Nkà na Ụzụ Bụ́ Ọkpọka Azụ Ahịa Iwu Ọgwụ Ọjọọ

N’oge gara aga, ndị Colombia na-azụ ahịa iwu ọgwụ ọjọọ na-ezo ngwá ahịa ha n’ụgbọelu ndị na-ebu mmadụ na n’ụgbọ mmiri. Otú ọ dị, n’oge na-adịbeghị anya, o juru ndị ọchịchị anya ịchọpụta na ndị na-azụ ahịa iwu na-ewu ụgbọ okpuru mmiri bụ́ ọkpọka nke ahụ ya dị okpukpu abụọ, nke dị ihe karịrị mita atọ n’obosara, bụ́ nke nwere ike ibu ihe dị ka cocaine dị tọn 200. Ndị bi nso n’ebe ahụ bụ́ ndị na-enyo ihe a na-eme n’ebe ahụ enyo duuru ndị uwe ojii gaa ‘n’otu ụlọ nkwakọba ihe dị ná mpụga Bogotá, nke dị mita 2,300 n’elu ugwu Andes nakwa kilomita 300 site n’ọdụ ụgbọ mmiri ọ bụla,” ka The New York Times na-ekwu. Ndị bu ụgbọ okpuru mmiri ahụ dị mita 300 gaara enwewo ike ịgafe oké osimiri, pụta n’elu mmiri na Miami ma ọ bụ n’obodo ndị ọzọ dị n’ụsọ oké osimiri ma butuo ọgwụ ọjọọ ndị ha bu na nzuzo.” Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye nọ n’ebe a na-ewu ya, ọ dịghịkwa onye e jidere, a na-eche na aka ndị omempụ Russia na America dị na ya, gụnyere injinia ụgbọ agha okpuru mmiri bụ́ onye nwere nkà. Obu ngwongwo a na-adọkpụ adọkpụ pụwororị ibuga akụkụ ụgbọ okpuru mmiri ahụ n’ụsọ oké osimiri ugboro atọ, ka ndị ọrụ ọchịchị kwuru. Ihe ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na-eme iji buga ngwá ahịa ha ná mba ọzọ tụrụ ha n’anya.

Ụmụ Anụmanụ Na-aba Ụba n’Ógbè DMZ

“Kemgbe e guzobere DMZ [Ógbè E Mere Ka Agha Ghara Ịdịkwa na Ya] mgbe Agha Korea biri na 1953, usoro nchebe e nwere emewo ka ebe ahụ na ebe ndị gbara ya gburugburu dịrị nnọọ n’enweghị ihe na-emebi ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal na-ekwu. “Ọ bụ ezie na ọganihu akụ̀ na ụba ebibiwo ihe ka ukwuu ná mpaghara ala ndị ọzọ dị na Korea abụọ ahụ, ebe ókèala nke ala ahụ dịịrị banye na mmiri abụrụwo ebe ụmụ anụmanụ na-akasị agbaba.” Nnụnụ na anụmanụ ndị a na-adịghị ahụkebe na ndị nke nọ n’ihe ize ndụ dịcha n’ebe ahụ. A na-eche na agụ na agụ owuru dịkwa ebe ahụ. Ndị ọkà n’ihe banyere gburugburu ebe obibi na-enwezi nchegbu na mgbalị ndị e mere n’oge na-adịghị anya maka udo ịdị n’etiti Ebe Ugwu na Ebe Ndịda Korea pụrụ ibibi ógbè DMZ dị nnọọ nchebe nye ụmụ anụmanụ. Ya mere, ha na-arịọ ka e nwee “ókèala nke nwere ‘ogige udo’” iji chebe ụmụ anụ ọhịa dị n’ebe ahụ nakwa iji nye ohere ka ụmụ anụmanụ si n’akụkụ abụọ ahụ na-agbarịta ibe ha. Journal ahụ na-ekwu, sị: “Ndị ọkà n’ihe banyere gburugburu ebe obibi na-enweta agbamume site ná nkwenye e kwenyere na udo pụrụ inye aka mee ka anụmanụ ndị a dịghachi n’otu, otú ahụ ọbụbụenyi ahụ dịwanyere mma siwororị mee ka ndị òtù ezinụlọ e kewara eri ogologo oge dịghachi n’otu.”

Oge Nkwụsịtụ Maka Nri Ehihie nke Na-akpata Nrụgide

“Na Britain ebe a na-eji ịdị ike eme nganga, a na-ele ndị na-eri nri ehihie anya dị ka ndị na-adịghị ike, ka ndị e were n’ọrụ bụ́ ndị ọrụ riri ahụ na-ahọrọ ịnọ n’oche ha taa mgbadume kama iri nri ehihe,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Financial Times nke London na-akọ. Nchọpụta e mere n’oge na-adịbeghị anya na-egosi na nkezi “oge nri ehihie” nke onye Britain ọ bụla bụzi nanị minit 36. Ndị ọkachamara n’ihe banyere ọgwụ na-ekwu na ịkwụsịtụ ọrụ n’ehihie na-ebelata nrụgide. Ma ndị ụfọdụ were ndị mmadụ n’ọrụ na-eme ndokwa maka inwe nnọkọ n’oge nri ehihie, si otú a na-eme ka ndị ọrụ ghara ịkwụsịtụ ọrụ ma ọlị. Datamonitor, ụlọ ọrụ nchọpụta chịkọtara akụkọ ahụ, na-ekwu, sị: “N’ịbụ ndị a matara n’ọnyà n’ọha mmadụ na-achọ ka ndị ọrụ na-arụpụtakwu ihe ma bụrụ nke na-ele oge anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, oge nkwụsịtụ maka nri ehihie na-abụrụ ọtụtụ ndị oge nkwụsịtụ na-adịghị mma.” Onye na-akọwa okwu na Datamonitor bụ́ Sarah Nunny kwukwara, sị: “Anyị na-asọ mpi n’ahịa ndị zuru ụwa ọnụ. Ọ dịkwaghị ekwe omume ịsị, ‘Aga m eme ya ma e mesịa.’ A ga-emerịrị ya ugbu a.”

Ụtaba Iri Mmadụ Ahụ na Mexico

Dị ka akụkụ nke ihe omume a malitere ọhụrụ maka igbochi na ịchịkwa ụtaba iri mmadụ ahụ na Mexico, José Antonio González Fernández, bụ́ odeakwụkwọ maka ahụ ike ná mba ahụ mgbe ahụ, kwuru na pasent 27.7 nke ndị Mexico na-ese ụtaba. Ihe kasị enye nchegbu bụ na ihe dị ka otu nde nke ndị na-ese ụtaba nọ n’agbata afọ 12 na 17. Maazị González kwuru na ọ bụ ise ụtaba na-akpata ọnwụ nke ihe e mere atụmatụ ya ịbụ mmadụ 122 na-anwụ na Mexico kwa ụbọchị. Ọ kwara arịrị maka “aka ọjọọ nke a na-akpa ọganihu akụ̀ na ụba mba ahụ, afọ ndụ mmadụ ndị a gaara eji arụpụta ihe bụ́ ndị a lara n’iyi, . . . na mmerụ ahụ anyị na-enweta n’ụzọ ụfọdụ n’ihi ndị na-anọ anyị nso ese ụtaba.”

Ọ̀ Bụ Igbo Mkpa Ime Mmụọ?

Iwuwanye ewu nke ndị ndụmọdụ na-eduzi onwe ha bụ́ ndị na-akwado inwe obi ike n’onwe onye, echiche ziri ezi, na ihe ịga nke ọma nke onwe onye “na-ekwekọ n’àgwà nke ndị nọpụrụ nnọọ iche n’ebe okpukpe a haziri ahazi dị,” ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ Globe and Mail na-ekwu. A na-enwe nnọọ mmasị n’ihe ime mmụọ, ma inwe mmasị n’ebe ndị e si enwetakarị ihe ime mmụọ na-ebelata.” Nnyocha e mere na-egosi na ọ bụ ezie na pasent 80 nke ndị Canada na-ekwu na ha kweere na Chineke, pasent 22 nke ndị na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst na-ewere nkwenkwe onwe ha dị ka ndị dị mkpa karịa ozizi chọọchị ọ bụla. Akụkọ ahụ Globe kọrọ kpọrọ ọnọdụ ime mmụọ nke a na-enweta site n’iduzi onwe onye “ihe ga-enyere gị aka inwetaghachi ume ma maliteghachi ịchọ inwe ihe ịga nke ọma.”