Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọ Mmiri Ndụ

Ịchọ Mmiri Ndụ

Ịchọ Mmiri Ndụ

IHE karịrị puku afọ abụọ gara aga, otu obodo na-enwe ọganihu nke mmadụ 30,000 bi na ya bịara bụrụ nke a ma ama n’Ọzara Arebia. N’agbanyeghị ihu igwe na-adịghị mma e nwere n’ebe ahụ, bụ́ ebe nkezi nke mmiri na-ezo kwa afọ bụ milimita 150, ụmụ amaala Petra mụtara ijili obere mmiri na-eme ihe nke ọma. Petra bịakwara baa ọgaranya ma nwee ọganihu.

Ndị Nabataea bi na Petra enweghị pọmpụ mmiri na-eji ike eletrik arụ ọrụ. Ha ewughị akatamkpo ihe mgbochi mmiri dị iche iche. Ma ha maara otú e si enweta ma chekwaa mmiri ha. Usoro dị ukwuu nke obere ọdọ mmiri, ihe mgbochi mmiri, ọwa, na olulu mmiri dị iche iche mere ka ha nwee ike iche mmiri ahụ a kpachapụrụ anya nweta ihu gaa n’obodo ha nakwa n’obere mbara ala ha dị iche iche. Ọ dịtụghịdị nke a lara n’iyi. E gwuru olulu mmiri ha dị iche iche nke ọma nke na ndị Bedouin nke oge a ka na-eji ha eme ihe.

“Nkà mmụta banyere mmiri bụ ịma mma a na-adịghị ahụ anya nke Petra,” ka otu ọkà n’ihe banyere mmiri kwuru n’ijuanya. “Ndị ahụ bụ ndị nwere nnọọ nkà pụrụ iche.” Na nso nso a, ndị ọkachamara Israel anọwo na-achọ ịmụta ihe site na nkà pụrụ iche nke ndị Nabataea, bụ́ ndị kụkwara ihe ọkụkụ na Negeb, bụ́ ebe ọ na-esi ike ka mmiri ozuzo gafee 100 milimita n’afọ. Ndị ọkà mmụta mkpụrụ akụ́kụ́ na ala enyochawo ihe fọdụrụnụ n’ọtụtụ puku ugbo ndị Nabataea bụ́ ndị ndị nwe ha ji nkà chee mmiri na-ezo n’oge oyi ihu gaa n’obere ubi ha ndị ala ha dị larịị.

Ka ọ dị ugbu a, ihe ndị a mụtara n’aka ndị Nabataea na-enyere ndị ọrụ ugbo nọ ná mba ndị kpọrọ nkụ dị n’ógbè Sahel nke Africa aka. Otú ọ dị, usoro ọgbara ọhụrụ e ji echekwa mmiri pụkwara ịdị irè otú ahụ. Na Lanzarote, otu n’ime Àgwàetiti Canary, bụ́ nke dị ná mpụga ụsọ oké osimiri nke Africa, ndị ọrụ ugbo amụtala otú e si akụ vine na fig n’ebe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmiri adịghị ezo na ya. Ha na-akụ osisi vine ma ọ bụ fig n’ime okokoro gbara gburugburu ma werezie ntụ e nwetara site ná mgbawa ugwu wụchie ájá ahụ iji gbochie mmiri isi n’ebe ahụ pụọ. Igirigi zuru ezu pụziri iru na mkpọrọgwụ ya iji mee ka ihe a kụrụ akụ dị mma.

Ihe Ngwọta Ndị Na-abụghị Ọkpọka

Gburugburu ụwa, a pụrụ ịnụ akụkọ ndị yiri nke ahụ banyere otú ndị mmadụ si nwee ike ibi n’ebe ndị ala kpọrọ nkụ—dị ka n’etiti ndị Bishnoi, bụ́ ndị bi n’Ọzara Thar nke India; ndị inyom Turkana nke Kenya; na ndị Navajo India nke Arizona, U.S.A. Usoro ha ji eme ihe iji nweta mmiri, bụ́ nke ha ji ọtụtụ narị afọ mụọ, na-egosipụta na a pụrụ ịdabere na ya maka igbo mkpa ọrụ ugbo karịa ihe ngwọta ndị na-akpali akpali bụ́ ọkpọka.

Narị afọ nke 20 bụ oge iwu ihe mgbochi mmiri. Ndị mmadụ gbochiri ma jiri osimiri ndị dị ukwuu mee ihe, ha malitekwara usoro sara mbara nke ịgba ala mmiri. Otu ọkà mmụta na-eme atụmatụ na pasent 60 nke iyi na osimiri ndị dị n’ụwa abụwo nke a chịkwara ruo n’ókè ụfọdụ. Ọ bụ ezie na atụmatụ ọrụ ndị dị otú ahụ batụrụ uru, ndị na-amụ banyere njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha na-arụtụ aka ná mbibi e bibiri gburugburu ebe obibi, tinyere mmetụta o nwere n’ahụ ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị na-enweghịzi ebe obibi.

Ọzọkwa, n’agbanyeghị ezi ebumnobi e ji wuo ha, abamuru nke atụmatụ ndị a adịghị erukebe ndị ọrụ ugbo bụ́ ndị chọsiri mmiri ahụ ike. N’izo aka n’atụmatụ ịgba ala mmiri n’India, onye bụbu Praịm Minista bụ́ Rajiv Gandhi kwuru, sị: “Ruo afọ 16, anyị emefuwo ego dị ukwuu. Ndị mmadụ enwetabeghị abamuru ọ bụla, a gbaghị ala mmiri, e nweghị mmiri, a mụbaghị mmepụta ihe, ha adịghị enweta enyemaka ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị.”

Ihe ngwọta ndị na-abụghị ọkpọka, n’aka nke ọzọ, abụrụwo nke bara uru karị na nke na-adịchaghị emebi gburugburu ebe obibi. Obere iyiala na ihe mgbochi mmiri ndị obodo dị iche iche rụrụ enwewo nnọọ ihe ịga nke ọma na China, bụ́ ebe a rụworo nde isii. N’Israel, ndị mmadụ achọpụtawo na site n’ịdịtụ akọ, a pụrụ ibu ụzọ jiri otu mmiri ahụ saa ihe, e mesịa, e were ya mee ihe n’usoro idebe ihe ọcha, n’ikpeazụkwa, e were ya gbaa ala.

Ihe ngwọta ọzọ dị irè bụ iji paịpụ ndị kọmputa na-achịkwa agba mmiri kpọmkwem na mkpọrọgwụ nke ihe a kụrụ akụ, bụ́ nke na-adịghị emebi ala ma bụrụ nke na-eji nanị pasent 5 nke mmiri e ji eme ihe n’usoro ndị dịbụ adị, eme ihe. Iji mmiri eme ihe n’ụzọ amamihe pụtakwara ịhọta ihe ọkụkụ ndị kwekọrọ n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ọka sorghum ma ọ bụ ọka millet, kama ịhọta ndị chọrọ ka a na-agbasi ha mmiri ike, dị ka okpete ma ọ bụ ọka.

Site n’itinyetụ obere mgbalị, ndị na-eji mmiri eme ihe n’ụlọ nakwa n’ụlọ mmepụta ihe pụkwara ibelata mmiri ndị ha na-eji eme ihe. Dị ka ihe atụ, a pụrụ iji ihe dị ka otu lita mmiri mepụta otu kilogram akwụkwọ ma ọ bụrụ na ụlọ mmepụta ihe ahụ na-azacha mmiri ha jibu mee ihe iji jiri ya mee ihe ọzọ—nchekwa nke ihe karịrị pasent 99. Mexico City ejiriwo ọkwá mposi ndị ọhụrụ dochie anya ndị dịbu adị. Mmiri ndị ọhụrụ a ji eme ihe bụ otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke mmiri ọkwá mposi ndị mbụ ahụ na-eji eme ihe. Obodo ahụ kwadokwara otu mkpọsa ihe ọmụma hiwere isi n’ibelata n’ụzọ pụtara ìhè ojiji e ji mmiri eme ihe.

Ihe Dị Mkpa Iji Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Ihe ngwọta nye nsogbu mmiri—na ihe ka ukwuu ná nsogbu gburugburu ebe obibi—chọrọ mgbanwe n’omume. Ọ dị ndị mmadụ mkpa ịdị na-emekọ ihe ọnụ kama ịchọ ọdịmma onwe ha nanị, ịchụ nnọọ ihe ụfọdụ n’àjà n’ebe ọ dị mkpa, na ikpebisi ike ilekọta ụwa maka ndị ga-ebi na ya n’ọdịnihu. Banyere nke a, Sandra Postel, n’akwụkwọ ya bụ́ Last Oasis—Facing Water Scarcity, na-akọwa, sị: “Ụkpụrụ ga na-achịkwa ụzọ e si eji mmiri eme ihe dị anyị mkpa—nduzi maka àgwà kwesịrị ekwesị n’ime ihe maka mkpebi ndị siri ike banyere ihe ndị dị n’usoro e kere eke bụ́ ndị anyị na-apụghị ịghọtacha.”

N’ezie, ‘ụkpụrụ nchịkwa dị otú ahụ nke ụzọ e si eji mmiri eme ihe’ chọrọ ihe karịrị ógbè ọ bụla ime nnọọ ihe n’ụzọ nke ha. Ọ dị mba dị iche iche nakwa ndị agbata obi mkpa imekọ ihe ọnụ, ebe ọ bụ na osimiri na-esi n’otu mba gafere n’ọzọ. “Nchegbu a na-enwe banyere otú mmiri hà na ọdịdị ya—nke a na-ewere n’oge gara aga dị ka ihe dị iche—aghaghị ịbụ ihe a ga-ele anya ugbu a dị ka okwu metụtara ụwa nile,” ka Ismail Serageldin na-ekwu n’ihe ndekọ ya bụ́ Beating the Water Crisis (Imeri Nsogbu Mmiri).

Ma ime ka mba dị iche iche mee ihe banyere okwu ndị metụtara ụwa nile abụghị ọrụ dị mfe, dị ka Odeakwụkwọ Ukwu òtù UN bụ́ Kofi Annan na-ekweta. “N’ụwa nke taa a na-emekọ ihe ọnụ na ya,” ka ọ na-ekwu, “usoro ndị e nwere maka ime ihe n’ụzọ zuru ụwa ọnụ ka na-amalite amalite. Oge eruwo ka anyị tinye ihe echiche ahụ bụ́ ‘ndị mba ụwa’ pụtara n’ọrụ.”

N’ụzọ doro anya, inweta mmiri dị mma n’ụzọ zuru ezu—ọ bụ ezie na ọ dị oké mkpa—abụghị nanị ihe dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-ebi ndụ dị mma na nke obi ụtọ. Ụmụ mmadụ aghaghị ibu ụzọ ghọta ibu ọrụ ha nwere n’ebe Onye ahụ nke nyere ma mmiri ma ndụ n’onwe ya nọ. (Abụ Ọma 36:9; 100:3) Kama ijikwa ụzọ elepụghị anya n’ihu na-eji ụwa na akụ̀ ndị dị na ya eme ihe, ọ dị ha mkpa ‘ịrụ ọrụ na ya na idebe ya,’ dị ka Onye Okike anyị nyere nne na nna anyị mbụ ntụziaka ime.—Jenesis 2:8, 15; Abụ Ọma 115:16.

Ụdị Mmiri Ka Mma

Ebe ọ bụ na mmiri dị oké mkpa, ọ bụghị ihe ijuanya na e ji ya mee ihe atụ n’ime Bible. N’ezie, iji nụ ụtọ ndụ dị ka e bu n’uche ka anyị nụ, anyị aghaghị ịmata isi iyi nke mmiri ihe atụ a. Anyị aghaghịkwa ịmụta igosipụta àgwà nwanyị nke narị afọ mbụ ahụ bụ́ onye rịọrọ Jisọs Kraịst, sị: “Onyenwe anyị, nye m mmiri a.” (Jọn 4:15) Tụlee ihe merenụ.

Jisọs kwụsịrị n’otu olulu mmiri miri emi nke dị nso na Nablus nke oge a—ihe àmà na-egosi na ọ bụ otu olulu mmiri ahụ ndị si gburugburu ụwa na-aga eleta ọbụna ruo taa. N’oge ahụ, otu nwanyị Sameria bịakwara n’olulu mmiri ahụ. Dị nnọọ ka ọtụtụ ndị inyom nke narị afọ mbụ, obi abụọ adịghị ya na ọ na-eme njem ugboro ugboro gaa n’ebe ahụ iji nọgide na-enwe mmiri n’ụlọ ya. Ma Jisọs kwuru na ya pụrụ inye ya “mmiri dị ndụ”—isi mmiri nke na-agaghị ata ata.—Jọn 4:10, 13, 14.

N’ụzọ kwere nghọta, a kpaliri mmasị nwanyị ahụ. Ma, n’ezie, “mmiri dị ndụ” ahụ Jisọs kwuru banyere ya abụghị mmiri nkịtị. Jisọs bu n’uche ndokwa ime mmụọ ndị pụrụ ime ka ndị mmadụ nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. Otú ọ dị, e nwere njikọ dị n’etiti mmiri ihe atụ na mmiri nkịtị—ha abụọ dị anyị mkpa iji nụ ụtọ ndụ n’ozuzu ya.

N’ihe karịrị otu oge, Chineke nyere ndị ya ihe ngwọta maka ụkọ mmiri n’ezie. O ji ụzọ ọrụ ebube nye ìgwè buru ibu nke ụmụ Israel gbara ọsọ ndụ mmiri bụ́ ndị gafere ọzara Saịnaị mgbe ha na-aga n’Ala Nkwa ahụ. (Ọpụpụ 17:1-6; Ọnụ Ọgụgụ 20:2-11) Elaịsha, bụ́ onye amụma Chineke, mere ka olulu mmiri Jeriko bụ́ nke e metọworo emetọ dị ọcha. (2 Ndị Eze 2:19-22) Mgbe ihe fọdụrụnụ ná ndị Israel nwere nchegharị si Babilọn laghachi n’ala nna ha, Chineke dugara ha ná “mmiri n’ọzara.”—Aịsaịa 43:14, 19-21.

Ihe mbara ala anyị chọrọ ngwa ngwa taa bụ mmiri na-adịghị agwụ agwụ. Ebe ọ bụ na Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, nyere ihe ngwọta maka nsogbu mmiri n’oge gara aga, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme otú ahụ ọzọ n’ọdịnihu? Bible na-emesi anyị obi ike na ọ ga-eme otú ahụ. N’ịkọwa ọnọdụ ndị a ga-enwe n’okpuru Alaeze ya e kwere ná nkwa, Chineke na-ekwu, sị: “M ga-akwaghe osimiri n’elu ugwu dị iche iche ọhịa na-adịghị, na isi iyi n’etiti ndagwurugwu dị iche iche: M ga-eme ka ọzara ghọọ ọdọ mmiri jupụtara ná mmiri, meekwa ka ala ọkpọ nkụ ghọọ ebe mmiri na-asụpụta, . . . ka ha wee hụ, mara, tụkwasị obi, nwee uche ịghọta n’otu, na aka Jehova mere nke a.”—Aịsaịa 41:18, 20.

Bible na-ekwe anyị nkwa na mgbe oge ahụ ruru, “agụụ agaghị agụ [ndị mmadụ], akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ.” (Aịsaịa 49:10) N’ihi ọchịchị ọhụrụ ga-achị ụwa nile, a ga-enwe ihe ngwọta zuru ezu nye nsogbu mmiri. Ọchịchị a—Alaeze ahụ, bụ́ nke Jisọs kụziiri anyị ikpe ekpere banyere ya—ga-achị “n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 9:6, 7; Matiu 6:9, 10) N’ihi ya, ndị mmadụ n’ebe nile n’ụwa ga-aghọ ndị mba ụwa n’ezie n’ikpeazụ.—Abụ Ọma 72:5, 7, 8.

Ọ bụrụ na anyị achọọ mmiri ndụ ahụ ugbu a, anyị pụrụ ilepụ anya ịhụ ụbọchị mgbe a ga-enwe n’ezie mmiri zuru ezu maka mmadụ nile.

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

N’elu: Ndị bi na Petra n’oge ochie maara otú e si echekwa mmiri

N’okpuru: Ọwa mmiri Nabataea dị na Petra

[Ebe E Si Nweta Foto]

Garo Nalbandian

[Foto dị na peeji nke 22]

Ndị ọrụ ugbo nọ n’otu n’ime Àgwàetiti Canary amụtawo otú e si akụ ihe ọkụkụ n’ebe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmiri adịghị ezo na ya

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwere nwanyị a nkwa “mmiri dị ndụ”?