Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Àgwà Na-agbanwe Agbanwe n’Ebe Ime Agadi Dị

Àgwà Na-agbanwe Agbanwe n’Ebe Ime Agadi Dị

Àgwà Na-agbanwe Agbanwe n’Ebe Ime Agadi Dị

MGBE ị gbara afọ ole ka ị ga-aghọ agadi? Azịza ya yiri ka ọ dabeere n’onye ị jụrụ ajụjụ ahụ. Ndị nọ n’afọ iri na ụma ga-eji obi ụtọ gụnye onye ọ bụla gafere afọ 25 n’onye merela agadi.

N’aka nke ọzọ, ndị na-agụ egwú a na-akpọ opera adịghị eru n’uju ha ruo ọtụtụ afọ n’ihu. Otu akụkọ nke dịkwa n’akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ The Sun-Herald na-ekwu banyere ndị na-ezubesi ike inweta ọkwa dị elu, sị: “Nke bụ́ eziokwu taa bụ na ọ bụrụ na i rubeghị n’ọkwá dị elu mgbe ị na-erule afọ 40, ị gaghị erukwa ya ọzọ.”

Echiche Ndị Zuru Ebe Nile

Ụfọdụ pụrụ iwere ya na ndị mere agadi na-enwekarị ihe ọghọm na ha adịghịkwa amụta ihe ngwa ngwa ma na-akakwa nkà n’ike n’ike. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya inwe echiche ndị dị otú ahụ? Dị ka ihe ndekọ nke Òtù Ahụ Ike Ụwa si gosi, n’ógbè nile na Europe, “otu n’ime mmadụ atọ ọ bụla na-anwụ n’ihe ọghọm ụgbọala na-emetụta ndị na-erubeghị afọ 25.” Ọzọkwa, a na-akakarịsị nká ngwa ngwa n’agbata afọ 30 na 40, ọ dịghịkwa ihe àmà e nwere na-egosi na ọgụgụ isi nke onye ahụ dị mma na-adalata ka ọ na-emekwu agadi.

Olee banyere echiche bụ́ na ndị agadi na-arịakarị ọrịa? “Otu echiche ụgha e nwere ebe nile bụ na ime agadi na ọrịa na-agakọta,” ka magazin bụ́ The Medical Journal of Australia na-ekwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị agadi nwetụrụ ezigbo ahụ ike, ha adịghịkwa ewere onwe ha dị ka ndị agadi. Ụfọdụ ndị nwere echiche yiri nke onye America ọnụ na-eru n’okwu bụ́ Bernard Baruch, bụ́ onye kwuru, sị: “Nye m, ime agadi bụ ịtụkwasị afọ iri na ise n’afọ ole m dị.”

Gịnịzi mere e ji na-akpakarị ókè megide ndị agadi, mgbe ụfọdụkwa ọbụna na-enwe nnọọ ajọ mbunobi megide ha? Azịza ya dabeere ruo n’ókè dị ukwuu n’àgwà e nwere n’ebe ime agadi dị.

Àgwà Ndị E nwere n’Ebe Ime Agadi Dị

“Ịbụ ndị ntorobịa na-atọgbu ndị America atọgbu, ọ gbanwewokwa n’ụzọ dị njọ otú ụlọ ọrụ mgbasa ozi si ele onye mere agadi anya,” ka Max Frankel na-ekwu na The New York Times Magazine. “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e nwekwaghị ndị agadi n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi,” ka ọ kwara n’arịrị. Nke a pụrụ inye aka ịkọwa ihe yiri ka ọ na-emegiderịta onwe ya n’oge a nke magazin bụ́ The UNESCO Courier kwupụtara: “Ọ dịbeghị . . . mgbe ọha mmadụ mewooro ndị òtù ya mere agadi ihe dị ukwuu otú a. Ha na-erite uru n’enyemaka ego na ije ozi ọha na eze, ma echiche ọha na eze nwere banyere ha jọgburu onwe ya.”

Ọbụna ndị ọrụ ahụ ike nwere ajọ mbunobi a. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Medical Journal of Australia si kwuo: “Ọtụtụ ndị dọkịta nakwa ọha na eze n’ozuzu ha, kwetara na o nweghịzi isi inye ndị gafeworo afọ 65 nlekọta iji gbochie ọrịa. . . . Echiche ahụ na-adịghị mma . . . pụtara na a dịghị agụnye ndị agadi n’ọtụtụ ihe ọmụmụ ndị dị mkpa a na-enwe.”

Otu akwụkwọ ahụ sịrị: “A pụrụ iji echiche na-adịghị mma e nwere banyere ndị agadi, ịkpọ ha ‘ndị kara nká,’ mere ihe ngọpụ iji nye ha nlekọta ahụ ike na-adịghị mma. Ọtụtụ nsogbu ha na-enwekarị, ndị na-adịkwa ntakịrị, bụ́ ndị na-emetụta otú akụkụ ahụ ha ụfọdụ si arụ ọrụ, dị ka ahụchaghị ụzọ na anụchaghị ihe nke ọma bụ ndị a na-eleghara anya ma ọ bụ were dị ka ihe ya na ime agadi na-agakọ. . . . Ịgbanwe echiche e nwere banyere ndị agadi dị oké mkpa iji nwee usoro mgbochi ọrịa nke dị irè.”

“Ma eleghị anya oge eruwo ka e meziwanye otú a na-esikarị akọwa ihe bụ́ ime agadi, ma ọ dịghị ihe ọzọ ná mba ndị mepere emepe,” ka akwụkwọ ahụ ike Britain bụ́ The Lancet na-atụ aro ya. Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Akwụkwọ ahụ na-akọwa, sị: “Nkọwa dị iche pụrụ iwepụ mmetụta nke enweghị olileanya, echiche nke ajọ ihe ndị ga-esi na ya pụta, na ikwu ihe ọjọọ ndị ga-emenụ bụ́ ndị a na-ejikarị akwado ajọ mbunobi banyere ‘oké mmụba’ nke ndị agadi ndị na-ewekọrọ ‘òkè gabigara ókè’ nke ihe ndị dị ụkọ bụ́ ndị a mawapụtara maka ahụ ike.”

Ọnụ Ọgụgụ nke Ndị Agadi Na-amụba

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnụ ọgụgụ ndị agadi amụbawo—ọ bụghịkwa nanị mmụba nkịtị kama ọ na-arị elu. “N’ụwa nile, ọnụ ọgụgụ ndị dị afọ 65 nakwa karịa ga-amụbaworị okpukpu anọ n’agbata 1955 na 2025, nkezi ọnụ ọgụgụ ha ma e jiri ya tụnyere ọnụ ọgụgụ nke mmadụ nile ga-amụbaworị okpukpu abụọ,” ka The UNESCO Courier na-akọ.

Ọnụ ọgụgụ ndị agadi nọ n’India akarịala ọnụ ọgụgụ ndị bi na France. E kwukwara na n’ime United States, nde 76 nke ndị a mụrụ n’ime afọ 18 ndị sochiri Agha Ụwa nke Abụọ ga-ala ezumike nká n’ime iri afọ ise na-abịanụ. Ebe ọnọdụ a nke inwe ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị agadi na-akpatara ọtụtụ ndị ọkà ná nhazi akụ̀ na ụba na ndị ọrụ ahụ ike nchegbu, ọ na-emekwa ka anyị tụgharịakwa uche ọzọ n’echiche ndị anyị bu ụzọ nwee banyere ime agadi.

Ilerugharị Ihe Anya

Ụfọdụ pụrụ iji ndụ tụnyere ihe nkiri nwere àgbà atọ. A na-atụ anya na obi ụtọ nke oge ntorobịa na agụmakwụkwọ ga-ewere àgbà nke mbụ. Ibu ọrụ nke ịmụ ụmụ na nrụgide ọrụ nke na-adịghị ebelata ebelata bụ ha mejupụtara àgbà nke abụọ. N’àgbà nke atọ, a na-agba ndị so n’ihe nkiri ahụ ume ka ha gaa nọdụ ala n’ebe ha na-agakwaghị na-apụta ìhè ma chere n’enwekwaghị ihe mkpali ọ bụla ruo mgbe ihe nkiri ahụ gwụsịrị.

Otú ọ dị, n’ihi ihe dị iche iche, gụnyere oké ọganihu ndị e nwere ná nlekọta ahụ ike na n’ịdị ọcha na narị afọ nke 20, ogologo oge nke “ndị so n’ihe nkiri” ahụ na-echere mgbe ha pụsịrị n’ebe ahụ a na-eme ihe nkiri “n’àgbà nke atọ” ejiriwo ihe ruru afọ 25 bukwuo ibu. Ọtụtụ ndị adịkwaghị enwe afọ ojuju n’ịbụ ndị ga-ala ezumike nká n’enwekwaghị ọrụ. Ndị agadi a dị gara gara, ndị ọnụ ọgụgụ ha na-ebuwanye ibu, amalitewo ikwusi ike ka e lerugharịa ihe anya.

Ụtụ Dị Ukwuu

Echiche ahụ zuru ebe nile nke bụ́ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị agadi na-adabere n’ebe ndị ọzọ nọ abụghị nnọọ eziokwu. The New York Times Magazine kwuru na n’ime United States, “ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị agadị nwere ihe zuuru ha, bụrụ ndị na-abaghị ọgaranya ma ha adaghị ogbenye, bụ́ ndị nwere ego karịa ndị di na nwunye na-akatabeghị ahụ . . . nakwa [na] ndị ọkà mmụta ná mmekọrịta ọha na eze na-achọpụta mpụta nke ìgwè na-akwado . . . ndị agadi nwere ego.” Philip Kotler, bụ́ prọfesọ na nkà mmụta azụmahịa na Mahadum Northwestern dị na United States kwuru okwu banyere nke a. “Ndị na-ere ahịa,” ka ọ sịrị, “n’oge na-adịghị anya, ga-amalite ile ndị dị afọ 55 ma ọ bụ karịa bara ọgaranya bụ́ ndị na-azụrụ ngwá ahịa anya dị ka ebe uru kasị dịrị nke a ga-elekwasị anya n’etiti ọha mmadụ.”

Ụtụ ndị agadi dị gara gara na-atụnye abụghị nanị n’ihe banyere ego. Akwụkwọ bụ́ The Sunday Telegraph nke Sydney kwuru na n’Australia “ndị nne ochie na-arụ ugbu a ọkara nke ọrụ nile metụtara ilekọta nwa mgbe ndị mụrụ ụmụ nwere ọrụ ha na-arụ, ebe ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị inyom na-arụ ọrụ bụ nne ha ochie na-elekọtara ha ụmụ ha mgbe ha gara ọrụ.”

N’ebe ndị dị ka obodo France bụ́ Troyes, a na-ewere amamihe nke ndị agadi dị ka ebe bara uru isi mụta ihe. A na-eji amamihe a eme ihe mgbe a na-akpọrọ ndị agadi ka ha na-akụziri ụmụaka aka ọrụ ndị dị ka ịkwa nkà, imepụta enyo, iji okwute atụ ihe, iwu ihe owuwu na itinye okporo mmiri n’oge ha na-anọghị n’ụlọ akwụkwọ. Tinyere ịkụzi ihe, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị agadi na-agakwa akwụkwọ iji mụta nkà dị iche iche.

Dị ka The UNESCO Courier nke January 1999 si kwuo, “Òtù Mba Nile Maka Mahadum Ndị Nọ n’Ọgbọ nke Atọ nke nwere isi ụlọ ọrụ ya na Paris” kwuru na “e nwere n’ụwa nile ihe karịrị mahadum 1,700 maka ndị agadi.” Banyere Mahadum ndị a, akwụkwọ ahụ na-akọ, sị: “Ọ bụ ezie na e nwere ọdịiche dị ukwuu n’otú e si hazie ma na-elekọta ya ná mba dị iche iche, mahadum nile maka ndị agadi nwekọrọ ọchichọ inyere ndị agadi aka ikere òkè zuru ezu n’ihe omume ọdịnala na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya.” A kọrọ na otu n’ime ụlọ akwụkwọ ndị dị otú ahụ na Japan nwere ụmụ akwụkwọ dị 2,500!

“Ụtụ nile ndị agadi na-atụnye n’ezinụlọ ha na n’ógbè ha buru nnọọ ibu, ọ bụ ezie na o siri ike ịtụ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ebe a na-adịghị akwụ ha ụgwọ maka ha,” ka Alexandre Kalache, bụ́ onye ndú nke otu ìgwè n’Usoro Ihe Omume Maka Ịka Nká na Ahụ Ike nke Òtù Ahụ Ike Ụwa, na-ekwu. O kwuru, sị: “Mba dị iche iche . . . ekwesịghị ile ndị agadi ha anya dị ka nsogbu kama dị ka ụzọ a pụrụ isi gwọta nsogbu dị iche iche . . . , karịsịa dị ka ndị a pụrụ iji mee ihe.”

N’enweghị ngọnarị, echiche na ajọ mbunobi nke ndị ọzọ nwere pụrụ inwe mmetụta n’anyị inwe ike inweta obi ụtọ n’ime agadi anyị, ma ruo n’ókè dị ukwuu, otú anyị si were ndụ pụkwara imetụta ya. Gịnị ka ị pụrụ ime n’onwe gị iji nọgide na-adị gara gara ma n’uche ma n’anụ ahụ, ọ bụrụgodị na ị na-aka nká? Biko gụọ igbe dị na peeji nke 16 na 17, rịbakwa ama ihe ndị agadi ụfọdụ kwuru na ọ bụ ya mere ha ji nọgide na-adị gara gara ma na-enwe obi ụtọ ná ndụ.

Gbalịa Ịnọgide Na-adị Gara Gara

Ị ga-achọpụta na otu ihe ndị agadi ndị a dị gara gara nwekọrọ ọnụ bụ na ha nọgidere na-arụ ọrụ bara uru—dị ka ọrụ ego ma ọ bụ ọrụ afọ ofufo. Ha na-enwekwa mmega ahụ oge nile, nwee ezigbo mmasị n’ebe ndị nọ n’afọ ndụ nile nọ, ma na-emeju agụụ ime mmụọ ha ndị bụ́ isi. Dị ka ị pụrụ ịhụ, ihe ndị a bụ́ ihe ndị dị oké mkpa maka ibi ndụ na-enye obi ụtọ na nke ịdị gara gara ga-abara ma ndị na-eto eto ma ndị agadi uru.

Ka ọ dị ugbu a, eziokwu na-adịghị enye obi ụtọ bụ na ọbụna ka ị na-agụ isiokwu a, gị onwe gị kwa na-eme agadi. (Eklisiastis 12:1) Otú ọ dị, n’ụzọ amamihe dị na ya, ị ga aṅa ntị ná nkwubi okwu dị n’akwụkwọ bụ́ Bulletin of the World Health Organization: “Dị nnọọ ka ahụ ike na-eme ka e nwee ike ịdị na-eme ihe omume dị iche iche, ọ bụ ndụ nke ịdị gara gara bụ nke nwekarịsịrị ike ịbụ nke ezi ahụ ike.”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ha Na-anọgide Na-adị Gara Gara Ma Na-enwe Obi Ụtọ ná Ndụ

SOUTH AFRICA: Piet Wentzel, onye dị afọ 77, bụ onye ọrụ afọ ofufo oge nile.

“Aghọtara m na mmega ahụ dị mkpa iji nọgide na-enwe ezi ahụ ike. Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, anọwo m na-elekọta obere ubi nke aka m. Ahụ na-adị m nnọọ mma mgbe m nwesịrị ụdị mmega ahụ ahụ. Ka m wee nwee ike na-arụzu ihe kasị ukwuu, agbalịwo m ịbụ onye a na-akwali site n’ụkpụrụ bụ́, ‘Ịnọ n’obi abụọ bụ onye ohi oge; iyigharị oge bụ onye òtù ya kachasịnụ.’”

[Foto]

“Aghọtara m mkpa inwechi mmega ahụ anya dị.”—Piet

JAPAN: Yoshiharu Shiozaki, onye dị afọ 73, na-arụ ọrụ dị ka onye ọkachamara n’ihe gbasara ala na ụlọ.

“Enwere m ọrịa azụ mgbu, ọbara mgbali elu, na ọrịa Meniere’s disease. Ana m eji ịnyịnya ígwè esi n’ụlọ aga ọfịs m ụbọchị anọ kwa izu; uje na ụla dị kilomita 12. Nke a bụ mmega ahụ dị mma nye m, ebe ọ na-adịghị enye m nsogbu n’azụ ma na-eme ka uru ahụ ndị dị m n’ụkwụ sikwuo ike. Ana m agbalị ime ka mụ na ndị ọzọ na-adị n’udo, tinyere ndị agbata obi m. Ana m agbalị ịghara ịdị na-achọ mmejọ na ihie ụzọ nke ndị ọzọ. Aghọtawo m na ndị mmadụ na-anabata agbamume ngwa ngwa karịa otú ha na-anabata nkatọ.”

[Foto]

“Ana m agbalị ịghara ịdị na-achọ mmejọ . . . nke ndị ọzọ.”—Yoshiharu

FRANCE: Léone Chalony, onye dị afọ 84, bụ onye na-ezisa ozi ọma oge nile.

“Mgbe m lara ezumike nká na 1982, o siiri m ike n’ihi na ọrụ m dị ka onye na-edozi isi na-atọ m ụtọ. Enweghị m ibu ọrụ ọ bụla, ya mere m ghọrọ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile nke Ndịàmà Jehova. Iduziri ọtụtụ ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible enyeworo m aka ịdị gara gara n’uche. Enweghị m ụgbọala, ya mere m na-aga ije nke ukwuu. Nke a na-eme ka m nwee ahụ ike.”

[Foto]

“Iduziri ọtụtụ ndị ọmụmụ Bible na-eme ka m dị gara gara n’uche.”—Léone

BRAZIL: Francisco Lapastina, onye dị afọ 78, bụ onye ọrụ afọ ofufo oge nile.

“Ọ dịghị ewutekebe m mgbe mmadụ kpasuru m iwe ma ọ bụ lelịa m. Ana m ewere ya na onye ahụ nọ ná nrụgide na ná nsogbu. Anyị nile nwere ụbọchị ndị anyị na-adịghị achọkebe iso ndị ọzọ akpakọrịta. Ana m agbalị ịghara ịdị na-ebu iwe n’obi ma na-eburu n’uche na ndị mmadụ aghaghị ịdị na-ediri m ihe ụfọdụ. Nke a enyeworo m aka inwe ọtụtụ ezi ndị enyi.”

[Foto]

“Ana m agbalị ịghara ịdị na-ebu iwe n’obi.”—Francisco

AUSTRALIA: Don MacLean, onye dị afọ 77, ka na-arụ ọrụ ruo awa 40 kwa izu.

“Afọ anọ ka a wasịrị m ahụ n’obi, m ka nwere ahụ ike bụ́ ịgba. Ewereghị m ịwa ahụ a dị ka ajọ nkwarụ na-adịgide adịgide ná ndụ m. M ka na-aga mkpapụ kwa ụbọchị, dị ka m na-eme eri ọtụtụ afọ. Mgbe m na-eto eto ma hụ ndị ọzọ ka ha na-akachu nká, ekpebisiri m ike ịghara inwe echiche dị otú ahụ. Ana m enweta ezi obi ụtọ n’ịmata ndị mmadụ na ịmalite mkparịta ụka. Ọ bụrụ na anyị emee ka ihe ime mmụọ bụrụ akụkụ nke ndụ anyị, mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihe a kọwara n’Abụ Ọma 103:5: ‘[Jehova ] na-ewere ezi ihe mee ka afọ ju ọnụ gị; ịdị na nwata gị ewee mee onwe ya ka ọ dị ọhụrụ dị ka ugo.’”

[Foto]

“Akachula nká.” —Don

JAPAN: Chiyoko Chonan, onye dị afọ 68, bụ onye na-ezisa ozi ọma oge nile.

“Ihe bụ́ isi n’ịnọgide na-enwe ezi ahụ ike bụ izere ikwe ka nchegbu buo ibu na inwe oké ike ọgwụgwụ. Ana m agbalị ịghara ịdị na-enwe oké nchegbu banyere ihe dị iche iche ma chọpụtakwa na ịdị na-emetụ ihe dị iche site n’oge ruo n’oge na-enyere m aka. Na nso nso a amalitere m ịmụ otú e si eji abacus eme ihe (ihe e ji eme mgbakọ na mwepụ) iji na-emega mkpịsị aka m na uche m. Echere m na ọ bara uru ịmalite ime ihe ndị ọhụrụ.”

[Foto]

“Echere m na ọ bara uru ịmalite ime ihe ndị ọhụrụ.”—Chiyoko

FRANCE: Joseph Kerdudo, onye dị afọ 73, bụ onye ọrụ afọ ofufo oge nile.

“Ụzọ dị mkpa isi mee agadi n’ụzọ dị ùgwù bụ ịnọgide na-adị gara aga ruo ogologo oge o kwere mee. Ịrụ ọrụ na-enye afọ ojuju, i kwesịkwara ilezi anya n’ihe oriri gị ma na-eme mgbanwe ndị kwesịrịnụ. Echere m na mgbe ndụ gị nwere nzube, ọ na-eme ka ị bụrụ onye dị iche. Echere m na iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe dị ezigbo mkpa n’inyere anyị aka ịnọgide na-enwe ezi ahụ ike. Tupu m ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, abụ m onye na-enwe nnọọ obi abụọ na onye na-adịghị enwe nchekwube. Ịmata eziokwu ndị dị n’ime Bible bụ ikike na-enweghị atụ nke na-enye mmadụ ike nke uche iji nagide ọnọdụ dịgasị iche iche.”

[Foto]

“Iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe dị ezigbo mkpa.”—Joseph