Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụghị Nanị Maka Ndị Nọ N’afọ Iri Na Ụma

Ọ Bụghị Nanị Maka Ndị Nọ N’afọ Iri Na Ụma

Ọ Bụghị Nanị Maka Ndị Nọ N’afọ Iri Na Ụma

N’akwụkwọ ozi o degara n’ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Poland, Jolanta bụ́ onye dị afọ 25 kọwara na ya dara mbà n’obi. O nwere nkwarụ nke mere ka ọ ghara ịga ije, n’ime ọnwa isii kwa, ma nne ya ma nne ya ochie nwụrụ. Ma, ọ maliteziri ịgụ akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. O dere, sị:

“Echeburu m na akwụkwọ a bara uru nye ndị nọ n’afọ iri na ụma ọ bụghị nye m,” ka o kwuru. “Lee ka m si hie ụzọ! N’ịmụ isi nke 12 ruo 16 nke akwụkwọ ahụ, enwetara m azịza ndị doro anya nye ajụjụ m dị iche iche: ‘N’ihi gịnị ka m ji enwe oké ịda mbà n’obi na owu ọmụma?’ ‘N’ihi gịnị ka onwe m na-ejighị amasị m?’ na ‘N’ihi gịnị ka m ji eru nnọọ újú mgbe ndị ikwu m m hụrụ n’anya nwụsịrị?’”

Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Isi ihe abụọ dị na peeji nke 130 dọọrọ mmasị m: ‘Ịmata na iru újú gị bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ oké ihe enyemaka n’ịnagide ya. Ma ịjụ ịnakwere ihe merenụ na-eme nnọọ ka iru újú ahụ dịtekwuo aka.’ Ịgụ okwu ndị a wusiri olileanya m nwere ịhụ ndị dara n’ụra ọnwụ ọzọ ike, bụ́ nke mere ka ndụ m nwekwuo nzube.”

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị imeri ịda mbà n’obi ma mee ka ndụ gị nwekwuo nzube, anyị chere na gị onwe gị kwa ga-erite uru site n’akwụkwọ ahụ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.