Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ibuli Udo Elu Kama Ibuli Agha Elu

Ibuli Udo Elu Kama Ibuli Agha Elu

Ibuli Udo Elu Kama Ibuli Agha Elu

DỊ KA DOROTHY HORLE SI KỌỌ

Na 1919, a mụrụ m n’otu ezinụlọ nke ndị Itali na-ekpe Chọọchị Katọlik, nke bi na Wilmington, Delaware, U.S.A. Nne na nna m agatụbeghị ụka, ma ha na-eziga mụ na ụmụnne m abụọ. Nnukwu chọọchị ndị e wuru n’ụzọ magburu onwe ha, ndị ihe oyiyi ndị dị na ha mara mma, na ndị na-eme oké ememe na-adọrọ mmasị m.

KA AFỌ na-agafe, enweghịzi m mmasị n’Okpukpe Katọlik. Chọọchị ahụ adịghị eji Bible akpọrọ ihe, bụ́ nke nna m na-akwanyere ùgwù ma na-agụ mgbe nile. Akwụkwọ akụkọ chọọchị anyị na-ewepụta bụ́ nke na-akpọ aha ndị nyere onyinye na ego ole ha nyere mere ka ahụ ghara iru m ala. A na-anụkwa ọtụtụ kepu kepu banyere ndị ụkọchukwu na-akpa àgwà ọjọọ. Mgbe m na-erule afọ 15, anaghịzi m ekpe okpukpe Katọlik. Nke a nyekwuru m oge inweta ọzụzụ na nkà ise ihe.

Ọrụ Ise Ihe

Na 1940, mgbe m dị afọ 21, alụrụ m William Horle, bụ́ nwa okorobịa na-enwe mmasị n’ise ihe ọ bụla metụtara agha—ụgbọelu, ndị soja, égbè, ụgbọ mmiri. Bill nwere obi ụtọ na m bụ ọkà n’ise ihe, ọ zụtakwaara m ágbá ise ihe ndị mbụ m jiri mee ihe bụ́ ndị e ji mmanụ mee. Amalitere m ịmụ nkà ise ihe nke ndị ọkà maara nke a na-akọ.

Mgbe ihe dị ka afọ abụọ anyị lụsịrị di na nwunye gasịrị, Bill malitere ihe omume ọ na-eji atụrụ ndụ bụ́ iji opu akpụpụta ụmụ irighiri ihe ndị metụtara agha. Ò mepụtara ndị soja a maka iji ha gwurie egwu? Ọ dịghị ma ọlị! O nwere ọchịchọ imepụta ihe ndị bụ́ ezigbo ọrụ nkà. Ndị ọrụ nkà ndị ọzọ na-eji plastik, osisi, ma ọ bụ plaster arụ ọrụ, ma opu dabara nnọọ adaba ebe ọ bụ na Bill nwetara ọzụzụ dị ka onye na-arụpụta ma na-arụzi ígwè ọrụ.

Ọ na-ese otu ihe, rụọ ihe ọ ga-eji kpụọ ya, ma jirizie opu wụọ ihe ahụ. Ka oge na-aga, ọ bịara nnọọ nwee nkà n’ijikọta akụkụ dị iche iche nke ihe a wụrụ awụ, ịgbagide ha ọkụ, ịkwọcha ha, na ime ka ha dị mụrụmụrụ. O mesịrị gbanwee site n’iji ihe ịkpụ ihe ndị e ji plaster-of-Paris mee gaa n’ihe ịkpụ ihe ndị e ji ihe e ji akpụ eze mee. Nke ahụ mere ka ọ na-arụ ọrụ n’ụzọ ka mma.

Mgbe ọ rụsịrị ọrụ n’ígwè ọ bụla, ọ bụ ọrụ m ịrụtọpụ ya. Site n’ime nnyocha sara mbara, anyị nwetara nkọwa otú yunifọm ochie nke ndị agha dịbu—ọbụna gụnyere bọtịn, eriri, baajị ọkwá, na ụcha ha.

Site n’enyemaka nke ihe na-eme ka ihe buo ibu, m na-ete mmanụ na ágbá ndị a rụrụ ịragide n’ígwè. Nke a nyere aka na-eme ka ihe oyiyi anyị yie ihe dị ndụ. Site n’ụlọ anyị dị n’okpukpu nke ime ala na Philadelphia, Pennsylvania, anyị mepụtara Ndị American Indian, ndị lụrụ Agha Obodo, ụgbọ mmiri e ji alụ agha nke United States, ịnyịnya ndị òtù Napoleon na ndị na-agba ha, ndị Mamluk nke Ijipt, ndị Zouave nke Algeria, na ihe ndị ọzọ.

E mesịa, Ndị Agha Mmiri United States kpọrọ Bill ịkpụ ndị agha mmiri mbụ nọkwasịrị n’elu ịnyịnya na Peking (bụ́ Beijing ugbu a), China, tupu 1939. Anyị rụrụ ọrụ na ya n’esepụghị aka, na 1954 kwa, anyị wetara ya n’Ụlọ Ọrụ Smithsonian dị na Washington, D.C. Afọ ụfọdụ mgbe e mesịrị, President Lyndon Johnson jụrụ ma a pụrụ ibuga ya na White House. N’ezie, anyị kwenyere.

Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị rere ihe oyiyi ndị anyị kpụrụ ere, ma Bill nyere ndị mmadụ ọtụtụ narị n’ime ha. A kpọtụrụ anyị aha n’ụzọ dị mma n’ọtụtụ akwụkwọ ndị na-ekwu banyere ndị soja a kpụrụ akpụ. E gosiri ihe anyị kpụrụ ná Ngosi Ngwá Ahịa Ụwa Nile e nwere na 1965 na Flushing Meadow, dị na Queens, New York. Ndị ọrụ ebe ngosi ihe mgbe ochie rịọrọ ka e nye ha ihe ndị anyị kpụrụ. Bruce Catton, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere Agha Obodo United States tinyere foto ọtụtụ n’ime ihe oyiyi ndị anyị kpụrụ n’akwụkwọ ndị o dere.

Ajụjụ Banyere Ndụ Arịa Elu

Otú ọ dị, ihe dị ka n’oge m gbara afọ 40, ihe malitere ịgbanwe n’ebe m nọ. Amalitere m iche echiche banyere Chineke. Otu Ụbọchị Krismas, ọkụ gbara n’ụlọ regburu ụmụaka Katọlik ise ka nne na nna ha nọ na chọọchị. Atụgharịrị m nke a n’uche, ‘Olee otú Chineke ga-esi kwe ka nke a mee n’ụbọchị ncheta ọmụmụ ya?’ Ahụrụ m otu akwụkwọ nke kọrọ banyere arụ ndị a kpara n’Oké Mgbukpọ nke ndị Juu. Ihe ndị a na ndị ọzọ dị egwu bụ́ ndị mere n’ụwa kpaliri m ịjụ, sị, ‘Olee ebe Chineke nọ? Ọ naghị eme ihe o kwesịrị ime!’

Site n’ihe nlereanya nna m setịpụrụ na mbụ, echere m na azịza ya aghaghị ịdị na Bible. Ya mere agara m n’ebe obibi onye ụkọchukwu Katọlik bụ́ nke dị nso n’ụlọ anyị dị na Philadelphia, mụ na onye ụkọchukwu yiri oge iji tụlee Bible. Echere m ya ruo ogologo oge, ma ọ bịaghị. Kwa izu ruo izu anọ, ana m eme njem gaa n’ebe obibi onye ụkọchukwu ahụ ma esoghị m ya kwurita okwu ọbụna otu ugboro.

N’otu uhuruchi, n’enweghịzi olileanya nakwa n’iwe, eleliri m anya n’eluigwe ma kpee ekpere, sị: “Amaghị m onye ị bụ. Amaghị m okpukpe ị na-akwado, ma amaara m na ị nọ ya. Biko mee ka m mara gị!” N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, Ndịàmà Jehova bịara n’ọnụ ụzọ m.

Site n’oge ruo n’oge, ahụwo m ka Ndịàmà kwụsịrị ụgbọala ha, rịtuo, ma na-aga n’ọnụ ụzọ dị iche iche. N’agbanyeghị na ọ dịghị ihe m maara banyere ha ma ọ bụ banyere ihe mere ha ji abịa, ọrụ ha na-arụ dọọrọ mmasị m.

N’ụbọchị ahụ na 1961 mgbe Ndịàmà bịara, enwere m nkụda mmụọ n’ihi na ọchịchọ m na-achọ Chineke enwebeghị isi. Ka m na-ehicha ibo ụzọ nke ihu ụlọ m, otu nwanyị katatụrụ ahụ aha ya bụ́ Marge Brion rịgotara na steepụ varanda ma kelee m. Atụgharịghịdị m iji gosi na m ma na ọ nọ ebe ahụ. Ma ka ọ na-ekwu banyere ụwa ịbụ nke a gbanwere ịghọ paradaịs mara mma, egere m ntị nke ọma n’ihe ọ bụla o kwuru. N’ikpeazụ, ọ jụrụ, sị, “Ị̀ na-ege m ntị?”

Ekwughachiri m ihe nile o kwuru, gụnyere amaokwu Bible o hotara n’Aịsaịa 55:11. Mgbe ahụ, atụgharịrị m, jide ya aka, ma kwuo, sị, “Bata n’ime ụlọ!” O nyere m Bible mbụ m na akwụkwọ na-enye aka ịmụ Bible bụ́ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri. O kwukwara ka mụ na ya na-enwechi nkwurịta okwu dabeere na Bible anya—kpọmkwem ụdị ọmụmụ ihe m nweburu olileanya na Chọọchị Katọlik ga-eduziri m.

Ebe ọ bụ na anyị na-amụ ihe ugboro abụọ n’izu, enwere m ọganihu dị ngwa n’ọmụmụ Bible m. N’oge na-adịghị anya, o doro m anya na achọtala m eziokwu ahụ. Ịmụta aha Chineke, bụ́ Jehova, bụụrụ m ahụmahụ na-emetụ n’obi. (Abụ Ọma 83:18) Chetụdị n’echiche—nke a bụ Chineke ahụ m nọworo na-achọsi ike ịmara malite mgbe m bụ nwata! Amụtakwara m na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, abụghị akụkụ dị omimi nke chi atọ n’ime otu. (Jọn 14:28) N’oge na-adịghị anya, amalitere m ịga nzukọ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova ma chọsie ike ịbụ onye nkwusa oge nile nke ozi Bible.

Ime Mkpebi Ndị Dị Mkpa

Ugbu a ule kasị ukwuu chere m ihu. Àga m ekewapụ onwe m n’òtù ọrụ nkà nke William na Dorothy Horle? Olee otú m pụrụ isi na-efe Chineke nke udo na Ọkpara ya, bụ́ Onyeisi Udo, mgbe m na-ebuli agha elu n’ihe ọkpụkpụ? (Aịsaịa 9:6) Ọ̀ bụ na Jehova ekweghị nkwa na ọ ga-eme ka “agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa”? (Abụ Ọma 46:9) Ya mere, n’ihi gịnị ka m ga-eji na-eme ka ihe Chineke ga-eme ka ọ kwụsị dịgide? Ọ̀ bụ na Aịsaịa ebughị amụma na ndị Chineke “ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè” ma ghara ịmụta agha ọzọ? (Aịsaịa 2:4) Echere m echiche ma kpesie ekpere ike ruo ogologo oge. “Apụghị m ite ha ágbá ọzọ!” bụ mkpebi m mere. N’April 25, 1964, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri.

Bill ekwuwo mgbe mgbe otú o si ewute ya na otu ụbọchị ọnwụ ga-ekewa anyị. Mgbe m malitere ịmụ Bible, m na-agwa ya, sị: “Bill, anyị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke!” (Aịsaịa 25:8; Mkpughe 21:4, 5) O chere na ara na-agba m. Mgbe m kọwara ihe mere na apụghịzi m ịdị na-ete ihe oyiyi agha ágbá ma ka nwee ezi akọ na uche, iwe were ya, o yikwara m egwu na ọ ga-ahapụ m. Mgbe e mesịrị, o mere otú ahụ.

Bill nọ na-emepụta ihe oyiyi agha dị iche iche n’onwe ya ruo ọtụtụ afọ. Ma ọ gbahapụghị m kpam kpam, ọ nọkwa na-akwado mụ na nwa anyị, bụ́ Craig mgbe nile, bụ́ onye a mụrụ na 1942. Na 1988, Bill lọghachitere, anyị bikọkwara ruo afọ iri tupu ya anwụọ.

Ka ọ dịgodị, na 1966, eruru m ihe mgbaru ọsọ m nke ịghọ ọsụ ụzọ. Kemgbe ahụ, eleghachibeghị m anya azụ. Enwere m ihe ùgwù nke ịmụrụ nwanne m nwanyị nke tọrọ m Bible. Ọ nabatara ihe ndị Bible na-akụzi, ọ ka bụkwa Onyeàmà na-arụsi ọrụ ike ruo taa. Nna m gere ntị n’ozi Bible, n’ime izu abụọ kwa, ọ malitere ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. E mere ya baptism mgbe ọ dị afọ 75, ọ nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo n’ọnwụ ya mgbe ọ dị afọ 81. Nne m nabatakwara Jehova dị ka Chineke ya, ọ bụ ezie na ọ nwụrụ tupu o mee nraranye. Ọ gbara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 94.

N’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, Jehova, bụ́ Chineke nke udo, agọziwo m n’ụzọ dị ukwuu. Ugbu a m dị afọ 81, m ka bụ ọsụ ụzọ, n’agbanyeghị na ọ na-esiri m ike ije ije. Enwere m mmetụta dị ka Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Ana m ekele Onye ahụ Nke mere m ka m dị ike, bụ́ Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, n’ihi na Ọ gụrụ m n’onye kwesịrị ntụkwasị obi, ebe O debere m ijere Ya ozi.” (1 Timoti 1:12) Lee ozi dị ebube ọ bụworo! Ọtụtụ ndị m mụụrụ Bible achụwo ihe dị iche iche n’àjà n’onwe ha iji jeere Chineke anyị bụ́ onye dị ebere ozi.

Ọ na-ewute m n’ezie na ezinụlọ m dum anabatabeghị eziokwu Bible. Ma eleghị anya, a ga-enwekwu ndị ga-anabata ya ka oge na-aga. Ma okwu Jisọs bụ́ na ndị na-eso ụzọ ya “ga-anata [otu narị otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ,” abụwo eziokwu n’ebe m nọ. (Mak 10:30) N’ezie, Jehova emewo ka m baa ọgaranya. Lee ihe ùgwù na ọṅụ ọ bụ iji Chineke na udo dochie anya ịbụ onye a ma ama na agha!

[Foto dị na peeji nke 12]

Anyị na Ọchịagha L. C. Shepherd, Jr., na 1954

[Credit Line

Defense Dept. photo (Ndị Agha Mmiri)

[Foto dị na peeji nke 13]

(Otú ọ hà n’ezie)

[Foto dị na peeji nke 14]

Mgbe m dị afọ 81, abụwo m ọsụ ụzọ ruo ihe karịrị afọ 30