Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Njọ Iru Újú?

Ọ̀ Dị Njọ Iru Újú?

Echiche nke Bible

Ọ̀ Dị Njọ Iru Újú?

“MA ANYỊ ACHỌGHỊ KA UNU GHARA ỊMARA IHE BANYERE NDỊ NA-ADA N’ỤRA ỌNWỤ, ỤMỤNNA ANYỊ; KA O WEE GHARA IWUTE UNU, ỌBỤNA DỊ KA Ọ NA-EWUTE NDỊ FỌDỤRỤ, NDỊ NA-ENWEGHỊ OLILEANYA.”—1 NDỊ TESALỌNAỊKA 4:13.

BIBLE na-enye olileanya maka ndị nwụrụ anwụ. Mbilite n’ọnwụ ndị Jisọs mere, tinyere ihe ndị ọ kụziri, na-ezo aka n’oge mgbe a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. (Matiu 22:23-33; Mak 5:35, 36, 41, 42; Luk 7:12-16) Olee otú olileanya a kwesịrị isi metụta anyị? Okwu Pọl onyeozi bụ́ ndị e hotara n’elu na-egosi na olileanya a pụrụ ịbụ ihe na-akasi obi mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ.

Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya anwụnahụwo gị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na i nwewo mmetụta nke ihe mgbu uche nke na-esochi ọdachi dị otú ahụ. Theresa, bụ́ onye di ya nke dị afọ 42 nwụrụ ntakịrị oge ka a wasịrị ya ahụ n’obi, na-ekwu sị: “Obi mapụrụ m nnọọ! Mmetụta mbụ m nwere bụ oké ụjọ. Abịaziri m nwee oké mwute nke nọgidere na-aka njọ ka oge na-aga. Ebere m ákwá nke ukwuu.” Mmeghachi omume ndị dị otú ahụ hà na-egosi enweghị okwukwe n’ebe nkwa Jehova nke ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ dị? Okwu Pọl ọ̀ pụtara na ọ dị njọ iru újú?

Ihe Atụ Ndị Dị na Bible nke Iru Újú

Anyị na-achọta azịza nye ajụjụ ndị ahụ site n’inyocha ihe atụ ndị dị n’ime Bible nke iru újú. N’ọtụtụ ihe ndekọ, a na-enwekarị iru újú mgbe onye òtù ezinụlọ nwụrụ. (Jenesis 27:41; 50:7-10; Abụ Ọma 35:14) Mmetụta ndị a na-ejikọta ha na iru újú a na-esikarị nnọọ ike.

Tụlee otú ụfọdụ ndị ikom nwere okwukwe si ruo újú n’ihi ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Dị ka ihe atụ, Abraham nwere okwukwe siri ike na Chineke pụrụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Ndị Hibru 11:19) N’agbanyeghị na o nwere nkwenye a, mgbe nwunye ya nwụrụ, o “wee bịa itiri Sera aka n’obi, na ịkwara ya ákwá.” (Jenesis 23:1, 2) Mgbe ụmụ Jekọb ghaara ya ụgha ma gwa ya na nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya bụ́ Josef anwụọla, Jekọb “[dọwara] uwe mgbokwasị ya nile . . . wee kwaara ya ákwá.” (Jenesis 37:34, 35) Leenụ, ọtụtụ afọ n’ihu, echiche banyere ọnwụ nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya ka nọ na-enye Jekọb nsogbu! (Jenesis 42:36-38) Eze Devid rukwara újú n’ihu ọha na n’ụzọ dị ukwuu n’ihi ọnwụ nke ụmụ ya abụọ, bụ́ Amnọn na Absalọm. Ọ bụ ezie na ha abụọ kpataara Devid na ezinụlọ ya obi erughị ala, ha ka bụ ụmụ ya, ọnwụ ha wetakwaara ya oké iru újú.—2 Samuel 13:28-39; 18:33.

Mgbe ụfọdụ, mba Israel nile ruru újú, dị ka ha mere n’ihi ọnwụ Mosis. Deuterọnọmi 34:8 na-agwa anyị na ndị Israel kwaara ya ákwá ruo ụbọchị 30.

N’ikpeazụ, e nwere ihe atụ nke Jisọs Kraịst. Ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. Mgbe Jisọs hụkwara otú ụmụnne Lazarọs ndị nwanyị, bụ́ Mata na Meri, na ndị enyi ha si na-ebe ákwá, ọ ‘sụrụ ude n’ime mmụọ ya, meekwa ka obi lọọ Ya mmiri.’ Ọ bụ ezie na ọ maara na ná mkpirikpi oge ọ ga-eme ka enyi ya dịghachi ndụ, ‘anya mmiri pụrụ ya n’anya.’ Jisọs hụrụ ezi ndị enyi ya bụ́ Mata na Meri n’anya. N’ihi ya o metụrụ ya n’ahụ nke ukwuu mgbe ọ hụrụ mwute ha na-enwe n’ihi ọnwụ nwanne ha nwoke.—Jọn 11:33-36.

Abraham, Jekọb, Devid, na Jisọs gosichara okwukwe dị ukwuu n’ebe Jehova na nkwa ya dị iche iche dị, ma ha ruru újú. Iru újú ha ọ̀ bụ ihe na-egosi adịghị ike ime mmụọ? Iru újú ha ọ̀ bụ ihe àmà nke ekweghị ná mbilite n’ọnwụ? Ọ dịghị ma ọlị! Iru újú bụ mmeghachi omume dị otú o kwesịrị mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ.

Ihe Mere Anyị Ji Eru Újú

Ọ dịghị mgbe ọ bụ nzube Chineke ka ihe a kpọrọ mmadụ na-anwụ anwụ. Nzube Jehova na mbụ, bụ́ nke o kwupụtara gwa Adam na Iv, bụ ka e mee ka ụwa nile ghọọ paradaịs mara mma nke ezinụlọ na-ahụ n’anya, nwere obi ụtọ bijupụtara. Ọnwụ ga-abịa nanị ma di na nwunye mbụ ahụ kpebie inupụrụ Jehova isi. (Jenesis 1:28; 2:17) N’ụzọ dị mwute, Adam na Iv nupụrụ isi, n’ihi nnupụisi ha kwa, “ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile.” (Ndị Rom 5:12; 6:23) Ya mere, ọnwụ bụ onye iro nwere obi ọjọọ, nke na-agaraghị adị.—1 Ndị Kọrint 15:26.

Mgbe ahụ, ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya na ihe a nke na-adịghị otú o kwesịrị, bụ́ ọnwụ nke onye dị mmadụ nso, na-akpatara ndị o metụtara oké ihe mgbu nke uche. Ọ na-eme ka ha nwee mmetụta nke ịtọgbọ chakoo ná ndụ ha. Theresa, bụ́ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke a kpọtụrụ aha n’elu, kwuru banyere di ya, sị: “Eji m n’aka na m ga-ahụ ya ọzọ ná mbilite n’ọnwụ, ma agụụ ya na-agụsi m nnọọ ike ugbu a. Ọ bụ nke ahụ bụ ihe na-ewute m n’ezie.” Ọnwụ nne ma ọ bụ nna pụrụ ichetara anyị na anyị na-anwụkwa anwụ. Ọnwụ nke onye na-eto eto na-ewute anyị karịsịa n’ihi ọdachi nke ịnwụchu ọnwụ.—Aisaia 38:10.

Ee, ọnwụ abụghị ihe dị otú o kwesịrị. E kwesịrị ịtụ anya ihe mgbu ọ na-akpata, Jehova adịghịkwa ele iru újú anya dị ka ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. Dị ka anyị hụrụ ya site n’ihe atụ nke Abraham, Jekọb, Devid, mba Israel, na Jisọs, igosipụta mwute anyị nwere n’ime obi abụghị ihe àmà na anyị adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ. *

Otú o sina dị, ọ bụ ezie na anyị dị ka ndị Kraịst na-eru újú n’ezie n’ihi ọnwụ, anyị adịghị enwe mwute dị ka “ndị fọdụrụ, ndị na-enweghị olileanya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) Anyị adịghị eru újú ruo n’ókè ezi uche na-adịghị na ya n’ihi na anyị anọghị ná mgbagwoju anya n’ihe metụtara ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Anyị maara na ha adịghị enwe ihe mgbu ma ọ bụ na-ata ahụhụ, kama ha nọ n’ọnọdụ yiri ụra dị omimi. (Eklisiastis 9:5; Mak 5:39; Jọn 11:11-14) Anyị nwekwara obi ike zuru ezu na Jisọs, bụ́ “mbilite n’ọnwụ na ndụ,” ga-emezu nkwa ya nke bụ́ ịkpọghachi “ndị nile dị n’ili.”—Jọn 5:28, 29; 11:24, 25.

N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-eru újú n’oge a, nweta nkasi obi n’ihe ọmụma ahụ bụ́ na Jehova na-aghọta ihe mgbu gị. Ka ihe ọmụma a na olileanya i nwere ná mbilite n’ọnwụ mee ka iru újú gị belata ma nyere gị aka idi mfu gị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Maka enyemaka iji nagide iru újú, lee peeji nke 14-19 na broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.