Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ Ịhụnanya nke Abụzụ

Abụ Ịhụnanya nke Abụzụ

Abụ Ịhụnanya nke Abụzụ

N’ỊBỤ nke dị milimita 50 n’ogologo ma ọ bụ ihe na-erughị ya, abụzụ nwere ike ọ gaghị eyi ihe ga-adọrọ mmasị. Ma, abụ abụzụ a na-adọrọ mmasị ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile. Olee otú obere ihe a e kere eke si abụ abụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

Ọ dị mma ịmara na n’ime ihe dị ka ụdị abụzụ 2,400 e nwere, ọ bụ nanị ndị nke oké na-abụ abụ, ma ọ bụ na-ebe ubé. Kama iji akpịrị ha na-abụ abụ, oké abụzụ na-eji nku ya agụ egwú. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-akọwa na oké abụzụ na-ebe ubé site n’iji akụkụ nke otu nku elu ya na-echi n’ahịrị dị na nku ya nke ọzọ bụ́ nke ihe dị ka ogwu 50 ruo 250 mejupụtara. Ókè ubé ahụ na-adaru ụda na-adabere n’ogwu ole o chitara kwa sekọnd. Nchikọta ahụ na-eme ka ụdị abụ pụrụ iche nke abụzụ jupụta ebe nile.

Ma n’ezie oké abụzụ adịghị abụ abụ nanị ka ndị mmadụ na-ege abụ ya gere ya! Ọ dịghị ma ọlị! Onye ọgụ egwú a na-ezube ka o gee abụ ọ na-abụ bụ onye ga-abụ nwunye ya. Akwụkwọ bụ́ Exploring the Secrets of Nature na-akọwa, sị: “N’ọchịchọ ọ na-achọ nwunye, oké abụzụ, bụ́ ọkà n’inye ihe ọmụma, na-abụ ụdị abụ atọ: otu bụ iji mee ka a mara na ọ nọ ya, ọzọ abụrụ iji mee mbedo, ọzọkwa abụrụ iji chụpụ ndị ọ na-achọghị ka ha maa ya aka.” Abụzụ ụfọdụ na-anọgide na-abụ abụ iji mee ka a mara na ha nọ ya ruo mgbe nne abụzụ gosiri mmasị. Mgbe o ji “ntị” dị n’ụkwụ ihu ya nụ abụ ahụ, nke nne ahụ adịghị achọ ịnọ n’ebe dị anya na-eme mbedo. Ka ọ na-agaru n’ebe a na-ebe ubé ahụ, oké abụzụ ahụ ga-amalite ịbụ abụ olu ụtọ, bụ́ abụ mbedo, n’akwụsịghị akwụsị. Abụ a a na-abụrụ onye a hụrụ n’anya na-arata nke nne n’ebe nke oké ahụ chọrọ ka ọ bụrụ nwunye ya nọ, abụzụ nke oké ahụ agbaakwa nke nne.

N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia ụfọdụ ndị na-eji oké abụzụ emere enyi n’ihi na abụ ya na-amasị ha. Ndị ọzọ na-ahọrọ ige egwú dị otú ahụ n’ebe obibi nke abụzụ. N’ọnọdụ ọ bụla, abụ nke obere abụzụ na-eme ndị mmadụ na-ege ya gburugburu ụwa obi ụtọ ma na-ewetara Onye Mere ya otuto.