Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyemaka Ndị Bara Uru Dị n’Ebe Nile

Enyemaka Ndị Bara Uru Dị n’Ebe Nile

Enyemaka Ndị Bara Uru Dị n’Ebe Nile

BAXTER, bụ́ nwa kọleji nke dị afọ 15, nwere ụzọ na-adọrọ mmasị o si eji ehihie Saturday eme ihe. Ọ na-eleta otu ìgwè ndị agadi, na-etiri ha egwú ma na-eduzi abụ ha na-eso ya na-abụ n’ogige nlekọta ndị agadi ha. “Ọ na-eme ka ndị bi n’ebe ahụ na-achị ọchị, na-enwekwa obi ụtọ na aṅụrị,” ka onye nkụzi Baxter na-ekwu. Lucille, bụ́ onye dị afọ 78, na-arụkwa ọrụ obiọma dị otú ahụ. Ọ na-eke ndị nọ n’ụkọ nri, na-eletakwa ndị ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ bụ́ ndị owu na-ama. Otu enyi Lucille kwuru banyere ya, sị: “Ọ bụrụ na e nwere mkpa, ọ bụrụhaalakwa na ọ pụrụ inye aka, ị ga-ahụ ya ebe ahụ.”

A Kọwaa Ịrụ Ọrụ Afọ Ofufo

Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-agbaso ụzọ ndụ a bụ́—‘Nọrọ ya mgbe ọ dị mkpa.’ Ha na-enye aka n’ebe ndị a na-ewu ihe owuwu nakwa n’ọfịs dị iche iche, n’ụlọ mmepụta ihe, n’ebe ndị a na-elekọta ndị ahụ na-esighị ike, n’ebe ndị a na-elekọta ndị na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta, n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, n’ebe ndị a na-edebe ndị na-enweghị ebe obibi, ná ngalaba na-emenyụ ọkụ, n’ebe ndị a na-enyere ndị ihe ụwa na-ara ahụ aka, n’ebe ndị a na-elekọta ụmụ anụmanụ na-enweghị ndị nlekọta, nakwa n’ebe ndị ọzọ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha nọ n’ebe nile! Ha na-eji nkà ha eme ihe n’ọrụ dị iche iche site n’inyere ndị mmadụ aka iwu ọbá ha ruo n’ịtụkọtara ndị mmadụ ego, sitekwa n’ilekọta ụmụ ọhụrụ a gbahapụrụ agbahapụ ruo n’ịkasi ndị na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta obi. Ha bụ ndị ọrụ afọ ofufo—mmadụ ndị omume ha na-abara ndị nọ ná mkpa uru ná ndụ.

A kọwawo ọrụ afọ ofufo dị ka “echiche dị mma e tinyere n’ọrụ.” Ọ gụnyere ihe ndị dị ka inwe ọchịchọ ime ihe, mmụọ nke ịchụ ihe n’àjà, anaghị ego, na ngosipụta nke ịchọ ọdịmma ndị ọzọ. “Ozi afọ ofufo,” ka mmadụ abụọ rụworo ọrụ afọ ofufo ogologo oge na-ekwu, bụ “iwepụta onwe anyị: inye oge anyị, aka na ụkwụ anyị, echiche anyị, ikike anyị nwere inyere onye ọzọ aka, nkà anyị nwere idozi nsogbu, amamihe anyị nwere dị ka ndị ọkachamara.” N’ụzọ na-akpali mmasị, inye ihe dị otú ahụ na-abakwara ndị ọrụ afọ ofufo ahụ uru n’onwe ha.—Lee igbe bụ́ “Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Na-eritekwa Uru.”

Ọnụ Ọgụgụ Na-arị Elu—Mkpa Na-arị Elu

Na United States, e mere atụmatụ na ihe dị ka 100 nde mmadụ na-arụ ọrụ afọ ofufo—ọnụ ọgụgụ ha na-arịkwa elu. “Ụlọ ọrụ anyị nọgidere na-eto eto n’ụzọ dị egwu,” ka Kathleen Behrens, bụ́ nnukwu onyeisi ụlọ ọrụ na-arụ ọrụ afọ ofufo bụ́ New York Cares, gwara Teta! na nso nso a. “N’afọ gara aga nanị, anyị nwetara ndị ọrụ afọ ofufo ọhụrụ karịrị 5,000 bụ́ ndị sonyere n’usoro ihe omume anyị.” Òtù ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo na Europe na-enwe ịrị elu yiri nke ahụ. Dị ka ihe atụ, na France, ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ afọ ofufo anọwo na-eji pasent 6 eto kwa afọ n’ime iri afọ abụọ gara aga. Otú ọ dị, mkpa e nwere maka inwekwu ndị ọrụ afọ ofufo ebelatabeghị. N’ụzọ dị iche, Ndị Ọrụ Afọ Ofufo nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu (ngalaba UN) na-ekwu na ọ bụrụ na e lee ya anya n’ụzọ zuru ụwa ọnụ, “mkpa e nwere maka inwekwu ndị ọrụ afọ ofufo dị ukwuu taa karịa ka ọ dịtụworo.” Otu onye na-elekọta ebe ngosi ihe mgbe ochie na-ekwu, sị: “Ndị ọrụ afọ ofufo dị mkpa nye ọrụ anyị.”

Ma, e nwere otu eziokwu yiri ụgha. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ntụzi ọrụ, ndị manịja, na ndị nhazi ọrụ bụ́ ndị na-eso ndị ọrụ afọ ofufo arụ ọrụ na-eche na ndị ọrụ dị otú ahụ “bara oké uru,” a dịghị egosi ekele n’ihe ka ukwuu n’ọrụ ndị ọrụ afọ ofufo. Iji malite ịgbanwe ọnọdụ ahụ, òtù Mba Ndị Dị n’Otu kpebiri iji afọ 2001 mere oge ilekwasị ndị ọrụ afọ ofufo anya. Igbe bụ́ “Afọ Mba Nile nke Ndị Ọrụ Afọ Ofufo” na-akọwa ụfọdụ n’ime ihe mgbaru ọsọ òtù UN na-enwe olileanya iru.

Ka ọ dịgodị, a na-enwe mgbanwe n’ihe banyere ịrụ ọrụ afọ ofufo bụ́ nke na-ewetara ma ndị ọrụ afọ ofufo ma ndị na-atụzi ọrụ ha, ihe ịma aka. N’agbanyeghị nke ahụ, a ka nwere ọtụtụ mmadụ gburugburu ụwa bụ́ ndị dị njikere iwepụta onwe ha maka abamuru nke ndị ọzọ. Gịnị na-akwali ha ime otú ahụ? Gịnị ka ha na-arụzu? Oleekwa otú ha pụrụ isi metụta ndụ gị?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Na-eritekwa Uru

“Ịgbalị inyere ndị ọzọ aka ewetaworo m ụgwọ ọrụ ka ukwuu, ka mma, ma na-enye nnọọ obi ụtọ karịa ka m gaara enweta site n’ịnọgide na-elekwasị anya kpam kpam n’achụmnta ego m,” ka Michael, bụ́ onye na-arụ ọrụ afọ ofufo n’oge ụfọdụ na-ekwu. Ọ bụghị nanị Michael ka ọ dị otú ahụ. Sharon Capeling-Alakija, onyeisi nhazi ọrụ nke Ndị Ọrụ Afọ Ofufo nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu, sị: “Gbaa ụwa gburugburu, ndị . . . na-enye onwe ha n’afọ ofufo maara nke ọma otú abamuru ha na-enweta site n’ahụmahụ ahụ haruru.” Dr. Douglas M. Lawson, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ọrụ afọ ofufo, na-akwado na ndị nchọpụta achọpụtawo na “mgbe mgbe n’ime nanị awa ole na ole nke mmadụ ịrụ ọrụ afọ ofufo, àgwà ya n’ebe ndị ọzọ nọ na mmetụta uche ya na-aka nnọọ mma nke na e nyewo nke a utu aha bụ́ ‘Ihe Mkpali nke Onye Na-enye Aka.’” “Ihe mkpali nke onye na-enye aka” abụghịkwa mmetụta na-akwụsị ngwa ngwa. Ndị nchọpụta nọ na Mahadum Cornell dị na United States nyochara otu ìgwè ụmụ mmadụ ruo ihe karịrị afọ 30 ma chọpụta na “ndị rụrụ ọrụ afọ ofufo nwere obi ụtọ na ahụ ike ka mma karịa ndị na-arụghị.” N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible na-ekwu, sị: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35; Ilu 11:25.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]

Afọ Mba Nile Maka Ndị Ọrụ Afọ Ofufo

Na November 20, 1997, Nzukọ Ezumezu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu kpọsara afọ 2001 dị ka “Afọ Mba Nile Maka Ndị Ọrụ Afọ Ofufo,” (IYV 2001). Dị ka òtù UN si kwuo, e nwere ebumnobi anọ a ga-emezu n’afọ a.

Mmata ka ukwuu A na-agba gọọmenti dị iche iche ume ịmata ịdị mkpa nke ndị ọrụ afọ ofufo site n’inyocha na idekọ ihe ndị ha rụzuru na inye ihe nrite maka ọrụ afọ ofufo ndị dị ịrịba ama.

Nkwado ka ukwuu A na-agba mba dị iche iche ume ịkwalite ịrụ ọrụ afọ ofufo site, dị ka ihe atụ, n’ịnabata ọrụ afọ ofufo dị ka ihe a pụrụ ịhọrọ n’ọnọdụ ozi agha ma ọ bụ n’iwepụ ụtụ isi ụfọdụ na ya.

Mkpọsa A na-akpọ usoro mgbasa ozi òkù inyekwu aka n’ịkpọsa akụkọ banyere ihe ịga nke ọma ndị e nwere n’ọrụ afọ ofufo. N’ihi ya, a pụrụ ịrụghachi ọrụ ahụ ugboro ugboro, “na-eme ka ọ ghara ịdị ógbè nke ọ bụla mkpa ichepụtawa usoro ha ga-esi eme nke ha.”

Nkwalite A na-agba òtù ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo ume ịhazi ihe ngosi iji mee ka ọha na eze mara uru ọha mmadụ na-erite site n’ọrụ afọ ofufo.

Òtù UN nwere olileanya na IYV 2001 ga-eme ka e nwekwuo ndị ga-arịọ maka ozi ndị ọrụ afọ ofufo, nwekwuo ọtụtụ ndị ga-achọ ije ozi dị ka ndị ọrụ afọ ofufo, nakwa ka e nwekwuo ego na ngwá ọrụ maka òtù ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo iji gboo mkpa na-arịwanye elu nke ọha mmadụ. Ngụkọta nke ọchịchị 123 esonyewo n’ịkwado ebumnobi nke nkwupụta òtù UN a.