Ịmata Mgbaàmà Ya
Ịmata Mgbaàmà Ya
“Enweghị obi ụtọ bụ mmetụta uche dị otú o kwesịrị, nke na-abụghị ọrịa; ịda mbà n’obi bụ ọrịa. Ihe ịma aka e nwere bụ ịghọta na ịmata ọdịiche dị na ha.”—Dr. David G. Fassler.
DỊ KA ihe ka ọtụtụ ná nsogbu ndị ọzọ, ịda mbà n’obi na-enwe mgbaàmà ndị doro anya. Ma mgbaàmà ya adịchaghị adị mfe mmata. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile nọ n’afọ iri na ụma na-enwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ dị ka ndị toworo eto na-enwe. Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti enweghị obi ụtọ nkịtị na ịda mbà n’obi? Ọ na-adabere karịsịa n’ókè ọnọdụ ahụ siruru n’ike na oge o were.
Ókè o siruru n’ike na-agụnye ogologo oge onye na-eto eto nọruru n’ọnọdụ nke enweghị obi ụtọ. N’ịbụ nke na-adị njọ karịa inwe obi nkoropụ ruo nwa oge, ịda mbà n’obi bụ nrịanrịa mmetụta uche siri ike bụ́ nke na-ebelata nke ukwuu ikike nke onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma nwere ime ihe nke ọma. Dr. Andrew Slaby si otú a akọwa otú ọnọdụ ahụ siruru n’ike: “Cheedị echiche banyere ahụ mgbu kasị njọ i nwetụworo—ọkpụkpụ gbajiri agbaji, ezé mgbu, ma ọ bụ ime nwa—mụbaa ya okpukpu iri ma wepụ ihe kpatara ya; mgbe ahụ ọ pụrụ ikwe gị mee ịma ihe ihe mgbu nke ịda mbà n’obi na-adị ka ya.”
Oge o were na-ezo aka n’ogologo oge ọnọdụ enweghị mmasị n’ihe ahụ dịruru. Dị ka ndị prọfesọ na nkà mmụta ọgwụ bụ́ Leon Cytryn na Donald H. McKnew, Jr. si kwuo, “nwata nke na-egosipụtaghị ihe àmà ọ bụla nke ịbụ onye a kasiri obi ma ọ bụ nke na-amaliteghị ibi ndụ otú o si ebibu n’ime otu izu ọ nọsịrị n’ọnọdụ enweghị obi ụtọ (ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya)—ma ọ bụ n’ime ọnwa isii o nwesịrị ihe o lere anya dị ka oké mfu—nọ n’ihe ize ndụ nke inwe nsogbu ịda mbà n’obi.”
Mgbaàmà Ndị A Na-ahụkarị
A na-achọpụta ịda mbà n’obi nanị mgbe onye na-eto eto na-egosipụta ọtụtụ mgbaàmà kwa ụbọchị, n’oge ka ukwuu n’ụbọchị, ruo ma ọ dịkarịa ala izu abụọ. A na-akpọ nke na-anọtechaghị aka, nchegbu. A na-achọpụta ụdị ka bụrụ ụdị na-adịghị ala ala nke ịda mbà n’obi mgbe mgbaàmà dị iche iche dịgidere ruo ma ọ dịkarịa ala otu afọ, na-enwe ihe na-akarịghị ọnwa abụọ onye ahụ nwetatụrụ onwe ya. Na nke ọ bụla n’ime ọnọdụ abụọ a, gịnị bụ mgbaàmà ụfọdụ nke ịda mbà n’obi bụ́ ndị a na-ahụkarị? *
Mgbanwe mberede n’àgwà na ọnọdụ uche. Onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma bụ́ onye na-erube isi amalitezie isesa mmadụ okwu na mberede. Àgwà nnupụisi na ọbụna isi n’ụlọ gbapụ bụ ihe a na-ahụkarị n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma dara mbà n’obi.
Ikewapụ onwe onye n’ebe ndị mmadụ nọ. Onye ahụ nọ n’oge uto nke dara mbà n’obi ekewapụ onwe ya n’ebe ndị enyi ya nọ. Ma ọ bụ, ọ pụrụ ịbụ
na ndị enyi ya kewapụrụ onwe ha n’ebe onye ntorobịa ahụ dara mbà n’obi nọ ebe ọ bụ na ha hụrụ mgbanwe na-adịghị mma n’omume na n’akparamàgwà ya.Enwechaghịzi mmasị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe omume nile. N’ụzọ dị iche n’otú ọ na-emebu, onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma aghọzie onye na-adịghị ekerecha òkè n’ihe. Ihe omume ntụrụndụ ndị ọ ka lesịrị nnọọ anya dị ka ndị na-akpali mmasị abụrụzie ndị ọ na-ele anya dị ka ndị na-agbụ agbụ.
Mgbanwe dị ịrịba ama n’ụzọ iri ihe. Ọtụtụ ndị ọkachamara na-eche na nsogbu ndị dị ka nsogbu achọghị iri ihe na nsogbu iribiga nri ókè bụ ndị ha na ịda mbà n’obi na-aga ụkwụ na ụkwụ mgbe mgbe (ọ pụkwara ịkpata ha mgbe ụfọdụ).
Nsogbu ihi ụra. Ma ọ́ bụghị na onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma adịghị ehi ụra nke ọma ọ bụrụ na ọ na-ehibiga ụra ókè. Ụfọdụ na-azụlite àgwà ihi ụra na-edoghị anya, na-amụ anya n’abalị nile ma na-ehi ụra n’ehihie nile.
Emeghịzi nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Onye ahụ nọ n’oge uto nke dara mbà n’obi enwewa ihe isi ike n’iso ndị nkụzi na ndị ọgbọ ya nọrọ n’udo, akara mmụta ya ebidokwa dalatawa n’ụzọ dị ukwuu. N’oge na-adịghị anya onye ahụ nọ n’afọ iri na ụma agaghịzi achọ ịga ụlọ akwụkwọ ma ọlị.
Omume ndị dị ize ndụ ma ọ bụ ndị nke ịkpatara onwe onye mbibi. Akparamàgwà ndị ‘dị nnọọ ize ndụ’ pụrụ igosi na onye ntorobịa enwechaghị mmasị n’ịdị ndụ. Mmadụ iji aka ya na-ebekasị ahụ ya pụkwara ịbụ mgbaàmà.
Mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe na obi amamikpe na-ekwesịghị ekwesị. Onye ahụ na-eto eto aghọọ onye na-akatọkarị onwe ya, na-enwe mmetụta nke ịbụ onye ọ na-adịghị uru ọ bara, n’agbanyeghị na ihe ndị bụ́ eziokwu pụrụ igosi na ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị.
Nsogbu mmetụta uche. Mgbe a na-apụghị ịhụ ihe kpatara ha n’elu ahụ, isi ọwụwa, azụ mgbu, afọ ọrụrụ, na nsogbu ndị yiri ha pụrụ ịbụ ihe ndị na-agba àmà banyere ịda mbà n’obi na-apụtachaghị ìhè.
Ichekarị banyere ọnwụ ma ọ bụ banyere igbu onwe onye. Ikwukarị ihe ndị na-atụ oké ụjọ pụrụ igosi ịda mbà n’obi. Otú ahụ ka mmadụ iyi egwu na ọ ga-egbu onwe ya pụrụ igosipụta.—Lee igbe dị n’okpuru.
Ọrịa Uche Na-emetụta Ụbụrụ?
A pụkwara inwe ụfọdụ n’ime mgbaàmà ndị a n’ọrịa ọzọ na-eju anya—ọrịa uche na-emetụta ụbụrụ. Dị ka ndị dọkịta bụ́ Barbara D. Ingersoll na Sam Goldstein si kwuo, ọrịa uche na-emetụta ụbụrụ (bụ́kwa
nke a maara dị ka uche mkpaghasị nke na-akpata ịda mbà n’obi) bụ “ọnọdụ nke ihe e ji mara ya bụ ịdị na-ada mbà mgbe mgbe ma na-enwe, n’agbata oge ịda mbà n’obi ndị ahụ, ume ọrụ na ọnọdụ uche na-adị elu gabiga ókè—n’ezie, dịrị elu gabiga nnọọ ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma ọnọdụ uche mmadụ kwesịrị ịdị.”A na-akpọ ọnọdụ mkpali a, uche mkpaghasị. Mgbaàmà ya pụrụ ịgụnye nchekasị, oké ekwurekwu, na achọchaghịzi ihi ụra. N’ezie, onye nwere nsogbu ahụ nwere ike ịnọ ọtụtụ ụbọchị n’ehighị ụra ma ghara inwe ihe àmà ọ bụla nke ike ọgwụgwụ. Mgbaàmà ọzọ nke ọrịa uche na-emetụta ụbụrụ bụ àgwà nke ime ihe ozugbo n’echeghị echiche, n’atụleghị ihe ndị pụrụ isi na ya pụta. “Mkpaghasị uche na-emetụtakarị iche echiche, ụzọ e si ele ihe anya, na ụzọ e si akpa àgwà n’etiti ndị mmadụ n’ụzọ ndị na-akpata oké nsogbu na mmechuihu,” ka otu akụkọ sitere n’Ụlọ Ọrụ Mba United States Na-ahụ Maka Ahụ Ike Uche na-ekwu. Ogologo oge hà aṅaa ka ọnọdụ mkpaghasị uche ahụ na-adịru? Mgbe ụfọdụ ọ na-adịru nanị ụbọchị ole na ole; n’ọnọdụ ndị ọzọ, mkpaghasị uche na-adịgide ruo ọtụtụ ọnwa tupu ọ pụọrọ nsogbu ibe ya, bụ́ ịda mbà n’obi.
Ndị kasị nọrọ n’ihe ize ndụ nke inwe ọrịa uche na-emetụta ụbụrụ na-agụnye ndị nwere ndị òtù ezinụlọ na-arịa ọrịa ahụ. Akụkọ ọma e nwere bụ na e nwere olileanya dịịrị ndị na-enwe nsogbu ahụ. “Ọ bụrụ na a chọpụta ya ngwa ngwa, gwọọkwa ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị,” ka akwụkwọ bụ́ The Bipolar Child na-ekwu, “ụmụaka a na ezinụlọ ha pụrụ ibi ndụ ka nnọọ mma.”
Ọ dị mkpa ịrịba ama na ọ dịghị mgbaàmà nke nanị ya ga-egosi na e nwere ịda mbà n’obi ma ọ bụ ọrịa uche na-emetụta ụbụrụ. Ọtụtụ mgbe karị, ọ na-abụ ìgwè mgbaàmà nke e nwere ruo oge ụfọdụ na-eduga ná nchọpụta ya. Ma, ajụjụ ahụ ka dịkwa, N’ihi gịnị ka nsogbu a na-eju anya ji eti ndị nọ n’afọ iri na ụma ihe otiti?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 E bu n’uche ka mgbaàmà ndị e gosipụtara n’ebe a bụrụ ntụle dị mkpirikpi, ọ bụghị ihe ndabere maka ime nchọpụta.
[Igbe dị na peeji nke 6]
MGBE NWATAKỊRI CHỌRỌ ỊNWỤ
Dị ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa Ọrịa nke United States si kwuo, n’otu afọ na-adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ ndị na-eto eto nọ na United States bụ́ ndị nwụrụ site n’igbu onwe ha karịrị ngụkọta nke ndị nile nwụrụ n’ọrịa cancer, ọrịa obi, ọrịa AIDS, nkwarụ site n’ọmụmụ, ọrịa strok, oyi ịba n’ahụ, oké ahụ ọkụ, na ọrịa akpa ume nke na-adịghị ala ala. E nwere eziokwu ọzọ na-enye nsogbu n’obi: E nwewo mmụba dị ịrịba ama n’ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’agbata afọ 10 na 14 a na-akọ na ha gburu onwe ha.
À pụrụ igbochi ndị nọ n’oge uto igbu onwe ha? N’ọnọdụ ụfọdụ, a pụrụ. “N’eziokwu, ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na n’ọtụtụ mgbe, tupu mmadụ egbuo onwe ya, ọ na-ebu ụzọ anwale ya ma ọ bụ kwuo okwu ụfọdụ na-agba àmà ihe ọ na-eche,” ka Dr. Kathleen McCoy dere. “Mgbe nwa gị nọ n’afọ iri na ụma kwuru ihe gosiri na ọ na-eche echiche igbu onwe ya, ọ bụ oge i kwesịrị ilerukwu anya ala nakwa ikekwe ịchọ enyemaka onye ọkachamara.”
Njupụta nke ịda mbà n’obi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-emesi ike mkpa ọ dị ndị nne na nna na ndị ọzọ toworo eto ịghara iwere ngosipụta ọ bụla onye na-eto eto mere na ọ na-achọ igbu onwe ya dị ka ihe egwuregwu. “N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okwu ọ bụla metụtara igbu onwe onye bụ́ ndị m nyochaworo, e leghaara ihe ndị na-agba àmà banyere atụmatụ onye ahụ nọ n’oge uto na-eme anya ma ọ bụ lee ha anya dị ka egwuregwu,” ka Dr. Andrew Slaby dere n’akwụkwọ ya bụ́ No One Saw My Pain (Ọ Dịghị Onye Hụrụ Ihe Mgbu M). “Ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi aghọtaghị ịdị ukwuu nke mgbanwe ndị ha nọ na-ahụ. Ha lekwasịrị anya n’ihe ndị ọ na-arụpụta ọ bụghị n’ihe kpatara nsogbu ahụ, nke na ihe a chọpụtara bụ ‘nsogbu ezinụlọ’ ma ọ bụ ‘iji ọgwụ ọjọọ eme ihe’ ma ọ bụ ‘nsogbu achọghị iri ihe.’ Mgbe ụfọdụ e nyere ọgwụgwọ maka iwe, mgbagwoju anya, na ahụ mgbakasị ọ kpatara, ọ bụghị ịda mbà n’obi ahụ. Ihe kpatara nsogbu ahụ ka dị ebe ọ dị, na-emekpa ahụ ma na-akawanye njọ.”
Ozi ahụ doro anya: Elegharala ihe àmà nile na-egosi na mmadụ chọrọ igbu onwe ya anya!
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbe ụfọdụ, àgwà nnupụisi na-abụ mgbaàmà nke ịda mbà n’obi na-apụtabeghị ìhè
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị dara mbà n’obi na-abụkarị ndị na-adịghịzi enwe mmasị n’ihe omume ndị na-akpalibu mmasị ha