Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Njem Ileta Ụmụ Anụmanụ na Ghana

Njem Ileta Ụmụ Anụmanụ na Ghana

Njem Ileta Ụmụ Anụmanụ na Ghana

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GHANA

KA ỌCHỊCHỊRỊ na alụlụ nyere ohere maka ìhè ụtụtụ, anyị jiri nwayọọ nwayọọ gaa ihe karịrị kilomita 80 n’ụzọ a na-eteghị ete e si aga Ogige Nchekwa Ụmụ Anụ Mba nke Mole nke dị n’Ebe Ugwu Ghana. Ihe kasị dịrị na gburugburu ala ahụ bụ ahịhịa, ọhịa, na osisi ndị na-etoghị ogologo. Mgbe ụfọdụ, anyị gbafere otu obodo nta nwere ụlọ nta ndị e ji ụrọ wuo ma jiri ahịhịa kpuchie elu ha.

Lee nnọọ ọdịiche dịnụ mgbe anyị rutere Damongo, bụ́ ime obodo na-ekwo ekwo nwere ụlọ ahịa dị iche iche, ụzọ ndị e tere ete, na ọtụtụ ụgbọala! Ụmụaka yi yunifọm na-achatụ odo odo na nchara nchara na-eje akwụkwọ. Ụmụ nwanyị ndị yi ọmarịcha ákwà bu ụdị ibu dị iche iche n’isi—nkụ, ihe oriri, na arịa ndị mmiri juru. Obere ụgbọala na traktọ na-egbusi opi ike, ndị ígwè na-agbafekwa. Anyị ga-agakwu kilomita 20.

N’Ogige Nchekwa Ụmụ Anụ Mba nke Mole

N’ikpeazụ anyị rutere n’ogige nchekwa ụmụ anụ ahụ. Dị ka onye dugharịrị anyị, bụ́ Zechariah, si kwuo, a malitere inwe Ogige Nchekwa Ụmụ Anụ nke Mole na 1971, obosara ala ya dịkwa square kilomita 4,840. E nwere ụdị anụ 93 na-enye nwa ara, ụdị anụ 9 na-ebi ma ná mmiri ma n’elu ala, na ụdị anụ 33 na-akpụ akpụ dị n’ihe ndekọ ogige nchekwa ụmụ anụ ahụ. Ha na-agụnye ọdụm, agụ owuru, anụ ọhịa hyena tụrụ àgwà, edi, enyí, anụ ọhịa bongo, atụ, ezì ọhịa, ele mmiri, anụ ọhịa duiker, anụ ọhịa genet, anụ ọhịa hartebeest, ufu, adaka, ụdị enwe dị iche iche, ele, ebi ogwu, agụ iyi, na agwọ, tinyere eke. Ọzọkwa, e nwere ihe karịrị ụdị nnụnụ 300 n’ebe ahụ.

Anyị si n’ahịhịa ruru anyị n’ikpere na-agafe wee na-akụgbu ijiji ojii ndị agụụ ji bekwasịrị anyị n’ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị rutere otu ìgwè ele nso. Na mbụ, o siri ike ịhụ ha, ebe ọ bụ na ụcha ha na ebe ha nọ yiri. Ka anyị na-ekiri ha, ha legidesiri anyị anya ike otú anyị na-ele ha, nke na o siri ike ịmata ndị njem nleta na ndị a bịara ikiri. Ka anyị na-ese foto, anyị kụjara n’ihi oké mkpọtụ anụmanụ mere n’aka nri anyị. N’igosi iwe ya maka mbata anyị batara n’ebe ọ nọọrọ onwe ya, otu oké ele mmiri buru ibu gbabara n’ime ọhịa dị n’ihu anyị.

Anyị hụziri enyí anọ gbara agba n’okpuru otu osisi buru ibu. Ha ji imi ha na-adọtu alaka ya ma na-ata akwụkwọ ya ndị dị nro. Anyị gakwuru ha nso, ma mgbe anyị nọ nani mita iri site n’ebe ha nọ, Zechariah gwara anyị ka anyị see ha foto. Ọ kụrụ aka n’isi égbè ya, nke dara ụda ọla bụ́ nke chụpụrụ enyí ndị ahụ n’okpuru osisi ahụ ma nye anyị ohere iseta ọbụna foto ndị ka mma. N’ebe na-adịghị anya, enyí ndị ahụ chọtara ebe apịtị dị ma jiri ya sawa ahụ. Zechariah kọwara na ụcha enyí ndị ahụ na-agbanwe agbanwe—site n’ịdị ojii ha gaa n’ịcha ọbara ọbara ma ọ bụ nchara nchara—na-adabere n’ụcha apịtị ha sara ahụ na ya.

Anyị gamitụkwuru ma hụzuo ọdịdị nke ogige ahụ. Osisi ndị dị na ya gụnyere acacia na shea. Ka anyị na-ala, anyị si otu ụzọ ahụ enyí ndị ahụ si. Ha ka nọ n’ebe dị ọtụtụ mita site n’ebe anyị nọ, ma enyí nke kasịnụ n’ìgwè ahụ weliri ntị ya, dịrị njikere ịlụ ọgụ, ma chụrụ anyị bịawa. Ọ̀ na-abịa ọgụ? Zechariah gwara anyị ka anyị ghara inye onwe anyị nsogbu, ma n’otu mgbe ahụ, ọ nyapụtara égbè ya n’ubu ya ma duru anyị pụọ n’ụzọ ahụ enyí ndị ahụ sị na-abịa. Anyị nọgidere n’aga, onye na-edugharị anyị bu égbè ya—anyị jikwa kamera anyị—dịkwa njikere ise foto. N’oge na-adịghị anya, anyị ahụkwaghị enyí ndị ahụ.

Zechariah kọwara na enyí ndị nọ n’ogige ahụ adịghịzi asọ mmadụ asọ ọbụna ụfọdụ na-abịakwa nso. Ka ha na-ahụ enyí ndị ahụ ugboro ugboro, ndị na-edugharị ndị nleta malitere inye ha aha. Otu ka ha na-akpọ Knobby [Akpụ] n’ihi na o nwere otu nnukwu akpụ n’ahụ ya. Enyí ọzọ ka ha na-akpọ Action [Onye Ike] n’ihi na ọ na-amajakarị ndị njem nleta.

Ọzọ, anyị zutere ọtụtụ adaka. Anyị kiriri ka ha na-aṅagharị n’elu osisi ma ọ bụ na agbagharị n’ala. Onye na-edugharị anyị ziri anyị nne adaka ku ụmụ abụọ, otu ka ọ kwọ n’azụ nke ọzọ ka o ku n’obi ya. Ha bụ ejima, ka ọ kọwara.

N’ezie, anyị ahụwo ọtụtụ anụmanụ taa. Zechariah gwara anyị na iji hụ ụmụ anụmanụ n’oge ọkọchị—n’agbata April na June—nanị ihe mmadụ ga-eme bụ ichere ha n’olulu mmiri n’ihi na ụmụ anụmanụ ga-abịa n’ìgwè bara ụba maka ịṅụ mmiri. O kwukwara na site n’iji ụgbọala injin na-arụ ọrụ na wheel ya anọ banye n’ogige ahụ, mmadụ pụrụ ịhụ ọtụtụ anụmanụ ndị ọzọ, gụnyere atụ na ọdụm.

Ọ bụzi oge maka nri ehihie. Ka anyị nọ na-eri nri, otu adaka buru ibu bịara nọkwasị n’elu pikọpụ dị n’akụkụ ụgbọala anyị ma legidesie anya ike ná nri m n’atụghị egwu. Adaka ndị ọzọ gafere, ha na ụfọdụ ele na otu ezì ọhịa, n’ikpeazụ enyí anọ rịgooro n’elu ugwu dị nso. Ikekwe anyị ahụwo ụzọ dị mfe isi mee ka ụmụ anụmanụ ndị a pụta ka e see ha foto!

N’Ọmà Ahịa

Oge anyị nọrọ n’Ogige Nchekwa Ụmụ Anụ Mba nke Mole dị nnọọ ntakịrị, ma ugbu a anyị ji ụgbọala gbaa awa abụọ n’ụzọ a na-eteghị ete gaa Sawla, otu ime obodo nke ndị Lobi bi, bụ́ agbụrụ ndị ọrụ ugbo mejupụtara. Ụmụ nwanyị agbụrụ a nwere omenala ha a na-adịghị ahụkebe nke iji aka ha mee ka egbugbere ọnụ ha buo ibu. Ọ bụ ezie na n’oge a ọdịnala ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-apụ n’anya ka mmepeanya ọgbara ọhụrụ na-enwe mmetụta n’ebe ụmụ agbọghọ nọ, ọtụtụ ụmụ nwanyị ka na-eji otú egbugbere ọnụ ha hà akpa nganga. N’ezie, a na-ewe ya dị ka mkparị ịgwa nwanyị Lobi na o nwere egbugbere ọnụ dị mkpụmkpụ ka nke nwoke.

Anyị rutere n’otu obodo nta ma banye n’ahịa. E ji alaka osisi wuo ụlọ ahịa ndị ahụ ma jiri akịrịka kpuchie elu ha. E nwere otu onye ọcha guzo ọtọ n’ahịa ahụ n’etiti ndị isi ojii Africa. Anyị gakwuuru ya ma chọpụta na ọ dịbeghị anya ọ bịara n’ebe ahụ iji sụgharịa Bible gaa n’asụsụ Lobi. O bi n’obodo nta dị nso kpọmkwem n’etiti ndị Lobi ka o wee nwee ike ịmụta ịsụ asụsụ ha nke ọma. O mere ka m cheta Robert Moffat, onye hiwere chọọchị n’etiti ndị ndịda Africa na-asụ Tswana na narị afọ nke 19 ma sụgharịa Bible gaa n’asụsụ ha.

Otu agadi nwanyị onye Lobi egbugbere ọnụ ya abụọ buru ibu nọ ala na bench dị n’otu n’ime ụlọ ahịa ndị ahụ. A fanyere ibé osisi ọcha abụọ hà ka mbọ mkpịsị aka ukwu n’oghere dị na nke ọ bụla n’ime egbugbere ọnụ ya abụọ. M chọrọ ise ya foto, ma ozugbo m weliri kamera m, ọ gbakutara m azụ. Otu n’ime ndị mụ na ha so kọwara na ndị Lobi oge gboo kwenyere na a pụrụ imetụta mkpụrụ obi ha n’ụzọ dị njọ ma ọ bụrụ na mmadụ esee ha foto.

Ka anyị na-alaghachi Sawla, bụ́ ebe anyị ga-anọ ọnọdụ abalị, echere m echiche banyere amamihe na ụdị ihe dị iche iche anyị huworo n’okike Chineke. O ji nkà kee ma anụmanụ ma mmadụ. Ọ bụ nnọọ dị ka ọbụ abụ ahụ tiri ná mkpu, si: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.”—Abụ Ọma 104:24.

[Map dị na peeji 20, 21]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

GHANA

[Foto dị na peeji nke 20]

Ezì ọhịa

[Foto dị na peeji nke 20]

Anụ ọhịa “hyena” tụrụ àgwà

[Foto dị na peeji nke 21]

Ìgwè ele

[Foto dị na peeji nke 21]

Enyí

[Foto dị na peeji nke 21]

Enyí mmiri

[Foto dị na peeji nke 22]

Otu nne adaka ku ụmụ abụọ

[Foto dị na peeji nke 23]

Anụ ọhịa “hartebeest”

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọmà ahịa ahụ