Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọgwụ Ọjọọ—Olee Ndị Na-eji Ha Eme Ihe?

Ọgwụ Ọjọọ—Olee Ndị Na-eji Ha Eme Ihe?

Ọgwụ Ọjọọ—Olee Ndị Na-eji Ha Eme Ihe?

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SOUTH AFRICA

“MMADỤ nile na-eji ọgwụ eme ihe.” A pụrụ iji okwu ahụ a na-akapịghị ọnụ rabanye onye na-amaghị ihe n’ịnwale iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ma na-adabere n’ihe anyị na-ele anya dị ka “ọgwụ,” eziokwu dịtụ n’okwu ahụ.

A na-akọwa okwu bụ́ “ọgwụ ọjọọ,” dị ka: “Ọgwụ ọ bụla, ma ọ̀ bụ nke aka mere ma ọ bụ na ọ bụghị, nke a pụrụ iji gbanwee ikike nghọta, ọnọdụ uche ma ọ bụ ọnọdụ mmetụta uche ndị ọzọ.” Nke ahụ bụ nkọwa dị mma, nke sara mbara nke ihe ndị a na-akpọ ọgwụ ndị na-emetụta uche, ọ bụ ezie na o metụtaghị ọtụtụ ọgwụ e ji agwọ ọrịa anụ ahụ.

Dị ka nkọwa ahụ si dị, mmanya na-aba n’anya bụ ọgwụ. Ihe bụ nsogbu bụ iji ya eme ihe gabiga ókè, bụ́ nke ihe àmà na-egosi na ọ na-arị elu. Nnyocha e nyochara kọleji na mahadum ndị dị n’otu mba dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ gosiri na “ịṅụ oké mmanya bụ nsogbu metụtara ọgwụ nke kasị njọ n’ogige mahadum.” Nnyocha ahụ gosiri na pasent 44 nke ụmụ akwụkwọ na-aṅụbiga mmanya ókè. *

Dị ka mmanya na-aba n’anya, ụtaba dị n’ebe nile n’enweghịkwa iwu na-emegide ya, n’agbanyeghị na o nwere nsí dị ike, bụ́ nicotine. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa si kwuo, ise siga na-egbu ihe dị ka nde mmadụ anọ kwa afọ. Ma, ndị a ma ama n’ịzụ ahịa ụtaba bụ ndị aka ji akụ̀, ndị a na-asọpụrụ n’obodo. Ise siga na-erikwa mmadụ ahụ nke ukwuu, ikekwe karịa ka iji ọtụtụ n’ime ọgwụ ndị megidere iwu eme ihe na-eme.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya ọtụtụ mba akwụsịwo ime mkpọsa ụtaba ma tinye ihe mgbochi ndị ọzọ. Ka o sina dị, ọtụtụ ndị ka na-ele ise siga anya dị ka ihe ọha mmadụ na-anabata. Ndị na-eme ihe nkiri na-anọgide na-eme ka ise siga yie ihe na-akpali akpali. Nnyocha Mahadum California dị na San Francisco mere banyere ihe nkiri ndị kasị nye ego n’agbata afọ 1991 na 1996 gosiri na pasent 80 nke ndị ikom a kasị mara bụ́ ndị e gosiri na ha na-ese siga.

Gịnị Banyere Ọgwụ Ndị “Iwu Kwadoro na Ndị E Ji Eme Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi”?

N’ezie ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa abaworo ọtụtụ ndị uru, ma a pụrụ iji ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Mgbe ụfọdụ ndị dọkịta pụrụ idepụta ọgwụ oké ngwa ngwa, ma ọ bụ ndị ọrịa arụgide ha idepụta ọgwụ ndị na-adịghị mkpa. Otu dibịa kwuru, sị: “Ndị dọkịta adịghị ewepụtakarị oge iji soro ndị ha na-agwọ nọkọọ iji chọpụta ihe kpatara mgbaàmà ọrịa ha. Ọ dị mfe ịsị, ‘Ṅụọ mkpụrụ ọgwụ a.’ Ma a dịghị eme ihe banyere ihe bụ́ isi kpatara nsogbu ahụ.”

Ọbụna ọgwụ ndị ọ na-abụghị dọkịta depụtara, dị ka aspirin na paracetamol (Tylenol, Panadol), pụrụ ịkpata oké nsogbu ahụ ike ma e jiri ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ihe karịrị mmadụ 2,000 na-anwụ kwa afọ n’ụwa nile n’ihi iji ọgwụ paracetamol eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

Dị ka nkọwa anyị nyere ná mmalite si gosi, caffeine nke dị na tii na kọfị bụkwa ọgwụ, ọ bụ ezie na ọ ga-ara ahụ anyị ile ya anya otú ahụ mgbe anyị na-aṅụ ihe ọṅụṅụ kasị amasị anyị n’ụtụtụ. Ọ ga-abụkwa ihe ezi uche na-adịghị na ya ile ihe ọṅụṅụ ndị dị ka tii na kọfị, bụ́ ndị ọha mmadụ weere na ha dị mma, anya dị ka ọgwụ ike dị ka heroin. Nke ahụ ga-adị ka iji nwamba a mụrụ ọhụrụ atụnyere ọdụm na-akpa ike. Ka o sina dị, dị ka ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike si kwuo, ọ bụrụ na ị na-aṅụkarị ihe karịrị iko kọfị ise ma ọ bụ iko tii itoolu n’ụbọchị, ọ pụrụ imerụ gị ahụ. Ọzọkwa, ọ bụrụ na i belata nnọọ n’ụzọ dị ukwuu ókè ị na-aṅụru ya, ị pụrụ inwe ihe mgbu nke ịkwụsị ịṅụ ya na-akpata, nke yiri nke otu onye na-aṅụ tii nwere, bụ́ onye malitere ịgbọ agbọ, inwe isi ọwụwa, ma bụrụ onye ọkụ na-achaba nnọọ n’anya.

Gịnị Banyere Iji Ọgwụ Eme Ihe n’Ụzọ Megidere Iwu?

Ihe ka eweta esemokwu bụ iji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’egwuregwu. Nke a pụtara ìhè n’egwuregwu Tour de France nke 1998 bụ́ mgbe a chụrụ mmadụ itoolu na-eji ịnyịnya ígwè eme egwuregwu n’ihi na ha ṅụrụ ọgwụ ọjọọ na-eme ka e mee nke ọma, bụ́ ndị so n’òtù egwuregwu kasị eme nke ọma. Ndị na-eme egwuregwu echepụtawo ụzọ dị iche iche isi mee ka nnyocha maka ọgwụ ọjọọ ghara ịdị irè. Magazin bụ́ Time na-akọ na ụfọdụ eruwo ọbụna n’ókè nke ịbụ ndị a “‘gbanyeere mamịrị ọzọ,’ nke pụtara [na] a na-eji obere tuubu gbanye mamịrị ‘dị ọcha’ nke onye ọzọ n’ime akpa mamịrị ha, bụ́ usoro na-afụkarị ụfụ.”

Anyị atụlebeghị ọnụ ọgụgụ na-eju anya nke ọgwụ ọjọọ ndị e ji eme ihe maka “ntụrụndụ.” Ha gụnyere wii wii, ọgwụ ecstasy (methylenedioxy-methamphetamine, ma ọ bụ MDMA), ọgwụ LSD (lysergic acid diethylamide), ọgwụ ndị na-akpali akpali (dị ka cocaine na amphetamine), ọgwụ ndị na-eme ka a nọrọ jụụ (dị ka ọgwụ ndị na-akụjụ ahụ), na ọgwụ heroin. E kwesịghịkwa ichezọ ihe dị iche iche a na-eji imi ekuru, dị ka mgba na mmanụ ụgbọala, bụ́ ndị na-ewuru ndị na-eto eto. N’ezie, a machibidoghị ihe ndị a a na-eji imi ekuru iwu, a pụkwara inweta ha n’ụzọ dị mfe.

Echiche a na-enwekarị banyere onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ ịbụ onye nọ n’ime ụlọ ruru unyi na-agba onwe ya ọgwụ ọjọọ pụrụ iduhie eduhie. Ọtụtụ ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ pụrụ ịdị na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị ruo n’ókè ụfọdụ ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị, ọ bụ ezie na ọgwụ ọjọọ riri ha ahụ aghaghị imetụta ọdịdị nke ndụ ha nke ukwuu karị ma ọ bụ ghara imetụtacha ya. Ka o sina dị, anyị apụghị ime ka mmetụta ọjọọ nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ yie ihe na-adịchaghị njọ. Otu onye edemede kọwara otú ụfọdụ ndị na-eji ọgwụ cocaine eme ihe si bụrụ ndị “pụrụ ‘ịgba onwe ha ọgwụ ọjọọ’ ọtụtụ ugboro na nwa mgbe nta, na-eme ka ahụ ha ghọọ ihe a dụpusiri adụpusi, nke na-agba ọbara, nakwa nke na-asọ oyi.”

Mgbe ihe yiri mbelata nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ ná ngwụsị afọ ndị 1980 gasịrị, iji ya eme ihe arịwala elu ọzọ n’ụwa nile. Magazin bụ́ Newsweek kwuru, sị: “Ndị ọchịchị na-enwe ihe ijuanya n’ihi oké ịrị elu nke ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ, ịrị elu nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị ọ bụla nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na ụkọ ego—nakwa ihe ọmụma—dị mkpa iji lụso ya ọgụ.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Star nke Johannesburg, South Africa, kwuru na dị ka ndekọ ọnụ ọgụgụ gọọmenti nyere si gosi, “otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla bi na South Africa bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ.”

Ụlọ Ọrụ UN Na-enyocha Mmekọrịta Ọha Mmadụ kwuru na “ndị na-emepụta ọgwụ ọjọọ na ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ . . . ahaziwo onwe ha gburugburu ụwa ma na-etinye ihe dị ukwuu n’uru ha na-erite n’ọgwụ ọjọọ ha n’ụlọ achụmnta ego ndị na-ekwe nkwa izochi ha nakwa ime ka ha nweta uru na-adọrọ adọrọ site n’atụmatụ achụmnta ego. . . . Ugbu a, ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ nwere ike itinye ego ha nwetara n’ụzọ megidere iwu n’ụlọ akụ̀ site n’iji kọmputa na-ebugharị ego ahụ gburugburu ụwa ma bụrụ nke nanị mba ole na ole na-enyocha.”

O yiri ka ọtụtụ ndị America hà pụrụ imetụ ọgwụ cocaine aka kwa ụbọchị, ọ bụ ezie na ọ bụ n’amaghị ụma. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ Discover kọwara na ihe ka ukwuu n’akwụkwọ ego America nwere ọgwụ ọjọọ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na taa iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, gụnyere ọgwụ ndị iwu na-akwadoghị, bụzi ihe ọtụtụ ndị na-anabata, bụrụ nke a na-ele anya dị ka akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. N’ịtụle mbibi a na-akpọsa n’ebe nile bụ́ nke ọgwụ ọjọọ nakwa ụtaba na mmanya na-aba n’anya na-akpata, ajụjụ pụtara ìhè bụ, N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji na-eji ha eme ihe? Ka anyị na-atụgharị uche n’ajụjụ a, ugbu a bụ oge dị mma ịtụle otú anyị si ele ọgwụ anya n’onwe anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A kọwara ịṅụ oké mmanya dị ka ‘ndị ikom ịṅụ karama mmanya ise ma ọ bụ karịa n’otu oge, nakwa ndị inyom ịṅụ karama mmanya anọ ma ọ bụ karịa.’

[Foto dị na peeji nke 3]

Ịṅụ oké mmanya bụ nsogbu bụ́ isi e nwere n’ọtụtụ ogige mahadum

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọtụtụ ndị na-ele siga na ọgwụ “ntụrụndụ” anya dị ka ihe ndị na-adịghị emerụ ahụ