Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe—Ngwọta Ya Dị!

Iji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe—Ngwọta Ya Dị!

Iji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe—Ngwọta Ya Dị!

“ACHỌPỤTA Nnukwu Ọgwụ Cocaine na Karama Mmanya.” Akụkọ na-esochi isiokwu akwụkwọ akụkọ ahụ kọwara otú ndị uwe ojii nọ na Johannesburg, South Africa, si jichie otu nnukwu igbe e ji ebulata ngwá ahịa bụ́ nke e tinyere karama mmanya Ebe Ndịda America dị 11,600. Ihe a gwakọtara ya na mmanya ahụ bụ ọgwụ cocaine dị n’agbata kilogram 150 na 180. E chere na nke ahụ bụ ọgwụ cocaine kasị ukwuu a tụbatatụrụla ná mba ahụ.

Ọ bụ ezie na nchọpụta dị otú ahụ pụrụ ime ka e nwee nchekwube, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị uwe ojii na-ejichi nanị ihe dị ka pasent 10 ruo 15 nke ọgwụ ndị megidere iwu n’ụwa nile. N’ụzọ dị mwute, nke ahụ yiri onye nlekọta ubi ibepụ akwụkwọ ole na ole nke ajọ ahịhịa na-eto ngwa ngwa ma hapụ mkpọrọgwụ ya n’ala.

Nnukwu ego a na-enweta n’ọgwụ ọjọọ na-egbochi mgbalị gọọmenti na-eme iji kwụsị mmepụta na orire ha. Na United States nanị, a na-eme atụmatụ na a na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ nke ọnụ ego ya ruru ọtụtụ ijeri dollar kwa afọ. Ebe ọ na-enye ego buru ibu otú ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị uwe ojii na ndị ọrụ ọchịchị, ọbụna ụfọdụ ndị nọ n’ọkwá dị elu, pụrụ itinye aka ná nrụrụ aka.

Alex Bellos bụ́ onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian Weekly si Brazil kọọ na dị ka otu nnyocha nke ndị ome iwu gosiri, “aha mmadụ atọ bụ́ ndị ome iwu, mmadụ 12 bụ́ ndị ome iwu steeti na mmadụ atọ bụ́ ndị isi obodo pụtara . . . n’otu ndepụta nke ihe karịrị mmadụ 800 a sịrị na ha tinyere aka na mpụ a haziri ahazi na ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ na Brazil.” Ndepụta ahụ gụnyekwara “ndị uwe ojii, ndị ọkàiwu, ndị ọchụ nta ego na ndị ọrụ ugbo nọ na steeti 17 n’ime steeti 27 nke mba ahụ.” Otu prọfesọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na Mahadum Brasília, kwuru banyere nchọpụta ndị a, sị: “Ọ bụ nnukwu ebubo metụtara akụkụ nile nke mba Brazil.” A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ọtụtụ mba bụ́ ndị ọgwụ ọjọọ na-emetụta nke ukwuu. Ihe na-eme ka nsogbu ahụ ka njọ bụ ụkpụrụ azụmahịa bụ́ na a na-emepụta ngwá ahịa dabere n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọzụzụ ya.

N’ihi ọganihu dị nta a na-enwe n’ihe banyere mmachibido iwu, ụfọdụ ndị na-akwado ka e mee ka ụfọdụ ọgwụ ọjọọ bụrụ ndị iwu na-adịghịzi emegide. Echiche bụ́ isi e nwere bụ na e kwesịrị ikwe ka ndị mmadụ n’otu n’otu nwee obere nke ha ga-eji na-eme ihe. A na-eche na nke a ga-eme ka gọọmenti na-achịkwa ya n’ụzọ dị mfe karị nakwa na ọ ga-ebelata nnukwu ego ndị isi azụmahịa ọgwụ ọjọọ na-enweta.

Ụfọdụ Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma

Ọgwụgwọ iji wepụ ọgwụ ọjọọ n’ahụ mmadụ pụrụ ibu ụzọ mee ka ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ kwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe ma mezie ka ahụ ike ha ka mma. N’ụzọ dị mwute, o yiri ka ozugbo onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ laghachiri n’ebe ọ na-anọbu, a ga-anwa ya ịmaliteghachi iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe. Onye edemede bụ́ Luigi Zoja kwuru ihe kpatara ya: “Ọ gaghị ekwe omume mmadụ ịkwụsị nnọọ otu àgwà n’emeghị ka o nwee ụzọ iche echiche dị iche kpam kpam.”

Darren, bụ́ onye e kwuru banyere ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, nwetara “ụzọ iche echiche dị iche” bụ́ nke gbanwere ndụ ya. Ọ na-akọwa, sị: “Abụ m onye na-asị na ya ekweghị na Chineke dị, ma ka oge na-aga, ọ bụ ezie na m na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe site n’ụtụtụ ruo n’abalị, abịara m mata na ọ ghaghị ịbụ na Chineke dị. N’ime ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ, agbalịri m ịkwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ma ndị enyi m adịghị ekwe ka m hapụ ya. Amalitere m ịgụ Bible mgbe nile tupu m lakpuo ụra, n’agbanyeghị na m ka na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ebelatara m mkpakọrịta mụ na ndị enyi m. Otu mgbede, ọgwụ ọjọọ ji nnọọ mụ na onye mụ na ya bi aka ọjọọ. Agwara m ya banyere Bible. N’ụtụtụ echi ya, ọ kpọrọ nwanne ya nwoke, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova na fon. Ọ gwara anyị ka anyị gaa hụ otu Onyeàmà bụ́ onye bi n’otu obodo ahụ anyị bi, agakwara m ịhụ ya.

“Anyị kwugidere okwu ruo n’elekere 11:00 nke abalị, ejikwa m ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible laa. Amalitere m iso ya na-amụ Bible ma kwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na ise siga. N’ihe dị ka ọnwa itoolu ka e mesịrị, e mere m baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Ịkwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe adịghị mfe. Michael, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ, kpughere ihe isi ike ndị o nwetara mgbe ọ kwụsịrị iji ọgwụ ọjọo eme ihe ka o jisịrị ya mee ihe ruo afọ 11: “O siiri m nnọọ ike iri nri, n’ihi ya kwa atara m ahụ. Ahụ na-erikwa m izizi, ọsụsọ na-agba m, ana m ahụ ìhè ọkụ gburugburu ndị mmadụ. Ọ gụsiri m agụụ ike ịmaliteghachi iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe, ma ịbịaru Jehova nso n’ekpere na ịmụ Bible nyeere m aka ịnọgide na-adị ọcha.” Ndị a na-ejibu ọgwụ ọjọọ eme ihe kwetara na ọ dị ha mkpa ịkwụsị kpam kpam iso ndị enyi ha mbụ na-akpakọrịta.

Ihe Mere Mgbalị Ndị Mmadụ Ji Ada

Iji ọgwụ ọjọọ eme ihe bụ nanị otu akụkụ nke nsogbu ka ukwuu bụ́ nke zuru ụwa ọnụ. Mkpali dị ukwuu nke ime ihe ọjọọ, ime ihe ike, na igosi obi ọjọọ na-ejupụta ụwa nile. Bible na-ekwu, sị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Jọn onyeozi mere ka a mata “ajọ onye” ahụ ná Mkpughe 12:9: “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.”

Tụkwasị n’adịghị ike nke ha, ụmụ mmadụ anọwo na-alụso onye iro a dị ike ọgụ. Ọ bụ Setan mere mmadụ ji daa ná mmalite. O kpebisiwo ike iwedakwu ihe a kpọrọ mmadụ ala nakwa ichigharị ha pụọ n’ebe Chineke nọ. Ojiji ihe a kpọrọ mmadụ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe yiri ka ọ bụ otu akụkụ nke ụzọ o si eme ihe. O ji oké iwe na-eme ihe n’ihi na ọ matara na “o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:12.

Olee Ihe Ngwọta Chineke Nwere?

Bible na-ekpughe ndokwa ịhụnanya Onye Okike mere iji napụta ihe a kpọrọ mmadụ n’ọnọdụ mmehie ha. Ná 1 Ndị Kọrint 15:22, a na-agwa anyị, sị: “Dị ka ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam, ọ bụkwa otú a ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst ahụ.” Jisọs ji ọchịchọ obi bịa n’ụwa dị ka mmadụ zuru okè ma chụọ ndụ elu ala ya n’àjà iji napụta ihe a kpọrọ mmadụ pụọ ná mmetụta nile nke mmehie na ọnwụ.

Ịmata ihe mere o ji nwụọ nakwa ihe ngwọta dịịrị nsogbu nile nke ụmụ mmadụ enyewo ọtụtụ ndị nkwali na agbamume ịkwụsị ịbụ ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ. Ma Bible na-eme ihe karịrị inyere anyị aka ime ihe n’otu n’otu banyere nsogbu ọgwụ ọjọọ ugbu a. Ọ na-ekwu banyere oge, mgbe e wepụsịrị mmetụta nke Setan, mgbe nsogbu nile nke ụwa, gụnyere iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ga-akwụsị kpam kpam.

Akwụkwọ Mkpughe na-akọwa “osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ pụta.” (Mkpughe 22:1) Osimiri ihe atụ a na-ese onyinyo ndokwa Chineke mere site n’aka Jisọs Kraịst iji mee ka ụmụ mmadụ nweghachi ndụ zuru okè n’elu ala paradaịs. Mkpughe na-akọwa osisi nke ndụ nke na-eme nke ọma n’akụkụ osimiri ahụ ma na-ekwu, sị: “Akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:2) Akwụkwọ osisi ihe atụ ndị ahụ na-ese onyinyo ndokwa ọgwụgwọ nke Jehova mere iji weghachi ihe a kpọrọ mmadụ n’izu okè n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ.

N’ikpeazụ, ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha, ọ bụghị nanị pụọ n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe kamakwa pụọ n’ọrịa nakwa ná nsogbu ndị ọzọ nile na-eti ha ihe otiti n’usoro ihe a retọrọ eretọ!

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Wii Wii Bụ Ihe Na-adịghị Ize Ndụ?

Ọtụtụ mba na-atụle ma hà ga-eme ka wii wii bụrụzie ihe na-emegideghị iwu, karịsịa maka iji ya na-agwọ ọrịa. A chọpụtawo na ọgwụ ọjọọ ahụ na-ebelata agbọ onunu bụ́ nke iji ọgwụ agwọ ọrịa na-akpata, ihe àmà na-egosikwa na ọ na-enyere ndị na-arịa AIDS aka inweghachi ọchịchọ iri nri. E jiwokwa ya mee ihe dị ka ihe na-akwụsị ahụ mgbu.

Ọ bụ ezie na e nweghị nkwekọrịta n’ihe banyere nchọpụta e mere, nnyocha ndị e dekọrọ na magazin bụ́ New Scientist egosipụtawo ụfọdụ n’ime mmetụta ndị na-emerụ ahụ nke wii wii.

N’otu nnyocha e mere na Mahadum Harvard, e jiri otu ìgwè na-ese wii wii kwa ụbọchị tụnyere ìgwè na-adịchaghị eji ya eme ihe. Ha chọpụtara obere ọdịiche n’ụdị nnyocha a na-eme n’ebe nile bụ́ nke e nyochara ikike ụbụrụ ha. Otú ọ dị, n’otu nnyocha e nyochara ikike ha nwere ịnagide ọnọdụ ọhụrụ, ndị na-ese wii wii nke ukwuu emeghị nnọọ nke ọma.

Mahadum ọzọ nyochara otu ìgwè nke ndị na-ese wii wii mgbe nile na ìgwè nke ndị na-ese siga, n’ime afọ 15. Ndị ahụ na-ese wii wii na-esekarị wii wii atọ ma ọ bụ anọ n’otu ụbọchị, ebe ndị ahụ na-ese siga na-ese siga 20 ma ọ bụ karịa n’otu ụbọchị. Ọnụ ọgụgụ hà nhata sitere n’ìgwè abụọ ahụ rịara ụkwara na ọzịza nke opi akpa ume. Nnyocha e nyochara akpa ume ha na-ekpughe otu mmebi nke mkpụrụ ndụ n’ìgwè abụọ ahụ.

Ọ bụ ezie na ugboro ole ndị ahụ na-ese wii wii sere ya dị ala karị, a chọpụtara na otu wii wii na-ewepụta nsí tar ji okpukpu atọ karịa nke otu siga na-ewepụta. Ọzọkwa, magazin bụ́ New Scientist kọkwara na: “Ndị na-ese wii wii na-ekumi ume ekumi karị, na-ejidekwa ume ha ruo oge ka ogologo.”

Ọzọkwa, a chọpụtara na mkpụrụ ndụ ndị pụrụ iguzogide ọrịa bụ́ ndị sitere n’akpa ume nke ndị ahụ na-ese wii wii nwere ikike ji pasent 35 dị ala karịa nke mkpụrụ ndụ ndị sitere n’akpa ume nke ndị na-ese siga nwere iji lụso nje ọgụ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto Ndị Agha Mmiri United States

[Igbe dị na peeji nke 11]

“Ikpe Dị Mwute Mara” Ndị Nne na Nna

Otu uche akwụkwọ akụkọ nke gbara n’akwụkwọ akụkọ South Africa bụ́ Saturday Star kwupụtara nchegbu banyere mmụba dị ukwuu nke ojiji ndị ntorobịa nọ na South Africa ji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe ma kwuo, sị:

“Na ụmụ anyị na-eme nke a [iji ọgwụ ọjọọ eme ihe] na-abụkarị ikpe dị mwute mara anyị bụ́ ndị nne na nna nakwa ọha mmadụ n’ozuzu ya. Oge nile, anyị na-arụsi ọrụ ike iji nweta ego, na-etinye oge na ike anyị nile iji nweta ihe onwunwe. Ụmụ anyị na-achọ uche, na ume anyị. Ànyị na-ewepụta oge bara uru soro ha nọkọọ? Ọ dị mfe inye ha ego ka ha hapụ anyị aka. Ọ dị mfe karịa ka ọ dị ige ha ntị—ịmata egwu ha, olileanya ha, nchegbu ha. N’abalị a, ka anyị na-anọdụ n’ụlọ nri ma ọ bụ na-ezuru ike n’ihu TV, ànyị ga-amata ọbụna ihe ndị ha na-eme?”

Ma ọ bụ, ànyị maara ihe ha na-eche?

[Foto dị na peeji nke 10]

A kwaliwo ọtụtụ ndị ịkwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe