Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọgwụ Ọjọọ—Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Eji Ha Eme Ihe?

Ọgwụ Ọjọọ—Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Eji Ha Eme Ihe?

Ọgwụ Ọjọọ—Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Eji Ha Eme Ihe?

“ADỊ m afọ 13, nwanne nwanyị ezigbo enyi m kpọrọ anyị òkù n’ụlọ ha n’otu mgbede. Mmadụ nile malitere ise wii wii. Ná mmalite, ekweghị m ise, ma mgbe e chechara ya onye ọ bụla n’ihu ọtụtụ ugboro, emesịrị m see ya.” Otú ahụ ka Michael, bụ́ onye si South Africa, si kọwaa otú e si mee ka ọ malite iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.

“Esi m n’ezinụlọ na-eji ọdịnala akpọrọ ihe bụ́ nke ji iti egwú ọdịnala mere aka ọrụ. Eso m n’otu òtù egwú, otu n’ime ndị egwú ahụ na-esekwa wii wii mgbe nile n’oge nzurutụ ike. Ọ nọgidere na-enye m ya ruo ihe karịrị otu ọnwa. Emesịrị m setụ ya ma malite ise ya mgbe nile.” Otú ahụ ka Darren, bụ́ onye Canada, si malite iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe.

Mmadụ abụọ a gara n’ihu jiri ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ mee ihe, dị ka ọgwụ LSD, ọgwụ opium, na ọgwụ ndị na-akpali akpali. N’ileghachi anya azụ, ugbu a n’ịbụ ndị na-ejibu ọgwụ ọjọọ eme ihe, ha kwetara na ọ bụ mmetụta nke ndị ọgbọ bụ isi ihe mere ha ji malite iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. “Ọ dịghị mgbe ọ bụla m chere na m ga-eji ọgwụ ọjọọ mee ihe,” ka Michael na-ekwu, “ma ọ bụ nanị ụmụaka ndị ahụ bụ ndị enyi m nwere, dị ka ọ na-adịkarịkwa ị ga-esonyere ha.”

Ebe A Na-eme Ihe Ntụrụndụ

N’ezie, nrụgide ndị ọgbọ na-ekere òkè dị ukwuu n’ime ka ọtụtụ ndị malite iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ọ pụkwara imetụta ndị na-eto eto karịsịa. Ọzọkwa, a na-ekpughepụ ha nye ihe nlereanya nke ndị na-eme ihe ntụrụndụ bụ́ ndị ihe ha na-amasịkarị ha, ndị na-enwe mmetụta siri ike n’ebe ndị na-eto eto bụ́ ndị na-enwe mmasị ikiri ha nọ.

Ọ bụ ndị na-eme ntụrụndụ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe karịsịa. Ndị egwú a ma ama na-ejikarị ọgwụ ike eme ihe n’oge ụfọdụ n’ọrụ ha. Ọtụtụ ndị na-eme ihe nkiri na-ejikarịkwa ọgwụ ọjọọ eme ihe.

Ndị na-eme ihe ntụrụndụ pụrụ ime ka ọgwụ ọjọọ na-adọrọ adọrọ ma na-akpali akpali n’ụzọ ọ na-eyighị ka ndị ntorobịa hà pụrụ iguzogideli ya. Magazin bụ́ Newsweek kọrọ na 1996, sị: “Okporo ámá dị iche iche nke Seattle jupụtara n’ụmụaka kwagara n’ebe ahụ iji jiri ọgwụ heroin na-eme ihe, nanị n’ihi na Cobain [bụ́ onye na-eti egwú rock] mere otú ahụ.”

A na-eme ka iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-adọrọ adọrọ na magazin, ihe nkiri, nakwa na telivishọn. N’otu aka ahụ, ụfọdụ ndị a ma ama bụ́ ndị na-akwa ákwà na-ahọrọ ndị na-egosi ụdị ákwà dị iche iche bụ́ ndị dị gịrịgịrị, ndị tara ahụ, n’iṅomi ọdịdị nke ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ.

Gịnị Mere Ọgwụ Ọjọọ Ji Eri Ụfọdụ Ndị Ahụ?

E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ so na-eme ka iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-arị elu. N’ime ha e nwere ndakpọ olileanya, ịda mbà n’obi, na enweghị nzube ná ndụ. Ihe ndị ọzọ na-akpata ya bụ nsogbu akụ̀ na ụba, enweghị ọrụ, na ihe nlereanya na-ezichaghị ezi nke ndị nne na nna.

Ụfọdụ ndị ọ na-esiri ike ha na ndị ọzọ inwe mmekọrịta, na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe ka ha wee nwee ike iso ndị ọzọ mekọrịta ihe. Ha kweere na ọgwụ ọjọọ na-eme ka ha nwekwuo obi ike, na-eme ka ha nwee mmetụta nke ịdị nkọ na ịbụ ndị a pụrụ inwe mmasị n’ebe ha nọ. Ndị ọzọ na-ahụ ya dị ka ihe ka mfe bụ́ iji ọgwụ ọjọọ eme ihe karịa iburu ibu ọrụ nke ịchịkwa ndụ ha.

Enweghị mmasị n’ihe bụ ihe ọzọ mere ndị ntorobịa ji amalite iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Akwụkwọ bụ́ The Romance of Risk—Why Teenagers Do the Things They Do na-ekwu banyere enweghị mmasị n’ihe na enweghị nlekọta nke ndị nne na nna, sị: “Ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ na-alọbata n’ụlọ tọgbọ chakoo mgbe a gbasara akwụkwọ. Ọ bụghị ihe ijuanya na owu na-ama ha, ha adịghịkwa achọ ịnọ nanị ha. Ndị enyi ha na-esonyere ha, ma ọbụna mgbe ha nọkọrọ ọnụ ha adịghị enwekarịkwa mmasị n’ihe. Ha na-ekiri telivishọn na vidio na-egosi egwú n’esepụghị aka ma ọ bụ na-emepe Internet, na-achọgharị ihe na-akpali akpali. Ise siga, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, na ịṅụ mmanya pụrụ n’ụzọ dị mfe ịbụ akụkụ nke ọnọdụ a.”

Michael, bụ́ onye e kwuru banyere ya ná mmalite, kwuru banyere otú ya si ghara inweta nlekọta nke nne na nna ya n’ụlọ, sị: “Ndụ ezinụlọ m na-enye obi ụtọ. Anyị bụ ezinụlọ na-akpachi nnọọ anya. Otú ọ dị, ma nne m ma nna m na-arụcha ọrụ, a dịghịkwa elekọta anyị n’ehihe. Ọzọkwa, nne na nna anyị hapụrụ anyị ka anyị na-eme ihe nile masịrị anyị. E nyeghị anyị ọzụzụ. Nne na nna m amaghị na m na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe.”

Mgbe o risịrị ha ahụ, ọtụtụ ndị na-anọgide na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe maka otu ihe doro anya: Ọ na-atọ ha ụtọ. Michael, bụ́ onye na-ejibu ọgwụ ọjọọ eme ihe kwa ụbọchị, kwuru banyere ihe ndị ha na-akpata: “Ọ dị m ka m na-arọ nrọ. Apụrụ m ịgbanahụ nrụgide ọ bụla m nwere. Ọ dịghị mgbe m nwere mmetụta nke ịbụ onye e yiri egwu. Ihe nile yiri ka hà magburu onwe ha.”

Onye ọzọ na-ejibu ọgwụ ọjọọ eme ihe, nke aha ya bụ Dick, bụ́ onye si South Africa, kọwara mmetụta wii wii nwere n’ahụ ya mgbe ọ malitere iji ya eme ihe mgbe ọ dị afọ 13: “Ana m achị ọchị na njakịrị ọ bụla. Ihe nile na-atọ m ọchị.”

Ịdọ aka ná ntị banyere mmerụ ahụ ọgwụ ọjọọ pụrụ ịkpata eyighịdị ka ọ na-atụ ndị ntorobịa ụjọ. Ha na-enwekarị àgwà nke “ọ gaghị eme m.” Akwụkwọ bụ́ Talking With Your Teenager na-ekwu ihe mere ndị nọ n’afọ iri na ụma ji eleghara ịdọ aka ná ntị bụ́ na ọgwụ ọjọọ na-emebi ahụ ike, anya: “Ha na-enwetaghachi onwe ha ngwa ngwa ma nwee ume dị ukwuu nke na ha echeghị na ahụ ike ha ga-emebi. N’oge uto, a na-enwekarị echiche nke ‘ịbụ onye ihe na-apụghị imetụta.’ Ndị nọ n’afọ iri na ụma na-ele ọrịa cancer akpa ume, aṅụrụma, ọgwụ ike iri mmadụ ahụ, anya dị ka ihe ndị na-eme ndị meworo okenye, ọ bụghị ha.” Ọtụtụ ndị amaghịdị ihe ize ndụ ndị dị na ya, dị ka iwu ewu nke ọgwụ ecstasy na-egosi. Gịnị ka ọ bụ?

Ọgwụ Ecstasy na Ebe A Na-agba Egwú Rave

A na-ejikarị ọgwụ MDMA e ji amphetamine mee, bụ́ nke a maara dị ka ecstasy, eme ihe ná nnọkọ ịgba egwú abalị nile bụ́ nke a na-akpọ rave. Ndị na-ere ya na-akwalite echiche bụ́ na iji ọgwụ ecstasy eme ihe bụ ụzọ na-adịghị ize ndụ nke isi nweta oké obi ụtọ nakwa ume dị ukwuu iji gbaa egwú abalị nile. Ọgwụ ọjọọ ahụ na-enyere ndị na-agba egwú aka ịnọgide na-agba egwú ruo ọtụtụ awa ruo mgbe ha banyere n’ihe otu onye edemede zoro aka na ya dị ka “ọnọdụ yiri ọhụụ.” Otu onye ntorobịa kọwara ndọrọ nke ọgwụ ecstasy, sị: “Mkpali ahụ na-amalite ná mkpịsị ụkwụ gị, na-eme ka ikpo ọkụ na ịhụnanya dị ukwuu rikpuo gị ka o ji nwayọọ nwayọọ na-eri gị izizi na-agbago n’isi gị.”

Foto e sere ụbụrụ nke ndị na-eji ọgwụ ecstasy eme ihe mgbe nile enyewo ihe àmà a na-ahụ anya na ọ bụghị ọgwụ na-adịghị emerụ ahụ bụ́ nke ndị na-ere ya na-azọrọ na ọ bụ. Ihe àmà na-egosi na ọgwụ ecstasy na-emebi akwara ozi ndị dị n’ụbụrụ ma na-ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ nke mmiri ọgwụ bụ́ serotonin. Mmebi dị otú ahụ pụrụ ịdịgide adịgide. Ka oge na-aga, nke a pụrụ ịkpata nsogbu ndị dị ka ịda mbà n’obi na enwekwaghị ikike ncheta. E nwetawo akụkọ banyere ọnwụ nke ụfọdụ ndị na-eji ọgwụ ecstasy eme ihe. Mgbe ahụkwa, ọtụtụ ndị na-ere ọgwụ ọjọọ na-agwakọta ọgwụ ecstasy na heroin iji mee ka o rie ndị ahịa ha ahụ.

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ọ Dị Mfe Nnweta

N’ọtụtụ mba ọnụ ego ọgwụ ọjọọ adaala ebe ọ bụ na a na-emepụta ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu. Nke ahụ bụ n’ụzọ ụfọdụ n’ihi mgbanwe ọchịchị na nke akụ̀ na ụba. South Africa bụ otu ihe atụ, bụ́ ebe mgbanwe ọchịchị meworo ka e nwee azụmahịa na-ebuwanye ibu na iso mba ndị ọzọ na-agbanwerịta ihe. Nke ahụ nakwa achịkwaghị ókèala nke ọma akwalitewo ahịa ọgwụ ọjọọ. Ebe ọnọdụ enweghị ọrụ na-arị elu, ọtụtụ puku mmadụ na-adabere n’ire ọgwụ ọjọọ iji nweta ego. N’ebe ọgwụ ọjọọ jupụtara, a na-enwekwa mpụ ime ihe ike na ya. Dị ka akụkọ dị n’otu akwụkwọ akụkọ si kwuo, ndị uwe ojii na-eledo ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ ndị dị na Gauteng, South Africa—ụfọdụ dị nanị afọ 13—n’ihi ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ. Ọtụtụ ụlọ akwụkwọ dị n’ógbè ahụ amalitewo inyocha ahụ ụmụaka na-aga akwụkwọ maka ọgwụ ọjọọ.

Gịnị Bụ Isi Ihe Na-akpata Ya?

O doro anya na e nwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ma ha nile bụcha mgbaàmà nke nsogbu ka ukwuu, bụ́ isi ihe na-akpata ya. Onye edemede bụ́ Ben Whitaker zoro aka na nke a, sị: “Mmụba nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’oge a bụ mgbaàmà ịdọ aka ná ntị nke adịghị ike na ihie ụzọ dị n’etiti ọha mmadụ, e wezụga owu ọmụma na obi nkoropụ: ma ọ́ bụghị ya olee ihe mere ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị nwere nkà na ndị ihe ụwa dabaara ji ahọrọ iji ọgwụ ọjọọ eme ihe kama ịnakwere ọnọdụ nke oge a?”

Nke a bụ ezigbo ajụjụ, bụ́ nke na-eme ka anyị ghọta na ọha mmadụ nke hụrụ ihe onwunwe n’anya, nke na-emikpu onwe ha n’ịrụzu ihe, adịghị egbo mkpa mmetụta uche na nke ime mmụọ anyị mgbe nile. Ọbụna ihe ka ọtụtụ n’okpukpe enwebeghị ike igbo mkpa ndị ahụ n’ihi na ha elegharawo isi ihe kpatara nsogbu ụmụ mmadụ anya.

Anyị aghaghị ịchọpụta ma chee isi ihe ahụ kpatara ya ihu tupu anyị enwee ike ịchọpụta nanị otu ihe ngwọta na-adịgide adịgide e nwere nye nsogbu ọgwụ ọjọọ. A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 7]

Mgbe ụfọdụ ndị a ma ama na-eme ka iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-adọro adọrọ

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

A na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe gabiga ókè n’ebe a na-eti egwú n’oge a

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Ọgwụ ọjọọ bụ́ “ecstasy” na-adịkarị n’ebe ndị a na-eti egwú “rave”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Foto AP/Greg Smith

Gerald Nino/Ụlọ Ọrụ U.S. Na-ahụ Maka Ntụbata na Mbupụ Ngwá Ahịa