Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Onye ahụ Na-emegide Kraịst?

Ònye Bụ Onye ahụ Na-emegide Kraịst?

Echiche nke Bible

Ònye Bụ Onye ahụ Na-emegide Kraịst?

“UNU NỤKWARA NA OTU ONYE NKE NA-EMEGIDE KRAỊST NA-ABỊA.”—1 JỌN 2:18.

Ọ BỤRỤ na a dọrọ gị aka ná ntị na a hụrụ otu ajọ onye omekome ka ọ na-aga n’ógbè unu, gịnị ka ị ga eme? O yiri ka ị ga-achọ ịchọpụta otú ọ dị n’ezie na ụzọ o si eme ihe. Ị ga-amụrụ anya.

Ọnọdụ yiri nke ahụ dị taa. A dọwo anyị aka ná ntị site n’okwu Jọn onyeozi: “Mmụọ ọ bụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs, o sighị na Chineke pụta: nke a bụkwa mmụọ nke onye ahụ na-emegide Kraịst, nke unu nụworo na ọ na-abịa; ọ bụkwa n’oge dị ugbu a ka ọ nọ n’ụwa.” (1 Jọn 4:3) Ọ̀ dị onye dị otú ahụ nke na-emegide Kraịst, bụ́ onye iro Chineke na onye na-eduhie ụmụ mmadụ, nke na-eyi ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ egwu ugbu a?

Jọn jiri okwu bụ́ “onye ahụ na-emegide Kraịst” mee ihe ugboro ise n’ime abụọ n’akwụkwọ ozi ya. Ọ na-ezo aka n’onye ma ọ bụ n’òtù na-emegide ihe Bible na-ezi banyere Jisọs Kraịst, ọ na-agụnyekwa ndị na-ekwu na ha bụ ihe ha na-abụghị bụ́ ndị na-ekwu na ha bụ Kraịst ma ọ bụ na ha bụ ndị o zitere. Bible na-enye ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya banyere onye ahụ na-emegide Kraịst. Ma dị ka ọ na-adị mgbe ụfọdụ n’ebe ndị na-emebi iwu nọ, a ṅawo ntị n’akụkọ ndị na-enweghị isi banyere onye ma ọ bụ òtù a a na-amaghị onye ọ bụ karịa n’ihe bụ eziokwu.

Ịghọtahie Onye Ọ Bụ

Eri oge Jọn onyeozi, ndị mmadụ anọwo na-ekwu na ihe Jọn kwuru banyere onye na-emegide Kraịst na-ezo aka n’ebe otu onye kpọmkwem nọ. Ndị mmadụ akpọwo ọtụtụ ndị aha. Ọtụtụ narị afọ gara aga, ọtụtụ ndị chere na Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu Rom bụ́ Nero bụ onye ahụ na-emegide Kraịst. Ka e mesịrị, oké ịkpọasị na ime ihe ike nke Adolf Hitler mere ka ọtụtụ ndị kwenyesie ike na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-emegide Kraịst. E ji okwu ahụ mee ihe ọbụna maka onye Germany bụ́ onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Friedrich Niestzsche. Ma ndị ọzọ kwenyere na onye ahụ na-emegide Kraịst ka ga-abịa na ọ ga-apụtakwa dị ka onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị akọ, onye obi tara mmiri nke nzube ya bụ ịchị ụwa. Ha kwenyere na anụ ọhịa ahụ dị ná Mkpughe isi 13 bụ izo aka kpọmkwem n’onye ahụ na-emegide Kraịst nke Jọn kpọtụrụ aha. Ha na-ekwu na n’ụzọ ụfọdụ a ga-eji akara ya bụ 666 mata onye a ga-apụta n’ọdịnihu nke ga na-akwado ajọ omume.

Ndị na-akwalite echiche ndị a na-ewere ya na Jọn zoro aka n’ebe nanị otu onye nke na-emegide Kraịst nọ. Ma gịnị ka okwu ya na-egosi? Tụlee 1 Jọn 2:18: “Dị ka unu nụkwara na otu onye nke na-emegide Kraịst na-abịa, ọbụna ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst apụtawo.” Ee, “ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst,” ọ bụghị otu onye, bụ ha kpatara ajọ ọnọdụ ime mmụọ nke dị laa azụ na narị afọ mbụ. Taa, e nwere ọ bụghị otu onye kama ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst bụ́ ndị mejupụtara òtù onye na-emegide Kraịst. N’ozuzu, ha ewetaworo ihe a kpọrọ mmadụ mbibi n’ụzọ ime mmụọ. (2 Timoti 3:1-5, 13). Olee ndị mejupụtara onye ahụ na-emegide Kraịst?

Ka anyị lee anụ ọhịa ahụ e kwuru maka ya ná Mkpughe isi 13 anya dị ka nke pụrụ iso na ya. Jọn onyeozi dere, sị: “Anụ ọhịa nke m hụrụ yikwara agụ, ụkwụ ya dịkwa ka ụkwụ bear, ọnụ ya dịkwa ka ọnụ ọdụm.” (Mkpughe 13:2, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Gịni ka ihe ndị a na-anọchite anya ha?

Ndị mmụta Bible ahụwo njikọ dị n’etiti Mkpughe isi 13 na Daniel isi 7. Chineke mere ka Daniel hụ anụ ọhịa dị iche iche bụ́ ihe atụ n’ọhụụ, gụnyere agụ, bear, na ọdụm. (Daniel 7:2-6) Gịnị ka onye amụma Chineke kọwara na ha pụtara? O dere na anụ ọhịa ndị ahụ bụ ihe atụ nke ndị eze ụwa ma ọ bụ ọchịchị dị iche iche. (Daniel 7:17) Ya mere, anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ ezi uche dị na ya na anụ ọhịa ahụ e kwuru maka ya ná Mkpughe na-anọchite anya ọchịchị ụmụ mmadụ. Ebe ọchịchị ndị a na-emegide Alaeze Chineke, ha bụ akụkụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst.

Olee Ndị Ọzọ So n’Onye ahụ Na-emegide Kraịst?

Mgbe Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke nọ n’elu ala, o nwere ọtụtụ ndị iro. Ọ bụ ezie na ọ nọ ụgbụ a n’ebe aka na-apụghị iru, o nwere ndị mmegide n’oge a. Rịba ama ndị a gụnyere n’ime ha.

Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ònye bụ onye ụgha ahụ ma ọ́ bụghị onye na-agọ sị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ? Onye na-agọnahụ Nna anyị na Ọkpara ya, onye a bụ onye ahụ na-emegide Kraịst.” (1 Jọn 2:22) Ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ndú nke okpukpe ụgha na-agbanwe ihe ndị doro anya Jisọs kụziri ka ha ghọọ ìgwè aghụghọ okpukpe. Ndị dị otú ahụ na-ajụ eziokwu Bible ma na-ezisa okwu ụgha n’aha Chineke na Kraịst. Ha na-agọnahụ ezi mmekọrịta ahụ dị n’etiti Nna ahụ na Ọkpara ya site n’ozizi Atọ n’Ime Otu ha. N’ihi ya, ha so n’onye ahụ na-emegide Kraịst.

Jisọs buru ụzọ dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na Luk 21:12, sị: “Ha ga-atụkwasị unu aka ha, sogbuokwa unu, na-arara unu nye n’aka ụlọ nzukọ na ụlọ mkpọrọ . . . n’ihi aha m.” Eri narị afọ mbụ, ezi ndị Kraịst atachiwo obi n’ajọ mkpagbu. (2 Timoti 3:12) Ndị na-akpali ụdị mmeso ahụ na-emegide Kraịst. Ha onwe ha kwa so n’onye ahụ na-emegide Kraịst.

“Onye na-adịghị n’akụkụ m na-emegide m; onye na-adịghị esokwa m ikpokọta ihe na-achụsa achụsa.” (Luk 11:23) N’ebe a Jisọs kwuru na onye ọ bụla nke na-emegide ya nakwa nzube Chineke nke ọ na-akwado so n’òtù onye ahụ na-emegide Kraịst. Gịnị na-echere ndị a?

Gịni Na-echere Ndị Na-emegide Kraịst?

“[Chineke] ga-eme ka ndị nile na-ekwu okwu ụgha laa n’iyi: mmadụ nke bụ́ onye ọbara na onye aghụghọ, Jehova na-akpọ ya onye arụ,” ka Abụ Ọma 5:6 na-ekwu. Nke a ò metụtara ndị na-emegide Kraịst? Ee. Jọn onyeozi dere, sị: “N’ihi na ọtụtụ ndị nduhie apụwo baa n’ime ụwa, bụ́ ndị na-adịghị ekwupụta na Jisọs Kraịst na-abịa n’anụ ahụ. Nke a bụ onye nduhie ahụ na onye ahụ na-emegide Kraịst.” (2 Jọn 7) N’ihi ụgha ha na-agha na nduhie ha, Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ga-ebibi ndị na-emegide Kraịst.

Ka oge mmezu nke ihe ahụ e kpere n’ikpe na-eru nso, ezi ndị Kraịst agaghị ekwe ka nrụgide na aghụghọ nke ndị na-emegide Kraịst, karịsịa ndị sitere n’aka ndị si n’ezi ofufe dapụ, mee ka okwukwe ha daa mbà. Ịdọ aka ná ntị Jọn dị oké mkpa: “Lezienụ onwe unu anya, ka unu wee ghara ịla ọrụ anyị rụrụ n’iyi, kama ka unu wee nata ụgwọ ọrụ zuru ezu.”—2 Jọn 8.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 12]

Nero na peeji nke 2 na nke 12: Site n’ikike nke Visitors of the Ashmolean Museum, Oxford