Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ntiwapụ Zuru Ụwa Ọnụ Nke Ịkpọasị

Ntiwapụ Zuru Ụwa Ọnụ Nke Ịkpọasị

Ntiwapụ Zuru Ụwa Ọnụ Nke Ịkpọasị

Ọ DỊ otu nnukwu anụ ọjọọ na-akpagharịrị onwe ya—nnukwu anụ ọjọọ a na-akpọ ịkpọasị. Ọ na-abawanye ụba n’ụwa nile.

Na Balkan, otu ógbè ka na-ata ahụhụ ihe si ná mkpocha agbụrụ e nwere n’oge na-adịbeghị anya pụta. Ibu iro dịruworo ọtụtụ narị afọ akpatawo igbu mmadụ n’ìgwè, ndina n’ike, nchụpụ, ịkpọ ụlọ na obodo nta dị iche iche ọkụ na ịkwakọrọ ihe na ha, mbibi nke ihe ọkụkụ na anụ ụlọ, na agụụ. Ogbunigwe ka jupụtara ebe nile.

Na East Timor, nke dị na Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia, mmadụ 700,000 egwu ji aghaghị ịgbapụ n’ihi ihe egwu nke igbu ọchụ, iti ihe, ịgba égbè aghara aghara, na nchụpụ n’ike. Ha gbahapụrụ ógbè nke usuu ndị agha nnupụisi bibiri. “Ọ dị m ka m bụ anụ a na-achụgharị achụgharị,” ka otu n’ime ndị o metụtara kwuru.

Na Moscow, ndị na-eyi ọha egwu ji bọmbụ tụjasịa otu nnukwute ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ. Mgbawa ahụ tụsasịrị ozu mmadụ 94 aka ha dị ọcha—ndị ụfọdụ n’ime ha bụ ụmụaka—n’ebe nile. Ihe karịrị mmadụ 150 merụrụ ahụ. Mgbe ihe oké ụjọ dị otú ahụ mesịrị, ndị mmadụ na-ajụ, sị, ‘Olee onye ọzọ ọ ga-eme?’

Na Los Angeles, California, otu onye na-akpa ókè agbụrụ tụdoro ma gbaa otu ìgwè ụmụaka ndị Juu na-aga ụlọ akwụkwọ ọta akara égbè, o mesịrị gbagbuo otu onye Philipines na-ekesa akwụkwọ ozi.

A pụrụ ịkọwa ịkpọasị n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka ihe gbasazuru ụwa nile. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị, akụkọ na-ekpughe ihe ndị na-eme mgbe ibu iro agbụrụ, ebo, ma ọ bụ okpukpe na mmebi iwu jikọrọ aka. Anyị na-ahụ ka e tisasịrị mba, ógbè, na ezinụlọ dị iche iche. Anyị na-ahụ ka mba dị iche iche mikpuru n’oké mgbukpọ nke agbụrụ. Anyị na-ahụ omume obi ọjọọ dị egwu a na-eme nanị n’ihi na ụfọdụ ndị dị “iche.”

Ọ bụrụ na ọ dị mgbe ọ bụla a ga-eke nnukwu anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ ịkpọasị agbụ, anyị aghaghị ịmata ihe ndị na-akpata ime ihe ike dị otú ahụ ịkpọasị na-akpali. È tinyere ịkpọasị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa nke ụmụ mmadụ? Ọ̀ bụ àgwà a na-amụta amụta? À pụrụ ịkwụsị ịkpọasị?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Kemal Jufri/Sipa Press