Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkwụsị Ịkpọasị

Ịkwụsị Ịkpọasị

Ịkwụsị Ịkpọasị

“Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya.”—MATIU 5:44.

RUO ọtụtụ ụbọchị, ndị ndú nke mba abụọ bụ́ ndị iro gara n’ihu n’okwu udo siri ike. President nke otu ala siri ike ma mepee emepee nọ ya mgbe a na-enwe nkwurịta okwu ahụ, na-eji ikike ya dị ukwuu na nkà mkpezi ya na-agbalị ime ka ndị ndú abụọ ahụ nwee nkwekọrịta. Ma ihe si ná mgbalị ndị a tara akpụ pụta bụ n’ezie nhụjuanya ka ukwuu. N’ime izu ole na ole, mba abụọ ahụ malitere ihe magazin bụ́ Newsweek kpọrọ “ime ihe ike kasị njọ e nwere n’etiti ha abụọ n’ime afọ iri abụọ.”

Gburugburu ụwa, ịkpọasị na ibu iro ndị dị n’etiti agbụrụ na mba dị iche iche enweghị nkwụsị, n’agbanyeghị mgbalị nile ndị ndú mba dị iche iche meworo. Ịkpọasị na-akawanye nnọọ njọ, bụ́ nke amaghị nke a na-akọ, nkwesi olu ike, na okwu nduhie na-akwalite. Ma ka ndị ndú nke taa na-agbalị n’efu inweta ihe ngwọta ọhụrụ, ha amaghị na ihe ngwọta ya kasị mma bụ nke ochie—ihe meworo ochie dị ka Ozizi Elu Ugwu ahụ. N’oge ozizi ahụ, Jisọs Kraịst gbara ndị na-ege ya ntị ume ịgbaso ụzọ Chineke si eme ihe. Ọ bụ mgbe ahụ ka o kwuru ihe ahụ e hotara n’elu, ya bụ́, “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya.” Ọ bụghị nanị na ndụmọdụ ahụ bụ ihe ngwọta kasị mma nye nsogbu ịkpọasị na ajọ mbunobi kamakwa ọ bụ nanihe ngwọta dị irè e nwere!

Ndị na-arụ ụka na-ajụ echiche nke mmadụ ịhụ ndị iro ya n’anya dị ka ihe na-apụghị ime eme na nke na-adịghị irè. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị mmadụ pụrụ ịmụta ịkpọasị, mgbe ahụ ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya iche na ha pụkwara ịmụta ghara ịkpọ asị? N’ihi ya okwu Jisọs na-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee ezi olileanya. Ha na-egosi na o kwere omume ịkwụsị ọbụna ibu iro dịteworo aka.

Tụlee ọnọdụ e nwere n’oge Jisọs n’etiti ndị Juu na-ege ya ntị. Ọ dịghị ha mkpa ịgate aka iji nweta ndị iro. Usuu ndị agha Rom nọgidere na-achịkwa ógbè ahụ, na-eme ka ndị Juu kwụọ ụtụ isi buru ibu, na-achịgbu ha, na-emeso ha n’ụzọ dị njọ, na-erigbukwa ha. (Matiu 5:39-42) Otú ọ dị, ụfọdụ pụrụ ọbụna ile ndị Juu ibe ha anya dị ka ndị iro n’ihi ụmụ obere nghọtahie a na-edozibeghị bụ́ ndị a hapụkwara, ha ewee na-akawanye njọ. (Matiu 5:21-24) Ọ̀ pụrụ n’ezie ịbụ na Jisọs na-atụ anya ka ndị na-ege ya ntị na-ahụ ndị kpasuru ha iwe ma kpatara ha ihe mgbu n’anya?

Ihe ‘Ịhụnanya’ Pụtara

Nke mbụ, ghọta na mgbe Jisọs kwuru banyere ‘ịhụnanya,’ o bughị n’uche ụdị mmetụta nke pụrụ ịdị n’etiti ezi ndị enyị. Okwu Grik maka ịhụnanya bụ́ nke e ji mee ihe na Matiu 5:44 sitere n’okwu bụ́ a·gaʹpe. Okwu a pụtara ịhụnanya nke ụkpụrụ na-eduzi ma ọ bụ na-achịkwa. Ọ dịchaghị mkpa na ọ ga-agụnye mmetụta na-ekpo ọkụ. Ebe ọ bụ ụkpụrụ ezi omume na-eduzi ya, ịhụnanya dị otú ahụ na-akwali mmadụ ịchọ ọdịmma ndị ọzọ, n’agbanyeghị àgwà ha. N’ihi ya, ịhụnanya a·gaʹpe pụrụ imeri iro mmadụ na ibe ya. Jisọs n’onwe ya gosipụtara ịhụnanya dị otú ahụ mgbe, kama ịkpọ ndị agha Rom kpọgidere ya n’elu osisi iyi, o kpere ekpere, sị: “Nna, gbaghara ha; n’ihi na ha amataghị ihe ha na-eme.”—Luk 23:34.

Ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịtụ anya na ụwa ga-anabata ozizi Jisọs n’ìgwè nakwa na ndị mmadụ ga-amalite ịhụ ibe ha n’anya? Ee e, n’ihi na Bible na-egosi na ụwa a ga-anọgide na-agbaga n’ọdachi. “Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ,” ka 2 Timoti 3:13 na-ebu n’amụma. Ka o sina dị, ndmmadn’otu n’otu pụrụ ịkwụsị ịkpọasị site n’ịbụ ndị e ziri ụkpụrụ ezi omume nke ọma site n’ịmụ Bible. Ihe ndekọ e nwere na-egosi n’ụzọ doro anya na ọtụtụ ndị esiwo otú a mụta iguzogide oké ịkpọasị nke gbara ha gburugburu. Tụlee ihe atụ ole na ole mere eme.

Ịmụta Ịhụ n’Anya

Mgbe Jose dị afọ 13, o tinyere aka n’agha okpuru dị ka onye so n’otu òtù na-eyi ọha egwu. * A kụziiri ya ịkpọ ndị ahụ a sị na ọ bụ ha kpatara ikpe na-ezighị ezi ọ hụrụ gburugburu ya asị. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, nzube ya bụ igbu ha. N’ịbụ onye hụrụ ka ọtụtụ n’ime ndị enyị ya nwụrụ, iwe na ọchịchọ ịbọ ọ́bọ̀ bịara ju José obi. Ka ọ na-arụ bọmbụ grenade, ọ na-ajụ onwe ya, sị: ‘N’ihi gịnị ka nhụjuanya jiri baa ụba? Ọ bụrụ na Chineke dị, ọ̀ bụ na ọ dịghị ahụ ihe na-emenụ?’ Ọtụtụ mgbe ọ na-akwa ákwá, na-enwe mgbagwoju anya na ịda mbà n’obi.

José mesịrị mata ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ha. Ná nzukọ mbụ ọ gara, ọ chọpụtara ozugbo na e nwere ọnọdụ ịhụnanya n’ebe ahụ. Mmadụ nile kelere ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ na n’ụzọ na-egosi omume enyi. Ka e mesịrị, nkwurịta okwu e so ya nwee n’isiokwu bụ́ “N’ihi Gịnị ka Chineke Ji Kwere Ka Ajọ Omume Dịrị?” mere ka o nweta azịza nye kpọmkwem azịza ndị ọ nọworo na-ajụ. *

Ka oge na-aga, ihe ọmụma ka ukwuu o nwetara na Bible mere ka José mee mgbanwe ná ndụ ya nakwa n’ụzọ o si eche echiche. Ọ bịara mụta na “onye na-adịghị ahụ n’anya na-anọgide n’ọnwụ. Onye ọ bụla nke na-akpọ . . . asị bụ ogbu mmadụ . . . ọ dịghị ogbu mmadụ ọ bụla nwere ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.”—1 Jọn 3:14, 15.

Otú ọ dị, igbubi ihe jikọrọ ya na ndị enyi ya na-eyi ọha egwu bụụrụ ya ihe ịma aka. Mgbe ọ bụla ọ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, a na-esogharị ya. Ụfọdụ ndị ha na ya na-akpakọrịtabu gara ọbụna nzukọ ole na ole iji ghọta ihe kpatara José ji mee mgbanwe dị otú ahụ. Ozugbo o doro ha anya na ọ bụghị onye sabo ma ọ bụ bụrụ ihe ize ndụ nye ha, ha hapụrụ inye ya nsogbu. Mgbe ọ dị afọ 17, e mere José baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ime nkwusa oge nile. Kama ịkpa nkata iji gbuo ndị mmadụ, ọ na-ewegaziri ha ozi ịhụnanya na olileanya!

Itikpọ Ihe Mgbochi Agbụrụ

Ndị si n’agbụrụ dị iche iche hà pụrụ itikpọ ihe mgbochi nke ịkpọasị bụ́ nke kewara ha? Tụlee ihe banyere ìgwè Ndịàmà Jehova na-asụ asụsụ Amharic nọ na London, England. Ihe dị ka mmadụ 35 mejupụtara ìgwè ahụ—mmadụ 20 n’ime ha bụ ndị Etiopia, mmadụ 15 bụkwa ndị Eritrea. Ha na-efekọ ofufe ọnụ n’udo na n’ịdị n’otu, n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na n’Africa, n’oge na-adịbeghị anya ndị Eritrea na ndị Etiopia lụrụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ.

Ezinụlọ otu Onyeàmà bụ́ onye Etiopia gwara ya, sị: ‘Ya adịla mgbe ọ bụla ị ga-atụkwasị ndị Eritrea obi!’ Ma ugbu a, ọ bụghị nanị na ọ na-atụkwasị ndị Kraịst ibe ya bụ́ ndị Eritrea obi kamakwa ọ na-akpọ ha nwanna nwoke na nwanna nwanyị! Ọ bụ ezie na ndị Eritrea a na-asụkarị asụsụ Tigrinya, ha họọrọ ịmụ Amharic—asụsụ ụmụnna ha bụ́ ndị Etiopia na-asụ—ka ha wee nwee ike isoro ha na-amụ Bible. Lee ihe àmà magburu onwe ya ọ bụ nke otú ịhụnanya Chineke siruru n’ike dị ka “ihe nkekọ nke izu okè”!—Ndị Kọlọsi 3:14.

Ichefu Ihe Gara Aga

Ma gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ bụ onye e mesoworo ihe n’ụzọ obi ọjọọ? Ọ́ bụghị ihe kwesịrị ekwesị ibu iwe n’obi megide ndị mekpọrọ ya ọnụ? Tụlee ihe banyere Manfred, bụ́ Onyeàmà si Germany. Ọ nọrọ afọ isii n’ime ndụ ya n’ụlọ mkpọrọ ndị ọchịchị Kọmunist nanị n’ihi na ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ̀ dịtụwo mgbe o nwere mmetụta ịkpọasị n’ebe ndị megburu ya nọ ma ọ bụ ọchịchọ imegwara? “Ee e,” ka ọ zara. Dị ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Saarbrüker Zeitung si kwuo, Manfred kọwara, sị: “Imeso mmadụ n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ imegwara mmeso na-ezighị ezi . . . na-akpatakarị imesoghachi mmadụ n’ụzọ na-ezighị ezi.” N’ụzọ doro anya, Manfred tinyere ihe Bible kwuru n’ọrụ: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.”—Ndị Rom 12:17, 18.

Ụwa nke Ịkpọasị Na-agaghị Adị!

Ndịàmà Jehova adịghị ekwu na ha zuru okè n’ihe banyere nke a. Ọtụtụ mgbe ha na-achọpụta na iwepụ iro ochie na ịkpọasị adịghị mfe. Ọ chọrọ mmadụ iji ịdị uchu nọgide na-eme mgbalị iji tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ya. Ma Ndịàmà Jehova n’ozuzu ha bụ ihe nlereanya dị adị nke ikike Bible nwere ịkwụsị ịkpọasị. Site n’usoro ọmụmụ Bible ebe obibi, Ndịàmà na-enyere ọtụtụ puku mmadụ aka ịtọhapụ onwe ha n’agbụ nke ịkpa ókè agbụrụ na nkwesi olu ike. * (Lee igbe bụ́ “Ndụmọdụ Bible Na-enye Aka Iwepụ Ịkpọasị.”) Ihe ịga nke ọma ahụ bụ nhụpere nke ihe ndị na-esi n’usoro izi ihe ahụ zuru ụwa ọnụ apụta bụ́ nke n’oge na-adịghị anya ga-enye aka wepụ ịkpọasị na ihe ndị na-akpata ya kpam kpam. Usoro izi ihe a a ga-enwe n’ọdịnihu ga-ewere ọnọdụ n’okpuru nlekọta nke Alaeze Chineke, ma ọ bụ ọchịchị zuru ụwa ọnụ. Jisọs kuziiri anyị ikpe ekpere maka Alaeze ahụ n’Ekpere Onyenwe anyị, mgbe ọ sịrị: “Ka alaeze Gị bịa.”—Matiu 6:9, 10.

Bible na-ekwe nkwa na n’okpuru nlekọta nke ọchịchị eluigwe a, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.” (Aịsaịa 11:9; 54:13) Mgbe ahụ ka okwu ndị ahụ a na-ehota ọtụtụ mgbe bụ́ nke Aịsaịa onye amụma kwuru ga-enwe mmezu n’ụwa nile: “[Chineke] ga-ekpekwa ikpe n’etiti mba nile, dozikwaara ọtụtụ ndị dị iche iche okwu ha: ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Chineke n’onwe ya ga-esi otú ahụ kwụsị ajọ ịkpọasị kpam kpam.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụghị ezigbo aha ya.

^ par. 12 Lee isi nke 8, bụ́ “N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?” n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 21 A pụrụ ime ndokwa maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu site n’ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu ma ọ bụ site n’idetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.

[Igbe dị na peeji nke 11]

Ndụmọdụ Bible Na-enye Aka Iwepụ Ịkpọasị

“Olee ebe ibu agha si bịa, olee ebe kwa ịlụ ọgụ si bịa, bụ́ nke dị n’etiti unu? ọ́ bụghị n’ebe ahụ, bụ́ ihe ụtọ nile unu nke na-ebu agha n’ihe nile dị unu n’ahụ, ka ha si bịa?” (Jemes 4:1) Ọtụtụ mgbe, anyị pụrụ iwepụ esemokwu n’etiti anyị na ndị ọzọ ma ọ bụrụ na anyị amụta ịchịkwa omume ịchọ ọdịmma onwe onye nanị.

“Unu nile n’otu n’otu elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.” (Ndị Filipaị 2:4) Ibute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu nke anyị bụ ụzọ ọzọ nke isi wepụ esemokwu na-enweghị isi.

“Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 37:8) Anyị pụrụ ịchịkwa mkpali ndị na-ebibi ihe, anyị aghaghịkwa ịchịkwa ha.

‘Chineke sitere n’aka otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ, ka ha biri n’elu ụwa nile.’ (Ọrụ 17:24, 26) Ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya mmadụ iche na ya ka ndị nke agbụrụ ọzọ mma, ebe ọ bụ na anyị nile bụ ndị òtù nke otu ezinụlọ mmadụ.

“Unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma.” (Ndị Filipaị 2:3) Ọ bụ omume nzuzu ilelị ndị ọzọ—n’ihi na ọtụtụ mgbe ndị ọzọ na-enwe àgwà ndị dị mma na ikike ndị anyị onwe anyị na-enweghị. Ọ dịghị agbụrụ ma ọ bụ ọdịbendị nke ọ bụ nanị ya nwe ihe nile dị mma.

“Ya mere otú a, otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Nanị ibute ụzọ n’igosi omume enyi na inyere ndị ọzọ aka, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ ọdịbendị ha, pụrụ inye aka nke ukwuu n’ịkwụsị enweghị nkwurịta okwu na iwepụ nghọtahie.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Ndịàmà bụ́ ndị Etiopia na ndị Eritrea na-efekọ ofufe ọnụ n’udo

[Foto dị na peeji nke 10]

Manfred, bụ́ onye mesịrị si n’ụlọ mkpọrọ ndị ọchịchị Kọmunist pụta, jụrụ ịkpọ mmadụ asị

[Foto dị na peeji nke 10]

Bible pụrụ inye aka tikpọọ ihe mgbochi ndị na-ekewa ndị mmadụ