Olee Ebe Mmiri Ahụ Nile Gara?
Olee Ebe Mmiri Ahụ Nile Gara?
Cherrapunji, India, bụ otu n’ime ebe ndị kasị dịrị mmiri mmiri n’elu ala. N’oge udu mmiri, mmiri ozuzo dị milimita 9,000 na-ede ugwu ya nile, bụ́ nke dị n’ala ala Ugwu Himalaya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú ọ pụrụ iyiru ihe siri ike nkweta, Cherrapunji na-enwekwa ụkọ mmiri.
EBE ọ bụ na e nweghị ahịhịa hiri nne ga-ejigide mmiri ahụ, ọ na-asọpụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ o zoro. Ọnwa abụọ mgbe mmiri udu mmiri zosịrị, mmiri na-akọ ụkọ. Ọtụtụ afọ gara aga, Robin Clarke, n’akwụkwọ ya bụ́ Water: The International Crisis (Mmiri: Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ), kọwara Cherrapunji dị ka “ọzara kasị dị mmiri mmiri n’elu ala.” *
N’ebe na-adịghị anya n’ebe mgbada site na Cherrapunji, ka Bangladesh dị, bụ́ ebe ụmụ mmadụ bijupụtara, bụrụkwa mba nke dị n’ebe mgbada bụ́ nke mmiri udu mmiri ndị si n’ugwu India na Nepal ndị ọhịa na-adịghị ekwodata, kasị akpa aka ọjọọ. N’afọ ụfọdụ, idei mmiri rikpuru ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke Bangladesh. Ma ozugbo idei mmiri ahụ talatara, Osimiri Ganges na-atalata dịzie obere, ala ahụ akpọọkwa nkụ. Ihe karịrị 100 nde mmadụ nọ na Bangladesh na-eche ajọ ihe ndị a na-eme kwa afọ bụ́ idei mmiri na ala ịkpọ nkụ ihu. Nke ka njọ, e jiwo nsí arsenic metọọ olulu mmiri ndị dị n’ebe ahụ, bụ́ nke pụrụ imeworịị ọtụtụ nde mmadụ nsí.
Na Nukus, Uzbekistan, nke na-adịghị anya n’Oké Osimiri Aral, nsogbu nke ya bụ nnu ọ bụghị nsí arsenic. Ihe na-acha ọcha na-awụkwasị osisi ogho ndị dị n’ebe ahụ ma na-eme ka ha ghara ito nke ọma. Nnu ahụ na-esi n’ájá dere mmiri nke dị n’ime ala apụta. Nsogbu a, bụ́ nke a na-akpọ nnu ijupụta n’ala, abụghị ihe ọhụrụ. Ọrụ ugbo a na-arụ na Mesọpotemia dalatara puku afọ anọ gara aga n’ihi otu ihe ahụ kpọmkwem. Ịgba ala mmiri gabiga ókè na enweghị ezi ọwara mmiri na-eme ka nnu dị n’ime ala jupụta n’elu ala. Iji wee ihe ubi dị mma, a ghaghị ijikwu mmiri dị mma mee ihe. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ala ahụ na-aghọ ihe na-abaghịzi uru—nye ọgbọ ndị ga-abịa n’ọdịnihu.
Olee Ebe Mmiri ahụ Nile Na-aga?
N’ụzọ dị mwute, ihe dị ukwuu ná mmiri ozuzo na-abụ oké mmiri ozuzo. Ọ bụghị nanị
na nke a na-akpata idei mmiri kamakwa ọ na-eme ka mmiri sọpụ n’ala ngwa ngwa ma sọbanye n’oké osimiri. Ebe ụfọdụkwa na-enwe mmiri ozuzo nke ukwuu, ebe ndị ọzọ na-enwe ntakịrị. A ma Cherrapunji ama dị ka nke na-enwe ihe karịrị milimita 26,000 nke mmiri ozuzo n’otu afọ, ebe Ọzara Atacama nke dị n’ebe ugwu Chile pụrụ ịnọcha ọtụtụ afọ n’enweghị mmiri ozuzo dị ịrịba ama ma ọlị.Ọzọkwa, ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ na mbara ala anyị bi n’ebe mmiri na-adịchaghị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ nnọọ mmadụ ole na ole bi n’ebe okpomọkụ nke Africa nakwa n’Ebe Ugwu America bụ́ ebe a na-enwe mmiri ozuzo n’ụba. Nnukwu Osimiri Amazon na-enubanye n’ime Oké Osimiri Atlantic pasent 15 nke mmiri nile na-asọbanye n’oké osimiri ahụ kwa afọ, ma ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’ebe ahụ ehighị nne, ọ bụ nnọọ obere mmiri dị mkpa maka ndị mmadụ iji mee ihe. N’aka nke ọzọ, ihe dị ka nde mmadụ 60 bi n’Ijipt, bụ́ ebe a na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo, Osimiri Naịl talatara atalata aghaghịkwa igbo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mkpa nile ha nwere maka mmiri.
N’ọtụtụ afọ gara aga, ndịrịta iche dị otú ahụ n’inweta mmiri akpataghị nsogbu ndị siri ike. Dị ka otu nnyocha si kwuo, na 1950, ọ dịghị ógbè ọ bụla dị n’ụwa hụsiri anya n’ihi ụkọ ma ọ bụ oké ụkọ mmiri. Ma oge ndị ahụ e nwere mmiri n’ụba agafeela. N’ógbè ndị kpọrọ nkụ n’Ebe Ugwu Africa na n’Ebe Etiti Esia, ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri e nwere maka otu onye ejiriwo okpukpu iri dị ala karịa ihe ọ bụ na 1950.
E wezụga mmụba n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na ntakịrị mmiri ozuzo a na-enwe n’ọtụtụ ebe ndị mmadụ bijupụtara, ọchịchọ a na-achọ mmiri arịwo elu n’ihi ihe ndị ọzọ. N’ụwa taa, ọganihu na inwe mmiri dị mma na-aga ụkwụ na ụkwụ.
Ọchịchọ A Na-achọwanye Mmiri
Ọ bụrụ na i bi ná mba mepere emepe, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị rịbawo ama na ụlọ mmepụta ihe na-ejupụta gburugburu osimiri ndị dị mkpa. Ihe kpatara ya doro anya. Ụlọ ọrụ mmepụta ihe chọrọ mmiri iji mepụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile, site na kọmputa ruo na waya e ji adụgide akwụkwọ. Ụlọ ọrụ na-emepụta ihe oriri na-ejikwa ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri dị ịtụnanya eme ihe. Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ike eletrik nwere ọchịchọ a na-apụghị imeju emeju maka mmiri, a na-ewukwa ha n’akụkụ ọdọ mmiri ma ọ bụ osimiri.
Ọbụna mkpa e nwere maka mmiri n’ọrụ ugbo ka ukwuu. N’ọtụtụ ebe, mmiri ozuzo adịghị nnọọ ehi nne ma ọ bụ a pụghị nnọọ ịdabere na ya iji nwee owuwe ihe ubi dị mma,
ya mere ịgba ala mmiri yiri ka ọ bụ ihe ngwọta dị mma iji nye mbara ala mmiri nke na-agụ ya. N’ihi ndabere a na-adabere n’ihe ọkụkụ ndị a gbara mmiri, ọrụ ugbo na-ewere akụkụ dị ukwuu nke mmiri dị mma nke mbara ụwa.Tụkwasị na nke a, mmiri e ji eme ihe n’ụlọ ebuola ibu. N’afọ ndị 1990, ọnụ ọgụgụ na-eju anya bụ́ nde mmadụ 900 ndị ka malitere ibi n’obodo ukwu chọrọ inwe usoro zuru ezu nke idebe ihe ọcha na inweta mmiri na-adịghị ize ndụ. Ebe ndị e si enweta mmiri kemgbe ụwa, dị ka osimiri na olulu mmiri, adịghịzi ezuru obodo ukwu. Dị ka ihe atụ, Mexico City na-ejizi paịpụ adọta mmiri site n’ebe karịrị kilomita 125 ma dọrọ ya gafee n’elu ugwu ndị ji mita 1,200 dị elu karịa obodo ukwu ahụ. Ọnọdụ ahụ, ka Dieter Kraemer na-ekwu n’ihe ndekọ ya bụ́ Water: The Life-Giving Source (Mmiri: Ihe Na-enye Ndụ), bụ nke “a pụrụ iji tụnyere azụ̀ octopus; na-esetịpụ aka site n’obodo ukwu ahụ iji nweta mmiri.”
N’ihi ya, ụlọ ọrụ mmepụta ihe, ọrụ ugbo, na ebe ndị mepere emepe anọwo na-ekwusi ike na ha chọkwuru mmiri. E mejuola ọtụtụ n’ime ọchịchọ ha ka ọ dịgodị, site n’inweta ya n’ebe nchekwa nke mbara ụwa—mmiri dị n’ime ala. Ọdọ mmiri dị n’ime ala bụ otu n’ime ebe ndị bụ́ isi e nwere mmiri dị mma n’ụwa. Ma ha pụrụ ịgwụ agwụ. Mmiri dị otú ahụ yiri ego dị n’ụlọ akụ̀. Ị gaghị anọgide na-adọrọ ya ma ọ bụrụ na ị na-etinye obere ego na ya. Otu ụbọchị, oge ime mpịazi ga-eru.
Iji Mmiri Dị n’Ime Ala Eme Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi na n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
Mmiri dị n’ime ala bụ mmiri anyị na-ekuru mgbe anyị gwuru olulu mmiri. Ihe ndekọ nke Òtù Na-ahụ Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ Groundwater: The Invisible and Endangered Resource (Mmiri Dị n’Ime Ala: Ihe Dị Mkpa Anya Na-adịghị Ahụ nke Na-apụ n’Anya) na-ekwu na a na-esi na ya enweta ọkara nke mmiri a na-eji eme ihe n’ụlọ na nke a na-eji agba ihe a kụrụ akụ. Ebe ọ bụ na a dịghị emetọru mmiri dị n’ime ala otú e si emetọ mmiri dị n’elu ala, ọ bụkwa na ya ka e si enweta ihe dị ukwuu n’ime mmiri ọṅụṅụ anyị, ma n’obodo ukwu ma n’ime ime obodo. A sị na ndọrọ a na-adọrọ mmiri dị n’ime ala agabigaghị ókè, ọ ga-aha otú ọ ha, ebe ọ bụ na mmiri ozuzo nke na-eji nwayọọ nwayọọ abanye n’ọdọ mmiri ndị a dị n’ime ala na-agbanyekwu mmiri na ha. Ma ruo ọtụtụ iri afọ, ihe a kpọrọ mmadụ anọwo na-adọrọ mmiri dị nnọọ ukwuu karịa ka nrugharị mmiri pụrụ idochi.
Ihe si na ya apụta bụ na mmiri dị n’ime ala na-agbadakwu, ọ na-aghọkwa ihe na-efu oké ego ma ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume bụ́ igwumi ala otú kwesịrị ekwesị iji ruo ya. Mgbe olulu mmiri tara, ọ na-akpata ọdachi n’ụzọ akụ̀ na ụba nakwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ. N’India, ọdachi ndị dị otú ahụ amalitelarị ime. Ebe ọ bụ na ihe oriri nke otu ijeri mmadụ bi n’etiti ala dị larịị nke China na India dabeere ná mmiri e chekwara n’ime ala, ihe a na-atụ anya ya n’ọdịnihu dị egwu.
A na-eme ka ntalata nke mmiri dị n’ime ala na-atalata kawanye njọ site n’imetọ ya. Fatịlaịza ndị e ji akọ ugbo, nsị́ mmadụ na nke anụmanụ, na mmiri ọgwụ ndị e ji eme ihe n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe, na-abanyecha na mmiri dị n’ime ala. “Ozugbo e metọrọ ọdọ mmiri dị n’ime ala, ọ pụrụ iwe ogologo oge na ego dị ukwuu iji dozie ya, ọbụna ọ pụrụ ịbụ nke na-apụghị ikwe omume,” ka otu akụkọ nke Òtù Ụwa Na-enyocha Ọnọdụ Ihu Igwe bipụtara na-ekwu. “A kpọwo ojiji ihe mmetọ dị iche iche ji nwayọọ nwayọọ na-abanye na mmiri dị n’ime ala ‘bọmbụ a haziri oge mgbawa ya.’ Ọ na-eyi ihe a kpọrọ mmadụ egwu.”
N’ikpeazụ, ihe na-emegide ihe a tụrụ anya ya bụ na mmiri e si n’ọdọ mmiri ndị dị n’ime ala dọta pụrụ ibibi kpọmkwem ala ahụ a chọrọ ka o dee. Nnu na-ejupụtazi n’elu ihe dị ukwuu n’ala ndị a gbara mmiri ná mba ndị kpọrọ nkụ ma ọ bụ ndị na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo n’ụwa. N’India nakwa na United States—mba abụọ n’ime mba ndị bụ́ isi na-emepụta ihe oriri—pasent 25 nke ala ndị a gbara mmiri abụrụworị ndị e bibiri nke ukwuu.
E Jighị A kpata A tụfuo Aba Ọgaranya
N’agbanyeghị ihe isi ike nile a, ọnọdụ ahụ agaraghị adị nnọọ oké njọ ma a sị na e ji nlezianya ka ukwuu na-eji mmiri dị oké ọnụ ahịa nke mbara ala eme ihe. Usoro ịgba ala mmiri, bụ́ ndị na-adịghị irè, na-emebikarị pasent 60 nke mmiri tupu ya eruo ihe ndị a kụrụ akụ. Usoro dị irè karị—iji nkà na ụzụ dịnụ eme ihe—pụrụ ibelata mmiri ụlọ ọrụ mmepụta ihe na-eji eme ihe ruo ọkara. Ọbụna mmiri e ji eme ihe n’obodo ndị mepere emepe pụrụ iji pasent 30 belata ma ọ bụrụ na e mezie paịpụ ndị gbawara agbawa ngwa ngwa.
Ọ bụrụ na a ga-echekwa mmiri, ndị mmadụ aghaghị ịdị njikere ime otú ahụ, a ghaghịkwa inwe ụzọ isi mee ya. È nwere ezi ihe ndị mere a ga-eji kwere na a pụrụ ichekwa mmiri dị oké ọnụ ahịa nke mbara ala anyị maka ọgbọ ndị na-abịa n’ọdịnihu? Isiokwu ikpeazụ anyị ga-aza ajụjụ a.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Lee isiokwu bụ́ “Cherrapunji—Otu n’Ime Ebe Ndị Kasị Dị Mmiri Mmiri n’Elu Ala,” na Teta! (Bekee) nke May 8, 2001.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]
MMIRI NA-EME KA ỤWA DỊGIDE
Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-eji mmiri dị ukwuu eme ihe n’usoro mmepụta ihe nile.
▪ Ọ pụrụ iwe mmiri dị tọn 280 iji mepụta otu tọn ígwè.
▪ Imepụta otu kilogram nke akwụkwọ pụrụ ịchọ ihe ruru mmiri dị kilogram 700 (ma ọ bụrụ na ụlọ ọrụ mmepụta ihe ahụ adịghị azacha mmiri o jibu mee ihe iji were ya mee ihe ọzọ).
▪ Iji mepụta otu ụgbọala, ndị na-emepụta ya na-eji mmiri ji okpukpu 50 dị arọ karịa ụgbọala ahụ, eme ihe.
Ọrụ ugbo pụkwara ịchọ nnọọ mmiri dị ukwuu otú ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na a na-azụ anụ ụlọ n’ógbè ụwa ebe a na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo.
▪ A ga-achọ mmiri dị lita 20,500 iji mepụta otu kilogram anụ ehi a kwọrọ akwọ site n’ehi California.
▪ Imechasị na itinye nanị otu ọkụkọ na friji na-ewe ma ọ dịkarịa ala mmiri dị lita 26.
[Ihe e sere ese/Foto ndị dị na peeji 20]
OLEE EBE NDỊ A NA-EJI MMIRI EME IHE?
N’ọrụ ugbo 65%
N’ụlọ ọrụ mmepụta ihe 25%
N’ụlọ 10%
[Foto ndị dị na peeji nke 21]
A na-emebisị ọtụtụ nde lita mmiri n’ihi paịpụ mmiri ndị gbawara agbawa na pọmpụ ndị a kpọghere hapụ ha ka mmiri na-agbafu
[Ebe E Si Nweta Foto]
AP Photo/Richard Drew